Dizemba 7–13. ‘Ịdị nsọ nye Onyenwe anyị’: Haggai 1–2; Zakaraya 1–4; 7–14,’ Bịanụ, Soro M—Maka Ebe Obibi na Nzukọ nsọ: Agba Ochie 2026 (2026)
Dizemba 7–13. ‘Ịdị nsọ nye Onyenwe anyị,’” Bịanụ, Soro M: Agba Ochie 2026
Laie Hawaii Tempụl
Dizemba 7– 13: “Ịdị nsọ nye Onyenwe anyị”
Haggai 1–2; Zakaraya 1–4; 7–14
Mgbe ọtụtụ iri afọ nke ndọkpu n’agha gasịrị, e kwere ka otu igwè ndị Izrel, ikekwe gụnyere ndị amụma Hagaị na Zekaraịa, ka ekwere ka ha laghachi Jerusalem. Ụfọdụ ndị nọ n’igwè a chetara otu tempụl ahụ dị tupu e bibie ya. Nye ndị ahụ nọ na-eche ma ọ ga-adịkwa ka ụlọ Onyenwe anyị ọzọ “n’ebube mbụ ya” (Haggai 2:3), Hagaị kwuru okwu mgbamume nke Onyenwe anyị: “Dịnụ ike, unu ndị ala ahụ niile, ka Onyenwe anyị kwuru, ma rụọ ọrụ: n’ihi na m nọnyeere unu, … unu atụla egwu.” “M ga-emejukwa ụlọ nke a n’ebube,… ma n’ebe a ka m ga-enye udo” (Haggai 2:4–5, 7, 9).
Mana ọ bụghị naanị tempụl ahụ dị nsọ ka ọ dị mkpa ka e wugharịa. N’ọtụtụ ụzọ, e bibiri ndị Chineke n’ụzọ ime mmụọ. Ma iwuzigharị ndị dị nsọ na-ewe ihe karịrị igbuwa nkume na idebe ha n’ọnọdụ iji wuo ụlọ nsọ. Ọ pụtara na nkanye “Ịdị Nsọ nye Onyenwe Anyị” ka ahaghị ịkanye ọ bụghị nanị n’elu mgbidi nke tempụl, ma ọ bụ ọbụna n’elu “mgbịrịgba nke ịnyịnya niile” na “ite ọ bụla dị na Jeruselem” (Zakaraya 14:20–21). A ga-akanyekwa ha n’obi ọ bụla.
Maka nchikọta nke akwụkwọ nke Haggai na Zakaraya, lee “Haggai” na “Zakaraya” niime Ọkọwa okwu Baịbụl.
Nchepụta niile maka Ọmụmụ ihe N’Ebe Obibi na na Nzukọ nsọ
Haggai 2; 2: 1–9
“Tulee ụzọ gị niile.”
E nwere ọtụtụ ihe dị mkpa a ga-eme iji wugharịa Jeruselem. Ma mgbe ihe dị ka afọ 15 gafeworo kemgbe ụmụ Israel lọghachiri, obi adịghị Onyenwe anyị mma na ejighị mwugharị tempụl ahụ kpọrọ ihe kacha mkpa (lee Haggai 1:2–5; lee kwa Ezra 4:24). Dị ka ị na-agụ Haggai 1; 2:1–9, tụlee ajụjụ ndị dị ka ndị a:
-
Kedụ nsonazụ niile ndị Izrel zutere niihi ha a arụchabeghi tempụl ahụ?
-
Olee ngọzi ndị Onyenwe anyị kwere ha nkwa ma ha wuchaa ụlọ Ya?
-
Gịnị bụ ozi nke Onyenwe anyị nyere gị na Haggai 1:5–7? Kedụ ka ị ga-esi mee ka ebumnuuche gị niile na-adaba adaba na nke Onyenwe anyị? Olee mgbe a gọziri gị niihi na iji Chineke kporo ihu na ndụ gị?
Ndị nsọ Ụbọchị Ikpeazụ ahụ zutere ọnọdụ ahụ yiri ka nke ndị Israel n’ụbọchị Hagaị (lee Doctrine and Covenants 95). Gịnị ka ị mụtara site n’ihe atụ abụọ ndị a gbasara mmetụta Onyenwe anyị na-enwe banyere tempụl?
Lee kwa Dale G. Renlund, “Jizọs Kraịst Bụ Akụ ahụ,” Liahona, Nov. 2023, 96–99; Terence M. Vinson, “Ezi Ndị Na-eso Ụzọ nke Onye Nzọpụta,” Liahona, Nov. 2019, 9–11; “Anyị Hụrụ Ụlọ Gị Naanya, O Chineke,” Abụ, no. 247; “Arụsiwo Provo City Center Temple” (vidiyo), ChurchofJesusChrist.org.
Provo City Center Temple Completed
Zakaraya 1–3; 7–8; 14
Onyenwe anyị pụrụ ịme ka m dị nsọ.
