Come, Follow Me
Ọktoba 12–18. “Onye Mgbapụta Ga-abịa na Zayọn”: Aịzaya 58– 66


Ọktoba 12–18. ‘Onye Mgbapụta Ga-abịa na Zayọn’: Aịzaya 58–66,” Bianụ, Soro M—Maka Ebe Obibi na Nzukọ nsọ: Agba Ochie 2026 (2026)

Ọktoba 12–18. ‘Onye Mgbapụta Ga-abịa na Zayọn,’” Bịanụ, Soro M: Agba Ochie 2026

Jizọs na-agụ scrol nye ndị mmadụ nọ na synagogue

Jizọs niime Synagogue na Nazareth, site n’aka Greg Olsen

Ọktoba 12– 18: “Onye Mgbapụta Ga-abịa na Zayọn”

Aịzaya 58–66

Nʻisi mbido ozi Ya, Jizọs Kraịst gara notu synagogue nọ na Nazareth, ebe a zụrụ Ya. Ọ guzooro nʻebe ahụ iji gụo site na akwụkwọ nsọ, mehee akwụkwọ nke Aịzaya, ma gụo ihe anyị maara ugbua dị ka Aịzaya 61:1–2 Mgbe ahụ ọ mara ọkwa, “Ụbọchị taa ka akwụkwọ nsọ nke a mezuru na ntị unu.” Nke a bụ otu nime ọkwa kwụ ọtọ nke Onye Nzọpụta na Ọ bụ Onye Etere Mmanụ, onye “ga-agwo ndị obi tiwara” ma “kwusaa nnapụta nye ndị adọkpuru nagha” (lee Luk 4:16–21). Akwụkwọ nsọ nke a nʻezie ka emezuru nʻụbọchị ahụ. Ma, dị ka ọtụtụ amụma ndị ọzọ nke Aịzaya, a na-emezu kwa ya nʻụbọchị anyị taa. Onye Nzọpụta na-aga niihu na-agwọ ndị obi tiwara ndị na abịakwute Ya. Aka nwekwara ọtụtụ ndị adọkpuru nʻagha ndị chọrọ nnapụta. Ma enwere ọdịniihu dị ebube ikwado maka—oge mgbe Onyenwe anyị ga “eke eluigwe ọhụrụ niile na ụwa ọhụrụ” (Aịzaya 65:17) ma “mee eziomume na otuto na-asọpụta nihu mba niile” (Aịzaya 61:11). Ị gụ Aịzaya na-emepe anya anyị ruo ihe Onyenwe anyị mewororịị, ihe Ọ na-eme, na ihe Ọ ka ga-eme maka ndị Ya.

akara ngosi ihe ọmụmụ

Nchepụta niile maka Ọmụmụ ihe N’Ebe Obibi na na Nzukọ nsọ

Aịzaya 58:3–12

akara ngosi semịnarị
Ibu ọnụ na-ewulite ike ime mmụọ ma na-agọzi ndị nọ na mkpa.

Gịni ga-eme mmadụ ga-eji kpachara anya hapụ iri nri mgbe enwere nri a ga-eri? Dị ka ị na-amụ Aịzaya 58:3–12, ịnwere ike chee maka ihe ndị ichere mere eji ebu ọnụ—tinyekwara ihe ndị kpatara Onyenwe anyị jiri nye iwu nke a. Ebe a bụ ụfọdụ ajụjụ itule:

  • Gịnị mere mgbe ụfọdụ ibu ọnụ ka a na-ahụ dị ka ibu arọ karịa ị bụ ngọzi? (lee Aịzaya 58:3–5). Olee otu nkuzi ndị nke Onyenwe anyị nọ nʻisi nke a ji agbanwe ụdị echiche ahụ maka gị?

  • Gịnị ka ọ nwere ike ịpụta i “tọghapụ agbụ niile nke ajọọ omume” ma “gbajie yok niile”? Aịzaịah 58:6 Kedụ otu ibu ọnụ ji agọzi ndị ọzọ? (lee amaokwu 7).

