“Nọvemba 2–8 ‘Mmụọ Ọhụrụ Ka M Ga-etinye niime Unu’: Izikiel 1–3; 33–34; 36–37; 47,” Bịanụ, Soro M—Maka Ebe Obibi na Nzukọ nsọ: Agba Ochie 2026 (2026)
“Nọvemba 2–8 ‘Mmụọ Ọhụrụ Ka M Ga-etinye niime Unu,’” Bịanụ, Soro M: Agba Ochie 2026
Nọvemba 2–8: “Mmụọ Ọhụrụ Ka M Ga-etinye niime Unu”
Izikiel 1–3; 33–34; 36–37; 47
Izikiel bụrịị onye amụma nọ mba ọzọ. Ya na ndị Izrel ndị ọzọ, egidere ya ma zipu ya Babịlọn. Na Jerusalem, Izikiel gaara ị bụ onye nchụaja na-eje ozi na tempụl. Na Babịlọn, o sonyere nʻetiti “ndị ahụ adọkpuru nʻagha” ma nọdụ ọdụ ebe ha nọdụrụ ọdụ” (Izikiel 3:5), nọro ebe dị ụlọ ọma nke Chineke anya ma nwee ntakịrị olile anya ịlaghachi. Emesịa otu ụbọchi, Izikiel hụrụ ọhụ. Ọ hụrụ “ebube nke Onyenwe anyị” (Izikiel 1:28)—nʻabụghi niime tempụl nọ na Jerusalem mana ebe ahụ na Babịlọn nʻetiti ndị achụpụrụ achụpụ. Ajọọ omume nọ na Jerusalem, ka ọ matara, adịwo oke njọ nke mere na ihu Chineke anọzighị ebe ahụ (lee Izikiel 8–11; 33:21).
Ma otu ọ dị e nwere ihe na-enye olileanya banyere ozi nke Izikiel. Nagbanyeghi ogologo oge ndị ọgbụgba ndụ ahụ dapụworo, Chineke ahapụbeghị ha kpam kpam. Ọ bụrụ na ha “ga-anụrụ okwu Onyenwe anyị” (Izikiel 37:4), ihe ahụ nwụworo anwụ ka enwere ike ịkpọtegharị. “Obi okwute” ha ka enwere ike iji “obi ọhụrụ” dochie (Izikiel 36:26). Ma nʻọdịnihu, Onyenwe anyị ga-ehiwe tempụl ọhụrụ na Jerusalem Ọhụrụ, “ma aha nke obodo ukwu ahụ site nʻụbọchị ahụ ga-abụ, Onyenwe anyị nọ ebe ahụ” (Izikiel 48:35).
Maka nchikọta nke akwụkwọ nke Izikiel, lee “Izikiel” niime Ọkọwa okwu Baịbụl.
Nchepụta niile maka Ọmụmụ ihe N’Ebe Obibi na na Nzukọ nsọ
Izikiel 3; 34
Onyenwe anyị na-akpọku m ịzụ igwe atụrụ Ya.
Na Izikiel 3 na 34, Onyenwe anyị na-akpọ ndị ndu nke ndị Ya dị ka ndị nche na ndị ọzụzụ atụrụ. Dị ka ị na-agụ isi ndịa, tulee ihe etutu aha ndịa na-ekwu banyere ihe ọ pụtara ị bụ onye ndu.
Kedụ ndị bụ “igwe atụrụ” Onyenwe anyị chọrọ ka ị zụọ? Kedụ ihe ị na-achọta niime Izikiel 34 nke nwere ike inyere otu onye aka kwadoo ije ozi Mishọn, izulite ụmụaka, ma ọ bụ imejuputa ije ozi nlekọta? Kedụ otu i ga-esi esoro ọmụmaatụ nke Onye Nzọpụta dị ka onye ọzụzụ atụrụ? (lee amaokwu 11–31).
I nwekwara ike tụgharịa uche na ihe ọdịmara ị na-ahụ niime isi nke a. Kedụ ihe “ezi ahịhịa ọzụzụ” na “ezi ebe ịta nri” nọchitere niime amaokwu 14? Kedụ ihe dị iche nʻetiti atụrụ nke “furu efu” na nke ahụ “achụpụrụ achụpụ”? (amaokwu 16). Kedụ akara ndị ọzọ ị na-achọta?
Lee kwa Jọn 21:15–17; Gerrit W. Gong, “Ije ozi Nlekọta,” Liahona, Me 2023, 16–19.
Ezikiel 33:10–19
Onyenwe anyị chọrọ ịgbaghara.
“Ọ bụrụ na … mmehie anyị adịrị nʻisi anyị,” ka ndị Izrel adọkpuru nʻagha chere, “anyị ga-esi an̄aa dị ndụ?” (Izikiel 33:10). Na nzaghachi, Onyenwe anyị kuziiri ha banyere nchegharị na mgbaghara. Ajụjụ ndị a nwere ike nyere gị aka tụgharịa uche nʻihe Ọ kuziri:
-
Kedụ ihe i chere ọ pụtara “ịtụkwasị obi na eziomume nke gị onwe [gị]”? (lee Izikiel 33:12–13).
