Come, Follow Me
Ọktoba 19–25. “Tupu M Kpụọ Gi nʻAfọ A Maara M Gị”: Jeremaya 1–3; 7; 16–18; 20


Ọktoba 19–25. ‘Tupu M Kpụọ Gi nʻAfọ A Maara M Gị’: Jeremaya 1–3; 7; 16–18; 20,” Bịanụ, Soro M—Maka Ebe Obibi na Nzukọ nsọ: Agba Ochie 2026 (2026)

Ọktoba 19–25. “Tupu M Kpụọ Gi nʻAfọ A Maara M Gị,ʻ” Bịanụ, Soro M: Agba Ochie 2026

Jeremaya na-ele nwoke ọzọ anya

Jeremaya, site n’aka Walter Rane

Ọktoba 19–25: “Tupu M Kpụọ Gi nʻAfọ A Maara M Gị”

Jeremaya 1–3; 7; 16–1820

Na mbụ, Jeremaya echeghi na ọ ga-abụ ezigbo onye amụma. “Lee, a pụghị m ikwu okwu,” ka ọ zaghachiri (Jeremaya 1:6). Mana Onyenwe anyị masiri ya obi ike, “Etinyewo m okwu m nʻọnụ gị” (amaokwu 9). Jeremaya chere na ọ bụ “nwata” na-enweghi nhụmihe ọbụla (amaokwu nke 6), mana Onyenwe anyị kọwara na akwadobere ya karịa otu o si wee chee—echiwo ya echichi nʻọkpụkpọ okù nke a tupu a mụọ ya (lee amaokwu nke 5). Nihi ya Jeremaya wepụrụ ụjọ ya niile ma nabata ọkpụkpọ okù ahụ. Ọ dọrọ ndị eze na ndị nchụ aja nke Jerusalem aka na ntị na ịdi nsọ egbugbere ọnụ ha agaghị azọpụta ha. “Nwa” ahụ chere na ọ gaghị ekwunwu okwu bịara nwete mmetụta okwu nke Chineke “niime obi [ya] dị ka ọkụ na-ere ere” ma enweghi ike ịkwuchi ya ọnụ (Jeremaya 20:9).

Akụkọ Jeremaya bụkwa akụkọ gị. Chineke maara gị, kwa, tupu a mụọ gị ma kwadoo gị maka ozi gị na ndụ. Niime ihe ndị ọzọ, ozi ahụ gụnyere otu ihe Jeremaya hụru nʻọhu: mkpọta nke ndị nke Chineke, nʻotu nʻotu, iji “na-ịkpọta [ha] na Zayọn” (Jeremaya 3:14). Ma ọbụrụgodi na ị maghị kpọm kwem ihe ị ga-eme ma ọ bụ kwuo, ị gaghị “atụ ụjo … ; nihi na a nọnyere M gị, ka Onyenwe anyị kwuru” (Jeremaya 1:8, 19).

Maka nchikọta nke akwụkwọ nke Jeremaya, lee “Jeremaya” niime Ọkọwa okwu Baịbụl.

akara ngosi ihe ọmụmụ

Nchepụta niile maka Ọmụmụ ihe N’Ebe Obibi na na Nzukọ nsọ

Jeremaya 1:4–19; 7:1–7; 20:8–9

Ndị amụma ka akpọrọ ikwu okwu nke Chineke.

Cheegodi na ị na-ekwuuru otu enyi gị okwu onye nke na anụtụbeghi maka ndị amụma mbụ, ma gị ekpebie ịkọwa ụkpụrụ ahụ jiri ọkpụkpọ okù nke Jeremaya ị bụ Onye amụma dị na Jeremaya 1:4–19. Gịnị ka ị na-ahụta niime amaokwu ndị a na-akuzi ihe banyere ndị amụma nke Chineke? Ị nwekwara ike lee anya na Jeremaya 7:1–7; 20:8–9 na abụ dị ka “Anyị Na-ege ntị Na Olu nke Onye Amụma” (Abụ, no. 22).

Ị nwekwara ike chọọ ikuziri enyi gị ihe banyere onye amụma ụbọchị taa dị ndụ. Enwere ịhe ọzọ niime amaokwu ndị a nke nwere ike ịnye aka? Na-ịmatụ, kedụ ihe ndị amụma ụbọchị anyị “na-efopụ” ma ọ bụ “adọda ala”? Gịnị ka ha “na-ewu” ma “na-akụ”? (Jeremaya 1:10). Kedụ otu i siworo bịa mata na onye amụma anyị dị ndụ ka akpọrọ site nʻaka Chineke?

