Come, Follow Me
Echiche niile ndị aga E Buru nʻUche: Ndị amụma na Amụma


“Echiche niile ndị aga E Buru nʻUche: Ndị amụma na Amụma,” Bịanụ, Soro M—Maka Ebe Obibi na Nzukọ nsọ: Agba Ochie 2026 (2026)

“Ndị amụma na Amụma,” Bịanụ, Soro M: Agba Ochie 2026

akara echiche niile

Echiche niile ndị aga E Buru nʻUche

Ndị amụma na Amụma

Dị ka otu ndị Kristian sịrị kewaa Agba Ochie dị ka ọdịnala ha sịrị dị, nkeji nke ikpeazụ (Aịzaya ruo na Malakaị) ka a na-akpọ Ndị amụma. Nkeji nke a, ihe ruru otu ụzọ nʻụzọ anọ nke Agba Ochie, juputara na okwu nke ndị odibo Chineke nyere ikikere, ndị ha na Onyenwe anyị kwuru okwu ma emesịa kwuchite ọnụ Ya, na-ekesara ndị mmadụ ozi Ya bido na agbata 900 ruo na 500 Tupu Amụọ Kraịst.

Ndị amụma Na-ekwuputa Uche nke Chineke

Ndị amụma na amụma rụrụ ọrụ dị oke mkpa gburugburu Agba Ochie. Ebreham, Izik, na Jekọb hụrụ ọtụtụ ọhụ ma kwuo okwu ha na ndị ozi nke eluigwe. Mozis kwuuru Chineke okwu ihu na ihu ma kwuputa uche Ya nye ụmụ Izrel. Akwụkwọ nke mbụ na nke abụọ nke ndị Eze kọrọ maka ọrụ and ozi niile ndị agaghị echefu echefu banyere ndị amụma Elijah na Elisha. Agba Ochie kwukwara maka ụmụ nwanyị ndị amụma dị ka Miriam na Debora, gụnyekwara ndịinyom ndị ọzọ ejiri mmụọ nke ibu amụma gọzie, dị ka Ribeka na Hannah. Ma ọbụlaghị na Abụ ọma niile ka a na-edeghi site nʻaka ndị akpọro dị ka ndị amụma, hanwa kwa juputara na mmụọ nke ibu amụma, kacha nke dị ka ha na-arụtụ aka nʻọbịbịa nke Mezaya ahụ.

Enweghị nke ọbụla niime nke a na-abịa dị ka ihe ijuanya nye ndị otù nke Nzukọ nsọ Ahụ nke Jizọs Kraịst nke Ndị Nsọ Ụbọchị Ikpeazu a. Nʻezie, ozi ọma nke Jizọs Kraịst eweghachitere na-akụziri anyị na ndị amụma abụchaghị naanị ndị agụgụala na-adọrọ mmasị mana ha bụkwa otu akụkụ dị oke mkpa nʻatụmatụ nke Chineke. Na-agbanyeghi na ụfọdụ nwere ike ịhụ ndị amụma dị ka ndị pụrụ iche naanị maka oge ndị nke Agba Ochie, anyị na-ahụ ha dị ka ihe anyị niile nwekọrọ ọnụ nʻoge Agba Ochie.

Mana ịgụ otu isi sitere na Aịzaya ma ọ bụ Izikiel nwere ike dị iche site na-ịgụ otu ozi ọgbakọ zuru ọha sitere nʻaka Onyeisi Nzukọ nsọ nke ugbua. Mgbe ụfọdụ ọ na-ara ahụ ịhụ na ndị amuma mgbe ochie nwere otu ihe ịgwa anyị. Mgbe emesịrị ihe niile, ụwa nke anyị bi niime ya taa dị nnọọ ezigbo iche site nʻụwa ebe ha kwusara ozi ọma ma buo amụma. Ma ebe ọ bụ eziokwu na anyị nwere onye amụma dị ndụ nwere ike kpọlite ajụjụ: Gịnị mere ịgba mbọ ahụ jiri baa uru—nʻezie ọ na ewe ịgba mbọ—iji gụọ okwu niile nke ndi amụma mgbe ochie?

otu onye amụma oge ochie na-ede ihe

Nʻuju Oge, site n’aka Greg Olsen

Ndị Amụma Oge ochie Nwere Ihe Ha Ga-agwa Anyị

Maka ọtụtụ mgbe, ndị mmadụ taa abụchaghị ndị ndị amụma mgbe ochie bu nʻobi kwuo okwu. Ndị amụma ahụ nwere nchegbu nke dịịrị ha ha na-achọ imezi ma nʻoge ma nʻebe nke ha—dị ka kwa otu ndị amụma anyị ụbọchị ikpeazụ a si na-emezi nchegbu dịịrị anyị taa.

