Ọktoba 5–11 ‘O buruwo Iru uju Anyi niile, ma Burukwa Mwute anyi niile’: Aịzaya 50–57,” Bianụ, Soro M—Maka Ebe Obibi na Nzukọ nsọ: Agba Ochie 2026 (2026)
Ọktoba 5–11 “O buruwo Iru uju Anyi niile, ma Burukwa Mwute anyi niile,ʻ”: Bịanụ, Soro M: Agba Ochie 2026
Ịkwa emo nke kraịst,site n’aka Carl Heinrich Bloch
Ọktoba 5–11: “O buruwo Iru uju Anyi niile, ma Burukwa Mwute anyi niile”
Aịzaya 50–57
Na oge ọrụ ya niile, Aịzaya kwuru maka onye nnapụta dị ike. Amụma ndịa gaara kacha adị oke ọnụ ahịa nye ndị Izrel mgbe otu narị afọ gasịrị mgbe ha nọ na ndọkpụ n’agha na Babịlọn Onye ọbụla ga-enwe ike dọdata mgbidi niile nke Babịlọn gaara abụ onye dike na mmeri nʻezie. Mana nke ahụ abụghị ụdị Mezaya nke Aịzaya kọwara na isi 52-53: “A kpọrọ Ya asị ma ndị mmadụ jụrụ Ya ajụ; otu nwoke nke jupụtara na mwute, na ịkwa arịrị amarawo ya ahụ: ma anyị zoro dị ka o siri dị ihu anyị site n’ebe ọ nọ. … Anyị weere ya dịka onye e etiri oke ihe otiti, onye Chineke tiri oke ihe otiti, ma kpagbuo” (Isaiah 53:3–4).
Site na-izite ụdị onye nnapụta a na-atụghị anya, Chineke kuziiri anyị banyere ezigbo nnapụta. Iji zọpụta anyị site na mmegbu na mkpagbu, Chineke zitere Onye n’onwe ya “emegburu emegbu, na … onye akpagburu.” Ebe ụfọdụ tụrụ anya ọdụm, O zitere nwa atụrụ (lee Aịzaya 53:7). Nʻezie, ụzọ nke Chineke abụghị ụdị ụzọ nke anyị (lee Aịzaya 55:8–9). Jizọs Kraịst na-atọghapụ anyị nʻabụghị naanị site na-ịmeghe ụlọ mkpọrọ ahụ mana site na-iwere ọnọdụ anyị nʻebe ahụ. Ọ na-atọghapụ anyị site na ụdọ igwe niile nke mwute na iri uju site na-ịbokwasị ha onwe Ya (lee Aịzaya 53:4-5, 12). Ọ naghị azọpụta anyị site nʻebe dị anya. Ọ na-eso anyị ata ahụhụ, nʻihe omume niile nke “obi ebere dị ebighị ebi” nke “na-aghaghị ewezuga onwe ya nʻebe ị nọ” (Aịzaya 54:8, 10).
Nchepụta niile maka Ọmụmụ ihe N’Ebe Obibi na na Nzukọ nsọ
Aịzaya 50–52
Ọdịniihu dị mma maka ndị nke Onyenwe anyị.
Nagbanyeghi na ndị Izrel nọrọ ọtụtụ afọ na ndọkpụ n’agha—ma nagbanyeghi na ndọkpụ n’agha ahụ bụ niihi nhọrọ ha nke nʻezighi ezi—Onyenwe anyị chọrọ ka ha lee anya nʻọdịniihu jiri olile anya. Gịnị ka ị na-achọta niime ozi nke Aịzaya nke na-enye gị olile anya? Ndepụta dị ka nke a nwere ike inyere gị aka na ọmụmụ ihe.
|
Ihe M na-amụta banyere Chineke (lee, na-ịmatụ, Aịzaya 50:2, 5–9; 51:3–8, 15–16; 52:3, 9–10) | |
|
Ozi niile nke olile anya (lee, na-ịmatụ, Aịzaya 50:9; 51:3–5, 11–12, 22–23; 52:9–10) | |
|
Kedụ ihe m nwere ike ịmee iji mee ka olile anya bụrụ ihe dị irè (lee, na-imatụ, Aịzaya 50:10; 51:1–2, 6–9; 52:1–3, 9–11) |
Lee kwa Mosaia 12:20–24; 15:13–18; 3 Nifaị 20:29–46; Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 113:7–10; Russell M. Nelson, “Nabata Ọdịniihu na Okwukwe,” Liahona, Nov. 2020, 73–76.
