“Maachị 16–22. ‘Nzube Chineke Maka Ya bụ nke Dị mma’: Jenesis 42-50,” Bianụ, Soro M—Maka Ebe Obibi na Nzukọ nsọ: Agba Ochie 2026 (2026)
“Maachị 16–22. ‘Nzube Chineke Maka Ya bụ nke Dị mma’,” Bịanụ, Soro M: 2026
Mgbaghara, site n’aka Megan Rieker
Maachị 16–22: “Nzube Chineke Maka Ya bụ nke Dị mma”
Jenesis 42–50
O ruworịị ihe dị ka afọ 22 kemgbe ụmụnne nwoke nke Josef rere ya ịgba ohu. Josef atawo ahụhụ ọtụtụ mnwale, gụnyere ebubo ụgha niile na ịtụ mkpọrọ ụgha. Mgbe o mesịrị hụ ụmụnne ya ndị nwoke ọzọ, Josef bụụrụ gọvanọ nke Ijipt niile, onye abụọ naanị nye Fero. Ọ gaara adịrị ya mfe ịbụ ọbọ n’isi ụmụnne ya ndị nwoke, ma buru n’uche ihe ha mere Josef rịị, nke ahụ gaara ekwe nghọta. Ma otu ọ dị Josef gbaghaara ha. Ọ bụghị naanị nke ahụ, mana o nyeere ha aka hụta nzube sinachi dị niime ahụhụ ya. Nzube Chineke Maka Ya bụ nke Dị mma” (Jenesis 50:20), ọ gwara ha, niihi na o tinyere ya n’ọnọdụ ịzọpụta “ndị otu ezi na ụlọ nna ya niile” (Jenesis 47:12).
N’ọtụtụ ụzọ, Josef dị ka Jizọs Kraịst. Agbanyeghị na mmehie anyị niile tara Jizọs ahụhụ dị ukwuu, Ọ na-enye mgbaghara, na-anapụta anyị niile site n’ọnọdụ dị njọ ukwuu karịa ụnwụ. Ma anyị kwesịrị ịnata mgbaghara ma ọ bụ nye ya—n’oge ụfọdụ anyị niile kwesịrị ime ha abụọ—ihe ịmaatụ nke Josef na atụrụ anyị aka n’ebe Onye nzọpụta nọ, ezi nsipụta nke ọgwụgwọ na mkpezi.
Nchepụta niile maka Ọmụmụ ihe N’Ebe Obibi na na Nzukọ nsọ
Jenesis 45:5–7; 47:12
“Chineke zitere m tupu unu iji chekwaa unu.”
Ị matawo myiri ọbụla dị n’etiti ndụ nke Josef na ozi aja mgbaghara mmehie nke Jizọs Kraịst? Ịhụta ụfọdụ ọmụmaatụ nke myiri ndị a, gbalịa ịtụnyere:
-
Jenesis 37:3 ya na Matiu 3:17.
-
Jenesis 37:26–28 ya na Matiu 26:14–16.
-
Jenesis 45:5–7 ya na Luk 4:18.
-
Jenesis 47:12 ya na Jọn 6:35.
Kedụ mmetụta ndị i nwere banyere Onye Nzọpụta na ozi Ya dị ka ị na-agụ edereede ndị a?
Jenesis 45; 50:15–21
Mgbaghara na-ewete ọgwụgwọ.
Ị na-agụ banyere maka Josef dị ka ọ na-agbaghara ụmụnne ya ndị nwoke maka ihe ọjọọ ndị ha meworo nwere ike kpatee mmụọ gị iche banyere onye ị nọ ugbu a na-agba mbọ ịgbaghara. Ajụjụ ndị a sotere nwere ike nye aka dị ka ị na-agbalị itinye ụkpụrụ nke a n’ọrụ:
-
Kedụ ihe mere ọ gaara eji ara Josef ahụ ịgbaghara ụmụnne ya ndị nwoke? (Iji nyochaa ihe ha mere ya, lee Jenesis 37). Kedụ nhụmiihe niile ma ọ bụ njirimara ndị nwere ike nyewo Josef ike iji gbaghara? (Lee, iji maa atụ, Jenesis 45:1-15 ma ọ bụ 50:15-21).