  • Kedụ otu ibu ọnụ siworo wetere gị ngọzi ndị ahụ akọwara niime Aịzaya 58:8–12?

Na ozi ya “Ọ Bụ na Nke a, Abụghi Ebumọnụ Nke M Họọrọ?” (Liahona, Me 2015, 22–25), Onyeisi Henry B. Eyring kwuru maka ọmụmatụ dị iche iche banyere otu ndị mmadụ sitere nwee ngọzi site na ibu ọnụ na onyinye ibu ọnụ. Olee otu i siworo nwete ngọzi ndị yiri nke a niime ndụ gị?

Lee kwa “Gọzie Ibu ọnụ Anyị, Anyị Ekpee,” Abụ, no. 138; Isiokwu niile na Ajụjụ niile, “Ibu ọnụ na Onyinye Ibu ọnụ,” Ọba akwụkwọ Ozi ọma

Gbaa mbọ ka ị mata ndị ị na-akụziri. “Ị bụ onye nkuzi yiri Krạịst gụnyere ịgba mbọ ị mata ndị ị na-akụziri ma ịgbalịsi ike ịghọta ihe nọ ha nʻobi. … Ịnwere ike chọta otu kacha mma ha ji amụta ihe nke ọma. Ịnwere ike jụọ ajụjụ, kpachara anya gee ntị, ma leruo anya ala. Nke kacha nke, ịnwere ike kpee ekpere maka nghọta nke naanị Mmụọ ahụ nwere ike inye. Ka ị na aka amata mmadụ nke ọma, otu ahụ ka ị na aka enwete ike inyere ya aka ịchọta nkọwa nke onwe na ike n’ozi ọma nke Jizọs Kraịst. Ozugbo ị ghọtara ihe na-akpọ akpịrị mmadụ nkụ, Mmụọ ahụ nwere ike kuziere gị ka ị ga-esi nye aka menyụọ ya jiri mmiri nke ndụ nke Onye Nzọpụta. (Ikuzi ihe n’Ụzọ nke Ọnye Nzọpụta13).

Aịzaya 58:13–14

Ịkwanyere Onyenwe anyị nnukwu ugwu N’ụbọchị Izu ike na-eweta ọn̄ụ.

Ụbọchị Izu Ike ọ bụ “ihe an̄ụrị” nye gị? Dị ka ị na-agụ Aịzaya 58:13–14, tulee otu ịnwere ike iji nwe kwuo an̄ụrị nʻụbọchị nke Onyenwe anyị. Ịma atụ, kedụ ihe ọ nwere ike ịpụta “ighara ime ihe na-enye gị obi ụtọ nʻụbọchị nsọ [Ya]”? Kedụ ihe dị iche nʻetiti “[ịnwere onwe gị obi ụto] niime Onyenwe anyị” na “ịme ihe nʻụzọ nke gị onwe gị”?

Lee kwa Russell M. Nelson, “Ụbọchị izu ike Bụ Ihe Obi ụtọ,” Liahona, Me 2015, 129–32.

Aịzaya 59:9–21; 61: 1– 3; 63:7–9

Jizọs Kraịst bụ Onye Nzọpụta na Onye Mgbapụta m.

Aịzaya 58–66 nwere ọtụtụ nrụtụaka na ozi aja mgbaghara nke Jesus Christ. Chọo ha dị ka ị na-amụ ihe. Kacha nke, hụba ama etutu aha niile na mkụrụokwu niile ejiri kọwaa Onye Nzọpụta. Iji maatụ:

  • Kedụ ihe na-amasị gị banyere nkọwapụta nke “Onye nrịọchite” na Aịzaya 59:16–21? Kedụ otu Onye Nzọpụta si emeri ọnọdụ niile akọwara na amaokwu nke 9–15?

  • Mgbe Jizọs Kraịst mara ọkwa nye ndị Nazareth na Ọ bụ Mezaya ahụ, Ọ n̄omiri site na Aịzaya 61:1–3 (lee 4:16–21; lee kwa vidiyo “Jizọs Amaa ọkwa Na Ọ bụ Mezaya ahụ,” Ọba akwụkwọ Ozi ọma.) Olee otu Onye Nzọpụta siworo gọzie gị na ndị ọzọ nʻụzọ niile akọwara niime amaokwu ndị a? Kedụ otu O siworo nye gị mma nʻọnọdụ ntụ?

