Come, Follow Me
Dizemba 14–20. “A Hụwo M Gị Naanya, Ka Onyenwe anyị kwuru”: Malakaị


Dizemba 14–20. ‘“A Hụwo M Gị Naanya, Ka Onyenwe anyị kwuru”: Malakaị,” Bianụ, Soro M—Maka Ebe Obibi na Nzukọ nsọ: Agba Ochie 2026 (2026)

Dizemba 14–20. ‘“A Hụwo M Gị Naanya, Ka Onyenwe anyị kwuru,’” Bịanụ, Soro M: Agba Ochie 2026

akpụrụakpụ nke Jizọs niihu igwe kpakpando juru

Dizemba 14– 20: “A Hụwo M Gị Naanya, Ka Onyenwe anyị kwuru”

Malakaị

“A hụwo m gị naanya,” ka Onyenwe anyị gwara ndị Ya site nʻọnụ onye amụma Malakaị. Mana ndị Izrel, ndị tara ahụhụ mkpagbu na ndọkpụ n’agha nke gafere ọtụtụ ndudugandu, jụrụ, “Nʻebe ka ị hụworo anyị naanya?” (Malakaị 1:2). Niihi ihe nile ndị Izrel gabigara, ha nwere ike na-eche ma agụgụala ha ọ bụ nʻezie akụkọ nke ịhụnanya Chineke nwere n’ebe ndị ọgbụgba ndụ Ya nọ. N’ụzọ ụfọdụ, ọ na-adị mfe ịhụ ya dị ka akụkọ adịghị ike na nnupụisi nke mmadụ. Otu ọ dị n’ime ihe niile, Chineke akwụsịghị ma ọlị isetịpụ aka ịhụnanya. Mgbe ụmụ Jekọb megburu nwanne ha Josef, Onyenwe anyị ka napụtakwara ha site n’ụnwụ (lee Jenesis 45:4–8). Mgbe Israel tamuru ntamu n’ime alaịkpa, O were mana nye ha nri (lee Ọpụpụ 16:1–4). Ọbụlagodi mgbe Israel chigharịrị gakwuru chi ndị ọzọ ma agbasasịa ha, Chineke kwere nkwa na ọbụrụ na ha chegharịa, na Ya ga-achịkọta ma gbapụta ha “na nnukwu obi ebere” (lee Aịzaya 54:7). N’ezie, Agba Ochie bụ akụkọ nke ndidi na ịhụnanya na-adịgide adịgide nke Chineke. Akụkọ nke a na-agakwa n’ihu taa. Jizọs Kraịst, “Anyanwụ ahụ nke Ezi omume,” dị ka Malakaị kpọrọ Ya, abịawo “jiri ọgwụgwọ ọrịa na nku Ya” (Malakaị 4:2). Ọ bụ ihe akaebe kachasị na-egosi ịhụnanya Chineke nwere n’ebe Izrel oge ochie nọ nakwa n’ebe anyị nile nọ.

Maka nchikọta nke akwụkwọ nke Malakaị, lee “Malakaị” niime Ọkọwa okwu Baịbụl.

akara ngosi ihe ọmụmụ

Nchepụta niile maka Ọmụmụ ihe N’Ebe Obibi na na Nzukọ nsọ

Malakaị 1–4

“Laghachikwute m ma aga M alaghachikwute unu.”

Nʻụbọchị nke Malakaị, ndị Izrel arụgharịwo rịị tempụl ahụ na Jerusalem, mana dị ka ndị mmadụ, ha ka kwesịrị ịrụgharị mmekọrịta ha na Onyenwe anyị. Dị ka ị na-amụ Malakaị, lee anya maka ajụjụ ndị Onyenwe anyị jụrụ ndị Izrel ma ọ bụ nke ha jụrụ Ya. Tụlee ịjụ onwe gị ụdị ajụjụ yiri ndị ahụ (ụfọdụ ọmụmatụ ka atụrụ arọ ha nʻokpuru) iji nyere gị aka nyochaa mmekọrịta gị na Onyenwe anyị ma bịaruo Ya nso.

