Come, Follow Me
Dizemba 21–27. “Anyị Echerewo Ya, ma Ọ Ga-azọpụta Anyị”: Ekeresimesi


“Dizemba 21–27. ‘Anyị Echerewo Ya, ma Ọ Ga-azọpụta Anyịʻ: Ekeresimesi,” Bianụ, Soro M—Maka Ebe Obibi na Nzukọ nsọ: Agba Ochie 2026 (2026)

“Dizemba 21–27. ʻAnyị Echerewo Ya, Ma Ọ Ga-azọpụta Anyị,ʻ” Bianụ, Soro M: Agba Ochie 2026

nwa ọhụrụ Jizọs na-ehi ụra

N’ihi na Amụworo Anyị otu Nwa, site nʻaka Simon Dewey

Dizemba 21–27: “Anyị Echerewo Ya, ma Ọ Ga-azọpụta Anyị”

Ekeresimesi

Agba Ochie na-ebu mmụọ nke ịtụsi anya ike. N’ụzọ dị otu ahụ, o yiri nnọọ ntakịrị ka oge Ekeresimesi. Malite na Adam na Iv, ndị petrak nke Agba Ochie, ndị amụma, ndị ode abụ, na ndị mmadụ na-atụanya ụbọchị ndị ka mma, jupụtara n’olileanya maka mmegharị ọhụrụ na nnapụta nke Mesaịa ahụ. Ma mgbe niile ka ndị Izrel nwere mkpa maka olile anya ahụ—ma ha nọ na ndọkpụ n’agha na Ijipt ma ọ bụ na Babịlọn ma ọ bụ mmehie na nnupụ isi nke onwe ha jisiri ha aka ike. Site n’ime ihe a nile, ndị amụma chetaara ha na otu Mezaya, bụ Onye Nnapụta, ga-abịa “ịma ọkwa nnwere onwe nye ndị a dọkpuru n’agha” (Aịzaya 61:1).

Olileanya ahụ malitere imezu mgbe a mụrụ Jizọs Kraịst na Betlehem. Onye dị ike Nnapụta nke Israel ka a mụrụ n’ụlọ anụ ma nyuwe ya n’ụlọ anụ ụlọ (lee Luk 2:7). Ma Ọ bụghị naanị Onye Nnapụta nke ndị Izrel oge ochie. Ọ bịara ịnapụta unu—iburu iru uju unu, iburu ihe mwute unu, ị bụ onye echipịara echipịa n’ihi ajọọ omume unu, ka ọ ga-abụ site na ubiri ụtali Ya unu nwere ike nata ọgwụgwọ (lee Aịzaya 53:4–5). Nke a bụ ihe mere Ekeresimesi ji jupụta na atụmanya ọn̄ụ ọbụna taa. Mezaya ahụ bịara ihe karịrị afọ 2,000 gara aga, Ọ na-anọgidekwa na-abata na ndụ anyị mgbe ọ bụla anyị na-achọ Ya.

akara ngosi ihe ọmụmụ

Nchepụta niile maka Ọmụmụ ihe N’Ebe Obibi na na Nzukọ nsọ

akara ngosi semịnarị
A na m an̄ụrị ọn̄ụ niime Onye Mgbapụta m.

Ekeresimesi ka ama dị ka oge ọn̄ụ niihi ọn̄ụ nke Jizọs Kraịst na-ewete nʻụwa. Ọtụtụ narị afọ tupu amụọ Onye Nzọpụta, ndị amụma Agba Ochie nwere mmetụta ọn̄ụ dị ka ha na-ekwu maka Mezaya ahụ na-abịa. Gụọ ufọdụ ederede ndịa na-esote, ma chee banyere ihe kpatara ha ga-eji abụ ihe di oke ọnụ ahịa nye ndị mmadụ ndị tụrụanya maka ozi nke Onye Nzọpụta: Abụ ọma 35:9; Aịzaya 25:8–9; 44:21–24; 51:11; Zephaniah 3:14–20; Mozis 5:5–11. Gịnị mere ederede ndịa jịri dị oke ọnụ ahịa nye gị? Kedụ ihe kpatara ederede akwụkwọ nsọ ndịa kwuru iji nwee ọn̄ụ?