    3:24

    Jesus Declares He Is the Messiah

  • Kedụ “ebere niile dị ịhụnaanya nke Onyenwe anyị” inwere ike “ikwuputa”? (lee Aịzaya 63:7–9).

  • Kedụ ihe nrụtụ aka ndị ọzọ nke Onye Nzọpụta ị na-ahụ na Aịzaya 58–66?

Lee kwa Mosiah 3:7; Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 133:46–53.

otu nwoke na-esetịpụ aka ji oriọna mmanụ iji mụnye ọkụ na oriọna nke otu nwanyị

Onyinye nke Ihè, site n’aka Eva Timothy

Aịzaya 60; 62

“Onyenwe anyị ga-abụrụ gị ihè ruo ebighị ebi.”

Aịzaya 60 na 62 na-ekwu maka ihè na ọchịchịrị, anya na ịhụ ụzọ iji kuzie banyere otu ozi ọma nke Jizọs Kraịst ga-eji agọzi ụwa nʻụbọchị ikpeazụ ndị a. Chọọ ụkpụrụ ndịa na Aịzaya 60:1–5, 19–20; 62:1–2. Dị ka ị na-agụ isi ndịa, tụgharịa uche otu Chineke ji na-akpọkọta ụmụ Ya site na ọchịchịrị bata na ihè Ya. Gịnị bụ oke na ọrụ gị niime ọrụ nke a?

Lee kwa 1 Nifaị 22:3–12; 3 Nifaị 18:24; Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 14:9; Bonnie H. Cordon, “Ka Ha Wee Hụ,” Liahona, Me 2020, 78–80.

Aịzaya 64:1–5; 65:17–2566

Kraịst ga-achị nʻụwa n’oge Otu puku afọ ahụ.

Aịzaya kwuru maka otu ụbọchị mgbe “a ga-echefu nsogbu ndị gara aga” (Aịzaya 65:16). Ebe amụma nke a nwere ọtụtụ mmezu, nʻuche nke kachasị zuo oke, ụbọchị ahụ ka na-abịa abịa—mgbe Jizọs Kraịst ga-alọghachi. Aịzaya kọwara ụbọchị ọdịniihu nke a niime Aịzaya 64:1–5; 65:17–2566. Hụba ama ugboro ugboro o jiri okwu ndị dị ka “n̄ụrịa” na “na-ịn̄ụrị ọn̄ụ.” Gịnị mere nlọghachi nke Onye Nzọpụta ga-eji abụ ụbọchị ịn̄ụrị ọn̄ụ nye gị? Kedụ ihe ị nwere ike ime iji kwadoo maka ọbịbịa Ya?

Lee kwa Edide niile nke Okwukwe 1:10; Russell M. Nelson, “Ọdịniihu nke Nzukọ nsọ ahụ: Ịkwado Ụwa maka Ọbịbịa nke Ugboro Abụọ nke Onye Nzọpụta,” Ensign, Apr. 2020, 13–17.

Maka nchepụta ndị ọzọ, lee mbipụta niile nke ọnwa nke a nke Liahona na magazin niile Maka Ume nke Ndị Ntoroọbịa .

akara ngosi nkeji ụmụntakịrị

Nchepụta niile maka Ikuziri Ụmụntakịrị

Aịzaya 58:6–11

Ibu ọnụ na-agọzi mụ na ndị ọzọ nọ na mkpa.

  • Ikekwe ụzọ kachasị mma iji gba ụmụ gị ume ibu ọnụ—mgbe ha dị njikere—bụ ịnyere ha aka ghọta nzube niile nke Onyenwe anyị maka iwu nke a. Tulee ịgụkọta Aịzaya 58:6–11 ọnụ iji chọpụta ọsịsa niile nke ajụjụ ndị a: Gịnị mere anyị ji ebu ọnụ? Kedụ otu anyị si ebu ọnụ? Unu nwere ike chọ nime “Buo ọnụ, Ibu ọnụ” niime Odudu nye Akwụkwọ nsọ.