  • Kedụ otu m siworo nwete mmetụta ịhụnaanya nke Onyenwe anyị maka m? (lee Malakaị 1:2).

  • Onyinye m niile nye Onyenwe anyị, ha na-akwanyere Ya nnukwu ugwu nʻezie? (lee Malakaị 1:6–11)

  • Kedụ ụzọ ndị m kwesịrị iji “laghachikwute” Onyenwe anyị? (lee Malakaị 3:7).

  • Ana m ezu Chineke ohi nʻụzọ ọ bụla? (lee Malakaị 3:8–11).

  • Kedụ otu agwa m nʻoge ihe isiike ji egosipụta mmetụta m nwere nʻebe Onyenwe anyị nọ? (lee Malakaị 3:13–15; lee kwa 2:17).

Malakaị 1:6–14

Onyenwe anyị na-achọ “onyinye na-enweghi ntụpọ.”

Dị ka ị na-agụ banyere onyinye akọwara niime Malakaị 1, gịnị ka ị na-achọpụta banyere aja niile ndị nchụaja na-achụ? Kedụ aro aja ndị a na-atu banyere mmetụta niile ndị nchụaja nwere nʻebe Onyenwe anyị nọ? (lee Malakaị 1:13). Tulee ime ndepụta nke onyinye niile, ma ọ bụ aja niile, nke ị na-eme nye Onyenwe anyị. Maka nke ọbụla nọ niime ndepụta ahụ, chee ihe nwere ike ịmee ka ọ bụrụ onyinye “emerụrụ emerụ” ma ọ bụ onyinye “enweghi ntụpọ” (Malakaị 1:7, 11).

Malakaị 3:8–12

akara ngosi semịnarị
Onyenwe anyị ga-emeghe ọnụ mpio nke eluigwe dị ka m na-egosi okwukwe m site na-ịkwụ otu ụzọ n’ụzọ iri.

Cheegodi na ịnwere otu enyi onye chọpụtara ugbu a na ị na-akwụ otu ụzọ n’ụzọ iri. Gịni kpatara iji eme nke ahụ?” enyi gị ajụọ. Chee maka nke a dị ka ị na-agụ Malakaị 3:8–12. Kedụ ihe ị na-achọta niime ebe ahụ nwere ike inyere gị aka zaa ajụjụ enyi gị? Kedụ ihe ọzọ ị ga-achọ ka enyi gị ghọta banyere otu ụzọ n’ụzọ iri. Maka enyemaka ndị ọzọ, inwere ike chọọ ozi nke Okenye Neil L. Anderson “Otu ụzọ n’ụzọ iri: Na-emepe Ọnụ mpio nke Eluigwe” (Liahona, Nov. 2023, 32–35), na-achọ ọsịsa maka ajụjụ ndị dị otu a:

  • Gịnị kpatara Onyenwe anyị ji chọọ ka anyị kwụọ otu ụzọ n’ụzọ iri?

  • Kedụ ihe nwere ike ime mmadụ aghara ịkwụ otu ụzọ n’ụzọ iri, ma kedụ otu anyi nwere ike iji megide ihe mgbochi ndịa?

  • Kedụ otu ịkwụ otu ụzọ n’ụzọ iri si agba okwukwe gị na Nna nke Eluigwe na Jizọs Kraịst ume?

I nwekwara ike kesara enyi gị otu Onyenwe anyị siworo gọzie gị mgbe ịkwụrụ otu ụzọ n’ụzọ iri. Inwere ike chọta nchepụta niime nkeji akpọrọ “Nkuzi Nọmba 1—Ngọzi niile Dị ịrịba ama mana nke Dị Nro” niime Ozi nke Okenye David A. Bednar “Ọnụ mpio niile nke Eluigwe” (Liahona, Nov. 2013, 17–18). Kedụ ụdị mmadụ anyi na-abụ site na-ịkwụ otu ụzọ n’ụzọ iri?

