“Nọvemba 16–22. ‘A Ga M Ahụ Ha Naanya Na-akpaghị oke’: Hosea 1–6; 10–14; Joel,” Bịanụ, Soro M—Maka Ebe Obibi na Nzukọ nsọ: Agba Ochie 2026 (2026)
“Nọvemba 16–22. ‘A Ga M Ahụ Ha Naanya Na-akpaghị oke,’” Bịanụ, Soro M: Agba Ochie 2026
Nọvemba 16– 22: “A Ga m Ahụ Ha Naanya Na-akpaghị oke”
Hosea 1–6; 10–14; Joel
Ọgbụgba ndụ ndị Izrel mere ha na Onyenwe anyị kwesịrị ịdi oke omimi ma baa nnukwu uru nke mere Onyenwe anyị jiri were ya tụnyere alụmdi na nwunye. Ọgbụgba ndụ, dị ka alụmdi na nwunye, gụnyere mkpebi dị ebighị ebi, nhụmihe enwekọrịtara ọnụ, iwukọta ndụ ọnụ, iguzosi ike pụrụ iche, na, nke kacha nke, ịhụnaanya eji obi niile gosi. Na mwute, ndị Izrel akwụdesighi ike na ọgbụgba ndụ ha. Ma otu ọ dị ozi nke Onyenwe anyị nyere ha abụghị “Aga m ajụ unu ruo ebighi ebi.” Kama ọ bụ “Aga m akpọghachite unu azụ” (lee Hosea 2:14–15). “Aga m ekwe nkwa ịlụ unu nʻonwem nʻezi omume,” Ọ mara ọkwa site nʻọnụ nke onye amụma Hosea (Hosea 2:19). “Aga m agwọ ndaghachi azụ ha, aga m ahụ ha naanya na-akpaghị oke” (Hosea 14:4). Nke a bụ kwa otu ụdị ozi ahụ nke Ọ na-enye anyị taa dị ka anyị na-achọ ịdebe ọgbụgba ndụ anyị jiri ịhụnaanya na nraranye.
Joel zikwara ozi yiri nke a: “Chigharịkwute Onyenwe anyị Chineke gị: niihi onye dị amara na ebere ka ọ bụ, onye na-adịghị ewe iwe ọsịsọ, nakwa onye na aba ụba nʻebere” (Joel 2:13) Ịgụ okwu ndị amụma ndịa nwere ike kpalie gị ịtụgharịa uche na mmekọrịta nke gị na Onyenwe anyị—ịche banyere otu nkwesị ntụkwasị obi Ya nye gị ji akpali nkwesị ntụkwasị obi gị nye Ya.
Maka nchikọta nke akwụkwọ niile nke Hosea na Joel, lee “Hosea, ma ọ bụ Hoshea” na “Joel” niime Ọkọwa okwu Baịbụl.
Nchepụta niile maka Ọmụmụ ihe N’Ebe Obibi na na Nzukọ nsọ
Hosea 1–3; 14
Mgbe niile ka Onyenwe anyị na-akpọku m ịloghachikwute Ya.
Gomer, nwunye Hosea, adịghị nkwesị ntụkwasị obi nye Ya, ma Chineke rụtụrụ aka na ihe omume nke a na-ezighi ezi iji kuziere ndị Izrel ụdị mmetụta Ọ nwere maka ha na ọgbụgba ndụ niile ha na Ya gbara. Dị ka ị na-agụ Hosea 1–3, tulee otu Onyenwe anyị na-ahụ mmekọrịta Ya na ndị ọgbụgba ndụ Ya. Kedụ otu ịgba ndụ gị na Onyenwe anyị jiri dịrị ka ịbanye alụmdi na nwunye? Kedụ otu ịghara idebe ọgbụgba ndụ ahụ jiri dịrị ka ekwesịghi ntụkwasị obi nye di ma ọ bụ nwunye? (lee Hosea 2:5–7, 13). Gịnị ka Hosea 2:14–23 na-akụziri gị banyere ịhụnaanya na ebere nke Onyenwe anyị? Olee otu i si egosi Ya ịhụnaanya na nguzosi ike gị?
