Come, Follow Me
Septemba 7–13. “Ọ Ga-eduzi Ụzọ Gị Nille”: Ilu 1–4; 15–16; 22; 31; Ekliziastis 1–3; 11–12


Septemba 7–13. ‘Ọ Ga-eduzi Ụzọ Gị Nille’: Ilu 1–4; 15–16; 22; 31; Ekliziastis 1–3; 11–12,” Bịanụ, Soro M—Maka Ebe Obibi na Nzukọ nsọ: Agba Ochie 2026 (2026)

Septemba 7–13. ‘Ọ Ga-eduzi Ụzọ Gị Nille,ʻ” Bịanụ, Soro M: Agba Ochie 2026

Jizọs ya na ụmụntakịrị

Jizọs ya na ụmụntakịrị, site nʻaka Dilleen Marsh

Septemba 7– 13: “Ọ Ga-eduzi Ụzọ Gị Nille”

Ilu 1–4; 15–16; 22; 31; Ekliziastis; 1–3; 11–12

Ị nwere ike were akwụkwọ nke Ilu dị ka otu nchịkọta nke ezi ndụmọdụ sitere na ndị nne na nna dị ịhụnaanya (lee Ilu 1:8). Isi ozi ya bụ na ọ bụrụ na ị na-achọ amamiihe—kacha nke amamiihe nke Chineke—ndụ ga-aga nke ọma. Mana Ilu ka akwụkwọ nke Ekliziastis sotere na azụ, nke yiri ka ọ na-ekwu, “Ọ dịghịkwa mfe otu isi chee.” Onye Okwuu okwuchukwu en̄omiri niime Ekliziastis chọpụtara na “ọ rara obi [ya] nye iji mata amamiihe” mana ọ ka chọpụtara “mkpasu oke iwe nke mmụọ” na “obi mnwute dị ukwuu” (Ekliziastis 1:17–18). Nʻụzo dị iche iche, akwụkwọ ahụ na-ajụ sị, “enwere ike ịnwe ezi nkọwa niime ụwa ebe ihe niile dị ka ihe efu, nke nwantịtị oge, na nke ejighi nʻaka?”

Ma otu ọ dị, ebe akwụkwọ abụọ ahụ na-ele ndụ anya site na nhụnuuche dị iche iche, ha na-akụzi eziokwu ndị yiri onwe ha. Ekliziastis kwupụtara: “ Ka anyị gee ntị nʻokwu nchikọta nke ihe niile: Tụọ egwu Chineke, ma debe iwu nsọ ya niile: niihi nke a bụ ọrụ niile nke mmadụ” (Ekliziastis 12:13). Nke a bụ otu ụdị ụkpụrụ ahụ ahụrụ gburugburu Ilu niile: “Tụkwasị obi na Onyenwe anyị jiri obi gị niile” (Ilu 3:5; lee kwa amaokwu nke 7). Ndụ kacha dịrị mma mgbe niile—akpachaghị anya kacha zuo oke—mgbe anyị tụkwasịrị obi ma soro Onyenwe anyị Jizọs Kraịst.

Maka nchikọta nke akwụkwọ ndị a, lee “Ilu, akwụkwọ nke” na “Ekliziastis” niime Ọkọwa okwu Baịbụl.

akara ngosi ihe ọmụmụ

Nchepụta niile maka Ọmụmụ ihe N’Ebe Obibi na na Nzukọ nsọ

Ilu 1–4; 15–16; Ekliziastis 1–3; 11–12

“Chebe ntị gị maka amamiihe.”

Akwụkwọ ndị nke Ilu na Ekliziastis jupụtara na ọtụtụ nghọta banyere amamiihe. Tulee ịkanye ihe nʻokwu ahụ “amamiihe” na okwu ndị yiri ya dị ka “mmata ịhe” na “nghọta,” dị ka ị na-ahụ ha niiime Ilu 1–4; 15–16; Ekliziastis 1–3; 11–12. Olee otu isi ndị a si emetụta ụzọ i si eche maka amamiihe? Ịdabere n’ihe ị chọpụtara, kedụ otu i ga-esi akọwa amamiihe nke “Onyenwe anyị na-enye”? (Ilu 2:6). Kedụ ngọzi ndị na-abịa site na amamiihe nke Chineke?

