Come, Follow Me
Febrụwarị 23–Maachị 1. “Enwere Ihe Ọ Bụla Na-esiri Onyenwe anyị Oke Ike?”: Jenesis 18–23


“Febrụwarị 23–Maachị 1. ‘Enwere Ihe Ọ Bụla Na-esiri Onyenwe anyị Oke Ike?’: Jenesis 18–23,” Bianụ, Soro M—Maka Ebe Obibi na Nzukọ nsọ: Agba Ochie 2026 (2026)

“Febrụwarị 23–Maachị 1. ‘Enwere Ihe Ọ Bụla Na-esiri Onyenwe anyị Oke Ike?’,” Bịanụ, Soro M: 2026

Sera ku Izik nwa ọhụrụ

Sera na Izik, site n’aka Scott Snow

Febrụwarị 23–Maach 1: “Enwere Ihe Ọ Bụla Na-esiri Onyenwe anyị Oke Ike?”

Jenesis 18–23

Ndụ nke Ebraham na Sera, nke juputara na ihe omume ma ndị na-agbawa obi ma ndị na-ekpo obi ọkụ, bụ aka ebe nke eziokwu Ebraham mụtara n’ọhụ—na anyị bịara n’elu ụwa maka ịnwale anyị, “ịhụ ma [anyị] ga-eme ihe niile ọbụla ọ bụ Onyenwe anyị Chineke [anyị] ga-enye anyị iwu mee” (Ebraham 3:25). Ebraham na Sera ha ga-ekwesị ntụkwasị obi? Ha ga-aganiihu inwe okwukwe na nkwa Chineke nke inwe ọtụtụ ụmụ ụmụ, ọbụna mgbe ha na-enweghị nwa n’afọ nka ha? Ma ozugbo a mụrụ Ịzik, okwukwe ha ọ ga-anagide ihe a na-echeghị—iwu nke iji otu mkpụrụ nwa nwoke ahụ kwa chụọ aja onye site na ya Chineke kweworo nkwa imejuputa ọgbụgba ndụ ahụ?

Ebraham na Sera tụkwasịrị obi na Chineke, ma Ọ tụkwasịrị obi na ha (lee Jenesis 15:6; Ndị Rom 4:3). Niime Jenesis 18-23, anyị na-ahụta akụkọ niile site na ndụ nke Ebraham, Sera, na ndị ọzọ nwere ike ịkpate anyị iche banyere njikere nke onwe anyị ikwere na nkwa niile nke Chineke, izere ajọọ omume ma ghara ile anya n’azụ, ma ịtụkwasị obi na Chineke na-agbanyeghị aja ahụ. Na ịnwale anyị, Chineke nakwa azulite anyị.

akara ngosi ihe ọmụmụ

Nchepụta niile maka Ọmụmụ ihe N’Ebe Obibi na na Nzukọ nsọ

Jenesis 18:9–14; 21:1–7

Onyenwe anyị na-emejuputa nkwa Ya niile n’oge nke Ya.

Onyenwe anyị ekwewo nkwa dị ebube nye ndị kwesịrị ntụkwasị obi, mana mgbe ụfọdụ ọnọdụ niile nke ndụ anyị nwere ike mee anyị iche otu nkwa ndị a nwere ike ikwe mmejuputa. Ebraham na Sera nwere ike cheekwa otu ahụ. Kedụ ihe ị na-amụta site na nhụmiihe ha niile? O nwere ike inye aka ịmalite ọmụmụ ihe gị site na-inyocha ihe Onyenwe anyị kweworo nkwa niime Jenesis 17:4, 15–22. Kedụ omume Ebraham na Sera merer? (lee Ntụgharị asụsụ Joseph Smith, Jenesis 17:23 [niime Jenesis 17:17, nkọwada b]; Jenesis 18:9–12). Kedụ otu Onyenwe anyị si zaghachi iji nyere ha aka nwete nnukwu okwukwe na nkwa Ya niile? (lee Jenesis 18:14).

Gịnị ka ị na-ahụta niime amaokwu ndị a na-ewulite okwukwe gị? Kedụ nhụmiihe ndị ọzọ niime ndụ gị ma ọ bụ nke onye ọzọ gbaworo okwukwe gị ume na Onyenwe anyị ga-emejuputa nkwa Ya niile n’oge na ụzọ nke Ya? I nwekwara ike tụgharịa uche otu i ga-esi akwado okwukwe gị mgbe anataghị niime ndụ nke a ngọzi niile ekwere nkwa. Kedụ ndụmọdụ ị na-ahụta niime Ndị Hibru 11:8-13 na ozi nke Onyeisi Russell M. Nelson “Kraịst E Biliwo; Okwukwe niime Ya Ga-akwagharị Ugwu ukwu niile”? (Liahona, Me 2021, 101–4).

