“Septemba 28–Ọktoba 4. ‘Kasie Ndị M Obi’: Aịzaya 40–49,” Bianụ, Soro M—Maka Ebe Obibi na Nzukọ nsọ: Agba Ochie 2026 (2026)
“Septemba 28–Ọktoba 4. ‘Kasie Ndị M Obi,ʻ” Bịanụ, Soro M: Agba Ochie 2026
Na-agwọ Nwoke Kpuru isi, site nʻaka Carl Heinrich Bloch, nọ na Mbarị Nkaọkpụ Frederiksborg nke Agụgụala Ala
Septemba 28–Ọktoba 4: “Kasie Ndị M Obi”
Aịzaya 40–49
“Nkasị obi” bụ okwu nke mbụ na Aịzaya isi 40. Nke a na-aka mmalite nke ụda dị iche, mkwusi ike dị iche nke ozi onye amụma. Edereede ndị isi mbụ nke Aịzaya dọrọ Izrel na Judah aka na ntị banyere mbibi na ndọkpụ n’agha nke ga-abịa nihi mmehie ha. Mana amụma ndị ikpeazụ ndịa ka eburu maka ịkasi ndị Juu obi ihe karịrị afọ 150 nʻọdịnihu—mgbe ebibisiworo Jerusalem na tempụl ma ndị Babịlọn adọkpụrụ ndị mmadụ n’agha. Otú osila dị, amụma ndị a, na-eru ọbụna n’ọdịnihu karịa ndị Izrel e meriri emeri, ndị nwere nkụda mmụọ. Ha na-ekwuru anyị okwu, anyịnwa kwa mgbe ụfọdụ na-enwe mmetụta ndị emeriri emeri, nkụda mmụọ, ma ọbuna ndị furu efu.
Ozi nke Aịzaya nye ndị ya na nye anyị dị mfe: “Atụla ụjọ” (Aịzaya 43:1). Ọnweghi ihe ọbụla furu efu. Onyenwe anyị echefubeghi gị, ma Ọ dị ike imegide ọnọdụ ndị nwere ike ịdị ka ha karịrị gị. Ọ bụ na Onyenwe anyị, onye “kere eluigwe nile” (Aịzaya 42:5), ọ dịghị ike karịa Babịlọn, karịa mmehie, karịa ihe ọ bụla dọkpuru gị n’agha? “Lọghachikwute nụ m,” Ọ na-arịọ, “niihi na-agbapụtawo m unu” (Aịzaya 44:22). Ọ pụrụ ịgwo, ịweghachi, ịgba ume, ịgbaghara, na ịkasị obi—ihe ọbụla dịịrị gị mkpa, nʻọnọdụ gị, iji nwee mgbapụta.
Nchepụta niile maka Ọmụmụ ihe N’Ebe Obibi na na Nzukọ nsọ
Aịzaya 40–49
Jizọs Kraịst pụrụ ikasị m obi ma nye m olile anya.
Mgbe ndị Izrel nọ na ndọkpụ nʻagha na Babịlọn, ọtụtu nwere ike chee ma ha etufuwo ruo ebighi ebi ọnọdụ ha dị ka ndị Chineke họọrọ, ndị ọgbụgba ndụ. Dị ka ị na-agụ Aịzaya 40–49, chọọ edereede ndị nwere ike nye ha nkasị obi na olile anya. Maka edereede nke ọbụla ịchọtara, tulee uche ma depụta ihe Onyenwe anyị nwere ike na-ekwuru gị nime amaokwu ndị a. Nke a bụ ihe ole ma ole i nwere ike iji bido:
-
40:11, 29–31:
-
41:10–13, 17–18:
-
42: 6–7:
-
43:1–7, 25:
-
44:1–4, 21–24:
-
46:3–4:
-
49:7–16:
Kedụ ihe i chere Onyenwe anyị chọrọ ka ị mata banyere Ya?
Ịnwere ike hụta na abụ ahụ “Ka Ntọala Siri Sie Ike” (Abụ, no. 85) dabere nʻokwu niile nke Aịzaya na Aịzaya 41:10; 43:2–5; 46:4. Tulee ịgụ ma ọ bụ ịge ntị na abụ nke a, wee na-achọ myiemetụ niile nọ na-agbata abụune niile na amaokwu ndịa sitere na Aịzaya Kedụ otu Onyenwe anyị siworo mezuo nkwa ndị dị niime amaokwu ndịa niime ndụ gị?
Lee kwa Patrick Kearon, “O Biliwo jiri Ọgwụgwọ na Nku Ya: Anyị Nwere ike Ị bụ Karịa Ndị Nwere mmeri,” Liahona, Me 2022, 37–40.