N’otu aka ahụ kwa, ndị amụma nwere ike ịhụ gafee nchegbu niile dịịrị ha. Ha na-akụzi eziokwu dị ebighị ebi, ndị di mkpa nye oge ọbụla na ebe ọbụla. Nihi agọziri ha jiri mkpughe, ha na-ahụ ọrụ nke Chineke dị ka o jiri saa mbara. Na-ịmatụ, Aịzaya dọrọ ndị oge nke ya aka na ntị banyere mmehie ha. Ọ dekwara banyere nnapụta nke ndị Izrel ndị ga-ebi afọ 200 na-abịa nʻọdịniihu. Nʻotu aka ahụkwa, ọ kuziri banyere nnapụta ahụ nke ndị nke ndị niile bụ nke Chineke na-achọ. Ma ọ dere amụma ndị, ọbụna taa, ka na-eche ka emezuo ha—dị ka nkwa nille nke “ụwa ọhụrụ” (Aịzaya 65:17) nke ga “ejuputa na ọmụma ihe nke Onyenwe anyị” (Aịzaya 11:9), ebe a ga-akpọkọta ebo Izrel ndị furu efu ma ebe “mba niile” agaghị “amụta agha ọzọ” (Aịzaya 2:4). Otu akụkụ nke ọn̄ụ na mkpatemmụọ ahụ na-abịa site na-ịgụ okwu niile nke ndị amụma Agba Ochie dị ka Aịzaya bụ ịmata na anyị na-arụ ọrụ niime ụbọchị ahụ dị ebube ha hụrụ nʻọhụ.

Nihi ya mgbe ị na-agụ amụma ndị nke oge ochie, ọ nwere ike nye aka ịmụta banyere ọnọdụ ahụ nke edere ha—mana ikwesị kwara ịhụta onwe gị niime ha, ma ọ bụ “were ha tụnyere [onwe gị]” (1 Nifaị 19:24; lee kwa amaokwu nke 23). Mgbe ụfọdụ nke ahụ pụtara ịhụta Babịlọn dị ka ọdịmara nke mmehie na mpako, nʻabụghị naanị dị ka obodo ukwu oge ochie. Ọ nwere ike pụta ịghọta ndị Izrel dị ka ndị nke Chineke nʻoge ma nʻebe ọbụla. Ma ọ bụ o nwere ike ịpụta ịhụ Zayọn dị ka ọrụ nke ụbọchị ikpeazụ nke ndị nke Chineke nabatara, kama naanị ịhụ ya dị ka aha ọzọ maka Jerusalem.

Anyị nwere ike tụnyere akwụkwọ nsọ na ndụ anyị nihi anyị ghọtara na otu amụma nwere ike mezuo nʻọtụtụ ụzọ. Otu ọmụmatụ ziri ezi bụ amụma ahụ dị niime Aịzaya 40:3: “Olu nke onye ahụ na-eti mkpu nʻọzara, Kwadoonụ ụzọ nke Onyenwe anyị.” Nye ndị Juu adọkpuru nʻagha na Babịlọn, okwu nke a nwere ike ọ rụtụrụ aka mgbe Onyenwe anyị na-arọpụta ụzọ nnapụta site na ndọkpụ n’agha ma laghachi azụ na Jerusalem. Nye Matiu, Mak, na Luk, amụma nke a rụtụrụ aka na Jọn Omee Baptizm, onye kwadoro ụzọ ahụ maka ozi ndụ ahu nke Onye Nzọpụta. Ma Josef Smith natara mkpughe na amụma nke a ka a ka na-emezu taa na nkwado maka ozi oge ọchịchị otu puku afọ nke Kraịst. Nʻụzọ ndị anyị ka na-aghọta ntakịrị ntakịrị, ndị amụma oge ochie nʻezie kwuuru anyị okwu. Ma ha kuziri ọtụtụ eziokwu dị ebighị ebi, dị oke ọnụ ahịa, ndị nke dịkwa anyị mkpa dị ka o jiri dịkwara ndị Izrel oge ochie.