Lee kwa Dallin H. Oaks, “Ozi dị mma nke Nnukwu Ọn̄ụ” (Ofufe nro Ekeresimesi nke Otù Ndịisi Mbụ, Dec. 4, 2022), Ọba akwụkwọ Ozi ọma; “Ọn̄ụ nye Ụwa,” Abụ, no 201.

kpakpando na-egbuke egbuke na mbara igwe abalị

Ọdịmara nwere ike ịnyere m aka cheta Jizọs Kraịst.

Ọtụtụ omenala ndị ejiri mara Ekeresimesi nwere ike nwee nkọwa nke ọdịmara nke na-atụrụ anyị aka nʻebe Kraịst nọ. Dị ka ị na-amụ Agba Ochie n’afọ nke a, e nwere ike ịhụwo ọtụtụ ọdịmara nke Onye Nzọpụta. Ole ma ole ka edepụtara nʻokpuru. Tulee ịmụ ihe ndị a ma na-edepụta ihe ha na-akụziri gị banyere Ya.

  • Kpakpando (Ọnụọgụgụ 24:17; Matiu 2:2; Mkpughe 22:16).

  • Onye ọzụzụ atụrụ (Abụ ọma 23; Luke 15:4–7; Jọn 10:11)

  • Nwa atụrụ (Jenesis 22:8; Ọpụpụ 2:5; 1 Pita 1:18–20).

  • Mmiri (Ọpụpụ 17:1–6; Jeremaya 2:13; Izikiel 47 :1–12; Jọn 4:7–14).

  • Nkume (1 Samuel 2:2; 2 Samuel 22:2–3; Abụ ọma 118:22–23; Aịzaya 28:16; Ndị Efesọs 2:20).

  • Alaka (Aịzaya 11:1–2; Jeremaya 23:5; 33:15).

  • Ihè (Abụ ọma 27:1; Aịzaya 9:2; 60:19; Maịka 7:8; Jọn 8:12).

Kedụ ọdịmara ndị ọzọ, ederede, na nkọwapụta ndị ịchọtaworo niime akwụkwọ nsọ nke na-agba ama banyere Jizọs Kraịst?

Lee kwa 2 Nifaị 11:4; Mosaia 3:14–15; Mozis 6:63; “Ụdị niile na Ọdịmara niile banyere Kraịst” na “Jizọs Kraịst,” ha abụọ niime Odudu nye Akwụkwọ nsọ niile (Ọbaakwụkwọ Ozi ọma).

“Aha ya ka a ga-akpọ Ịtụnaanya.”

Jizọs Kraịst ka a na-akpọ ọtụtụ aha na etutu aha niile dị iche iche. Lee anya maka etutu aha ndị dị niime amaokwu ndịa na-esote: Abụ ọma 23:1; 83:18; Aịzaya 7:14; 9:6; 12:2; 63:16; Emọs 4:13; Zakaraya 14:16; Mozis 7:53. Kedụ etutu aha ndị ọzọ i nwere ike ichete? O nwere ike masị gị ịdepụta etutu aha niile nke Jizọs Kraịst ndị ị na-achọta niime abụ Ekeresimesi. Kedụ otu etutu aha nke ọbụla si emetụta ụzọ i si na-eche banyere Ya?

Tulee ịhọrọ otu etutu aha ma ọ bụ orụ nke Onye Nzọpụta nke ga-enyere gị aka cheta Ya nʻafọ niile na-abịa abịa.

Lee kwa Quentin L. Cook, “Udo Nke Onwe n’Oge Ndị Ịma Aka,” Liahona, Nov. 2021, 89–92; “Nụrụ! Ndị Mmụọ ozi nke Chineke Na-abụ abụ,” Abụ niile, no. 209.

