Ọktoba 26–Nọvemba 1. ‘A Ga M Agbanwe Iri uju Ha KʻỌbụrụ Ọn̄ụ’: Jeremaya 31–33; 36–39; Abụ Akwa 1; 3” Bịanụ, Soro M—Maka Ebe Obibi na Nzukọ nsọ: Agba Ochie 2026 (2026)
Ọktoba 26–Nọvemba 1. ‘A Ga M Agbanwe Iri uju Ha KʻỌbụrụ Ọn̄ụ,’” Bịanụ, Soro M: Agba Ochie 2026
Jeremaya Na-akwa akwa maka Mbibi Jeremaya, site nʻaka Rembrandt van Rijn
Ọktoba 26–November 1: “A Ga M Agbanwe Iri uju Ha KʻỌbụrụ Ọn̄ụ”
Jeremaya 31–33; 36–39; Abụ Akwa 1; 3
Mgbe Onyenwe anyị kpọrọ Jeremaya na mbụ ị bụ onye amụma, Ọ gwara ya na ozi ya ga-abụ “i fopụ, na ịdọda nʻala” (Jeremaya 1:10)—ma na Jerusalem, enwere ọtụtụ ajọọ ihe a ga-efopụ ma dọdata nʻala. Mana nke a bụ naanị otu akụkụ ozi nke Jeremaya—akpọkwara ya “iwu, na ịkụ” (Jeremaya 1:10). Kedụ ihe enwere ike wunye ma ọ bụ kụnye nʻebe mkpọkpọ ebe tọgbọrọ nʻefu niihi nnupụ isi nke ndị ọgbụgba ndụ? Ịjụ ya nʻụzo ọzọ, mgbe mmehie ma ọ bụ mkpagbu lara ndụ anyị nʻiyi, kedụ otu anyị nwere ike iji wugharịa ma kụnye ọzọ? Ọsịsa ahụ dabeere na “Alaka nke ezi omume” (Jeremaya 33:15), Mezaya ahụ ekwere na nkwa. Ọ na-ewete “ọgbụgba ndụ ọhụrụ” Jeremaya 31:31)—otu nke na-achọ karịa ofufe egbugbere ọnụ. Iwu Ya ga-adịrịrị “niime ime anụ ahụ [anyị],” edere “niime obi [anyị].” Nke ahụ bụ ihe ọ pụtara Onyenwe anyị “ị bụ Chineke [anyị]” na anyị ị “bụ ndị nke [Ya]” (Jeremaya 31:33). Ọ bụ ihe omume na-eme ogologo ndụ mmadụ, ma anyị gakwa eme mmejọ dị iche iche ma nwee ihe ga-ebutere anyị iri uju mgbe na mgbe. Mana mgbe anyị mere otua, Onyenwe anyị kwere nkwa sị, “Aga m agbanwe iri uju ha kʻọbụrụ ọn̄ụ” (Jeremaya 31:13).
Maka nchikọta nke akwụkwọ nke Abụ Akwa, lee “Abụ Akwa, Akwụkwọ nke” niime Odudu nye Akwụkwọ nsọ.
Nchepụta niile maka Ọmụmụ ihe N’Ebe Obibi na na Nzukọ nsọ
Jeremaya 31; 33
Onyenwe anyị ga-akpọpụta ndị ọgbụgba ndụ Ya site na ndọkpụ nʻagha.
Na Jeremaya 31; 33 Onyenwe anyị nakweere na “akwa arịrị, na ikwa ákwá ilu” ahụ (Jeremaya 31:15) nke ndị Izrel ga-agabiga na ndọkpụ n’agha. Otu ọ dị, o nyewokwa anyị okwu nkasị obi na olile anya. Lee anya ha dị ka ị na-agụ isi ndị a. Kedụ nkwa ndị ị na-ahụ nwere ike gbasa gị?
Jeremiah 31:31–34; 32:37–42
“Ha ga-abụ ndị m, ma aga M abụ Chineke ha.”
Nagbanyeghi na ndị Izrel emebiwo ọgbụgba ndụ ha, Jeremaya buru amụma na Onyenwe anyị ga-ehiwe ọgbụgba ndụ “ọhụrụ” na nke dị “ebighi ebi” ọzọ ya na ha (Jeremiah 31:31; 32:40). Kedụ ihe bụ ọgbụgba ndụ ahụ? Tulee ịchọ maka nghọta niime Odudu nye Akwụkwọ nsọ, “Ọgbụgba ndụ Ọhụrụ na nke Dị ebighị eb,” Ọba Akwụkwọ Ozi ọma.
