“Nọvemba 30–Disemba 6. ʻỌ na-enwe Obi ụto nʻEbereʻ: Maịka; Nahum; Habakuk; Zephaniah,” Bịanụ, Soro M—Maka Ebe Obibi na Nzukọ nsọ: Agba Ochie 2026 (2026)
“Nọvemba 30–Disemba 6. ‘Ọ na-enwe Obi ụto nʻEbere,ʻ” Bịanụ, Soro M: Agba Ochie 2026
Na Mmalite Ka Okwu ahụ Nọ, site n’aka Eva Timothy
Nọvemba 30–Disemba 6: “O Na-enwe Obi ụto nʻEbere”
Maịka; Nahum; Habakuk; Zephaniah
Ịgụ Agba Ochie mgbe ụfọdụ pụtara ịgụ amụma niile banyere mbibi. Mgbe na mgbe ka Onyenwe anyị na-akpọ ndị amụma ịdọ ndị ajọọ mmadụ aka na ntị banyere ikpe Ya. Ozi niile nke Maịka, Nahum, Habakuk na Zephaniah bụ ezi ọmụmatụ. Na uju dị egwu, ndị amụma hụrụ ọhụ maka ọdịda obodo ukwu nke, nʻoge ahụ, yiri ka ha siri ike ma dị ike: Nineveh, Babịlọn, na Jerusalem. Mana nke ahụ bụ ọtụtụ puku afọ gara aga. Gịnị mere o ji baa uru igụ amụma ndị a taa?
Nagbanyeghi na ebibiri ajọọ obodo ukwuu ndịa nwere mpako, ajọọ omume nwere mpako ka na-aga niihu. Anyị nwere ike hụ ururu ha niime obi anyị. Ndị amụma Agba Ochie kpughere otu anyị nwere ike iji pụọ site na-ajọ ihe ndịa. Ikekwe nke ahụ bụ otu ihe mere anyị ji ka kwesị ịgụ okwu ha taa. Ha abụghị naanị ndị amụma nke mbibi—ha bụ ndị amụma nnapụta. Nkọwa niile nke mbibi ahụ ka emere ka ọ jụọ oyi site na ọkpụkpọ okù ịbịakwute Kraịst ma nata mgbaghara Ya. Dị ka otu Maịka si dee ya, Onyenwe anyị anaghị enwete obi ụtọ na-ịma anyị ikpe, mana “ọ na-enwe obi ụtọ nʻebere” (Maịka 7:18). Otu a bụ ụzọ nke Onyenwe anyị nʻoge ochie, ma ọ bụ ụzọ Ya taa. “Ụzọ Ya niile dị ebighị ebi” (Habakuk 3:6).
Maka nchikọta nke akwụkwọ ndị a, lee “Maịka,” “Nahum,” “Habakkuk,” and “Zephaniah” niime Ọkọwa okwu Baịbụl.
Nchepụta niile maka Ọmụmụ ihe N’Ebe Obibi na na Nzukọ nsọ
Maịka 6:1–8
“Gịnị ka Onyenwe anyị na-achọ nʻaka gị?”
Maịka na-akpọku anyị ka anyị chee ịhe ọ ga-adị ka ya “ịbịa niihu Onyenwe anyị, ma kpọo isi … nʻala niihu Chineke dị elu” (Maịka 6:6). Gịnị ka amaokwu ndịa 6–8 na-agwa gị banyere ihe dịrị Onyenwe anyị mkpa dị ka Ọ na-anwalee ndụ gị?
Lee kwa Dale G. Renlund, “Kpee ikpe ziri ezi, Hụ Ebere nanya, ma Jiri Obi umeala Jekọrịta ije gị na Chineke,” Liahona, Nov. 2020, 109–12.
“Onyenwe anyị dị mma, ebe mgbaba siri ike nʻụbọchị nsogbu” (Nahum 1:7).
Nahum 1
Onyenwe anyị dị ike ma dị ebere karịa.
Ozi Nahum bụ ibu amụma maka mbibi nke Nineveh—isi obodo na-eme ihe ike nke alaeze ukwu Asirịa, ndị kposasịrị Izrel ma mebie Judah. Nahum malitere site na-ịkọwa iwe nke Chineke na ike na-enweghi atụ Ya, mana O kwukwara banyere ike na ịdị mma nke Chineke. Lee anya maka amaokwu niile niime isi 1 nke nwere ike ịnyere gị aka ghọta mmaramagwa ọbụla niime ndị a— na mmaramagwa ndị ọzọ nke Chineke nke ị chọpụtara. Gịnị mere i jiri chee na ọ dị mkpa ịmata banyere nke ọbụla na ihe niile ndị a banyere Onyenwe anyị?
Habakuk
Enwere m ike ịtụkwasị obi n’uche nke Onyenwe anyị na nʻoge Ya.