Nʻuche nke gị, kedụ uru ọ bara inwe “ịdị nsọ nye Onyenwe anyị” akanyere nʻelu mpanaka ụbọchị niile dị ka ndị ahụ akpọrọ aha na Zakaraya 14:20? (lee kwa Ọpụpụ 28:36–38). Kedụ uru ọ bara inwe ya akanyere nʻelu tempụl niile taa? Kedụ ihe nkebiokwu nke a pụtara nye gị? Olee otu i nwere ike i si mee ka ịdị nsọ bụrụ akụkụ nke ndụ gị kwa ụbọchị? Tụgharịa uche nʻajụjụ ndịa dị ka ị na-agụ ọkpụkpọ okù nke Onyenwe anyị nye ndị Ya ịji bụrụ ndị dị nsọ karịa Zakaraya 1:1–6; 3:1–7; 7:8–10; 8:16–17.
Ịnwekwara ike ịgụ Zakaraya 2:10–11; 8:1–8; 14:9–11, 20–21 iji mụta otu ndụ ga-adị ka ya nʻụbọchị ọdịniihu mgbe anyị niile ga-ebinyere Onyenwe anyị nʻọnọdụ ịdị nsọ. Kedụ ihe na-enye gị obi ụtọ banyere ọhụ nke Zakaraya maka ọdịniihu nke Jerusalem? Kedụ ihe ị na-achọta ebe a nke ị ga-achọ ịhụ na ogbe gị? Kedụ otu inwere ike iji kwadoo maka ibi niime ọnọdụ niile nke Zakaraya kọwaara?
“Lee, Eze gị na-abịakwute gị; onye ikpe ziri ezi, na onye nwere nzọpụta ka ọ bụ; onye ewedara ala, ma na-anọkwasị kwa nʻelu ịnyịnya ibu” (Zakaraya 9:9). Mbata nke Mmeri, site n’aka Harry Anderson
Zakaraya 9:9–11; 11:12–13; 12:10; 13:6–7; 14:1–9
Jizọs Kraịst bụ Mezaya ahụ ekwere na nkwa.
Ọtụtụ odide nke Zakaraya na-atụ aka ma nʻije ozi Jizọs Kraịst nʻelu ụwa ma Ọbịbịa nke Ugboro Abụọ Ya ga-emerịrị. Nʻokpuru bụ ụfọdụ amụma ndị nke Zakaraya, gụnyere akwụkwọ nsọ banyere mmezu ha. Dị ka ị na-amụ ederede ndịa, jụọ onwe gị: Gịnị ka nke a na-akụziri m banyere Onye Nzọpụta?
-
Zakaraya 9:9–11 (lee Matiu 21:1–11; 1 Pita 3:18–19)
-
Zakaraya 11:12–13 (lee Matiu 26:14–16; 27:1–7)
-
Zakaraya 12:10 (lee Jọn 19:37; Mkpughe 1:7)
-
Zakaraya 13:6–7; 14:1–9 (lee Matiu 26:31; Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 45:47–53)
Kedụ ihe i chere ọ gaara adị ka ya ịnọ nʻetiti ndị mmadụ na-anabata Jizọs na Jerusalem dị ka akọwara niime Zakaraya 9:9–11? Kedụ otu ị ga-esi anabata Ya niime ndụ gị, n’ebe obibi gị, na niime obodo gị?
Lee kwa Odudu nye Akwụkwọ nsọ, “Mezaya,” Ọba akwụkwọ Ozi ọma; “Mbata Mmeri nke Onyenwe anyị na Jerusalem” (vidiyo), Ọba akwụkwọ Ozi ọma; Ronald A. Rasband, “Hosana dịrị Chineke Kachasị Elu,” Liahona, Me 2023, 108–12.
The Lord's Triumphal Entry into Jerusalem
Maka nchepụta ndị ọzọ, lee mbipụta niile nke ọnwa nke a nke Liahona na magazin niile Maka Ume nke Ndị Ntoroọbịa .
Nchepụta niile maka Ikuziri Ụmụntakịrị
Haggai 1:2–8
“Tulee ụzọ gị niile.”
-
Dị ka ị na-agụ akụkụ ụfọdụ nke Haggai 1:2–5 gị na ụmụ gị, nyere ha aka chọta ịhe mere obi adịghị Onyenwe anyị mma nʻebe ndị ahụ nọ. Ikekwe ụmụ gị nwere ike họrọ otu nkebiokwu sitere na amaokwu 6 ma see ihe osise maka ya. Ha nwere ike gosi ya onwe ha ma chepụta ihe nkebiokwu nke ọ bụla eserese na-anọchi anya ya. Mgbe anyị na-egbu oge na-eme ihe ndị Onyenwe anyị na-achọghị, kedụ otu oji dịrị ka iri ihe oriri ma afọ ejughị? Unu nwere ike kwuoro ibe unu okwu banyere otu unu nwere ike iji wepụta oge maka ihe ndị dịịrị Onyenwe anyị mkpa.