Na Hosea 14, chọọ maka nkwa ndị ahụ mara mma nke Onyenwe anyị kwere ndị ahụ ga-alọghikwute Ya. Gịnị ka nkebiokwu ahụ “hụ ha naanya na-akpaghị oke” pụtara nye gị? (amaokwu 4). Gịnị ka mbụrụ ahịhịa ahụ dị niime amaokwu 5–8 na-akuziri gị banyere ngọzi niile nke Onyenwe anyị, gụnyekwara ngọzi niile nke nchegharị? Dị ka akụkụ nke ọmụmụ gị, tulee ịgụ ma ọ bụ ị gee ntị nye otu abụ banyere ebere nke Onye Nzọpụta, ụdị dị ka “Bịakwutenu Jizọs” (Abụ niile, no. 117).
Gomer, onye nọchitere ụlọ nke Izrel na ọgbụgba ndụ niile emebiri, ka enyere mgbapụta site nʻaka Onyenwe anyị. Ngosipụta site nʻaka Deb Minnard, ikikere sitere na goodsalt.com
Hosea 6:4–7; Joel 2:12–13
A ghaghị inwe mmetụta nke nraranye nye Chineke nime ahụ, nʻabụghị naanị igosiputa ya nʻelu ahụ.
Ndi bi nʻoge Hosea naara achụ aja anụmanụ, mana ha nọ kwa na-emebi iwu nsọ ndị kacha mkpa. Kedụ ihe i chere ọ pụtara na Onyenwe anyị “chọrọ ebere, ọbụghị aja, na mmata ihe nke Chineke karịa aja nsure ọkụ”? (Hosea 6: 6). Kedụ ihe i chere ọ pụtara ka eziomume dịrị ka igwe ojii ma ọ bụ ka igirigi? (lee Hosea 6:4). Kedụ otu ezi omume anyị kwesịrị isi a dị? (lee Aịzaya 48:18; 1 Nifaị 2:9–10).
Ịnwekwara ike gụọ Matiu 9:10–13; 12:1–8 iji hụ otu Onye Nzọpụta si jiri Hosea 6:6 nʻoge ije ozi Ya. Kedụ otu ederede ndịa si enyere gị aka ghọta okwu niile nke Hosea?
Mgbe ị na-agụ Joel 2:12–13, ọ nwere ike nye aka ị mata na ndọwa uwe mmadụ bụ ihe iriba ama ana ahụ anya nke iri uju ma ọ bụ mmetụta nchegharị. Kedụ otu ndọwa obi anyị siri dị iche site na ndọwa uwe anyị?
Joel 2
“A ga m awụkwasị Mmụọ nkem n’elu anụ ahụ niile.”
Kedụ myiri ndị ị na-ahụ nʻetiti ụbọchị anyị na ụbọchị ahụ Joel hụrụ nʻọhụ? (lee kacha nke Joel 2:1–2, 11, 18–32). Gịnị na-amasị gị banyere ngọzi niile nke Onyenwe anyị kwere nkwa na amaokwu ndịa 18–32? Gịnị mere ngọzi ndị a nwere ike iji baa uru taa?
O nwere ike ịdị mmasị ị gụ ihe Moronaị kwuru banyere Joel 2 mgbe ọ gara lete Josef Smith nʻafọ 1823 (lee Joseph Smith—Agụgụala 1:41). Kedụ otu isi chee na amụma ndị ahụ dị niime Joel 2:28–32 ka a na-emezu nʻụbọchị anyị? (lee kwa Ọrụ 2:1–21). Kedụ ihe i chere ọ pụtara na Onyenwe anyị “ga-awụkwasị mmụọ [Ya] nʻelu anụ ahụ niile”? (Joel 2:28).
Ịnwere ike tụgharịa uche nʻokwu ndịa sitere nʻaka Onyeisi Russell M. Nelson: “N’ụbọchị ndị n’abia abịa, ọ gaghị ekwesị ekwesi ịnya ndụ nke ime mmụọ na-enweghị odudu, ntụzi aka, nkasi obi, na mmetụta nke Mmụọ Nsọ na-adịgide” (“Mkpughe maka Nzukọ nsọ, Mkpughe maka Ndụ Anyị,” Liahona, Me 2018, 96). Gịnị mere mkpughe ji dị oke mkpa maka ịnyandụ nke ime mmụọ gị?