Lee kwa Edide niile nke Okwukwe 1:6, 9; “Gịnị kpatara Anyị Ji Enwe Ndị amụma?” (vidiyo), ChurchofJesusChrist.org.

1:37

Why Do We Have Prophets?

Jeremaya 1:5

akara ngosi semịnarị
Chineke maara m tupu a mụọ m.

Kedụ ihe Jeremaya mụtara banyere onwe ya niime Jeremaya 1:5? Dị ka onye amụma akpọrọ ọhụrụ, gịnị mere ozi ahụ ji dịịrị ya mkpa ịmata?

Ọtutụ ihe Jeremaya mụtara banyere onwe ya niime Jeremaya 1:5 bụkwa eziokwu banyere gị. Chineke maara gị kwa tupu a mụọ gị ma kwadobe gị maka oke nʻọrụ doro anya. Ịmụtakwu banyere ndụ gị tupu a mụọ gị, gụọ Alma 13:1–4; Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 138:53–56; na Ebreham 3:22–23. I nwere ike depụtasị eziokwu ndị ị chọtara. Kedụ ihe kpatara ozi nke a ji dịrị gị mkpa ịmata?

Ị mụta banyere otu eziokwu ndịa siri metụta ndụ nke Okenye Ahmad S. Corbitt, mụọ ozi ya “Ị Nwere ike Ikpọkọta Izrel! (Liahona, Me 2021, 63–63). Kedụ otu ị mata banyere ndụ tupu ndụ anụ ahụ gị ga-esi emetụta ụzọ iji ebi ndụ anụ ahụ gị?

Nke a bụ ihe Onyeisi Russell M. Nelson kwuru banyere ndụ tupu ndụ anụ ahụ gị:

“Nna nke Eluigwe unu amarwo gị kemgbe ogologo oge. Gị, dị ka nwa Ya nwoke ma ọ bụ nwa Ya nwanyị, ka Ọ ghọọrọ ịbịa n’ụwa n’oge nke a akpọrọ aha, ị bụ onye ndu nime ọrụ Ya dị nnukwu n’elu ụwa. A họọrọ gị ọbụghị nihi ejirimara nke anụ ahụ gị kama nihi ejirimara nke ime mmụọ gị niile, dị ka ị bu dike, ịnwe mgbam ume, eziokwu nke obi gị, akpịrị ịkpọ nkụ maka eziokwu, agụụ maka amamiihe, na ọchịchọ ijere ndị ọzọ ozi.

“I melitere ụfọdụ ejirimara ndịa tupu ndụ anụ ahụ. Ndị ọzọ ka inwere ike imelite nʻụwa ebe a dị ka ị na-agbalịsike ịchọ ha” (“Mkpebi niile maka Ebighi ebi,” Liahona, Nov. 2013, 107).

Cheegodi maka ụfọdụ ọnọdụ ịnwere ike izute nke ọ ga-adị mkpa ịcheta eziokwu ndịa banyere ndụ tupu ndụ anụ ahụ gị. Gịnị ka i nwere ike ime iji chetara onwe gị eziokwu ndị a?

Lee kwa Russell M. Nelson, “Mkpebi nIile maka Ebighi ebi,” Liahona, Nov. 2013, 106–9; Isiokwu niile na Ajụjụ niile, “Echichi echiri na mbụ,” “Ndụ Tupu Ndụ Anụ Ahụ,” Ọba akwụkwọ Ozi ọma.

n’aka ekpe, otu onye guzoro n’otu nnukwu olulu mmiri tọgbọ chakoo; n’aka nri, nsọdammiri

Na Jeremaya 2:13, Onyenwe anyị were ọnọdụ nke ime mmụọ ndị mmadụ tụnyere “olulu mmiri gbawara agbawa” ma were Onwe Ya tụnyere “isi iyi nke mmiri na-enye ndụ.”

Jeremaya 2; 7

“Ha ajụwo m isi iyi nke mmiri na-enye ndụ.”