Niihi Ịhụnaanya, site n’aka Angela Johnson
Nyere ndị na-amụ ihe aka bịakwute Jizọs Kraịst. “Enweghi ihe ị ga-eme dị ka onye nkuzi ga a ka agọzi ndị na-amụ ihe karịa ị mee ha mara Nna nke Eluigwe na Jizọs Kraịst ma nwete mmetụta ịhụnaanya Ha” (Nkuzi ihe n’Ụzọ nke Ọnye Nzọpụta, 8). Dị ka ị na-akwado ikuziri ndị ọzọ Aịzaya 50–57, tulee otu ịnwere ike iji nyere ha aka hụ njikọ niile dị nʻetiti ịma aka niile nke ndị Izrel, amụma niile nke Aịzaya maka Kraịst, na ịnata enyemaka si nʻigwe maka ndọli nke onwe ha.
Aịzaya 53
Jizọs Kraịst wekwasịrị Onwe Ya mmehie m na mwute m niile.
Isi ole na ole nʻakwụkwọ nsọ na-akọwa ozi mgbapụta nke Jizọs Kraịst nʻụzọ mara mma karịa Aịzaya 53. Tulee ihe omume dị ka ndịa iji ghọtakwuo ma tinye nʻọrụ nkuzi ndị a dị ike.
-
Tụgharịa uche ma ọ bụ kparịta ụka otu akụkọ na ejije ndịa ji egosikarị ndị dike na-anapụta mmadụ. Tulee ndịiche dị na ngosipụta ndị ahụ jiri nkọwapụta nke Onye Nzọpụta na Aịzaya 53.
-
Mgbe ịgụsịrị amaokwu nke ọbụla, kwụsịtụ itule nuche ahụhụ Onye Nzọpụta tara—”mwute” ahụ, “iri uju niile,” na “njehie niile,” Ọ gabigara—maka onye niile na kpọmkwem maka gị. Inwere ike dochie okwu ndị a ”anyị” na “nke anyị” jiri “Mụ” na “nke m” dị ka ị na-agụ. Kedụ mmetụta ma ọ bụ echiche nke amaokwu ndị a na-akpali niime gị?
-
Tulee ile vidiyo nke a “Alaeze M Abụghị nke Ụwa Nke a” (Ọba akwụkwọ Ozi ọma), ma tụgharịa uche otu amụma ndị dị na Aịzaya 53 jiri mezuo. Gịnị bụ ụfọdụ iri uju na mwute nke Onye Nzọpụta na-ebu maka gị?
5:25My Kingdom Is Not of This World
-
Chọta foto nke ihe omume ndị gbara Aja mgbaghara mmehie nke Jizọs Kraịst gburugburu (lee Akwụkwọ Nka Ozi ọma, nọs. 56–60). Emesịa ị nwere ike chọọ nkebiokwu na Aịzaya 53 nke na-akọwa ihe omume ndị dị niime foto ahụ. Kedụ ihe nkuzi ndịa na-akpate gị ịme?
Lee kwa “Lee Onye Mgbapụta Dị Ukwuu Anwụwo,” Abụ, no. 191.
Aịzaya 54; 57:15–19
Jizọs Kraịst chọrọ ka m laghachikwute Ya.
Anyị niile nwere oge mgbe ọ na-adị kʻanyị nọ ebe dị anya site nʻebe Onyenwe anyị nọ niihi mmehie na adịghị ike anyị. Ụfọdụ akwụsiwo ịnwe olile anya na Ọ ga-enwe ike agbaghara ha. Aịzaya 54 na 57 bụ isi dị ukwuu iji gụọ maka ịnwete mmasi obi ike na mgbam ume nʻoge ndị dị otu ahụ. Tụmadị na Aịzaya 54:4–10; 57:15–19, kedụ okwu ndị na-akuziri gị otu Onye Nzọpụta si eche banyere gị? Kedu ihe dị iche ọ na-eme na ndụ gị iji mara ihe ndị a banyere Ya?