Lee kwa Matiu 7:24–27; 25:1–13.

Nyere ndị na-amụ ihe aka kesaa ihe ha na-amụta “Nye ndị na-amụ ihe ohere niile iji kesaara ibe ha ihe ha na-amụta banyere Onye Nzọpụta na ozi ọma Ya. Ịme nke a ga-enyere ha aka tinye eziokwu niile a na-akụziri ha nime ime obi ha ma gosipụtakwa ha. Ọ ga-enyekwara ha aka nwete obisike nike ha nwere iji ekesa eziokwu ndịa na ntọ ndị ọzọ” (Ikuzi ihe n’Ụzọ nke Onye Nzọpụta26). Na-ịmatụ, inwere ike ịkpọku ndị na-amụ ihe ka ha dedata ụfọdụ nrụtụaka sitere na Ilu ma ọ bụ Ekliziastis ebe ha chọtara nghọta banyere amamiihe nke Chineke. Emesịa kpọkuo ndị na-amụ ihe ikwu banyere ihe ha mụtara.

Ilu 1:7; 2:5; 3:7; 15:33; 16:6; 31:30; Ekliziastis 12:13

“Abụkwala onye maara ihe na anya nke gị onwe gị: tụọ Onyenwe anyị egwu.”

Isiokwu ọzọ a hụtara gburugburu Ilu na Ekliziastis bụ “egwu nke Onyenwe anyị.” Na-atụ anya maka nkebiokwu nke a dị ka ị na-agụ. Kedụ ihe i chere ọ pụtara ịtụ egwu Onyenwe anyị? Chọọ maka nghọta niime ozi Okenye Devid A. Bednar, “Ya mere Ha Bịajụrụ Ụjọ Ha,” (Liahona, Me 2015, 46–49). Kedụ otu egwu nke Onyenwe anyị si dịrị iche site na ụdị egwu ndị ọzọ?

Lee kwa Ilu 8:13.

Ilu 3:5–74

akara ngosi semịnarị
“Tụkwasị obi n’Onyenwe anyị jiri obi gị niile.”

Kedụ otu ị ga-esi anwa ịrịọ onye ọzọ na ọ katụ mma ị “tụkwasị obi na Onyenwe anyị” karịa “ịdabere … na nghọta nke onwe [anyị]”? (Ilu 3:5). Kedụ ntụnyere ma ọ bụ ihe ọmụmụ ihe ndị enwere ike imetụ aka ị ga-eji? Dị ka ị na-atule Ilu 3:5–7, chee maka ụzọ ndị ị nwere ike iji mejupụta ahịrị okwu dị ka ndị a: Ịtụkwasị obi na Onyenwe anyị dị ka … Ịdabere na nghọta nke onwe anyị dị nnọọ ka …

Gịnị mere o ji ọ bụghị amamihe ịdabere na nghọta nke onwe anyị? Kedụ otu ijiri chọpụta na Onyenwe anyị kwesịrị ntụkwasị obi?

Ọbụnadị otu ahụ, o nwere ike ịra anyị ahụ ịtụkwasị obi nʻOnyenwe anyị mgbe ụfọdụ. Gịnị kpatara nke a? Okenye Gerrit W. Gong tụrụ aro ụfọdụ ihe kpatara ya, gụnyekwa ndụmọdụ ga-enye aka, niime “Tụkwasị obi Ọzọ” (Liahona, Nov. 2021, 97–99). Kedụ akụkọ ma ọ bụ nkuzi ndị ị na-achọta niime ozi nke a ndị nwere ike ịnyere onye ọzọ aka weghachite ntụkwasị obi ha na Onyenwe anyị?

