Come, Follow Me
Nọvemba 9–15. Enweghi Chineke Ọzọ Pụrụ Ịnapụta”: Daniel 1–7


“Nọvemba 9–15. “Enweghi Chineke Ọzọ Pụrụ Ịnapụta”: Daniel 1-7,” Bianụ, Soro M—Maka Ebe Obibi na Nzukọ nsọ: Agba Ochie 2026 (2026)

“Nọvemba 9–15. ʻEnweghi Chineke Ọzọ Pụrụ Ịnapụta,’” Bịanụ, Soro M: Agba Ochie 2026

Nebuchadnezzar na-ege Daniel ntị nke ọma

Daniel akọọwa Nrọ nke Nebuchadnezzar, site nʻaka Grant Romney Clawson

Nọvemba 9–15: “Enweghi Chineke Ọzọ Pụrụ Ịnapụta”

Daniel 1–7

O dị nnọọ kaa ọ dịghị onye ga-eyi egwu ịtụba gị n’ekwu ọkụ na-ere ere ma ọ bụ n’olulu ọdụm n’ihi okwukwe i nwere na Jizọs Kraịst. Mana ọ dịghị onye ọ bụla n’ime anyị ga-esi na ndụ a gafee na-enweghị nnwale nke okwukwe. Ya mere anyị niile nwere ike irite uru site nʻọmụmatụ nke ndị dị ka Daniel, Shedrak, Mishak, na Abed-nego, bụ ndị dị ke Na-achị Obodo Ukwu Babilọn dọọrọ n’agha dị ka ụmụ okorobịa. (lee 2 Ndị Eze 24:10–16). Ha ka omenala ha na-amachaghị gbara gburugburu nke nwere ụkpụrụ dị iche iche, ha zutere ọnwụnwa dị ukwuu ịhapụ nkwenye ha niile na ezi omume ọdịnala ha niile. Ma ha nọgidere na-ekwesị ntụkwasị obi nye ọgbụgba ndụ ha niile. Kedu ka ha si mee ya? Site na-ime ihe ndị ahụ dị nta ma ndị dị mfe Chineke chọrọ n’aka anyị nile—ikpe ekpere, ibu ọnụ, ịhọrọ ezi ndị enyi, ịtụkwasị Ya obi, na ịbụ ihè nye ndị ọzọ. Dị ka Josef nọ n’Ijipt na Esta nọ na Persia, Daniel na ndị enyi ya nọ na Babịlọn nọgidere na-enwe okwukwe na Chineke, ma Chineke rụkwara ọrụ ebube ndị ka na-akpalimmụọ ndị kwere ekwe ruo taa.

Maka nchikọta nke akwụkwọ nke Daniel, lee “Daniel” niime Ọkọwa okwu Baịbụl.

akara ngosi ihe ọmụmụ

Nchepụta niile maka Ọmụmụ ihe N’Ebe Obibi na na Nzukọ nsọ

Daniel 1; 36

akara ngosi semịnarị
Enwere m ike ịtụkwasị obi n’Onyenwe anyị mgbe a nwalere okwukwe m.

N’otu uche, anyị niile bi na Babịlọn. Anyị na-ezutekarị ọnwụnwa iji mebie ihe anyị kwere ma si na okwukwe anyị na Kraịst wezuga onwe anyị. Dị ka ị na-agụ Daniel 1, 3, and 6, hụba ama ụzọ niile ejiri na-amanye Daniel, Shadrak, Meshach, na Abed-nego ka ha mee ihe ndị ha maara na o zighi ezi. Kedụ otu ha jiri zaghachi ọnọdụ ndịa? (lee Daniel 1:10–13; 3:15–18; 6:10). Gịnị bụ nsonaazụ nke okwukwe ha? Gịnị ka ị na-amụta site na nhụmịhe ndịa nke nwere ike inyere gị aka tụkwasị obi nʻOnyenwe anyị mgbe izutere mmegide? Tulee kwa ajụjụ ndịa na-esote:

  • Mgbe ole ka amanyere gị ka ịmee otu ihe ị maara na o zighi ezi? Kedụ otu Onyenwe anyị siworo gọzie gị maka idobe iwu nsọ Ya niile?