Onyeisi Dieter F. Uchtdorf kuziri:
“Otu ọbụla ndụ anyị siri laa n’iyi kpam kpam enweghị ihe o mere. Ọbụladị na mmehie anyị na-acha uhie uhie emeghị ihe ọbụla, na-agbanyeghị ọnụma juru anyị obi, owu kụrụ anyị, ma ọbụ obi mgbawa anyị nwere. Ọbụna ndi ahụ na-enweghị olileanya, ndi dara mba, ndi mebiri ntụkwasị obi enwere na ha, ndị kwụsịrị ịkwụwa aka ha ọtọ, ma ọbụ dapụ site nʻebe Chineke nọ pụrụ inwe mwugharị. …
“Ozi nke oziọma na-enye an̄ụrị bụ nke a: n’ihi atụmatụ ebighị ebi nke an̄ụrị nke Nna anyị nke Eluigwe dị ịhụnaanya wetara na site n’Aja-mgbaghara mmehie na-enweghị ọgwụgwụ nke Jizọs Kraịst, anyị agaghị abụ sọọsọ ndi a gbapụtara site na ọnọdụ anyị dara ada ma weghachi anyị na-enweghị ntụpọ, mana anyị nwekwara ike gaaniihu ị dị mma karịa ka mmadụ chere ma bụrụ ndi ga-eketa oke ndụ ebighị ebi na ndi ga-enweta otuto nke Chineke nke ọnụ apụghị ịkọwa” (“Ọ Ga-ebukwasị Gị nʻelu Ubu Ya ma Buru Gị Laa Ebe obibi,” Liahona, Me 2016, 102).
Lee kwa Patrick Kearon, “Ebumnuuche Chineke Bụ Ịkpọghachi Gị Ebe Obibi,” Liahona, Me 2024, 87–89.
Aịzaya 55–56
Onyenwe anyị na-akpọku onye niile “ijigidesi ike ọgbụgba ndụ m.”
Kemgbe ọtụtụ ndudugandu, a matawo Izrel dị ka ndị ha na Chineke gbara ndụ. Otu osila dị, atụmatụ Chineke mgbe niile gụnyere karịa naanị otu mba, niihi na “onye ọbụla akpịrị kpọrọ nkụ” ka a ga-akpọku ị “bịa … na mmiri ahụ” (Aịzaya 55:1). Debe nke a nʻuche dịka ị na-agụ Aịzaya 55 na 56, ma tụgharịa uche ihe ọ pụtara ịbụ ndị nke Chineke. Kedụ ozi nke Chineke nye ndị ahụ chere na ha “apụwo kpam kpam” site nʻebe Ọ nọ? (Aịzaya 56:3). Tulee ịkanye ihe nʻamaokwu ndị ahụ na-akọwa agwa na omume nke ndị ahụ na “ejigidesi ike ọgbụgba ndụ m” (lee Aịzaya 56:4–7).
Maka nchepụta ndị ọzọ, lee mbipụta niile nke ọnwa nke a nke Liahona na magazin niile Maka Ume nke Ndị Ntoroọbịa .
Nchepụta niile maka Ikuziri Ụmụntakịrị
Aịzaya 51–52
Onyenwe anyị na-akpọku m “iyikwasị ume [m].”
-
Ọ nwere ike bụrụ ihe ọn̄ụ nye ụmụ gị ịchọpụta nkebiokwu dịka “teta,” “guzoro ọtọ,” na “yikwasị onwe gị ume” nime Aịzaya 51:9, 17; 52:1–2, 9 ma emesịa mee ejije jiri nkebiokwu ndị ahụ. Mgbe emesịrị otu ahụ, unu nwere ike kwuo banyere ihe ọ pụtara ịteta, iguzoro ọtọ, na iyikwasị ume nke ime mmụọ. Gịnị ka Onyenwe anyị na-arịọ anyị ime niime amaokwu ndị a?