Nʻebe mpaghara akọrọ ebe ndị Izrel biiri, ndị mmadụ chekwara mmịri dị ụkọ niime olulu dị niime ime ala akpọro cistern. Gịnị ka i chere “olulu mmiri ahụ gbawara gbawa” ekwuru na Jeremaya 2:13 na-anọchite? Gịni mere ojiri ka mma ị gbara mmiri site nʻisi iyi karịa na idabere nʻolulu mmiri? Gịnị ka ọ pụtara ị gbahapụ “isi iyi nke mmiri na-enye ndụ”? Dị ka ị na-agụ Jeremaya 2 and 7, hụta otu ndị mmadụ jiri gbahapụ mmiri na-enye ndụ nke Onyenwe anyị (lee, na-ịmatụ, Jeremaya 2:26–28; 7:2–11). Gịnị kpatara “mmiri na-enye ndụ” jiri bụrụ ọdịmara dị mma maka ihe Onye Nzọpụta na-enye gị? Chee banyere otu isi na anata mmiri na-enye ndụ.

Jeremaya 7 ka edegara ndị mmadụ ndị na-abanye “nʻụlọ nke Onyenwe anyị … ife Onyenwe anyị ofufe,” mana omume ha ekwekọghị na ofufe ha nke anya na-ahụ (lee amaokwu 2–11). Kedụ ozi ndị ịchere na Onyenwe anyị gaara enwe maka gị niime amaokwu nke 21–23?

Jiri ọmụmụ ihe ndị enwere ike imetụ aka. Ndị amụma nke Onyenwe anyị mgbe na mgbe na-ewere eziokwu nke ime mmụọ tụnyere mpanaka ndị ama ama. Tulee ịme otu ahụkwa dị ka ina-amụta ma na-akuzi ozi ọma. Na-ịmatụ, ịhụ Jeremaya 2:13nʻuche gị, ị nwere ike nwunye mmiri niime ite gbawara agbawa ma ọ bụ n̄ụọ mmiri site nʻisi iyi esi an̄ụ mmiri. Kedụ otu Jizọs jiri dị ka “isi iyi nke mmiri na-enye ndụ”? (Jeremaya 2:13). Olee otu anyị si an̄ụ site na mmiri na-enye ndụ nke Ya?

Jeremaya 3:14–18; 16:14–21

Onyenwe anyị ga-akpọkọta ndị Ya.

Na Jeremaya 16:14–15, Jeremaya were mkpọkọta nke Izrel nʻụbọchị ikpeazụ ndịa iji tụnyere Ọpụpụ nke ndị Izrel site na Ijipt. Nʻuche nke gị, gịnị kpatara mkpọkọta ahụ jiri ka dịrị ndị nke Chineke mkpa karịa Ọpụpụ ahụ?

Kedụ ihe Jeremaya 3:14–18; 16:14–21 na-atụpụta banyere otu mkpọkọta ahụ si eme?

Nʻozi ya “Olileanya nke Izrel,” Onyeisi Russell M. Nelson, dị ka Jeremaya, kuziri na mkpokọta nke Israel, “bụ ihe kachasị mkpa a na-eme nʻelu ụwa taa” (worldwide youth devotional, June 3, 2018, Ọba akwụkwọ Ozi ọma). Gụọ ma ọ bụ gee ntị na ozi ya, ma hụ ma ị ga-enwe ike chọpụta (a) otu Onyeisi Nelson jiri kọwaa mkpọkọta nke Izrel, (b) otu o jiri kọwaa mkpa ọ dị, na (ch) otu ịnwere ike iji bụrụ akụkụ nke mkpọkọta ahụ.

Maka nchepụta ndị ọzọ, lee mbipụta niile nke ọnwa nke a nke Liahona na magazin niile Maka Ume nke Ndị Ntoroọbịa .

akara ngosi nkeji ụmụntakịrị

Nchepụta niile maka Ikuziri Ụmụntakịrị

Jeremaya 1:5

Nna nke Eluigwe maara m tupu a mụọ m.

  • Iji dubata eziokwu ahụ dị mkpa akuziri na Jeremaya 1:5, ịnwere ike gosi ụmụ gị otu foto nke nwa ọhụrụ (ma ọ bụ ọ kwe omume, ị nwere ike lee anya na foto nke ụmụ gị mgbe ha bụ ụmu a mụrụ ọhụrụ). Jụọ ụmụ gị ma ha maara ebe ha bibụrụ tupu a mụọ ha. Unu nwekwara ike gụkọọ otu egwu ọnụ na-akuzi banyere ndụ tupu ndụ anụ ahụ anyị, dị ka “Ebibụrụ m Nʻelu Igwe” (Akwụkwọ ukwe Ụmụ ntakịrị, 4).

