Nọvemba 23–29. ‘Chọọnụ Onyenwe anyị, ma Unu Ga-adị Ndụ’: Emọs; Obadaya; Jona,” Bianụ, Soro M—Maka Ebe Obibi na Nzukọ nsọ: Agba Ochie 2026 (2026)
“Nọvemba 23–29. ‘Chọọnụ Onyenwe anyị, ma Unu Ga-adị Ndụ,’” Bịanụ, Soro M: Agba Ochie 2026
Jizọs na Beach nke Nineveh, site n’aka Daniel Lewis
Nọvemba 23– 29: “Chọọnụ Onyenwe anyị, ma Unu Ga-adị Ndụ”
Emọs; Obadaya; Jona
Jona nọ nʻụgbo mmiri na-aga Tarshish. Enweghi ihe dị njọ ị ga Tarshish, kama ọ bụ na ebe ahụ dị anya site na Nineveh, ebe Jona kwesịrị ị ga jee kwusaa ozi Chineke. Mgbe ụgbọ mmiri ahụ zutere oke ebili mmiri, Jona maara na ọ bụ nihi nnupuisi ya. N’ihi isi ọnwụ nke Jona, ndị ọrụ ụgbọ mmiri ibe ya kwabara ya n’ogbu nke oke osimiri ahụ iji kwụsị oke ifufe ahụ. Ọ dị nnọo ka nsọtụ nke Jona na ozi ya. Ma Jehova echefughị Jona—dị nnọọ ka Ọ chefubeghịkwa ndị Ninive, nọ nʻụlọ nke Izrel, ma ọ bụ onye ọ bụla n’ime anyị.
Ya mere, Ọ nọgidere na-ezipụ ndị amụma—dị ka Jona, Emọs, Obadaya, na ndị amụma anyị taa—na-ezi ozi na ọ bụrụ na anyị echegharịa, a gaghị akwapụ anyị ruo mgbe ebighị ebi. N’ime “ihe nzuzo niile” nke Chineke na-ekpughe (see Amos 3:7), nke a bụ otu n’ime ihe ndị kasị dị oke ọnụ ahịa: na n’ihi Jizọs Kraịst, oge agafebeghị ịgbanwe. Ọ ka chọrọ inyere anyị aka ibi ndụ kwekọrọ n’ọgbụgba ndụ ndị anyị na Ya gbara, ma Ọ dị njikere inye anyị ohere ọzọ.
Maka nchikọta nke akwụkwọ ndị a, lee “Emọs,” “Obadaya” na “Jona”niime Ọkọwa okwu Baịbụl.
Nchepụta niile maka Ọmụmụ ihe N’Ebe Obibi na na Nzukọ nsọ
Emọs 3:1–8; 7:10–15
Onyenwe anyị na-ekpughe eziokwu site na ndị amụma Ya.
Na Emọs 3:3–6, onye amụma Emọs nyere ọmụmatụ nchịkọta anyị nwere ike ịwepụta site na ihe iriba ama ndị anyị na-anụ ma ọ bụ hụ: mgbe ọdụm gbọrọ ụja, ọ ga-abụrịrị na ọ nwudere anụ; ọ bụrụ na ejidere nnụnụ n’ọnyà, ọ ga-abụrịrị na enwere ihe ọ na-eri nọ nʻọnyà ahụ. Na amaokwu ndịa 7–8, Emọs tinyere echiche nke a na ndị amụma. Kedụ nchịkọta ndị anyị nwere ike ịnwete mgbe onye amụma buru amụma? Kedụ ihe ọzọ ị na-amụta banyere ndị amụma site na Amos 7:10–15?
Kedụ ihe Onyenwe anyị na-ekpughere gị site na ndị amụma Ya?
Okenye Ulisses Soares kwuru na “ịnwe ndị amụma bụ ihe iriba ama nke ịhụnaanya nke Chineke” (“Ndị amụma Na-ekwu okwu site Nʻike nke Mmụọ Nsọ,” Liahona, Me 2018, 99). Tulee otu ị ga-esi emejuputa ahịrịokwu nke a ”A maaram na Chineke hụrụ m nanya, niihi O zitere ndị amụma ndị …” Nke a bụ ụfọdụ akwụkwọ nsọ nwere ike ínye aka: Ditronomị 18:18; Izikiel 3:16–17; Ndị Efesọs 4:11–14; 1 Nifaị 22:2; Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 21:4–6; 84:36–38; 107:91–92.
Gịnị ka i ga-agwa onye na-eche na enweghi uru ndị amụma bara taa?
Leekwa Isiokwu niile na Ajụjụ niile, “Ndị Amụma” Ọba akwụkwọ Ozi ọma.
Emọs 4– 5
“Chọọnụ Onyenwe anyị, ma Unu Ga-adị Ndụ.”
Dị ka Emọs 4:6–13, kwuru, kedụ olile anya Onyenwe anyị nwere ga-eme mgbe ndị Izrel gabigara ọtụtụ mnwale? lee kwa Hilaman 12:3). Ebe mnwale gị niile nwere ike ọbụghi Chineke zitere ha, kedụ kwanụ otu ha siri nye gị ohere iji chigharịa nʻebe Ọ nọ?