  • Ọ bụrụ na ịnweworịị nhụmihe dị mma site nʻibu ọnụ, kesaara ya ụmụ gị. Ị nwekwara ike jụọ ha otu ha nwere ike iji kọwara otu enyi ihe kpatara Onyenwe anyị jiri nye anyị iwu nke a.

Aịzaya 58:13–14

Ụbọchị Izu ike nwere ike ị bụ ihe obi ụtọ nye m.

  • Mgbe ị gụsịrị Aịzaya 58:13–14, ị nwere ike rụtụ aka nʻụbọchị ndị nke izu ụka dị na kalenda ma kpokuo ụmụ gị isoro gị kpọpụta ụbọchị ndị ahụ. Mgbe iruru na Ụbọchị Izu ike, gwa ha ka ha kpọọ ụbọchị ahụ “ihe obi ụtọ.” Gwa ha ihe mere Ụbọchị Izu Ike jiri bụrụ “ihe obi ụtọ” nye gị.

  • Kesaara ibe unu ụzọ unu nwere ike iji “nye onwe gị obi ụto niime Onyenwe” na Ụbọchị Izu ike. Ikekwe ụmụ gị nwere ike see nchepụta ha niile ma debe ha niime “akpati ihe obi ụtọ nke Ụbọchị Izu ike.” Emesịa, mgbe ha chọrọ nchepụta banyere ihe ndị a ga-eme nʻỤbọchị Izu ike, ha nwere ike were otu nchepụta site na akpatị ahụ.

ihe osise nke Jizọs

Ihè Anyị, site n’aka Dan Wilson

Aịzaya 60:1–3

Onye Nzọpụta dị ka ihè nye m.

  • I nwere ike kpọkuo ụmụ gị imechi anya ha dị ka ị na-agụ Isaiah 60:1–3. Gwa ha ka ha mehee anya ha mgbe ha nụrụ okwu ahụ “ihè” ma mechie ha ọzọ mgbe ha nụrụ “ọchịchịrị.” Kọwaa na Jizọs Kraịst na ozi ọma Ya dị ka ihè na-enyere anyị aka hụ uzọ anyị ji alaghakwuru Nna nke Eluigwe.

Aịzaya 65:17–25

Mgbe Jizọs ga-abịa ọzọ, Ọ ga-ewete udo na ọn̄ụ.

  • Aịzaya 65:17–25 na-akọwa ihe ụwa ga-adị ka ya mgbe Onye Nzọpụta ga-abịa ọzọ. Dị ka ị na-agụ amaokwu niile ndịa gị na ụmụ gị, nyere ha aka chọọ otu ndụ ga-esi adị iche nime “ụwa ọhụụ” Aịzaya kọwara. Gịnị mere oge nke a ga-eji bụrụ oge “obi ụtọ na ịn̄ụrị ọn̄ụ ruo mgbe ebighị ebi”? (amaokwu 18).

  • I nwekwara ike kwekọta ọnụ otu egwu banyere Ọbịbịa nke Ugboro Abụọ, dị ka “Mgbe Onye Nzọpụta Ga-abịa Ọzọ” (Ọba akwụkwọ Ozi ọma). Kesaara ibe unu ihe unu na-ele anya ya banyere ọbịbịa nke Onye Nzọpụta. Kedụ ihe anyị nwere ike ime iji kwadoo maka ụbọchị ahụ?

Maka echiche ndị ọzọ, lee mbipụta nke ọnwa nke a nke magazin Friend .

Jizọs Kraịst nọ n’igwe, na-enwuputa ihè

“Bilie, gbukee: niihi na ihè gị abịawo, ma ebube nke Onyenwe anyị ebilitewo n’isi gị” (Aịzaya 60:1). Ìhè na Ndụ, site n’aka Mak Mabry

Ihu akwụkwọ ihe omume ndị Prịamarị: Ụbọchị Izu ike nwere ike ị bụ ihe obi ụtọ nye m.