Dị ka ị na-agụ Jeremaya 31:31–34; 32:37–42, tụgharịa uche:
-
Ihe ọ pụtara nye gị ịsonye na ndị ọgbụgba ndụ nke Chineke?
-
Ihe ọ pụtara na-edere iwu Ya niime obi gị?
-
Ihe Onyenwe anyị kwere na nkwa mgbe gị na Ya gbara ndụ.
-
Otu mmekọrịta ọgbụgba ndụ gị na Onyenwe anyị siri gbanwee gị.
Kedụ nkwa ndị ị kwere Chineke dị ka ị sonyere na emume nsọ niile dị nsọ. Kedụ otu O si na-emezu nkwa Ya niile nye gị?
Lee kwa David A. Bednar, “Nọgidenu niime M, ma Mu onwe m kwa niime Gi; Ya mere soro M Na-Eje,” Liahona, Me 2023, 123–26.
Jeremaya 36
Akwụkwọ nsọ nwere ike ime ka m si nʻajọọ ihe pụọ.
Dị ka ọ dị na Jeremaya 36: 2-3, gịnị mere Onyenwe anyị jiri nye Jeremaya iwu ka ọ detuo amụma ya niile? Dị ka ị na-agụ Jeremaya 36, hụba ama otu ndị a na-esote siri chee banyere amụma ndị a.
-
Onyenwe anyị (lee amaokwu ndị a 1–3, 27–31)
-
Jeremaya (lee amaokwu ndịa 4–7, 32)
-
Baruch (lee amaokwu ndịa 4, 8–10, 14–18)
-
Jehudi na Eze Jehoiakim (lee amaokwu ndịa 20–26)
-
Elnathan, Delaiah, na Gemariah (lee amaokwu 25)
Tụgharịa uche ụdị mmetụta ịnwere banyere akwụkwọ nsọ ahụ. Kedụ ụzọ ha siworo nyere gị aka siri na ajọọ ihe pụọ?
Jeremaya 37– 39
Nọgidesi ike na-isoro ndị amụma nke Chineke.
Na Jeremaya 37:1–3, 15–21; 38:1–6, 14–28, kedụ ihe akaebe ị na-ahụ mere Eze Zedekaya jiri wee kwere na Jeremaya bụ ezigbo onye amụma nke Onyenwe anyị? Kedụ ihe akaebe ị na-ahụ nke mere Zedekaya ji ekweghi? Kedụ ihe ị na-amụta site na ntụnyere nke a? Dị ka ị na-agụ Jeremaya 39, tụgharịa uche nʻihe dị iche ọ gaara-eme ọ bụrụ na Zedekaya na ndị ya sooro onye amụma ahụ ma debe iwu nsọ niile nke Onyenwe anyị. (Were ihe mere Zedekaya tụnyere ihe mere ezi na ụlọ nke Lehi na 1 Nifaị 1–2.)
Jeremaya 38: 6–13; 39: 15–18
Enwere m ike kaa obi na nkwụsị ike maka ihe ziri ezi.
Ndị ọrụ eze ahụ chere na amụma niile nke Jeremaya na-eme ka otu ndị agha ha ghara ịnwe mmụọ ịlụ ọgụ, ya mere ha tụbara Jeremaya niime ụlọ mkpọrọ ruru inyi (lee Jeremaya 38:1–4). Na Jeremaya 38:6–13, kedụ ihe na-amasị gị banyere nzaghachi nke Ebed-melech onye Ethiopia? Hụbakwa ama ngọzi Onyenwe anyị nyere Ebed-melech niime Jeremaya 39:15–18.
Olee otu inwere iji soro ọmụmatụ nke Ebed-melech?
Akwá nke Jeremaya
Abụ Akwa 1; 3
Onyenwe anyị pụrụ ịwepụ iri uju ahụ m na-enwete niihi mmehie.