  • Ọ bụrụ kwanụ na okwukwe gị edurughị ruo na ọrụ ebube ndị ahụ ị na-achọ? (maka ọmụmatụ, lee Alma 14:8–13). Nihi ihe ị gụtara na Daniel 3:13–18, kedụ otu ịchere Shadrak, Meshach, na Abed-nego gaara iji zaa ajụjụ nke a? Kedụ otu ọmụmatụ ha nwere iji metụta ụzọ iji ezute mnwale gị niile?

  • Kedụ otu nhọrọ niile nke ezi omume gị nwere ike iji duba ndị ọzọ nʻinwete okwukwe dị ukwuu na Onyenwe anyị? (lee Daniel 2:47; 3:28–29). Tụgharịa uche na ndapụta nke nhọrọ gị niile nwere ike ị na-enwe nʻebe ndị ọzọ nọ.

Lee kwa Dieter F. Uchtdorf, “Atụkwala Ụjọ, Naanị Kwere,” Liahona, Nov. 2015, 76–79.

Gbaa mbọ mee ka onye niile sonye. Onye Nzọpụta “na-akpọku … mmadụ nile ka ha bịakwute ya ma keta oke n’ịdị mma ya” (2 Nifaị 26:33). Ọ bụrụ na ị na-akuziri ezi na ụlọ gị ma ọ bụ klas ihe, tụgharịa uche ụzọ niile ịnwere ike iji nye onye niile ohere isonye nʻụzo ọbụla. Iji nye ọmụmaatụ, ị nwere ike inye onye ọ bụla otu edereede nke akwụkwọ nsọ, otu nkeji nke ozi ọgbakọ, ma ọ bụ otu ọdịnọọgbara sitere na otu abụ iji tụgharịa uche ma kwuo okwu maka ya. Amanyekwala onye ọbụla ka o sonye, mana nye ha ohere niile.

Shadrak, Meshach, Abed-nego, na onye nke anọ niime olulu ọkụ

Shadrak, Meshach, na Abednego niime Oke Ọkụ, site nʻaka William Maughan

Daniel 2

Nzukọ nsọ Ahụ nke Jizọs Kraịst nke Ndị nsọ Ụbọchi ikpeazu a bụ alaeze nke Chineke nʻụwa.

Site na mkpughe, Daniel hụrụ na nrọ nke Nebukadneza buru amụma banyere ọtụtụ alaeze nke ụwa n’ọdịnihu, ya na alaeze Chineke n’ọdịnihu, nke a “na-agaghị ebibi ma ọlị” (Daniel 2:44). “Nzukọ nsọ a bụ ala eze ụbọchị ikpeazụ ahụ eburu nʻamụma,” ka Okenye D. Todd Christofferson kụziri, “ọ bụghị mmadụ kere kama Chineke nke eluigwe hiwere ya wee na-akpọdata dị ka nkume e gbupụtara site n’ugwu ukwu na-ejighị aka’ iji mejupụta ụwa” (“Gịnị Kpatara Nzukọ nsọ,” Liahona, Nọv. 2015, 111). Chee echiche banyere alaeze ụbọchị ikpeazụ nke Chineke dị ka ị na-agụ nkọwa nke nkume ahụ na Daniel 2:34–35, 44–45. Gịnị bụ ọrụ gị na-inyere amụma a aka bịa na mmezu?

Lee Kwa “Nụrụ, Unu Mba niile!,” Abụ, no. 264; “Chineke Nyere Ha Ọmụma ihe” (vidiyo), ChurchofJesusChrist.org.