Gịnị ka i chere nkebiokwu nke a “mepere gị ọnụ mpio niile nke eluigwe” dị niime (amaokwu 10) pụtara? Ikekwe ịnwere ike siri na ọnụ mpio lepu anya wee chee banyere ebumnuuche nke ọnụ mpio niile. Gịni kpatara “ọnụ mpio niile nke eluigwe” jiri bụrụ ụzọ dị mma iji kọwaa otu Onyenwe anyị ji agọzi anyị mgbe anyị kwụrụ otu ụzọ n’ụzọ iri?

Jizọs pụtakwuru Josef Smith niime Tempụl  Kirtland

Ọhụ niime Tempụl Kirtland site n’aka Gary Smith

Tulee Malakaị 4:5–6

“A ga m ezita Elijah Onye Amụma.”

Mgbe Moronaị n̄omiri Malachi 4:5–6 nye Josef Smith, ọ mere otu ahụ “nʻụzọ dịtụ iche site nʻotu esi agụ ya” niime Baịbụl (lee Joseph Smith—Agụgụala 1:36–39). Gịnị ka ndịiche nke Moronaị na-agbakwunye na nghọta gị maka amụma nke a? Karịsịa, tụgharịa uche n’ajụjụ ndị dị ka ndị a:

  • Kedụ ndị bụ “ndị nna”? (lee Ditronomị 29:13) Kedụ nkwa ndị ekwere ha? (lee Ebreham 2:9–11). Olee otu i si enye aka emezu nkwa ndị a?

  • Kedụ nhụmiihe ndị nyewooro gị aka chigharịa obi gị nye ndị nna nna gị? Gịnị mere nke ahụ jiri dị oke mkpa nye atụmatụ nke Nna nke Eluigwe?

Iji mụtakwuo ihe ndị ọzọ banyere ọbịbịa Elijah na otu eji na-emezu amụma ndịa taa, lee Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 110:13–16 na D. Todd Christofferson, “Ike Nrachị Ahụ” (Liahona, Nov. 2023, 19–22). Gịnị mere i jiri nwee obi ekele na Elijah abịawo?

Lee kwa Gerrit W. Gong, “Anyị niile Nwere otu Akụkọ,” Liahona, Me 2022, 43–46; “Chigharịa Obị Unu,” Abụ, no. 291; “Ike Nrachị Ahụ” (vidiyo), ChurchofJesusChrist.org.

3:38

The Sealing Power

Maka nchepụta ndị ọzọ, lee mbipụta niile nke ọnwa nke a nke Liahona na magazin niile Maka Ume nke Ndị Ntoroọbịa .

akara ngosi nkeji ụmụntakịrị

Nchepụta niile maka Ikuziri Ụmụntakịrị

Malakaị 1:2

Onyenwe anyị hụrụ m naanya.

  • Kedụ otu gị na ụmụ gị nwere iji zaa ajụjụ ahụ dị niime Malachi 1:2—”Nʻebe ka ị hụworo anyị naanya?” Kesaara onye n’ibe ya ihe kpatara unu ji mara na Ọ hụrụ unu naanya? Ikekwe ụmụ gị nwere ike see ihe osise ndị na-echetara ha maka ịhụnaanya Ya.

Mee ka ụmuaka sonye na mkparịta ụka ozi ọma. Ọ bụrụ na ị na-akụziri ụmụaka dị obere, ịnwere ike chee maka ụzọ ekeereuche niile iji mee ka ha sonye niime mkparịta ụka nke ozi ọma. Na-ịmatụ, ụmụ gị nwere ike nyefee ibe ha otu bọọlụ; mgbe ha ji bọọlụ ahụ, ha nwere ike kesaa otu ihe kpatara ha jiri mara na Jizọs hụrụ ha naanya.

ndị nne na nna na otu nwata nwoke na-elepụ anya site nʻọnụ mpio

Malakaị 3:8–12

Onyenwe anyị ga-agọzi m dị ka m na-akwụ otu ụzọ n’ụzọ iri.