-
Unu nwekwara ike ịgụrụ ụmu unu amaokwu 8 ma kpọkuo ha ịme ka a ga-asị ha na “agbago elu ugwu,” “weta osisi,” na “wuo ụlọ [nke Onyenwe anyị].” Ụmụ gị nwere ike mee ndepụta ihe ndị ha na-eme nʻụbọchị ọbụla, gụnyere ihe ndị Onyenwe anyị gwara ha mee. Gwa ụmụ gị ka ha “tulee ụzọ [ha] niile” site na ise ihe okirikiri nʻihe Onyenwe anyị nwere ike ikwu na ọ bụ nke kacha mkpa na ndepụta ha.
Nkuzi-ịhe nke ebe obibi. Onyeisi Russell M. Nelson akuziwo na ebe obibi kwesịrị ịbụ “isi ebe ọmụmụ ihe nke ozi ọma.” (“Ị Bụ Ndị nsọ Ụbọchi ikpeazụ a Na-En̄omi,” Liahona, Nov. 2018, 113). Dị ka ezi na ụlọ gị na-amụ ndụmọdụ nke Haggai iji “tulee ụzọ gị niile,” unu nwere ike kwuo banyere otu unu ga-eji ewere Chineke kporo ihu na ndụ nke ezi na ụlọ unu.
Zakaraya 3: 1–7
Ịgba ndụ ma ịdebe ha nwere ike nyere m aka dịrị ka Nna nke Eluigwe na Jizọs Kraịst karịa.
-
Nʻotu ọhụ, Zakaraya hụrụ otu onyeisi nchụaja onye “eyikwasịrị uwe ruru unyi” (Zakaraya 3:3). Ma mmụọ ozi nyere ya uwe dị ụcha. Ịnwere ike nyere ụmụ gị aka chọpụta eziokwu ndị dị mkpa site na-ịgụkọta Zakaraya 3:1–7 ọnụ ma kwuo banyere ihe uwe ahụ ruru unyi na uwe ahụ dị ụcha nwere ike ịna anọchite. Kedụ otu anyị nwere ike iji dịrị ụcha site na mmehie anyị, ọbụnadị mgbe emesịworo anyị baptizim? Olee otu ọgbụgba ndụ baptizim anyị si enyere anyị aka “jee ije nʻụzọ niile [nke Onyenwe anyị]”?
-
Gị na ụmụ gị nwere ike lee anya na foto nke baptizim, dị ka nke ahụ dị na ndepụta nke a. Gịnị kpatara anyị ji eyi uwe ọcha na baptizim anyị? Unu nwekwara ike gụọ otu egwu banyere baptizim, ụdị dị ka “Mgbe Emere M Baptizim” (Akwụkwọ Ukwe Ụmụntakịrị, 103, kedụ ihe ukwe nke a na-akuzi banyere ihe kpatara Onyenwe anyị jiri chọo ka anyị mee baptizim?
Zakaraya 9:9–11; 11:12; 13:6–7
Jizọs Kraịst bụ Mezaya ahụ ekwere na nkwa.
-
Ụmụ gị nwere ike chọọ iche ya nʻuche ha ihe omume ahu eburu nʻamuma niime Zakaraya 9:9, mgbe Jizọs bịara na Jerusalem nʻoge izu ụka ikpeazu nke ndụ anụ ahụ Ya. Iji nyere ha aka na nke a, gosi ha foto nke ihe omume ahụ, dị ka nke ahụ dị na ndepụta nke a. Ị nwekwara ike kesara ụmụ gị “Onye Nzọpụta Agawo na Jerusalem” (niime Akụkọ niile nke Agba Ọhụrụ, 110–12). Ụmụ gị nwere ike tụọ aka na ndị ahụ no na foto ahụ ndị “na-an̄ụrị ọn̄ụ nke ukwuu.” Onye bụ Eze ahụ niime Zakaraya 9:9? Gịnị mere anyị ji enwe obi ekele maka Ya?
1:35Chapter 44: The Savior Goes to Jerusalem
-
Tulee ịnyere ụmụ gị aka ịwere amụma niile sitere na Zakaraya jiri tunyere amaokwu niile nke Agba Ọhụrụ ndị kọwara mmezu ha. Ebe a bụ ụfọdụ ọmụmatụ: Zakaraya 9:9 na Matiu 21:5–9; Zakaraya 9:11 na 1 Pita 3:18–19; Zakaraya 11:12 na Matiu 26:14–16; Zakaraya 13:7 na Matiu 26:31. Kedụ ihe ị na-amụta banyere Onye Nzọpụta site na amaokwu ndị a?
Maka echiche ndị ọzọ, lee mbipụta nke ọnwa nke a nke magazin Friend .