13:49

God Gave Them Knowledge

Daniel 2:1–30

Ị nata mkpughe na-achọ nkwadobe nke ime mmụọ.

Dị ka ị na-enyochagharị Aịzaya 2:1–15, tulee otu ị gaara esi chee ma ọ bụrụ na ịhụ onwe gị nʻọnọdụ Daniel. Kedụ ihe Daniel mere? (lee Daniel 2:16–18). Kedụ ihe ị nwere ike ịmụta site na Daniel 1:17 banyere otu Chineke si kwado Daniel? Kedụ ihe ị nwere ike ịmụta site na Okwu niile na omume niile nke Daniel mgbe ọ natasịworo enyemaka nke Onyenwe anyị? (lee Daniel 2:19–30).

Daniel 7:13–14

Jizọs Kraịst bụ Ọkpara Nna nke Ebighị ebi.

Nʻoge ozi nke Onye Nzọpụta nʻụwa, ọtụtụ ndị Juu weere etutu aha ahụ “Nwa nke Mmadụ” sitere na Daniel 7:13 dị ka aha Mezaya ahụ na-abịa abịa. Kedụ ihe ị na-amụta banyere Mezaya ahụ site na Daniel 7:13–14? (lee kwa Mozis 6:57).

Onye Nzọpụta mgbe na mgbe na-akpọkarị onwe ya dị ka “Nwa nke Mmadụ.” Tulee ịnyochagharị ụfọdụ ọmụmatụ: Matiu 25:31; Mak 9:31; 10:45. Kedụ ihe Ọ na-akuzi banyere Onwe Ya niime amaokwu ndị a? Na Mak 14:61–64, Jizọs jiri etutu aha nke a nʻụbọchị ikpeazụ nke ndụ anụ Ya. Hụba ama agwa ndị mmadụ gosiri mgbe ha nụrụ ọkwaa Ya. Kedụ otu amụma nke Daniel banyere Nwa nke Mmadụ ji emetụta mmetụta gị banyere ihe mere Ya na Mak 15?

Dị ka esi wee kpọọ Jizọs asị maka ịma ọkwa na Ọ bụ “Nwa nke Mmadụ,” ị nwekwara ike zute mkpagbu maka ịma ọkwa eziokwu. Were amụma ahụ dị na Daniel 7:13–14 ji tunyere nkwa niile dị na Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 121:29, 46.

Lee kwa Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 49:6; Odudu nye Akwụkwọ nsọ, “Nwa nke Mmadụ,” Ọba Akwụkwọ Ozi ọma.

akara ngosi nkeji ụmụntakịrị

Nchepụta niile maka Ikuziri Ụmụntakịrị

Daniel 1; 36

Jizọs ga-enyere m aka mee ihe ziri ezi ọbụna mgbe ọ rara ahụ.

  • Iji nyere ụmụ gị aka mụta ihe site na akụkọ niile na-akpate mmụọ ndị dị niime akwụkwọ nke Daniel, ị nwere ike chọta foto nke ihe omume ndị ahụ na Daniel 1, 3, na 6 (lee ihu akwụkwọ ihe omume nke izu ụka nke a ma ọ bụ Akwụkwọ Nka Ozi ọma, nọs 23, 2526). Emesịa ị nwere ike chewe foto ndị ahụ ihu nʻala ma kpọkuo otu nwata ka ọ mehee ya ma kọọ akụkọ nke ihe ọ nọchitere. (Maka enyemaka, lee “Daniel na Ndị Enyi Ya,” “Shadrak, Meshach, and Abed-nego,” na “Daniel na Olulu Ọdụm ahụ” niime Akụkọ niile nke Agba Ochie, 154–56, 160–62, 163–65.)