-
Ụmụ gị nwekwara ike gụkọọ Aịzaya 51:1, 4, 7 ọnụ ma chọpụta onye Onyenwe anyị na-ekwuru okwu na ihe Ọ chọrọ ka ha mee. Gịnị ka ọ pụtara “ịge ntị nye” Onyenwe anyị? Kedụ otu anyị ga-esi egosi Onyenwe anyị nʻanyị “na-ege ntị nye” Ya?
Aịzaya 53:3–9
Jizọs Kraịst wekwasịrị onwe Ya mmehie m na mwute m niile.
-
Gị na ụmụ gị nwekwara ike lee anya na foto dị iche iche na-egosi ntaram ahụhụ na ọnwụ nke Jizọs Kraịst (lee, na-ịmatụ, Akwụkwọ Nka Ozi ọma, nọs 56, 57, 58). Emesịa unu nwere ike gụkọọ Isaiah 53:3–6, 9 ọnụ ma chọọ mkpụrụokwu ndị na-akọwa ihe na-eme na foto ndị ahụ. Nyere ụmụ gị aka ghọta na Aịzaya kesara eziokwu ndịa ọtụtụ narị afọ gara aga tupu ha emee. Gịni mere ọ ga-eji adị mkpa ndị mmadụ ịmata ihe ndịa ọtụtụ afọ tupu ha emee? (lee Alma 39:15–19).
-
Mgbe ịgụsiri site na Aịzaya 53:4, “O buruwo iru uju anyi, ma burukwa mwute anyị,” ụmụ gị nwere ike gba mbọ ibuli otu ihe dị arọ (ma ọ bụ ha emee ka a ga-asị ha na-ebuli otu). Kwuo okwu banyere otu “iri uju” na “mwute” ma ọ bụ obi ọjọọ ga-esi adị ka ibu arọ ma raa ahụ ibu. Gịni mere Jizọs jiri buru “iri uju” anyị, “mwute” na “ajọọ omume” ma ọ bụ mmehie anyị? (lee kwa Alma 7:11–12).
Aịzaya 55:6
E nwere m ike ịchọ Onyenwe ma kpọkuo Ya.
-
Ikuziri ụmụ gị banyere Aịzaya 55:6, ị nwere ike zoo otu foto nke Jizọs otu ebe na imeụlo ahụ. Ị nwere ike kpọkuo ụmụ gị ka ha chọta foto ahụ ma kwuo otu ụzọ ha nwere ike iji “chọọ …Onyenwe anyị nʻoge enwere ike ịhụnwu Ya.” Egwu dị ka “Chọọ Onyenwe anyị Mgbe Oge Ka dị” (Akwụkwọ Ukwe Ụmụntakịrị, 108) nwere ike inye ha nchepụta. Emesịa ịnwere ike kwe ka otu niime ụmụaka ahụ zoo foto ahụ ma megharịa ihe egwuruegwu ahụ.
Aịzaya 55:8–9
Ụzọ niile nke Onyenwe anyị karịrị nkem dị elu.
-
Mgbe agụsịrị Aịzaya 55:9, ọ nwere ike bụrụ ihe obi ụtọ nye ụmụ gị iguzoro nʻelu oche ma kwuo maka otu ihe niile jiri dị iche mgbe ị nọ nʻebe dị elu karịa.” Ma ọ bụ ha nwere ike see foto nke ihe Aịzaya 55:9 pụtara nye ha. Emesịa unu nwere ike kparịta ụka ụfọdụ ụzọ nke Onyenwe anyị ndị dị elu karịa ụzọ nke anyị. Na-ịmatụ, kedụ ụzọ O ji emeso ndị mmehie omume? (lee Mak 2:15–17). Kedụ ụzọ O ji eduru ndị ọzọ? (lee Matiu 20:25–28). Kesaara ụmụ gị otu ijiri mụta ịtụkwasị obi na ụzọ niile na echiche niile kacha dị elu nke Onyenwe anyị.
Maka echiche ndị ọzọ, lee mbipụta nke ọnwa nke a nke magazin Friend .