Ọbụna ndị amụma mgbe ụfọdụ na-enwe ajụjụ banyere ụzọ nke Onyenwe anyị. Habakuk, onye biri nʻoge ahụ ajọọ omume na Judah bara ụba, bidoro ndekọihe ya jiri ajụjụ ọ jụrụ Onyenwe anyị (lee Habakkuk 1:1–4). Kedụ otu ị ga-esi achịkọta nchegbu niile nke Habakuk ọnụ? Kedụ ajụjụ ndị yiri nke a ndị mmadụ na-ajụ banyere Chineke taa? Inwewo ụdịrị mmetụta yiri nke a? Inwekwara ike jiri ajụjụ ya niile tụnyere ndị ọzọ dị niime akwụkwọ nsọ niile, ụdị ndị ahụ a na-ahụ niime Mak 4:37–38 and Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 121:1–6.
Onyenwe anyị zaghachiri ajụjụ niile nke Habakuk site na-ikwu na Ọ ga-ezite ndị Chaldea (ndị Babịlọn) iji taa Judah ahụhụ (lee Habakkuk 1:5–11). Mana Habakuk ka nwekwara nchegbu, nihi o yiri ka ozighi ezi na Onyenwe anyị ga-anọrọ nʻakụkụ “mgbe [Babịlọn] dị ọjọọ na-adọkasị ma rie nwoke ahụ karịrị ya nʻezi omume [Judah]” (lee amaokwu ndịa 12–17). Kedụ ihe ị na-achọta niime Habakkuk 2:1–4 nke na-akpali gị ịtụkwasị obi nʻOnyenwe anyị mgbe ị nwere ajụjụ ndị a na-azaghị? (lee kwa Mak 4:39–40; Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 121:7–8; “Chineke Ga-Ebuli Anyị Elu” [vidiyo], Ọba Akwụkwọ Ozi ọma).
God Will Lift Us Up
Isi nke 3 bụ ekpere otuto na okwukwe nke Habakuk. Kedụ otu ụda olu nke Habakuk dị niime isi nke 3 siri dị iche site na isi nke 1? Nke a bụ nchepụta nke nwere ike ịnyere gị aka tụgharịa uche na amaokwu ndịa 17–19: mee ndepụta nke ngọzi niile nke anụ ahụ na nke ime mmụọ Chineke nyerworo gị. Emesịa chee ya nʻuche na ngọzi niile nke anụ ahụ funarịrị gị. Olee otu nke a ji emetụta gị banyere ngọzi ndị ọzọ? Gịnị mere o nwere ike i ji raa gị ahụ “ị n̄ụrị niime Onyenwe anyị” (amaokwu 18) nʻoge ihe isiike dị ka ndị ahụ akọwara niime amaokwu 17? Tụgharịa uche otu inwere ike iji hiwe nnukwu okwukwe na Chineke, ọbụna mgbe ndụ yiri ka ozighi ezi.
Lee kwa Gerrit W. Gong, “Ihe nille Maka Ọdịmma Anyị,” Liahona, Me 2024, 41–44; “Duo, Ihè di Ebere,” Abụ, no. 97; Isiokwu niile na Ajụjụ niile, “Ịchọ Ọsịsa maka Ajụjụ niile,” Ọba akwụkwọ Ozi ọma.
Nwee ndidi. Mgbe ụfọdụ anyị chọrọ ọsịsa nye ajụjụ anyị ugbu a, mana nghọta nke ime mmụọ na-ewe oge ma anaghị amanye amanye. Dị ka Onyenwe anyị gwara Habakkuk, “Chere maka ya nihi ọ ghaghị ịbịa” (Habakkuk 2:3).
Zephaniah
“Chọọnụ Onyenwe anyị, unu niile bụ ndị dị umeala nʻụwa.”
Dị ka ị na-agụ amụma niile nke Zephaniah, hụba ama agwa niile na omume niile nke dubara na mbibi—lee kacha nke Zephaniah 1:4–6, 12; 2:8, 10, 15; 3:1–4. Emesịa lee anya maka njirimara ndị mmadụ nke Chineke ga-echekwa—lee Zephaniah 2:1–3; 3:12–13, 18–19. Kedụ ozi ndị ịchere na Onyenwe anyị nwere maka gị niime amaokwu niile ndịa?
Zephaniah 3:14–20
Onyenwe anyị ga-an̄ụrị ọn̄ụ Ya na ndị Ya na Zayọn.
Mgbe ịgụsịrị Zephaniah 3:14–20, lee ọtụtụ ụzọ inwere ike iji mejupụta ahiriokwu nke a: “Nwee obi ụtọ ma n̄ụrịa ọnụ jiri obi niile: nihi na … Gịnị mere o jiri dị mkpa nye gị ịmata banyere ihe kpatara eji ejì ihe ndị a an̄ụrị ọn̄ụ? Ịnwere ike jiri amaokwu ndịa tụnyere nhụmihe ahụ akọwara niime 3 Nifaị 17 ma tugharịa uche otu Jizọs Kraịst si eche maka ndị Ya—gụnyere gị.