Ndị Amụma Oge ochie Gbara ama banyere Jizọs Kraist

Ikekwe nke kacha dị mkpa karịa ịhụ onwe gị niime amụma niile nke Agba Ochie bụ ịhụ Jizọs Kraịst niime ha. Ọ bụrụ na ịchọọ Ya, ị ga-ahụ Ya, ọbụnadị mgbe a na-akpọghi Ya aha. O nwere ike nye aka itinye nʻuche na Chineke nke Agba Ochie, Onyenwe anyị Jehova bụ Jizọs Kraịst. Mgbe ọbụla ndị amụma kọwara ihe Onyenwe anyị na-eme ma ọ bụ ihe Ọ ga-eme, ha na-ekwu maka Onye Nzọpụta.

Jizọs bilitere nʻọnwu na-esetịpụ aka ebe otu nwoke nọ

Onyenwe anyị Ka Ọ Pụtakwuru Ebreham, site n’aka Keith Larson

Ị ga-ahụkwa nrụtụaka ndị gbasara Onye Etere mmanụ, Onye Mgbapụta, na Eze ọdịniihu nke si nʻagbụrụ Devid. Ndị a niile bụ amụma ndị gbasara Jizọs Kraịst. Nke kacha nke, ị ga-agụ banyere nnapụta, mgbaghara, mgbapụta, na mweghachite. Edebe Onye Nzọpụta nʻuche ma nʻobi gị, amụma ndịa ga nụzọ eke duba gị nʻebe Ọkpara Chineke nọ. Mgbe emesịrị ihe niile, ụzọ kachasị mma iji ghọta amụma bụ ịnwe “mmụọ nke ibu amụma.” nke Jọn gwara anyị bụ “ama nke Jizọs” (Mkpughe19:10).

Hụba ama

  1. Aịzaya, Jeremaya, Izikiel, na Daniel ka a na-akpọkarị Ndị Amụma Ukwu nihi ịdị ogologo nke akwụkwọ ha. Ndị amụma ndị ọzọ (Hosea, Joel, Emọs, Obadaya, Jona, Maịka, Nahum, Habakuk, Zephaniah, Haggai, Zakaraya, na Malakaị) ka a kpọrọ Ndị Amụma Nta nihi akwụkwọ ha dị mkpu mkpu karịa. Akwụkwọ nke Abụ Akwa ka a na-ewekarị ka akụkụ nke Ihe Ndị Edere, nʻabụghi ndị Amụma.

  2. Anyị amaghị otu ejiri chikọta akwụkwọ nke amụma ndị ahụ. Nʻọnọdụ ụfọdụ, enwere ike otu onye amụma ji aka ya hụ maka nchịkọta ihe odide na amụma ya niile. Nʻọnọdụ ndị ọzọ, enwere ike edere ma chikọta nkuzi ya niile mgbe ọ nwụchara.

  3. Lee Ọpụpụ 15:20; Ndị ikpe nke 4.

  4. Lee Jenesis 25:21–23; 1 Samuel 1:20–28; 2:1–10.

  5. “Cheedị echiche banyere obi ụtọ na ịdị ngwa ngwa banyere ihe niile: onye amụma ọbụla malite site na Adam ahụwo ụbọchị anyị. Ma onye amụma ọbụla ekwuwo okwu banyere ụbọchị anyị, mgbe a ga-akpọkọta Izrel ma kwadoo ụwa maka Ọbịbịa nke Ugboro Abụọ nke Onye Nzọpụta. Chee maka ya! Niime ndị niile ndị biworo nʻụwa nke a, anyị bụ ndị nwere ohere isonye niime ihe omume nnukwu mkpọkọta, nke ikpeazụ nke a. Nke a bụ ihe ọn̄ụ!” (Russell M. Nelson, “Olileanya nke Izrel” [worldwide youth devotional, June 3, 2018], Ọba akwụkwọ Ozi ọma). Lee kwa Ronald A. Rasband, “Mmejuputa Amụma,” Liahona, Me 2020, 75–78.

  6. Onye Nzọpụta, dị ka o kwuru maka Aịzaya, sịrị, “Ma ihe nile nke o kwuru adịwo ma ga-adị, ọbụna dịka otu okwu nile nke o kwuru siri dị” (3 Nifaị 23:3; nkwusi ike agbakwụnyere).

  7. Lee Matiu 3:1–3; Mak 1:2–4; Luk 3:2–6.

  8. Lee Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 33:10; 65:3; 88:66.

  9. Lee Aịzaya 9:6–7; 61:1; Hosea 13:14; Zakaraya 9:9.