    1:39

    Daniel and His Friends

    1:39

    Shadrach, Meshach, and Abed-nego

    1:45

    Daniel and the Lions’ Den

  • Nyere ụmụ gị aka chee maka ọnọdụ niile nke enwere ike ịmanye ha ka ha họrọ ajọọ nhọrọ, dị ka emere Daniel na ndị enyi ya Daniel 1, 3, na 6. Kekọrịtara unu na ibe unu otu esiworo gọzie unu maka ime ezi nhọrọ ọbụna mgbe ọ rara ahụ. Unu nwekwara ike gụkọọ otu egwu ọnụ banyere isiokwu nke a, dị ka “Họrọ nke ahụ Ziri ezi” (Abụ niile, no. 239).

ụmụ okorobịa na-ajụ ịta anụ

Ịtụkwasị obi Nʻamamiihe nke Okwu ahụ

Daniel 1:1–17

Nna nke Eluigwe chọrọ ka m lekọta anụ ahụ m.

  • Ịgụ akụkọ banyere Daniel na ndị enyi ya ịjụ anụ na mmanya nke eze ahụ nwere ike kpalie mkparịta ụka gbasara iwu ahụike Nna nke eluigwe nyere anyị taa. (lee Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 89). Ikekwe, ị nwere ike ịchọ ngọzi niile nke Daniel na ndị enyi ya natara ma jiri ha tụnyere ngọzi ndị ahụ e kwere na nkwa n’Okwu nke Amamihe (lee Daniel 1:15–17 na Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 89:18–21).

Daniel 2

Nzukọ nsọ Ahụ nke Jizọs Kraịst nke Ndị nsọ Ụbọchi ikpeazu a bụ alaeze nke Chineke nọ nʻụwa.

  • Mgbe ị gụsịrị Daniel 2:31–35, 44–45 gị na ụmụ gị, ịnwere ike kpọkuo ha ị se ihe osise nke nrọ nke Nebuchadnezzar. Nyere ha aka ghọta na nkume ahụ dị niime nrọ ahụ nọchitere Nzukọ nsọ Ahụ nke Jizọs Kraịst nke Ndị Nsọ Ụbọchị Ikpeazu a. Kedụ ihe anyị na-amụta banyere Nzukọ nsọ ahụ niime nrọ nke a? Ụmụ gị nwere ike kpọpụta ụfọdụ ihe Nna nke Eluigwe mere iji hiwe Nzukọ nsọ Ya nʻụbọchi ikpeazụ ndị a. Ọ bụrụ na ha chọọ enyemaka, ị nwere ike gosi foto niile ihe omume sitere na Mweghachite nke Nzukọ nsọ ahụ (lee Akwụkwọ Nka Ozi ọma, nọs. 90–95).

Daniel 6

Nna nke Eluigwe chọrọ ka m na-ekpe ekpere mgbe niile.

  • Gịnị mere ịkpere ekpere nye Nna nke Eluigwe jiri dịịrị Daniel mkpa? Ikekwe gị na ụmụ gị nwere ike ikwu okwu banyere ajụjụ ahụ dị ka unu na-agụkọta Daniel 6 ọnụ. Emesịa unu nwere ike kesaara ibe unu ihe kpatara ekpere jiri dịrị unu mkpa. Ọ nwere ike masị ụmụ gị ị se foto onwe ha mgbe ha na-ekpe ekpere na ọnọdụ dị iche iche. Ha nwere ike jiri ihe osise ndị ahụ kuziere onye na ibe ya ihe na anyị nwere ike ịkpe ekpere nye Nna nke Eluigwe nagbanyeghi ebe anyị nọ ma ọ bụ ihe anyị chọro.

Maka echiche ndị ọzọ, lee mbipụta nke ọnwa nke a nke magazin Friend .

Daniel na-eguzoro niihu otú otù ọdụm

Daniel nime Olulu Ọdụm, site n’aka Briton Rivière

Ihu akwụkwọ ihe omume Prịamarị: Chineke ga-agọzi m dị ka m na-ahọrọ isoro Jizọs Kraịst