-
Kedụ ngọzi ndị bịara site na mgbaghara nke Josef nye ụmụnne ya ndị nwoke? Ịma atụ, tụnyere mmekọrịta ndị dị niime ezi na ụlọ nke Jekọb na mbido akụkọ ahụ (lee, iji maa atụ, Jenesis 37:3-11) ya na mmekọrịta ndị dị na ngwụcha (lee Jenesis 45:9–15; 50:15-21). Kedụ otu ụmụ ihe gaara eji apụta n’ụzọ dị iche ọ bụrụ na Josef adịghịrịị njikere ịgbaghara?
-
Tulee idedata aha onye nwere ike inwe mkpa mgbaghara gị—ma ha arịọwo mgbaghara ma ha arịọbeghị. Gịnị ka i nwere ike ime iji kpọkuo ike ọgwụgwọ nke Onye Nzọpụta niime ọnọdụ ahụ? Ọ bụrụ ma ịgbaghara yiri ka ihe siri oke ike, tulee inyochagharị ndụmọdụ nke Okenye Gerrit W. Gong niime ahịrị edemede isii ikpeazụ nke ozi ya “Obi ụtọ na Ebighị ebi” (Liahona, Nov. 2022, 85). Kedụ ihe ị na-ahụta na-enye gị olile anya na i nwere ike ịgbaghara?
Lee kwa Ozizi na Ogbụgba ndụ niile 64:9–11; “Mgbaghara: Ibu M Ka E Mere Ịdị Mfe” (vidiyo), Ọba akwụkwọ Ozi ọma.
Forgiveness: My Burden Was Made Light
Jenesis 49
Jekọb nyere ezi na ụlọ ya ngọzi nke onye amụma.
Ngọzi nke Jekọb nye ụmụ ụmụ ya nwere niime ha ihe oyiyi a na-ahụ anya nke ọma, mana ha adịghị mfe nghọta. N’ekele, ozi ọma eweghachitere na-enye anyị ụfọdụ enyem aka. Mgbe ị na-agụ ngọzi enyere Josef niime Jenesis 49:22–26, gụọ amaokwu ndị a sotekwara, ma lee nghọta ndị ha na-ewete: 1 Nifaị 15:12; 2 Nifaị 3:4–5; Jekọb 2:25; Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 50:44.
Dị ka ị na-agụ banyere ngọzi nke Judah niime Jenesis 49:8-12, chetakwa na Jizọs Kraịst bụ onye agbụrụ nke Judah. Kedụ ihe ịchọtara niime amaokwu ndị a na-echetere gị maka Onye Nzọpụta? (lee kwa Mkpughe 5:5–6, 9; 1 Nifaị 15:14–15; Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 45:59; 133:46–50).
Ị na-agụ ngọzi ndị a nwere ike kpakee mmụọ gị inyocha ngọzi nke petrak gị—ma ọ bụ, ọ bụrụ na i nweghị otu, ịnata otu. Kedụ mkpụrụokwu na nkebiokwu ndị dị niime ngọzi gị na-atụgharị echiche gị nye Jizọs Kraịst?
Lee kwa Randall K. Bennett, “Ngọzi Onye Petrak Gị—Odudu Mmụọ Kpatere sitere na Nna nke Eluigwe,” Liahona, Me 2023, 42–44.
Jenesis 50:19-21
Chineke nwere ike inyere m aka chọta mpụtara niime mnwale m niile.
Na-agbanyeghị o dochabeghị anya mgbe ahụ ọ naara agabiga ya, Josef n’ikpeazụ bịara nwee ike ịleghachi anya azụ na mkpagbu ya niime Ijipt ma hụ na “nzube Chineke maka ya bụ nke dị mma” (Jenesis 50:20). Ọ bụrụ na ị nwere ike ileta Josef mgbe ọ nọ niime olulu ahụ ma ọ bụ niime ụlọ mkpọrọ, kedụ otu ị gaara eji akasi ya obi? Kedụ otu Jenesis 50:19-21 ga-eji enyere gị aka niime oge mnwale gị niile?