-
Kedụ ihe ị ga-agwa onye chere na ndị ahụ akọwara niime Izikiel 33:12–19 bụ ndị a na-emesoghi nʻụzo ikpe ziri ezi? (lee kwa Matiu 21:28–31; Luk 18:9–14).
-
Gịnị ka ị na-ahụta niime amaokwu ndị a na-enyere gị aka ghọta ihe ọ pụtara ịchegharị? Kedụ nghọta ndị agbakwunyere i na-ahụ niime Izikiel 36:26–27 na Alma 7:14–16?
Izikiel 37
Onyenwe anyị na-akpọkọta ndị Ya ma na-enye ha ndụ ọhụrụ.
Mkpọkọta nke Izrel ka egosipụtara na Izikiel 37 site na ọdịmara abụọ. Dị ka ị na-agụ banyere nke mbụ—ọkpụkpụ ndị nwụrụ anwụ a na-eweghachite na ndụ (lee amaokwu ndịa 1–14)—tụgharịa uche ihe ọ na-agwa gị banyere mkpọkọta Izrel nʻakụkụ abụo nke akwa mgbochi (lee kwa Izikiel 36:24–3). Ị nwere ike tulee ajụjụ dị ka ndị a:
-
Gịnị ka Onyenwe anyị na-agba mbọ imezu site na mkpọkọta nke Izrel?
-
Olee otu O siri emezu ya?
Ị nwere ike jụọ onwe gị otu ụdị ajụjụ ahụ dị ka ị na-agụ banyere ọdịmara nke abụọ niime amaokwu ndịa 15-28. Ọdịmara nke a gụnyere mkpịsị abụọ, nke ọtụtụ ndị ọkammụta tapịara dị ka bọọdụ osisi eji ede ihe nke ejikọtara jiri hinji. Mkpisi nke Judah nwere ike nochite anya Baịbụl (ebe ọtụtụ ihe dị niime Baịbụl ka ụmụ ụmụ nke Judah dere), ma mkpịsị nke Josef nwere ike nọchite anya Akwụkwọ nke Mọmọn ( ebe ezi na ụlọ nke Lehi bụ ụmụ ụmụ nke Josef si na Ijipt. I buru nke ahụ nʻuche, gịnị ka amaokwu ndị a na-akuzi banyere ọrụ Akwụkwọ nsọ na-arụ na mkpọkọta nke Izrel?
Chee otu Baịbụl na Akwụkwọ nke Mọmọn jiri rụkọta ọrụ na ndụ gị—tụmadị, na ị nyere gị aka bịakwute Kraịst. Kedụ amaokwu ndị kachasị baara gị uru?
Lee kwa 2 Nifaị 3:11–13; 29:14; “Izrel, Izrel, Chineke Na-akpọ,” Abụ, no. 7; Isiokwu niile na Ajụjụ niile, “Baịbụl,” “Akwụkwọ nke Mọmọn,” Ọba akwụkwọ Ozi ọma; “Akwụkwọ nke Mọmọn Na-akpọkọta Izrel Ekposasịrị” (vidiyo), Ọba akwụkwọ Ozi ọma.
The Book of Mormon Gathers Scattered Israel
Nʻotu ọhụ, Izikiel hụrụ osimiri na-asọpụta site na tempụl ma gwọọ Oke Osimiri Ogbu ahụ.
Izikiel 47:1–12
Enwere m ike ịchọta ọgwụgwọ nke ime mmụọ niime ụlọ nke Onyenwe anyị.
Dị ka ị na-agụ Izikiel 47:1–12, ọ nwere ike nye aka ị mata na Oke Osimiri Ogbu ahụ dị oke nnu nnu nke mere na azụ na ahịhịa adịghi niime ya. Gịnị na-amasị gị banyere mmiri ndị akọwara amaokwu ndịa 1–12? (lee kwa Mkpughe 22:1). Kedụ ihe mmiri ndịa na-egosị ọdịmara ya? Kedụ ihe osisi ndị ahụ akọwara niime amaokwu 12 na-anọchite?
Gịnị ka ozi nke Okenye Dale G. Renlund “Agụgụala Ezi na ụlọ na Ọrụ Tempụl: Nrachi na Ọgwụgwọ” na-agbakwunye na nghọta gị? (lee Liahona, Me 2018, 47–48). Tụgharịa uche otu isi wee chọta ndụ nke ime mmụọ na ọgwụgwọ niihi tempụl.
Nchepụta niile maka Ikuziri Ụmụntakịrị
Izikiel 3:17; 33:1–5
Ndị amụma dị ka ndị nche na-adọ anyị aka na ntị maka ihe egwu.