Akwụkwọ nke Abụ Akwa bụ nchịkọta abụ edere mgbe ebibisiworo Jerusalem na tempụl ya. Gịnị mere i ji chee na ọ dị mkpa na echekwara ha? Tulee ihe mbụrụ ahụ dị niime Abụ Akwa 1 na 3 na enyere gị aka ịghọta banyere oké iru uju nke Izrel nwere. Kedụ ozi nke olilenanya na Kraịst ị na-achọta? (lee kacha nke Abụ Akwa 3:20–33; lee kwa Matiu 5:4; Jemis 4:8–10; Alma 36:17–20).
Onyeisi M. Russell Ballard kpọtụrụ ọnọdụ dị iche iche nwere ike ị mee ka ụfọdụ mmadụ daa mba inwe olile anya, ma ọ nyere ha ndụmọdụ banyere ebe a ga-achọta olile anya.
“Ụfọdụ n’ime anyị nwere ike ịhụ na ndụ anyị jupụtara na nkụda mmụọ, ndakpọ olileanya na iru uju. Ọtụtụ na-eche na ha enweghị enyemaka imeri ọgbaaghara ahụ yiri ka ọ juputara n’ụwa. Ndị ọzọ na-enwe nchegbu banyere ndị òtù ezinụlọ ha ndị mmiri omenala ajọọ ihe na-eburu notu ntabi anya, oke ọkụ ọkụ nke omenala ndị ụkpụrụ ha na-ada ada na ụkpụrụ eziomume ndị na-anyụ ka ọkụ. … Ọtụtụ ndị ahapụwo onwe ha ịnakwere ajọọ omume na obi ọjọọ nke ndị ụwa dị ka ihe a na-apụghị imeta emeta. Ha akwụsiwo ịnwe olile anya. …
“… Ụfọdụ n’ime anyị nwere ike ha adawo mba inwe olileanya niile n’ihi mmehie na njehie. Mmadụ nwere ike mikpuo onwe ya nʻụwa n’ụzọ miri emi nke na ọ dịghịzi ahụ ụzọ ịpụta ma niihi ya ọ tụfuo olileanya niile. Arịrịọ m na-arịọ ndị niile dabara n’ọnyà nke onye iro nke a bụ ka ha ịghara ịda mbà! N’agbanyeghị otu ihe nwere ike isi adị ọkụ ọkụ ugbua, ma ọ bụ otu ha ka ga-esi adị, biko kwenyere m, ị nwere ike inwe olile anya mgbe niile. Mgbe niile” (“Ọn̄ụ nke Olile anya Emezuru,” Ensign, Nov. 1992, 31–32).
Lee kwa “Bianu, Unu Ndị Oke Mwute,” Abụ, no. 115.
Nyere ndị ọzọ aka mata na mmụta ihe nke onwe ha dị ha nʻaka. Mgbe ụfọdụ o dị nnọọ ka ụzọ kacha mfe eji akụzi ihe bụ ị gwa ndị na-amụ ihe ihe anyị chere na ha kwesịrị ịma. Otu osila dị, ụzọ kacha mfe anaghị abụcha ụzọ kacha mma mgbe niile. Okenye Devid A. Bednar kuziri: “Nzube anyị ekwesịghị ị bụ ʻKedụ ihe m ga-agwa ha?ʻ Kama, ajụjụ ndị anyị kwesịrị ịjụ onwe anyị bụ ʻKedụ ihe m ga-akpọku ha ịme? Kedụ udị ajụjụ mmụọ kpakere nke m nwere ike ịjụ, ma ọ bụrụ na ha dị njikere ịzaghachi, ga-ebido ikpọbata Mmụọ Nsọ niime ndụ ha?’” (nnọkọ mgbede ndi mmadu na Onye Ji Ikike Zuru ọha, Feb. 7, 2020, broadcasts.ChurchofJesusChrist.org; lee kwa Nkuzi ihe n’Ụzọ nke Ọnye Nzọpụta, 25). E nwere ọtụtụ ụzọ esi enyere ndị na-amụ ihe aka ịmata na mmata ihe nke onwe nọ ha nʻaka. Na-ịmatụ, niime ndepụta nke a ka akpọkuru ndị na-amụ ihe ịchọ, ịtụgharị uche, ịdepụta ihe, ịlee anya na foto, isonye nʻọmụmụ ihe a na-emetụ aka, ịse ihe osise, na ịkesa na itinye na ndụ ihe ha mụtara.
Nchepụta niile maka Ikuziri Ụmụntakịrị
Jeremaya 31:3
Nna nke Eluigwe na Jizọs Kraịst hụrụ m naanya “jiri ịhụnaanya nke ebighị ebi.”