Ma Ilu 3:6 ma Ilu 4 na-atụnyere ndụ nye “okporo ụzọ” ma ọ bụ “ụzọ.” Kedụ ihe i chere ọ pụtara ịkwe ka Onyenwe anyị “duzie ụzọ [anyị] niile”? (Ilu 3:6). Kedụ ihe ị chọtara niime isi nke 4 na-enyere gị aka “tulee ụzọ nke ụkwụ [gị]? (amaokwu nke 26). Na-ịmaatụ, kedụ ịhe amaokwu ndịa 11-12 na 18-19 na-akụzi banyere ngọzi nke isoro ụzọ nke ziri ezi? Kedụ ihe amaokwu ndị a 26–27 pụtara nye gị?

Lee kwa 2 Nifaị 31:18–21; “Onyenwe anyị, Aga M Eso Gị,” Abụ, no. 220.

Ilu 15; 16:24–32

“Azịza dị nro na-eme ka iwe na ọnụma laa azụ.”

Ụfọdụ nchepụta dị niime Ilu 15–16 nwere ike kpateemmụọ gị ịmezima ụzọ ahụ iji ekwurịta okwu gị na ndị ọzọ, kacha nke ndị ịhụru naanya. Na-ịmatụ, chee banyere oge ndị ahụ doro anya mgbe “azịza dị nro” nyere aka “[ime] ka iwe na ọnụma laa azụ” (Ilu 15:1).

I nwekwara ike chee maka oge ndị ahụ mgbe Onye Nzọpụta gosiri ọmụmatụ nke nkuzi niime Ilu 15:1–4, 18 (lee Mak 12:13–17; Jọn 8:1–11). Kedụ otu ị ga-esi esoro ọmụmaatụ Ya dị ka ị na-akpakọrịta gị na ndị ọzọ?

Kedụ otu ndụmọdụ ahụ dị niime Ilu 15; 16:24–32 nwere ike iji metụta mkparịta ụka dijital nke taa? Lee ma ị ga-ahụ otu amaokwu nime isi ndịa nke ịnwere ike idegharị dị ka ndụmọdụ banyere mkparịta nke soshial midiya ma ọ bụ site na edereede ahọọrọ.

Lee kwa Neil L Andersen, “Isoro Jizọs: Ịbụ Onye Ome udo,” Liahona, Me 2022, 17–20; Ronald A. Rasband, “Okwu dị Mkpa,” Liahona, Me 2024, 70–77; Maka Ume nke ndị Ntoroọbịa: Ihe Odudu maka Ime Nhọrọ niile (2022), 11–12.

otu nwanyị ya na ọtụtụ seagull

Onye Pụrụ Ịchọta Ezi Nwanyị? II, site nʻaka Louise Parker

Ilu 31: 10–31

Nwanyị na-atụ egwu Onyenwe anyị, ọ bụ ya ka a ga-eto.”

Ilu 31:10–31 na-akọwa “ezi nwanyị,” ma ọ bụ nwanyị nke nwere nnukwu ume nke ime mmụọ, ikike, na ike mmetụta. Ịnwekwara ike gbalịa jiri okwu nke gị onwe gị ịchịkọta ihe amaokwu nke ọbụla na ndị a na-ekwu banyere ezi ụmụ nwanyị. Kedụ njirimara ndị ịnwere ike ịn̄omi?

Ekliziastis 1–312

Ndụ nke anụ ahụ bụ ihe nwantịtị oge.

Gịnị mere o jiri baara gị uru ịcheta na ọtụtụ ihe niime ụwa nke a, dị ka Ekliziastis 1–2 kwusịrị ike, bụ “ihe efu” (ma ọ bụ ihe nwantịtị oge ma mgbe na mgbe adịghị mkpa)? Kedụ ihe ị na-achọta niime Ekliziastis 12 nke na-enye ndụ uru dị ebighi ebi?

Maka nchepụta ndị ọzọ, lee mbipụta niile nke ọnwa nke a nke Liahona na magazin niile Maka Ume nke Ndị Ntoroọbịa .

akara ngosi nkeji ụmụntakịrị

Nchepụta niile maka Ikuziri Ụmụntakịrị

Ilu 1:7; 2:5; 15:33; 16:6; Ekliziastis 12:13

“Ịtụ egwu Chineke” pụtara ịhụ Ya naanya ma rubere Ya isi.