Maka nchepụta ndị ọzọ, lee mbipụta niile nke ọnwa nke a nke Liahona na magazin niile Maka Ume nke Ndị Ntoroọbịa .
Nchepụta niile maka Ikuziri Ụmụntakịrị
Maịka 5:2
Jizọs Kraịst ka-amụrụ na Bethlehem.
-
Ụmụ gị nwere ike gaghị ama na ọ bụ amụma nke Maịka bụ nke nyeere ndị Amamiihe ahụ aka ịchọta nwa ọhụrụ Jizọs na Bethlehem. Nʻijiri Maịka 5:2 na Matiu 2:1–6, ikekwe ụmụ gị nwere ike mee ejije nhụmihe ha. Emesịa ịnwere ike kwuo banyere ihe kpatara ọmụmụ Jizọs ji dịrị oke mkpa nke mere ndị amụma maara maka ya ọtụtụ afọ tupu a mụọ Ya.
A Mụwo Nwa ahụ Dị nsọ, site nʻaka Dana Wood
Nahum 1:7
“Onyenwe anyị dị mma, ebe mgbaba siri ike nʻụbọchị nsogbu”
-
Mgbe ịgụsịrị Nahum 1:7, gị na ụmu gị nwere ike wuo ma ọ bụ see ihe osise dị mfe nke “ebe mgbaba siri ike” ma ọ bụ ebe ewusiri ike (enwere otu foto nke otù na ndepụta nke a). Gịnị bụ ụfọdụ ihe ndị na-akpata ndị mmadụ ji enwe mkpa ebe ewusiri ike? Gịnị na-eme ụbọchị anyị “ụbọchị nke nsogbu”? Kedụ otu Jizọs Kraịst ji dị ka ebe mgbaba nye anyị?
Habakuk 2:3
Chineke ga-emezuriri nkwa Ya niile mgbe niile.
-
Iji dubata Habakuk, gị na ụmụ gị nwere ike kwuo banyere ihe ndị dị mma mana naanị mgbe anyị cheretụrụ—dị ka mkpụrụ osisi nke kwesịrị ịcha acha ma ọ bụ achịcha a ga-amị nʻọkụ. Gịnị ga-eme ma anyị nwaa ịta mkpụrụ osisi ma ọ bụ achịcha ahụ mgbe ha na-adịbeghi njikere. Mgbe ahụ inwere ike ikwu banyere onye amụma Habakuk, onye choburu ịmata mgbe Onyenwe anyị ga-akwụsị ajọọ omume dị niime ụwa. Gụọ nzaghachi Onyenwe anyị niime Habakuk 2: 3. I nwere ike nyere ụmụ gị aka chee maka ihe ndị Chineke kwere na nkwa. Jiri ọmụmatụ nke ọ bụla, unu nwere ike ikwukọta ọnụ, “Chere maka ya; niihi na ọ ga-abịarịrị.”
Habakkuk 2:14
E nwere m ike imejuputa ụwa nʻọmụma ihe nke Jizọs Kraịst.
-
Iji kọwaa Habakuk 2:14, gị na ụmụ gị nwere ike wujuo otu ite ma ọ bụ ihe ọzọ jiri foto na okwu na-anọchite ihe ndị Jizọs mere ma ọ bụ kuzie. Kedụ otu anyị nwere ike iji nyee aka mejuputa ụwa nʻọmụma ihe nke Onyenwe anyị?
-
Ịnwekwara ike gosi ụmụ gị otu maapụ nke ụwa (lee Maapụ ndị nke Agụgụala Nzụkọ nsọ, no. 7, “Maapụ nke Ụwa”). Nyere ha aka chọta ebe ha bi na ebe ndị mgbasa ozi ọma ha ma jeworo ozi. I nwekwara ike gụkọta ọnụ otu egwu banyere ikesa ozi ọma, dị ka “Anyị Ga-ewetere Ụwa Eziokwu Ya” (Akwụkwọ Ukwe Ụmụntakịrị, 172–73). Kedụ ihe anyị nwere ike ịgwa ndị ọzọ gbasara Jizọs Kraist?
Zephaniah 3:14–20
Jizọs Kraịst na-an̄ụrị ọn̄ụ ya na ndị na-esoro Ya.
-
Na Zephaniah 3:14–20, ụmụ gị nwere ike chọọ maka otu ihe na-eme ka ha chọọ “ị gụ egwu, … nwee obi ụtọ ma n̄ụrịa ọn̄ụ jiri obi niile.” Ikekwe unu nwere ike bụkọtanụ otu abụ ọn̄ụ ọnụ ma kwuo maka ọn̄ụ ahụ unu na-achọta niime ozi ọma nke Jizọs Kraịst.
Maka echiche ndị ọzọ, lee mbipụta nke ọnwa nke a nke magazin Friend .