Jiri akwụkwọ nsọ ndị ọzọ Mgbe ụfọdụ anyị nwere ike ghọta Agba Ochie nke ọma karịa ma ọ bụrụ nʻanyị agbakwụnye ọmụmụ anyị jiri amaokwu ndị sitere na Akwụkwọ nke Mọmọn. Na-ịmatụ, ndị amụma Akwụkwọ nke Mọmọn Nifaị na Jekọb nwere ohere ịgụ odide niile nke Aịzaya dị na epekele niile nke bras (lee 1 Nephi 19:22–23), ma ha jiri amụma ndịa kuzie ihe banyere Onye Nzọpụta. Ịmụta otu Nịfaị na Jekọb jiri were ndị ya tụnyere Aịzaya 48–49 lee 1 Nifaị 22. Nke ahụ nwere ike nyere gị aka ịwere isi ndị a tụnyere ndụ nke onwe gị.
Site na-irubere Onyenwe anyị isi, anyị nwere ike nwee “udo … dịka osimiri” (Aịzaya 48:18).
Aịzaya 40–49
“Ị bụ nwa odibo m.”
N’ime Isaiah 40–49 niile, Onyenwe anyị na-ekwu maka “nwa odibo” Ya na “ndị akaebe” Ya. Okwu ndịa na-arụtụ aka na Jizọs Kraịst (lee Aịzaya 42:1–7), na ụlọ nke Izrel (lee Aịzaya 45:4), na nye Eze ndị Cyrus, onye hapụrụ ndị Juu ka ha lọghachi na Jerusalem ma wuzigharịa tempụl ahụ (lee Aịzaya 44:26–28; 45:1–4). Ịnwekwara ike tulee otu ederede ndị a jiri gbasa gị dị ka nwa odibo na onye aka ebe nke Onyenwe anyị. Na-ịmatụ, tulee ajụjụ ndị dị ka ndị a:
Aịzaya 40:1–3, 9–11; 43:9–12.. N’echiche dị an̄aa ka iji bụrụ onye akaebe nke Jizọs Kraịst? Kedụ “ozi dị mma niile” nke ịnwere ike ikesaa dị ka onye aka ebe Ya? I nwere ike chee ya eche na a kpọwo gị iguzoro n’ebe a na-agba akaebe n’ikpe nke ụlọikpe. Nʻikpe nke a, Jizọs Kraịst ka eboworo ebubo maka ihe okwuru ededatara na Aịzaya 43:11. Kedu ama ịnwere ike ịgba iji nye nkwado maka ihe Jizọs kwuru? Kedụ ihe akaebe sitere na ndụ gị nke ịnwere ike ikwupụta?
Aịzaya 41:8–13; 42:6; 44:21. Gịnị ka Onyenwe anyị kpọrọ gị ka ị mee? Tulee ọkpụkpọ okù niile nke Nzukọ nsọ nakwa ohere ndị ọzọ iji jere Ya ozi. Kedụ otu O siworo “kpụọ” ma ọ bụ kwadoo gị ịbụ nwa odibo Ya? Kedụ otu O si akwado gị dị ka ị na-eje ozi?
Aịzaya 49:1–9. Kedụ ozi ndị ị na-achọta niime amaokwu ndị a nke nwere ike inye aka mgbe mbọ gị niile na ije ozi dị nnọọ ka ọ bụ “ihe ọkpọrọ, na ihe efu”? (amaokwu 4).
Aịzaya 40:3–8, 15–23; 42:15–16; 47:7–11
Ike nke Chineke karịri ike nke ụwa.
Aịzaya ugboro ugboro chetaara ndị ya maka ike na-enweghi atụ nke Chineke, ọbụna ma e jiri ya tụnyere ike ọchịchị mmegbu nke ụwa nke gbara ha gburugburu. Chọọ ozi niile nke a dị ka ị na-agụ Aịzaya 40:3–8, 15–23; 42:15–16; na 47:7–11 (hụba ama na isi nke 47 ka edegaara Babịlọn ndị dọkpuru Izrel nʻagha). Kedụ ihe amaokwu niile ndị a na-akuziri gị banyere ihe nke ụwa? Gịnị ka ha na-akuziri gị banyere Chineke? Tulee ihe kpatara ozi nke a nwere iji dịịrị ndị Juu adọkpuru nʻagha mkpa. Gịnị mere o ji dịrị gị mkpa?
Aịzaya 48:10; 49:13–16
Onyenwe anyị pụrụ ịn̄ụcha m site na mkpagbu m niile.
Dị ka ị na-agụ Aịzaya 48:10, tulee “ekwu ọkụ nke mkpagbu” nke gị onwe gị. Kedụ otu Onyenwe anyị si “na-an̄ụcha” gị? Kedụ otu Aịzaya 49:13-16 ji enyere gị aka mgbe ị na-agabiga mkpagbu?
Lee kwa “Ọkụ nke Onye nn̄ụcha” (vidiyo), Ọba akwụkwọ Ozi ọma.
The Refiner's Fire
Maka nchepụta ndị ọzọ, lee mbipụta niile nke ọnwa nke a nke Liahona na magazin niile Maka Ume nke Ndị Ntoroọbịa .