  • Olee otu i nwere ike isi nyere ụmụ gị aka mụta banyere ịkwụ otu ụzọ n’ụzọ iri? Ịnwere ike gwa ha ka ha gụpụta mpanaka ntakịrị ruru 10, ụdị dị ka mkpụrụego dị na ihu akwụkwọ ihe omume nke izu ụka nke a. Emesịa ha nwere ike kewapụta otu n’ime ihe mpanaka ndị ahụ site na ndị ọzọ—nke a ka anyi na-enye Onyenwe anyị dị ka otu uzọ n’uzọ iri. Dị ka Malakaị 3:8–12dere, gịnị kpatara Onyenwe anyị ji chọọ ka anyị kwụọ otu ụzọ n’ụzọ iri? (lee kwa “Malakaị Onye amụma” niime Akụkọ niile Nke Agba Ochie, 171–72; “Ihe Mbụ Ga-abụ Nke Mbụ!” [vidiyo], Ọba akwụkwọ Ozi ọma).

    0:58

    Malachi the Prophet

    1:18

    First Things First!

  • Dị ka ụnụ na-agụkọta Malakaị 3:10 ọnụ, ị nwere ike kpọkuo ụmụ gị iguzo nʻakụkụ otu ọnụ mpio mgbe ahụ ị na-agụ nkebiokwu ahụ “ọnụ mpio niile nke eluigwe.” Ma ọ bụ ịnwere ike wụnye mmiri niime otu iko tutu ya ejubiga okè iji gosi nkebiokwu ahụ na “a gaghị enwe ime ụlọ zuru ezu ịnara ya.” Gwa ụmụaka ahụ banyere ngọzi niile Chineke nyeworo gị dị ka ị na-akwụ otu ụzọ n’ụzọ iri. Ikekwe ụmụ gị nwere ike see ihe osise ndị na-anọchite ngọzi ndị a ma kobe ha na nʻelu ma ọ bụ nʻakụkụ ọnụ mpio nke ebe obibi gị.

Malakaị 4:5–6

Elijah bịara ichigharị obi anyị nʻebe ndị ezi na ụlo anyị nọ.

  • Na Malakaị 4:5–6, ụmụ gị nwere ike lee anya maka ọsịsa niile maka ajụjụ ndịa na-esote banyere amụma nke Malakaị: Onye ka Onyenwe anyị kwere nkwa izite? Kedụ mgbe O kwuru nʻonye nke a ga-abịa? Gịnị ka Onyenwe anyị kwuru nʻonye nke a ga-eme? Gịnị kpatara o jiri dịrị mkpa onye nke a ịbịa? Ebe ka emezuru amụma nke a? (lee Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 110:13–16).

  • Iji chọta otù nkwa ahụ dị niime Malakaị 4:5 jiri mezuo, ịnwekwara ike nyochagharịa “Josef na Oliver Natara Ntụghe niile nke Ọkwa nchụaja” niime Akụkọ niile nke Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile, 26–30. Egwu dị ka “Obi nke Ụmụntakịrị,” (Akwụkwọ Ukwe Ụmụntakịrị, 92) nwere ike inyere ụmụ gị aka mụta ihe kpatara o jiri dị oke mkpa na Elijah bịara. Inwekwara ike jee na FamilySearch.org/discovery, na FamilySearch Tree app, ma ọbụ My Family booklet maka egwuruegwu ndị nwere ike nyere gị na ụmụ gị aka chigharịa obi ha nʻebe ndị nna nna ha nọ.

Maka echiche ndị ọzọ, lee mbipụta nke ọnwa nke a nke magazin Friend .

otu nwanyị na-efegharị hankachif ọcha

Hosanna nke Ịkwa ozu, site nʻaka Rose Datoc Dall. Otu nwanyị akpọrọ Ịkwa ozu guzoro nʻụwa ndị mmụọ, ndị nna nna ya agbaa ya gburugburu. Ọ na-an̄ụri ọn̄ụ nihi nnapụta ha site na ndọkpụ n’agha nke ime mmụọ.

Ihu akwụkwọ ihe omume Prịamarị: Onyenwe anyị na-agọzi m dị ka m na-akwụ otu ụzọ n’ụzọ iri