-
Ụmụaka nta nwere ike nwe mmasị ịme ihe ndị na-agakọ ya na Izikiel 3:17. Na-ịmatụ, ha nwere ike tụọ aka na anya ha, ntị ha, na ọnụ ha mgbe ị na-agụ okwu niile ndị ahụ “onye nche,” “nụrụ,” na “ọnụ.” Ha nwekwara ike masị ha ịgagharị agagharị—nʻezi ma ọ bụ niime ụlọ. Dị ka ha na-eje ije, dọọ ha aka na ntị banyere ihe ndị nọ nʻokporo ụzọ, dị ka osimiri a ga-awufe, alaka a ga-esi nʻokpuru gafee, ma ọ bụ anụmanụ ndị a ga-ezere (ma ha bụ eziokwu ma ọ bụ ejije). Nke a nwere ike duba na mkparịta ụka banyere otu onye amụma nke Onyenwe anyị si adọ anyị aka na ntị banyere ihe egwu anyị adịghị ahụ.
-
Nke a bụ ụzọ ọzọ iji gosipụta Izikiel 3:17; 33:1–5.. Otu niime ụmụ gị nwere ike mee ka a ga-asị na ọ bụ “onye nche” site na-ịlepụ anya na mpio ma na-agwa onye niile ihe na-eme nʻezi. Unu nwekwara ike kirie vidiyo “Onye nche nʻelu Tọwa” (ChurchofJesusChrist.org). Olee otu onye amụma anyị dị ndụ si dị ka onye nche nye anyị?
4:17Watchman on the Tower
Onye amụma Izikiel, site n’aka Lyle Beddes
Izikiel 37:15–23
Baịbụl na Akwụkwọ nke Mọmọn na-enye aka “kpọkọta” anyị na Jizọs Kraịst.
-
Mgbe unu gụkọtara Izikiel 37:15–23 ọnụ, gị na ụmụ gị nwere ike chọta mkpịsị abụọ ma dee nʻelu otu Maka Judah (Baịbụl) ma nʻelu nke ọzọ Maka Josef (Akwụkwọ nke Mọmọn). Unu nweziri ike kesaa akụkọ ma ọ bụ akwụkwọ nsọ niile sitere na Baịbụl na Akwụkwọ nke Mọmọn nke na-enyere unu aka bịaruo Onye Nzọpụta nso ma bụrụ “ndị [Ya]” (amaokwu 23). Kedụ ihe mere o ji dị mma ị nwe akwụkwọ nsọ abụọ ndị a?
Anwakwala ị gụcha ihe niile. O nwere ike ị gaghị enwe ike ịnyocha eziokwu niile dị niime Izikiel gị na ụmụ gị. Jiri ekpere tulee ihe dịịrị ha mkpa ịghọta, ma chọọ odudu nke ime mmụọ iji mata ihe ha ga-elekwasị anya na ya. (Lee Nkuzi ihe n’Ụzọ nke Ọnye Nzọpụta, 17.)
Izikiel 47:1–12
Obi anyị na ezi na ụlọ anyị niile nwere ike ịchọta ọgwụgwọ niime ụlọ nke Onyenwe anyị.
-
Izikiel 47 na-akọwa ọhụ nke Izikiel maka mmiri na-asọpụta site na tempụl na ọgwụgwọ nke Oke Osimiri Ogbu ahụ—osimiri nke dị oke nnu nnu nke mere azụ na ahịhịa adịghi niime ya. Ikekwe ụmụ gị nwere ike see otu mkpanaka ma ọ bụ abụọ site na ọhụ ahụ, di ka tempụl, osimiri, ọzara, Oke Osimiri Ogbu ahụ, ọtụtụ azu, ma ọ bụ osisi juputara na mkpụrụ. Emesịa, dị ka unu na-agụkọta amaokwu ndịa 1–12 ọnụ, ha nwere ike kesaa ihe osise ha mgbe ọbụla akpọrọ mkpanaka ahụ aha. Kedụ ngọzi ndị bịara site na osimiri ahụ dị niime ọhụ nke a? Nyere ụmụaka ahụ aka hụ otu ngọzi ndị ahụ ji dịrị ka ngọzi niile Onye Nzọpụta na-enye ndị ahụ na-edebe ọgbụgba ndụ niile nke tempụl. Vidiyo ahụ “Ma Osimiri ahụ Ga-eto eto” (Ọba akwụkwọ Ozi ọma) nwere ike nye aka.
3:43And the River Will Grow
-
Unu nwekwara ike gụkọọ otu egwu ọnụ nke na-akọwa ngọzi niile nke tempụl, ụdị dị ka “Ezi na ụlọ Nwere ike Dịkọta ọnụ Ruo Ebighi ebi” (Akwụkwọ Ukwe Ụmụ ntakịrị, 188). Kedụ ihe egwu nke a na-akuzi banyere otu Onyenwe anyị si agọzi anyị niime ụlọ nsọ Ya?
Maka echiche ndị ọzọ, lee mbipụta nke ọnwa nke a nke magazin Friend .