Dị ka ị na-agụ Emọs 5:4, 14–15, tulee otu Onyenwe anyị jiri gosi gị ebere. Kedụ otu ịchọ Ya siworo nwetere gị ndụ?
Emọs 8:11–12
Okwu nke Onyenwe anyị nwere ike chụọ agụrụ na akpịrị ịkpọ nku nke ime mmụọ.
Dị ka ị na-agụ Emọs 8:11–12, chee banyere ihe mere ụnwụ jiri bụrụ ezi ntụnyere maka ibi ndụ na-enweghi okwu nke Chineke (lee kwa Jọn 6:26–35; 2 Nifaị 9:50–51; 32:3; Ịnos 1:4–8). Olee otu iji a mata mgbe ịnwere agụrụ nke ime mmụọ?
Amaokwu ndịa nwere ike gbasa Nnukwu Ngọnarị okwukwe (lee Isiokwu niile na Ajụjụ niile, “Ngọnarị okwukwe,” Ọba akwụkwọ Ozi ọma). Kedụ otu “ụnwụ” nke ime mmụọ ahụ jiri metụta ụmu nke Chineke? Kedụ otu Mweghachite ahụ siworo chụọ agụrụ nke ime mmụọ gị?
Lee kwa “Nnukwu Ngọnarị okwukwe” (vidiyo), Ọba akwụkwọ Ozi ọma.
The Great Apostasy
Obadaya 1:21
Kedụ ndị bụ “ndị nzọpụta … nʻelu ugwu Zayọn”?
Ịrụtụ aka na Obadaya 1:21, Onyeisi Gordon B. Hinckley kọwara na anyị na-abụ ndị nzọpụta nʻelu Ugwu Zayọn mgbe anyị natara emume nsọ niile maka ndị nwụrụ anwụ niime tempụl (lee “Okwu Mmechi,” Liahona, Nov. 2004, 105). Kedụ otu ịrụ otu ụdị ọrụ ahụ si yie ihe—ọ bụrụgodi nʻụzọ dị ntakịrị—nke Onye Nzọpụta meere anyị? Kedụ otu ịrụ orụ nke a jiri nyere gị aka nwete mmetụta ịbịaru Onye Nzọpụta nso?
Lee kwa “Tempụl niile Dị Nsọ nʻelu Ukwu Zayọn,” Abụ, no. 289.
Jona 1– 4
Onyenwe anyị na-adị ebere nye ndị niile ga-echigharị nʻebe Ọ nọ.
Nineveh bụụrụ onye iro nke Izrel a maara maka ịme ihe ike na obi ọjọo. Nye Jona, ọ dịrị ya ka ihe na-ekweghị omume na ha ga-echegharị. O nwere ike dọrọ mmasị ịwere agwa Jona (lee Jona 1; 3–4) jiri tụnyere mmetụta niile nke Alma na ụmụ nwoke nke Mosaia (lee Mosaia 28:1–5; Alma 17:23–25). Kedụ ihe ị na-amụta site na Jona3 nke na-akpali gị ịkesaa ozi ọma ahụ nye ọbụna ndị ahụ nwere ike yie ka ha adịghị njikere ịgbanwe?
Dịka ị na-agụ Jona, lee anya maka ọmụmatụ niile nke ebere Onyenwe anyị. Gịnị kpatara ijiri chee na Jona “enweghi obi ụto” ma “na-ewe oke iwe” (Jona 4:1) mgbe Onyenwe anyị setịpụrụ ebere nye ndị nke Nineveh? Kedụ ihe ịchere na Onyenwe anyị na-agba mbọ ikuziri ya niime isi 4? Tụgharịa uche otu i siworo nwete ebere Ya na ndụ gị. Gịnị ka ị na-amụta site na Jona nke nwere ike i nyere gị aka dikwuo ebere?
Nchepụta niile maka Ikuziri Ụmụntakịrị
Niihi Sọnde nke a bụ Sọnde nke ise nke ọnwa, a na-agba ndị nkuzi Praịmarị ume iji ihe omume ọmụmụ ihe ndị a dị niime “Appendix B: Ịkwado Ụmụntakịrị maka Oge ndụ nʻỤzọ Ọgbụgba ndụ nke Chineke.”
Emọs 3:7
Ndị amụma bụ ndị ozi nke Jizọs Kraịst.
-
Iji nyere ụmụ gị aka ghọta Emọs 3:7, ịnwere ike takaara otu onye niime ha ozi dị mfe ma gwa ha ka ha kesaa ozi ahụ nye ụmụaka ndị ọzọ. Kedụ otu onye ozi niime egwuruegwu nke a jiri dịrị ka onye amụma? Gịnị kpatara Onyenwe anyị jiri enye anyị ndị amụma?
-
Iji mụtakwuo banyere ihe ndị amụma na-eme, gị na ụmụ gị nwere ike nyochagharịa ozi niile nke ugbua sitere nʻaka Onyeisi nke Nzukọ nsọ nke ugbua I nwere ike gụọ otu egwu dị ka “Soro Onye amụma” (Akwụkwọ Ukwe Ụmụntakịrị, 110–11). Kesaara onye n’ibe ya ihe ị mere unu jiri họrọ isoro onye amụma nke Onyenwe anyị.