Kedu ihe ị ga-eme ma ọ bụrụ na ọ dị gị ka ị naghị anata mwụkwasị ahụ? Ndị a bụ ụfọdụ ọmụmaatụ ndị nwere ike ịnye aka. Gịnị ka ndị nọ n’akwụkwọ nsọ ndị a mere iji nata mwụkwasị nke Mmụọ nke Onyenwe anyị?
Dị ka ị na-agụ okwu ndị a sitere n’aka Okenye David A. Bednar, tụgharịa uche n’ihe ọ pụtara nye gị inwe mmetụta nke mwụkwasị Mmụọ Nsọ na ndụ gị kwa ụbọchị.
“Anyị na-emekarị ka ọ na-siri anyị ike ịnata mkpughe nke onwe. Site na nke ahụ, ịhe m na-akọwa nkwa ọgbụgba ndụ bụ bụ na dị ka anyị na-asọpụrụ ọgbụgba ndụ anyị, anyị nwere ike na-enwe Mmụọ Nsọ mgbe niile ka ọ bụrụ onye nsiso anyị mgbe niile. Mana anyị na-ekwu maka ya ma anyị na-eme ya ka a ga-asị na ịnụ olu Olu nke Onyenwe anyị site na Mmụọ Ya bụ ihe a na-adịghị ahụ mgbe niile. [Mmụọ ahụ] kwesịrị ịnọnyere anyị oge niile. Ọ bụghị kwa nanosecond ọ bụla, mana ọ bụrụ na mmadụ na-eme ike ya niile—ịkwesighi ịbụ onye zuru oke—ma ọ bụrụ na mụ na gị na-eme ike anyị niile ma anyị ma anyị anaghị eme oke ajọọ omume, mgbe ahụ anyị nwere ike ịtụkwasị Mmụọ Nsọ obi iduzi anyị. …
“… Ọ dị nnọọ kʻanyị kwenyere na Mmụọ Nsọ dị egwu ma buo ibu na dị mberede, ebe ọ dị jụụ ma dị nta ma na-abawanye ka oge na-aga” (“Mkparịta ụka nke Okenye David A. Bednar” [nnọkọ mgbede ndị mmadụ na Onye Ji Ikike Zuru ọha, Feb. 7, 2020], broadcasts.ChurchofJesusChrist.org).
Lee kwa Gary E. Stevenson, “Mkpali niile nke Mmụọ ahụ,” Liahona, Nov. 2023, 42–45; “Nʻogbe Onye Iro” (vidiyo), Ọba akwụkwọ Ozi ọma.
Enemy Territory
Mepụta agbata nke ime mmụọ. “Gịnị ka ị hụtaworo nke na-etinye aka na agbata ime mmụọ maka ọmụmụ ozi ọma? Gịnị na-ebelata ihe site na ya? … Chee echiche banyere ntọ ahụ ebe ịkachasị akuzi ihe [ma ọ bụ mụta ihe]. Olee otu o si emetụta gị mgbe mgbe ị nọ ebe ahụ? Kedụ otu kacha mma inwere ike iji kpọbata Mmụọ ịnọ ebe ahụ? (Nkuzi ihe n’Ụzọ nke Ọnye Nzọpụta, 7).
Nchepụta niile maka Ikuziri Ụmụntakịrị
Hosea 2:19–20
E nwere m ike ịkwesị ntụkwasị obi na-idebe ọgbụgba ndụ m.
-
Na akwụkwọ nke Hosea, Onyenwe anyị weere ọgbụgba ndụ Ya na ndị Ya tụnyere alụmdi na nwunye. Ị mụta ihe site na ntụnyere nke a, gị na ụmụ gị nwere ike lee anya na foto nke otu nwoke na nwanyị na-eme ọlụlụ ma kwuo banyere otu Nna nke Eluigwe si chọọ ka di na nwunye kpaso onwe ha agwa. Nyere ụmụ gị aka chọta okwu ndị dị niime Hosea 2:19–20 na-akọwa otu Onyenwe anyị si eche banyere anyị. Kedụ otu anyị ga-esi egosi Onyenwe anyị na-anyị hụrụ Ya naanya na anyị ga-ekwesị ntụkwasị obi nye Ya?