  • Ọ bụrụ na ụmụ gị ga-achọ ịmụtakwu karịa, ị nwere ike nyere ha aka chọta “Ndụ tupu ndụ anụ ahụ” na Odudu nye Akwụkwọ nsọ. Ha nwere ike chọọ maka ọsịsa niile nye ajụjụ ndịa “onye,” “mgbe ole,” na “gịnị” banyere ndụ tupu ndụ anụ ahụ.

otu nwata nwanyị jidere otu nwa ọhụrụ

Jeremaya 1: 4–19

Ndị amụma ka akpọrọ ikwu okwu nke Onyenwe anyị.

  • Tulee igosi foto nke onye amụma dị ndụ ma ọ bụ ndị amụma sitere na akwụkwọ nsọ (ịnwere ike chọta ụfọdụ niime Magazin nile nke Nzukọ nsọ, na Akwụkwọ Nka Ozi ọma, na Bịanụ, Soro M Jụọ ụmụ gị ihe ha maara banyere ndị amụma ndị a.

  • Iji kuzie banyere ihe ndị amụma na-eme, ị nwere ike họrọ ụfọdụ amaokwu nwere ike inyeaka sitere na Jeremaya 1, ụdị dị ka amaokwu 5, 7, 10, na 19. Ụmụ gị nʻotu nʻotu nwere ike họrọ otu niime amaokwu ndị ahụ, gụọ ya, ma kesaa otu ihe ha mụtara banyere ndị amụma.

Jeremaya 16:14–16

Enwere m ike ịnyere ụmụ nke Nna nke Eluigwe aka lọghachikwute Ya.

  • Dị ka ị na-agụ Jeremaya 16:16, ụmụ gị nwere ike mee ka a ga-asị ha “na-akụ azụ” ma ọ bụ “na-achụ nta” maka ihe ndị nọ na gburugburu ime ụlo ahụ. Onyeisi Russell M. Nelson ewerewo ndị ọkụ azu na ndị di nta dị niime amaokwu nke a jiri tụnyere ndị mgbasa ozi ọma (lee “Mkpọkọta nke Izrel Ahụ Ekposasịrị,” Liahona, Nov. 2006, 81). Kedụ ihe ndị mgbasa oziọma na-eme? Kedụ otu anyị ga-esi nye aka “kụọ azụ” ma “chụọ nta” maka ndị Izrel ekposasịrị? (lee “Otu Ozi maka Ụmụntakịrị sitere n’aka Onyeisi Russell M. Nelson” [vidiyo], ChurchofJesusChrist.org).

    3:30

    Video: A Message for Children from President Russell M. Nelson

Jeremaya 18: 1–6

Enwere m ike hapụ ka Onyenwe anyị duo ndụ m, dị ka ọkpụ ite si akpụgharị ụrọ.

  • Iji nyochagharịa amaokwu ndịa, ịnwere ike kparịta ụka ma ọ bụ gosi otu eji akpụ ite (lee foto dị na ngwụcha ndepụta nke a). Kedụ ozi nke Onyenwe anyị nwere maka anyị niime Jeremaya 18:1–6? Gịnị ka ọ pụtara ị bụ ụrọ nʻaka nke Onyenwe anyị? (lee kwa Aịzaya 64:8). Maka akụkọ ọzọ na-ewere anyị tụnyere ụrọ nke onye na-akpụ ite, lee ozi nke Okenye Richard J. Maynes “Ọn̄ụ Ahụ nke Ibi Ndụ Dabeere na Kraịst” (Liahona, Nov. 2015, 27–30).

Maka echiche ndị ọzọ, lee mbipụta nke ọnwa nke a nke magazin Friend .

aka na-akpụ ite nọ na wheel

“Lee, dị ka ụrọ ahụ si nọrọ nʻaka onye na-akpụ ite, otu a ka unu nọ nʻaka m, O ụlọ nke Izrel” (Jeremaya 18:6).

Ihu akwụkwọ ihe omume Prịamarị: Enwere m ike ịnyere ụmụ nke Nna nke Eluigwe aka lọghachikwute Ya.