  • Ị nyere ụmụ gị aka ghọta ederede ndị banyere ịtụ egwu Chineke, ịnwere ike gbanwee okwu ahụ “egwu” jiri okwu ndị dị ka nsọpụrụ, ịhụnaanya, ma ọ bụ nrube isi (lee kwa Ndị Hibru 12:18). Kedụ otu nke a si emetụta ụzọ anyị si eche banyere amaokwu ndị a? Kedụ otu anyị ga-esi egosi na anyị na-atụ egwu Onyenwe anyị?

Ilu 3: 5–7

Enwere m ike ịtụkwasị obi n’Onyenwe anyị jiri obi m niile.

  • Gị na ụmụ gị nwere ike gosipụta ụfọdụ ihe omume ga-adaba na Ilu 3:5–7, dị ka iji aka gị mee obi, ịdabere nʻotu akụkụ, ịga ije nʻotu ebe, ma na-atụ aka na anya gị. Kedụ otu anyị ga-esi egosi na anyị tụkwasịrị obi na Jizọs Kraịst jiri obi anyi niile?

  • Igosi ihe ọ pụtara ị “ghara ị dabere na nghọta nke onwe gị” (Ilu 3:5), tulee ịkpọku ụmụ gị ịdabere nʻelu otu ihe dị ike ma kwụrụ chịm, dị ka mgbidi. Ha nwere ike gbalịa ịdabere nʻelu otu na-esighi ike, dị ka aziza. Ma ọ bụ ha nwere ike mee ka mkpịsị ma ọ bụ pencil dabere nʻelu ihe ndị na-akwụsịghị ike dị iche iche, ụdị dị ka akwụkwọ ma ọ bụ otu mpempe akwụkwọ. Gịnị mere o jirị dị mkpa “ịtụkwasị obi na Onyenwe anyị” (amaokwu 5) ma na-abụghị na “nghọta nke onwe anyị”?

nwanyị na-atụ ụjọ ji okoko osisi

Ịmụta ịtụkwasị obi na Onyenwe anyị, site nʻaka Kathleen Peterson

Ilu 15:1, 18

Enwere m ike iji okwu ndị dị ebere.

  • Ikekwe gị na ụmụ gị nwere ike chee maka ọnọdụ ndị mgbe gị ma ọ bụ ha nwere ike iwe iwe. Gụkọta ilu 15:1 ọnụ, ma nyere ụmụ gị aka tinye amaokwu nke a niime ọnọdụ ndị ha chere. Ikekwe ha nwere ike mụọ ụfọdụ “azịza dị nro.” Otu egwu banyere obi ọma, dị ka “Ekwuru Ịhụnaanya N’ebe a” (Akwụkwọ Ukwe Ụmụntakịrị, 190), nwere ike kwusie ụkpụrụ nke a ike.

  • Ịmụ ihe ọ pụtara “adịghị ewe iwe ọsịsọ” (Ilu 15:18), gị na ụmụ gị nwere ike kesaa oge ndị ahụ mgbe gị (ma ọ bụ onye ọzọ ị ma) were iwe mana họrọ igosi obi ọma. Nyere ụmụ gị aka chee maka ihe ndị anyị nwere ike ime ngwa ngwa ma ọ bụrụ na anyị “adịghị ewe iwe ọsịsọ.” Na-ịmatụ, anyị nwere ike ịme ngw ngwa ịche banyere Jizọs, ịrịọ Nna nke Eluigwe maka enyemaka, ịche echiche maka otu ukwe Praịmarị, ma ọ bụ, ma ọ kwe omume, isi ebe ahụ pụọ.

Maka echiche ndị ọzọ, lee mbipụta nke ọnwa nke a nke magazin Friend .

Jizọs na-edu atụrụ abụọ

”N’ime ụzọ gị niile kwupụta Ya, ma ọ ga-atụziri gị aka n’ụzọ gị niile.” (Ilu 3:6). Ọ Na-Edu M, site n’aka Yongsung Kim. Oyiyi nke a si nʻaka havenlight.com

Ihu akwụkwọ ihe omume ndị Praịmarị: Enwere m ike iji okwu ndị na-egosị ịhụnaanya