Maka nchepụta ndị ọzọ, lee mbipụta niile nke ọnwa nke a nke Liahona na magazin niile Maka Ume nke Ndị Ntoroọbịa .

akara ngosi nkeji ụmụntakịrị

Nchepụta niile maka Ikuziri Ụmụntakịrị

Agba Ochie na-akuziri m banyere Jizọs Kraịst karịa.

  • Gị na ụmụ gị nwere ike nwee ụfọdụ ihe ịchọ mma nke Ekeresimesi nke unu nwere ike iji malite mkparịta ụka banyere Jizọs Kraịst. Ikekwe unu nwere ike ikwu maka otù kpakpando ekeresimesi, ihè niile, ma ọ bụ otu onyinye si echetara anyị banyere Onye Nzọpụta. Mgbe ahụ, unu nwere ike leba anya n’ime otu ma ọ bụ karịa nke akwụkwọ nsọ ndị na-esote nke nwere ike ịbụ ọdịmara nke Jizọs Kraịst: Jenesis 22:8; Ọnụọgụgụ 24:17; Abụ ọma 23:1; 27:1. Ma eleghị anya, ụmụ gị nwere ike ijide otu foto ma ọ bụ ihe ịchọ mma nke na-agakọ ya na amaokwu nke ọ bụla dị ka ha na-agụ ya. Kedụ otu Jizọs jiri dịrị ka nwa atụrụ, kpakpando, onye ọzụzụ atụrụ, ma ọ bụ ihè? Tulee ikwekọta otu egwu Ekeresimesi ọnụ dị ka “Kpakpando Na-Egbuke egbuke” (Akwụkwọ Ukwe Ụmụntakịrị, 37).

  • Ụmụ gị nwekwara ike lee anya na foto nke nọ na ngwụcha nke ndepụta nke a dị ka ị na-agụ Aịzaya 9:6 nye ha. Gwa ụmụ gị ka ha tụọ aka na nwa ọhụrụ Jizọs mgbe ha nụrụ nkebiokwu ahụ “amụrụ otu nwa.” Kesaa ama gị na ndị amụma nọ nʻAgba Ochie maara na a ga-amụ Jizọs.

  • Dị ka ị na-akwado ịmụ ndụ nke Jizọs Kraịst na Agba Ọhụrụ nʻafọ na-abịa abịa, tulee inyochagharị gị na ụmụ gị ihe ha mụtaworo banyere Ya nʻafọ nke a niime Agba Ochie. Ịnwere ike nyocha ndepụta ndị no niime akụrụngwa nke a na ihe ndị idepụtara site nʻọmụmụ ihe nke onwe ọbụla iji nyere gi aka cheta ihe ịmụworo. Ndị ụmụaka dịtụ obere nwere ike nwete uru site na-ileba anya na Akụkọ niile nke Agba Ochie ma ọ bụ foto ndị dị niime Bịanụ, Soro M. Kedụ amụma ma ọ bụ akụkọ ndị pụtara ihe nke ọma? Kedụ ihe anyị mụtara banyere Onye Nzọpụta?

Omenala niile nke Ekeresimesi nwere ike ịtụ aka na Jizọs Kraist.

  • Ezi na ụlọ ndị Izrel nweburu omenala, ụdị dị ka Emume ngabiga na erimeri ndị ọzọ, nke ebumnuche ha bụ ịtụkwasị obi na uche ha nʻebe Onyenwe anyị nọ (lee Ọpụpụ 12). Kedụ omenala gị na ụmụ gị nwere nʻoge Ekeresimesi nke na-enyere unu aka lekwasị anya na Jizọs Kraịst? Kedụ omenala ndị ị maara banyere ha site na agụgụala ezi na ụlọ unu? Ị nwere ike tulee gị na ụmụ gị ịkparịta ụka banyere ụfọdụ omenala unu ga-achọ ibido. Ụfọdụ nchepụta gụnyere ijere onye nọ na mkpa ozi, ịhọro otu ihe ị ga-enye Onye Nzọpụta dị ka “onyinye”, ikpoku otu enyi isoro gị kirie ofufe nro Ekeresimesi nke Otù Ndịisi Mbụ (broadcasts.ChurchofJesusChrist.org), ịde egwu Ekeresimesi nke gị, ma ọ bụ ịchọta otu ụzọ ekeereuche iji kesaa ozi banyere ọmụmụ Kraịst.