Lee kwa Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 88:68.

Jenesis 19:12–29

Onyenwe anyị nyere m iwu izere ajọọ omume ma ghara ile anya n’azụ.

Kedụ ihe mmụta ị na-amụta banyere izere ajọọ omume dị ka ị na-agụ banyere Lọt na ezi na ụlọ Ya? Ịma atụ, kedụ ihe na-amasị gị banyere ihe ndị mmụọ ozi kwuru ma mee iji nyere Lọt na ezi na ụlọ ya aka gbanarị mbibi? (lee Jenesis 19:12–17). Kedụ otu Onyenwe anyị si enyere gị na ezi na ụlọ gị aka gbanarị ma ọ bụ chọta nchekwa site na mmetụta ọjọọ niile dị n’ụwa? Chee banyere ọnọdụ niile ebe e nwere ike ịnwa gị [ile anya] n’azụ” (amaokwu 26) mgbe i kwesịrị ị na-ele anya n’ihu n’okwukwe niime Onye Nzọpụta. Gịnị ka Luk 9:62 gbakwunyere na nghọta gị maka echiche nke a?

Lee kwa Ntụgharị asụsụ Joseph Smith, Jenesis 19:9–15 (niime appendix Baịbụl).

Jenesis 19:26

Gịnị ka nwunye Lọt na-emetaghị?

Okenye Jeffrey R. Holland kuziri:

Eziokwu, ihe dị njọ n’ihe nwunye Lọt mere bụ ọbụghị nnọọ na ọ nọ na-ele anya n’azụ; niime obi ya ọ chọbụrụ ị laghachi azụ. Ọ ga-adị ka na ọbụna tupu ọ gafere oke niile nke obodo ukwu ahụ, ihe ndị Sọdọm na Gomorrah nyere ya nọ na-agụ ya agụụ. …

“O kwere omume na nwunye Lọt leghachiri anya azụ n’ekweghị ekwe n’ebe Onyenwe anyị nọ maka ihe ndị Ọ nọ na-arịọ ya ịhapụ n’azụ. … Ya mere ọ bụghị nnọọ na o leghachiri anya azụ; o lere anya n’azụ na-agụụ. N’ezie, njikọ ya na mgbe gara aga karịrị obisike ya n’ọdịniihu. Nke ahụ, n’eziokwu, bụ nnọọ akụkụ nke mmehie ya.

“… Ana m arịọ unu ịghara ịnọgide n’ụbọchị ndị ugbu a gaworo aga ma ọ bụ inwe agụụ n’efu maka ụnyahụ niile, nagbanyeghi otu ịdị mma nke ụnyahụ ndị ahụ dị. Mgbe gara aga bụ iji mụta ihe site na ya mana ọbụghị ibi na ya. Anyị na-eleghachi anya azụ iji nara mgbuke niile sitere na nhụmiihe ndị na-amụke amụke mana ọbụghị ntụ ntụ. Ma mgbe anyị mụtara ihe anyị kwesịrị ịmụ ma weteworo onwe anyị ihe ndị kachasị mma anyị hụbigaworo, mgbe ahụ anyị elepụ anya ma cheta na okwukwe na-echekarị ihu n’ọdịniihu. …

“… Ịnọgide na ndụ gara aga, gụnyere mmehie niile gara aga, adịghị nnọọ mma! Ọ bụghị ozi ọma nke Jizọs Kraịst. …

“Nye [ndị] niile nke ndudugandu niile, ana m akpọ oku, ‘Chetanụ nwunye Lọt’ [Luk 17:32]. Okwukwe bụ maka ọdịniihu. Okwukwe nʻeto n’elu oge gara aga mana anaghị achọ ịnọte aka n’ebe ahụ. Okwukwe tụkwasịrị obi na Chineke nwere nnukwu ihe e dokwara maka onye ọbụla niime anyị ma na Kraịst n’ezie bụ ‘onyeisi nchụaja nke ihe ọma niile ga-abịa’ (Ndị Hibru 9:11)” (“Nke Kacha Mma Ka Ga-abịa,” Ensign, Jan. 2010, 24, 26–27).