Hosea 10:12
“Oge eruwo ịchọ Onyenwe anyị.”
-
Hosea 10:12 na-arụtụ aka na-ịgha mkpụrụ, iwe ihe ubi, oge, na mmiri ozuzo iji kpọkuo anyị ịchọ Onyenwe anyị. Dị ka ị na-agụ amaokwu nke a, olee ekeereuche na-abịa n’uche nke nwere ike kpaliemmụọ ụmụaka ịchọ Ya? Na-ịmatụ, ikekwe, ụmụ gị nwere ike ịse otu elekere ma dedata ụzọ ndị ha nwere ike isi na-achọ Onyenwe anyị n’oge dị iche iche n’ụbọchị. Abụ dị ka “Oge ọ bụla, Ebe ọ bụla” (Ọba Akwụkwọ Ozi ọma) nwere ike inyere gị aka kuzie ihe na ọ bụ oge dị mma mgbe niile ịchọ Onyenwe anyị.
-
Ma ọ bụ ụmụ gị nwere ike ime omume dị mfe nke na-agakọ ya n’amaokwu ahụ, dị ka ime ka a ga-asị na a na-akụ mkpụrụ, na-akpara akwụkwọ nri, ma ọ bụ na-eguzo na mmiri ozuzo. Nyere ụmụ gị aka ka ha jiri ịgha mkpụrụ na inweta ezigbo nri tụnyere ibi ndụ ezi omume na ịnata ngọzi niile nke Onyenwe anyị. Mgbe ahụ, unu nwere ike ịgwa ibe unu banyere ngozi niile nke Onyenwe anyị zokwasịrị unu dị ka unu na-agbalị ịchọ Ya.
Hosea 13:4, 14
Jizọs Kraịst bụ Onye Nzọpụta na Onye Mgbapụta m.
-
Iji kwusie eziokwu ahụ dị na Hosea 13:4 ike na ọ dịghị Onye Nzọpụta dị ma e wezụga Jizọs Kraịst, ị nwere ike gosi ụmụ gị foto nke ọtụtụ mmadụ, gụnyere Jizọs. Ụmụ gị nwere ike nʻotu nʻotu na-atụ aka na onye ahụ nwere ike ịzọpụta anyị site na mmehie na ọnwụ. Kesaa ama gị banyere Jịzọs Kraịst na Aja mgbaghara mmehie Ya.
-
Ụmụ gị nwere ike chọ okwu ndị dị niime Hosea 13:4, 14 na-akọwa Jizọs Kraịst. Kedụ ihe okwu ndị a na-akuziri anyị banyere Ya? Tulee ịnyere ụmụ gị aka jiri Odudu nye Akwụkwọ nsọ iji chọta akwụkwọ nsọ ndị ọzọ na-akuzi na Jizọs bụ Onye Nzọpụta na Onye Mgbapụta anƴị. Kesaara onye n’ibe ya otu o si emetụta unu banyere Jizọs Kraịst.
Joel 2:28–29
Mmụọ Nsọ ahụ nwere ike idu m.
-
Ikekwe ịnwere ike nyere ụmụ gị aka ghọta Joel 2:28–29 site na-ịkwe ka ha wụọ otu ihe dị mmiri mmiri ma emesịa jiri nke na-ata ata tụnyere ya. Gịnị ka o nwere ike ịpụta maka “ịwụkwasị” anyị Mmụọ ahụ?
-
Dị ka ụnụ na-agụkọta Joel 2:28–29 ọnụ, ị nwere ike kpọkuo ụmụ gị itinye aha ibe ha iji dochie nkebiokwu nke a “ụmụ unu ndị nwoke” na “ụmụ unu ndị nwanyị.” Emesịa nyere ha aka nyochaa akwụkwọ nsọ dị ka Jọn 14:16; Moronaị 10:5; Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 42:17 iji chọpụta otu Mmụọ ahụ nwere ike iji nyere ha aka.
Maka echiche ndị ọzọ, lee mbipụta nke ọnwa nke a nke magazin Friend .