-
Dị ka ị na-agụ Jeremaya 31:3 gị na ụmụ gị, ha nwere ike nyere gị aka chọta mpanaka (ma ọ bụ foto nke mpanaka) nke na anọte aka, ụdị dị ka mkpụrụ ego igwe, na ndị nʻadịghi anọte aka, ụdị dị ka otu mkpụrụ osisi. Unu nwere ike kwuo banyere ihe “ịdị ebighị ebi” pụtara ma kesara ibe unu otu unu siri nwete mmetụta “ịhụnaanya dị ebighị ebi” nke Nna nke Eluigwe. Unu nwekwara ike gụkọta egwu dị ka “Chineke Na-elekwasị Anyi niile Anya” ọnụ (Akwụkwọ Ukwe Ụmụntakịrị, 229).
Jeremaya 31:31–34; 32:38–41
Chineke ga-enyere m aka dobe ọgbụgba ndụ m niile.
-
Ọ nwere ike masị ụmụ gị ị se otu obi nʻelu mpempe akwụkwọ ma dee niime obi ahụ ihe ha mụtara site na Jeremaya 31:31–34 banyere ịgba ndụ ha na Chineke. O nwere ike masị gị ịnyochagharị ọgbụgba ndụ ahụ ha mere na baptizim (lee Mosaia18:10, 13) ma kparịta ụka ihe ọ pụtara na-edere nkwa ndịa niile niime obi ha.
Jeremaya 36: 1–4
Akwụkwọ nsọ niile bụ okwu Chineke.
-
Ihu akwụkwọ ihe omume nke izu ụka nke a nwere ike nyere ụmụ gị aka mụta banyere Jeremaya, Baruch, na eze ahụ (lee Jeremaya 36). Ha nwekwara ike mee ihe omume ndị ga-agakọ ya na okwu niile dị niime Jeremaya 36:4–10, ụdị dị ka ịde nʻakwụkwọ (lee amaokwu 4) na gụrụ ndị mmadụ akwụkwọ nsọ (lee amaokwu ndịa 8, 10).
-
Gị na ụmụ gị nwere ike lee anya nʻotu akwụkwọ ụmụaka na otu kopị nke akwụkwọ nsọ ma kwuo banyere otu akwụkwọ ndịa jiri dịri iche. Gịnị mere akwụkwọ nsọ jiri pụọ iche? O nwere ike ịkpate mmụọ ma unu kesara onwe unu ụfọdụ ederede akwụkwọ nsọ nke pụrụ iche nye unu.
Jeremaya 38: 6–13
Enwere m ike iguzo maka ihe ziri ezi.
-
I nwere ike iji foto dị na ngwụcha ndepụta nke a iji nyere ụmụ gị aka ịhụ nʻuche akụkọ nke Ebed-melech dị nime Jeremaya 38:6–13. Inwekwara ike nyere ha aka chọta otu amaokwu ebe Ebed-melech mere otu ihe dị ike iji nyere onye amụma nke Onyenwe anyị aka. Kedụ ihe anyị nwere ike ị mee iji gosi na anyị mara na onye amụma anyị taa ka akpọrọ site nʻaka Chineke?
Abụ Akwa niile 1:1–2, 16; 3:22–26
Onye Nzọpụta mere ya ekwe omume ka agbaghara m mmehie m niile.
-
Iji dubata Abụ Akwa niile, ị nwere ike chọọ ị kọwara ụmụ gị na nihi na ndị Izrel echegharịghị, Jerusalem and tempụl ka ebibiri. Ị nwere ike kesara onwe unu ụdị mmetụta unu gaara enwe ma ọ bụrụ na unu biiri nʻebe ahụ nʻoge ahụ (lee Abụ Akwa 1:1–2, 16). Kedụ otu ozi ahụ dị niime Abụ Akwa 3:22–26 gaara esi enye gị olile anya?
-
Unu nwekwara ike gwakọrịta onwe unu banyere oge ndị ahụ ịnwere obi mwute niihi ajọọ nhọrọ ị mere. Kedụ ihe anyị chọtara niime Abụ Akwa 3:22–26 na-enyere anyị aka ghọta mgbaghara nke Jizọs Kraịst na-enye?
Maka echiche ndị ọzọ, lee mbipụta nke ọnwa nke a nke magazin Friend .