Ebraham na-eleli anya ruo eluigwe jiri mmaekwu n’aka ya na Izik dina n’elu ebe nchụaja

Ebraham na Izik, site n’aka Harold Copping

Jenesis 22:1–19

akara ngosi semịnarị
Njikere Ebraham iji Izik chụọ aja bụ ihe yiri Chineke na Ọkpara Ya.

Na-agbanyeghị anyị amaghị ihe niile mere Chineke jiri nye Ebraham iwu iji Izik chụọ aja, anyị maara na ọ bụ ihe mnwale banyere okwukwe ya niime Chineke. Anyị maara kwa na ọ bụ “ihe myiri nke Chineke na Ọkpara Ọ Mụrụ Naanị Ya” (Jekọb 4:5). Dị ka ị na-agụ Jenesis 22:1-19, i nwere ike chọọ ọdịmara niile ma ọ bụ myiri niile dị n’etiti Ebraham iji Izik chụọ aja na aja nke Nna nke Ọkpara Ya, Jizọs Kraịst. Tulee ide ihe ị chọtara niime chaatị dị ka nke a:

Ebraham na Sera

Nna nke Eluigwe na Jizọs Kraist.

Ebraham na Sera

Izik bụ naanị nwa nwoke Ebraham na Sera mụrụ (Jenesis 22:2; lee kwa Ndị Hibru 11:17)

Nna nke Eluigwe na Jizọs Kraist.

Jizọs bụ Onye Nna Mụrụ Naanị Ya (Jọn 3:16)

Ebraham na Sera

Izik ka a gaara eji chụọ aja kama nwa atụrụ (Jenesis 22:7–9)

Nna nke Eluigwe na Jizọs Kraist.

Jizọs Kraịst bụ Nwa atụrụ nke Chineke (Jọn 1:29)

Kedụ ọdịmara niile ma ọ bụ myiri niile nye aja mgbaghara mmehie nke Onye Nzọpụta ị hụrụ kachasị pụta ihè? Tulee ịgụ egwu ma ọ bụ ịgụ okwu niile nke abụ na-egosi ịhụnaanya nke Nna nke Eluigwe maka anyị, dị ka “Chineke Hụrụ Anyị naanya, Ya mere O Zitere Ọkpara Ya,” Abụ, no. 187. I nwekwara ike dekọọ mmetụta gị niile banyere Nna nke Eluigwe na Jizọs Kraist na aja Ha maka gị.

Ọ bụrụ na ị ka chọrọ ịmụtakwu karịa banyere aja nke Onye Nzọpụta anyị, tulee ịgụ ozi nke Onyeisi Jeffrey R. Holland “Lee Nwa atụrụ nke Chineke” (Liahona, Me 2019, 44–46). Gịnị mere nwa atụrụ jiri bụrụ ọdịmara dị ike banyere Ọkpara nke Chineke? Gịnị ka Onyeisi Holland kuziri na-abawanye nsọpụrụ gị maka onyinye nke Nna nke Eluigwe?

Lee kwa “Akedah (Nkéchi)” (vidiyo), Ọba akwụkwọ Ozi ọma.

12:57

Akedah (The Binding)

Jiri nlere niile iji kuzie ihe. Ịgbakwunye ihe dị iche iche na nkuzi na ọmụmụ ihe, i nwere ike jiri otu foto ma ọ bụ karịa dị niime ndepụta nke a dị ka ị na-amụ akụkọ niile dị niime Jenesis 18-23. Ịma atụ, gị na ezi na ụlọ gị ma ọ bụ klas gị nwere ike mata uju niile dị niime foto nke Ebraham na Ịzik. Kwuo banyere ihe mere nkọwa ndị a ji dịrị mkpa nye akụkọ ahụ, ma chọta nkọwa ndị a niime akwụkwọ nsọ. Kedụ otu ha si egosi isi ihe ịma atụ nke akụkọ nke aja nke Ọkpara Chineke?

Maka ihe ndị ọzọ, lee mbipụta niile nke ọnwa nke a nke Liahona na magazin niile Maka Ume nke Ndị Ntoroọbịa.

akara ngosi nkeji ụmụntakịrị 01

Nchepụta niile maka Ikuziri Ụmụntakịrị

Jenesis 17:15–21; 18:14; 21:1–7

E nwere m ike ịtụkwasị Chineke obi idebe nkwa Ya niile.