Nchepụta niile maka Ikuziri Ụmụntakịrị
Aịzaya 40:3–5
E nwere m ike ịnye aka kwado “ụzọ nke Onyenwe anyị.”
-
Chee maka ụfọdụ ụzọ ndị inwere ike iji gosi ihe ọ nwere ike ịpụta ị “kwado … ụzọ nke Onyenwe anyị,” dị ka akọwara na Aịzaya 40:3–5. Na-ịmatụ, gị na ụmụ gị nwere ike gbatịa otu ihe gbagọrọ agbagọ, kpochapụ ala nwere ngwongwo, ma ọ bụ mepụta ụzọ site n’okporo ụzọ nkume. Ịnwekwara ike gosi foto niile nke Jọn Omee Baptizim na Josef Smith (lee Akwụkwọ Nka Ozi ọma, nọs 35, 87). Kedụ otu ha si kwado ụzọ maka ọbịbịa nke Onyenwe anyị? (lee Luk 3:2–18; Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 135:3). Olee otu anyị nwere ike isi nyee aka? Nke a nwere ike bụrụ ohere iji kwuo banyere otu ndị ji Ọkwa nchụ aja nke Erọn ji enye aka kwado ụzọ nke Onyenwe anyị (lee Ozizi na Ọgbụgba ndụ nile 84:26–28).
Aịzaya 43:10
E nwere m ike ị bụ onye aka ebe nke Onyenwe anyị.
-
Mgbe unu gụkọtasịrị Aịzaya 43:10 ọnụ, unu nwere ike kwuo banyere ihe ọ pụtara ị bụ onye aka ebe. Kesara ibe unu nhụmihe niile unu nwetere nke ị nwere ike iji bụrụ “onye aka ebe” nke—na-ịmatụ, nrị nke ịdetuworo ọnụ, ebe ịgatuworo, ma ọ bụ onye ị ma ama. Gịnị ka ọ pụtara ị bụ onye aka ebe nke Onyenwe anyị? Gịnị ka anyị nwere ike ịgwa ndị mmadụ banyere Ya?
Aịzaya 44:3–4; 45:8
Onyenwe anyị ga “awụkwasị” ngọzi Ya nʻisi m.
-
Mgbe ịgụsịri amaokwu ndịa, ụmụ gị nwere ike gbaa otu ahịhịa mmiri ma kwuo banyere ngọzi niile nke Onyenwe anyị na-awụkwasị nʻisi ha. Gịnị ga-eme ahịhịa mgbe agbara ya mmiri? Kedụ otu ngọzi niile nke Onyenwe anyị siworo nyere anyị aka too etoo?
“Eziomume anyị [nwere ike dịrị] ka ebili mmiri nke oke osimiri” (Aịzaya 48:18).
Aịzaya 48:17–18
Ịdobe iwu nsọ niile nke Chineke na-ewete udo.
-
Foto na vidiyo nke ebili mmiri nke osimiri na oke osimiri nwere ike ịnyere ụmu gị aka chee Aịzaya 48:18 nʻuche ha (dị ka foto ndị ahụ dị niime ndepụta nke a). Ụmụ gị nwere ike nwee mmasị imegharị aka ha na ogweaka ha dị ka osimiri na ebili mmiri nke oke osimiri. Kedụ otu udo ga-esi a dị ka osimiri? Kedụ otu eziomumme ga-esi a dị ka ebili mmiri? Kwuo banyere otu idebe iwu nsọ Chineke ji nyere gị aka inwete udo dị ka osimiri ma ọ bụ sie ike dị ka ebili mmiri.
-
Gụkọtanụ ọnụ otu egwu banyere iwu nsọ, ụdị dị ka “Debe Iwu nsọ niile” (Akwụkwọ Ukwe Ụmụntakịrị, 146–47). Kedụ ihe egwu nke a na-akuzi banyere ihe mere anyị ji kwesị idebe iwu nsọ Chineke?
Aịzaya 49:14–16
Onyenwe anyị agaghị echefu m ma ọlị.
-
Aịzaya :49:14–16 nwere ike ịbụ nnukwu nkasị obi nye ụmụ gị ọtụtụ afọ na-abịa. Dị ka ị na-agụ amaokwu 14, i nwere ike kwuo banyere ihe nwere ike ịme ndị mmadụ echee na echefuwo ma ọ bụ hapụ ha. Kedụ otu anyị ji ama na Onyenwe anyị echefubeghi anyị?
-
Iji dubata amaokwu ndịa 15–16, ịnwere ike jụọ ụmụ gị banyere onye ha agaghị echefu ma ọlị, dị ka onye otù ezi na ụlọ ma ọ bụ enyi. Dị ka Aịzaya 49: 15-16kwuru, gịnị mere Onyenwe anyị agaghị echefu anyị ma ọlị? Emesịa unu nwere ike kesaara ibe unu mmetụta unu banyere Jizọs Kraịst.
Maka echiche ndị ọzọ, lee mbipụta nke ọnwa nke a nke magazin Friend .