N’ebe obibi, ịmụ ihe na ibi ndụ enweghị nkewapụ. Ozi ọma na-ewere oge dị mkpa ozugbo n’ebe obibi. Ebe ahụ ndị gị na ha na-amụ ozi ọma bụ ndị gị na ha ga-ebi ndụ ya—ụbọchị niile. N’ezie, ọtụtụ oge, ibi ndụ ozi ọma bụ otu anyị si amụta ozi ọma ahụ Ya mere dị ka ị na-amụta ma na-akuzi ozi ọma na-ebe obibi, chọọ ụzọ ndị ị ga-eji jikọta ọnụ ịhe unu na-amụta ya na ihe unu na-eme. Nʻebe obibi gị, kwe ka ozi ọma bụrụ ihe ị na-agbalịsike ibi, na-abụghi naanị ihe ị na-ekwu maka ya (Ikuzi ihe n’Ụzọ nke Ọnye Nzọpụta31).

Ebe ahụ anya a mụrụ ya

Ngosipụta Ebe ahụ amụrụ ya, site n’aka Ethan Brown

Nna nke Eluigwe nyere m onyinye nke Ọkpara Ya ịbụ Onye Nzọpụta m.

  • Kedụ otu i nwere ike i si nyere ụmụ gị aka nwee nsọpụrụ na ọn̄ụ nke ọmụmụ nke Kraịst? I nwekwara ike lee vidiyo ahụ “Kraịst ahụ dị ka Nwata” (Ọba akwụkwọ Ozi ọma) ma ọ bụ gụkọta ọnụ Matiu 1:18–25; 2:1–12; Luk 1:26–38; 2:1–20. Nwata ọbụla nwere ike họrọ otu onye site na vidiyo ahụ ma ọ bụ nkọwapụta nke akwụkwọ nsọ ma kesaa otu onye ahụ si nwee mmetụta nʻebe Onye Nzọpụta nọ. Emesịa unu nwere ike kesaara ibe unu mmetụta unu banyere Ya.

    17:57

    The Christ Child

  • Ikekwe gị na ụmụ gị nwere ike kwuo banyere onyinye ndị ịnyeworo ma ọbụ nke ịnataworo kemgbe afọ gara aga nke wetere gị ọn̄ụ. Emesịa unu nwere ike gụkọọ Aịzaya 25:9 ọnụ ma kwuo okwu banyere ihe kpatara iji an̄ụrị ọn̄ụ nihi Nna nke Eluigwe ziteere anyị Onye Nzọpụta. Iji nyere ụmụ gị aka ghọta nke ọma ọrụ Jizọs Kraịst dị ka Onye Nzọpụta anyị, kpọkuo ha ị gụ Aịzaya 25:8–9; 53:3–5; na Hosea 13:14. Gịnị ka amaokwu ndị a na-akuziri anyị banyere otu Onyenwe anyị si azọpụta anyị?

  • Unu nwekwara ike kwekọrịta ukwe Ekeresimesi ọnụ, ụdị dị ka “Away in a Manger” (Akwụkwọ Ukwe nke Ụmụntakịrị, 42–43) ma ọ bụ “O Obere Obodo nke Bethlehem” (Abụ, no. 208). Nyere ụmụ gị aka chọta nkebiokwu ndị dị niime egwu ahụ nke na-enyere ha aka mata na Nna nke Eluigwe na Jizọs Kraịst hụrụ ha naanya.

Maka echiche ndị ọzọ, lee mbipụta nke ọnwa nke a nke magazin Friend .

Ebe ahụ ana ahụ anya a mụrụ ya

Ebe Ahụ A Mụrụ Ya, site n’aka N. C. Wyeth

Ihu akwụkwọ ihe omume Prịamarị: Agba Ochie na-akuziri m banyere Jizọs Kraịst