  • Ịmụta ihe banyere ntụkwasị obi nke Ebraham na Sera na nkwa niile nke Chineke, gị na ụmụ gị nwere ike kwuo banyere otu oge mgbe ha cheere maka ihe ha chọrọ n’ezie. I nweziri ike lee anya na foto nke Sera na Ịzik na mmalite nke ndepụta nke a ma kwuo banyere nkwa Chineke kwere ya na Ebraham (lee kwa “Ebraham na Sera,” niime Akụkọ niile nke Agba Ochie, 28–31). Nyere ụmụ gị aka chee maka ihe ndị Chineke kweworo anyị nkwa ọ bụrụ ma anyị kwesị ntụkwasị obi. Gbaa ha ume inwe ndidi ma tụkwasị obi na Chineke ga-edebe nkwa Ya niile.

    2:20

    Abraham and Sarah

  • Inyere ụmụ gị aka mụta eziokwu dị mkpa niime Jenesis 18:14, i nwere ike dee mkpụrụokwu nke ọbụla site na ahịrịokwu mbụ nke amaokwu ahụ na mpempe akwụkwọ dị iche. Emesịa gwakọta akwụkwọ niile ọnụ, ma kpọkuo ụmụ gị ịhazi mkpụrụokwu niile n’usoro ziri ezi. Gị na ụmụ gị nwere ike gụọ Jenesis 17:15–21; 21:1–7 iji chọta ọmụmaatụ nke ihe Onyenwe anyị mere yiri ka ihe na-adịghị ekwe omume. Kesaara ụmụ gị okwukwe gị na Onyenwe anyị ga-emejupụta nkwa Ya niile, ọbụna ọ bụrụ na ha yiri ihe na-adịghị ekwe omume ma ọ bụ gbuo ogologo oge.

Jenesis 19:15–26

E nwere m ike ịgbanahụ ajọọ omume.

  • Jụọ ụmụ gị maka ọnọdụ nke mmadụ nwere ike ịkpọku ha ime ihe ha maara na-ezighị ezi. Kedụ otu anyị ga-esi “agbanahụ” ọnọdụ ndị a? Chịkọta Jenesis 19:15-26 site na-ịkọwa na ezi na ụlọ nke Lọt biiri n’obodo ukwu gbara ajọọ omume ma ndị mmụọ ozi adọọ ha aka na ntị ịpụ. Dị ka gị na ụmụ gị na-agụkọta amaokwu 15–17, 26, jụọ ha ihe o nwere ike ịpụta maka anyị taa “ịgbanarị” ihe ọjọọ ma “ghara ile anya n’azụ” (amaokwu 17).

nwoke na nwanyị na-agbapụ Sọdọm na Gomorrah

Sọdọm, site n’aka Julius Schnorr von Carolsfeld

Jenesis 22:1–14

Ebraham rubeere Onyenwe anyị isi.

  • Ojiji foto nke Ebraham na Izik na Mkpọgbu n’obe (lee Akwụkwọ Nka Ozi ọma, nos. 9, 57) nwere ike nyere ụmụ gị aka tụnyere akụkọ dị niime Jenesis 22 ya na aja nke Onye Nzọpụta (lee Matiu 27:26–37). Gịnị ka anyị nwere ike ịmụta banyere Nna nke Eluigwe na Jizọs Kraist site na nkọwapụta niile nke Ebraham na Izik na maka Mkpọgbu n’obe? (Lee kwa “Ebraham na Izik,” niime Akụkọ Agba Ochie niile, 34–37.)

    2:0

    Abraham and Isaac

  • I nwere ike iche maka egwuregwu dị mfe igwu gị na ụmụ gị nke na-achọ ka ha soro ntuziaka niile? Ikekwe ntuziaka niile nwere ike iduga na foto nke Onye Nzọpụta zoro ezo. Ihe egwuregwu ahụ nwere ike kpatee mkparịta ụka banyere ihe niile Nna nke Eluigwe nyeworo anyị iwu mee ka anyị nwee ike biri anyị na Ya na Jizọs Kraịst ọzọ. Tulee ịgụ egwu dị ka “Debe Iwu Nsọ niile” (Akwụkwọ Ukwe Ụmụntakịrị, 146–47). Ihu akwụkwọ ihe omume nke izu ụka nke anwekwara ike nye aka.

Maka ihe ndị ọzọ, lee mbipụta nke ọnwa nke a nke magazin Friend.

Ebraham na-ele Izik bu ukwu nkụ

Ebraham na Izik, site n’aka Jeff Ward

Ihu akwụkwọ ihe omume Prịamarị: Ebraham rubeere Onyenwe anyị isi