Nyere ụmụntakịrị aka buo akwụkwọ nsọ nʻisi. Okenye Richard G. Scot kwuru: “Ibu akwụkwọ nsọ n’isi bụ imepụta enyi ọhụrụ. Ọ bụ dị ka ịchọpụta mmadụ ọhụrụ onye nwere ike inye aka n’oge mkpa, nye nkwalite na nkasi obi, ma bụrụ nsipụta mkpali nke mgbanwe a chọrọ” (“Ike nke Akwụkwọ nsọ,” Ensign, Nov. 2011, 6). Ịnyere ụmụ gị aka buo nʻisi ihe niile ma ọ bụ akụkụ nke Emọs 3:7, unu nwere ike dedata ya nʻala ma kwugharịa ya ọnụ. Emesịa unu nwere ike hichaa ma ọ bụ kpuchie okwu ole nʻole tutu ruo mgbe ụmụ gị nwere ike ịkwugharị amaokwu niile ahụ site na nʻisi ha.
Emọs 8:11–12
Mweghachite nke ozi ọma bụ ihe kwụsịrị ụnwụ nke ngọnarị okwukwe ahụ.
-
Kpọkuo ụmụ gị ime ka a ga-asị na agụrụ na-agụ ha dị ka ị na-agụ Amos 8:11–12. Kedụ otu ọ dị ka ya mgbe agụrụ nke okwu nke Chineke na-agụ anyị? Ikekwe ụmụ gị nwere ike mee ka a ga-asị ha na-eri nri dị ka ị na-ekesara ibe unu ụfọdụ akwụkwọ nsọ na-amasị unu.
-
Inwere ike jiri Odudu nye Akwụkwọ nsọ, “Ngọnarị okwukwe” (Ọba akwụkwọ Ozi ọma), ma ọ bụ “Mgbe Agba Ọhụrụ Gasịrị” (niime Akụkọ niile nke Agba Ọhụrụ, 167–70) iji nyere ụmụ gị aka ghọta “ụnwụ” ahụ nke bịara site na Nnukwu Ngọnarị okwukwe ahụ na otu o jiri kwụsị nihi Mweghachite ahụ. Kesaara onye n’ibe unu ihe kpatara ijiri nwee obi ekele na Onyenwe anyị weghachitere ozi ọma Ya nʻụbọchị anyị.
2:52After the New Testament
Jona 1– 3
Onyenwe anyị ga enyere m aka rubere Ya isi, ọbụna mgbe ọ rara ahụ.
-
Iji nyere ụmụ gị aka mụta akụkọ nke Jona, ịnwere ike nyochaa “Jona Onye amụma” na Akụkọ niile nke Agba Ochie; lee kwa ihu akwụkwọ ihe omume nke izu ụka nke a). Emesịa ịnwere ike ịjụ:
-
Kedụ ihe mere mgbe Jona erubeghi Onyenwe anyị isi? (lee Jona 1:4–17).
-
Kedụ ihe Jona mere iji chegharịa? (lee Jona 1:10–12; 2:1–4, 9; 3:1–4).
-
Kedụ ihe mere mgbe Jona rubere isi? Jona 3:5).
2:30Jonah the Prophet
-
-
Ụmụ gị nwere ike nwee obi ụtọ ịkọgharị akụkọ nke Jona ma ọ bụ mee ejije ya. Kesara ibe unu ụfọdụ nhụmihe mgbe Onyenwe anyị chọrọ ka ị mee otu ihe nke rara gị ahụ. Olee otu O siri nyere gị aka rubere Ya isi?
Jona 1– 4
Onyenwe anyị na-adị ebere nye ndị niile ga-echigharịa nʻebe Ọ nọ.
-
Ikekwe ụmụ gị nwere ike mee ka a ga-asị ha na-agba Jona ajụjụ ọnụ banyere nhụmihe ya. Kedụ ajụjụ ndị ha nwere ike ị jụ Ya? Gbaa ha ume ka ha jụọ ajụjụ niile iji chọpụta ihe Jona mụtara banyere Onyenwe anyị. Kedụ ihe Jona nwere ike ikwu, na-ịmatụ, banyere ebere nke Onyenwe anyị? (lee, na-ịmatụ, Jona 2:7–10; 3:10; 4:2).
Kraịst na Nwoke Ahụ Kpọnwụrụ, site n’aka J. Kirk Richards
-
Nyere ụmụ gị aka chee maka ọmụmatụ niile mgbe Onye Nzọpụta gosiri ndị ọzọ ebere, ụdị dị ka Mak 2:3–12; Luk 23:33–34; na Jọn 8:1–11. Gị na ụmụ gị nwere ike chọọ maka foto niile nke ọmụmatụ ndị ahụ. Kedụ ohere ndị anyị na-enwete iji gosi ndị ọzọ ebere?
Maka echiche ndị ọzọ, lee mbipụta nke ọnwa nke a nke magazin Friend .