Lee kwa Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 122; “Otu Ntọala Si Sie ike,” Abụ, no. 85.
Joseph Smith n’etiti Ndị Amụma, site n’aka Paul Mann (nkọwa)
Jenesis 50:24-25
“Ọhụụ ka Onyenwe anyị ga-akpọlite.”
Dị ka ị na-agụ Jenesis 50:24-25 na Ntụgharị asụsụ nke Joseph Smith 50:24-38 (niime appendix nke Baịbụl), tụgharịa uche ihe mere ọ gaara eji adị mkpa nye Josef ịmara banyere Mosis na Joseph Smith ọtụtụ senchuri niihu. Kedụ otu Joseph Smith si mezuo amụma niile nke Josef banyere ya? (lee Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 1:17–23; 20:7–12; 39:11; 135:3).
Maka ihe ndị ọzọ, lee mbipụta niile nke ọnwa nke a nke Liahona na magazin niile Maka Ume nke Ndị Ntoroọbịa
Nchepụta niile maka Ikuziri Ụmụntakịrị
Jenesis 42–44; 45:4–15
E nwere m ike inwe ịhụnaanya na mgbaghara nye ezi na ụlọ m.
-
O nwere ike na-enye obi ụtọ maka ụmụ gị ịmegharị ejije akụkọ nke Josef dị ka ya na ezi na ụlọ ya na-ezukọtakwa ọzọ (lee Jenesis 42–44). Ma ọ bụ ha nwere ike jiri “Josef na Ụnwụ ahụ” (niime Akụkọ niile nke Agba Ochie, 57-60) ma ọ bụ foto niile dị niime ndepụta nke a iji kuzie akụkọ ahụ nye ibe unu. Nke a bụ ụfọdụ ajụjụ ndị nwere ike inyere ụmụ gị aka mụta site na akụkọ ahụ:
-
Gịnị ka Josef mere iji gosi ịhụnaanya nye ezi na ụlọ ya? (lee Jenesis 45:4–15).
-
Gịnị mere i jiri chee na Josef gbaghaara ụmụnne ya ndị nwoke?
-
Kedụ otu i siri chee o siri metụta ụmụnne Josef ndị nwoke mgbe ha chọpụtara na Josef agbagharawo ha? Onye niime ndụ gị nwere mkpa mgbaghara? Olee otu i si egosi ịhụnaanya na mgbaghara?
2:26Joseph and the Famine
-
Dị ka ị na-akwado izu ụka ọbụla, jụọ, “Kedụ ihe ụmụ m ga-eme iji mụta ihe?” Ịma atụ, niime ihe omume nke a ụmụ gị na-eme ejije ma ọ bụ na-akọgharị otu akụkọ. Ime nke a ga-enyere ha aka cheta ma ihe mere ma ụkpụrụ niile nke ozi ọma e nwere niime akụkọ ahụ.
-
Gị ma ọ bụ ụmụ gị nwere ike na-achọ ikesa otu nhụmiihe mgbe ha gbaghaara mmadụ ma ọ bụ mgbe mmadụ gbaghaara ha. Unu nweziri ike gụọ ụdị egwu dị ka “Hụ Ibe Unu Naanya” (Akwụkwọ Ukwe Ụmụntakịrị, 136) ma ọ bụ “Nyere M aka, Ezi Nna” (Akwụkwọ Ukwe Ụmụntakịrị, 99).
Jenesis 48:8-9
Onyenwe anyị na-enyere m aka site na ngọzi niile nke ọkwa nchụaja.
-
Gị na ụmụ gị nwere ike lee anya na foto nke Jekọb na-agọzi ụmụ ya ndị nwoke na ngwụcha ndepụta nke a ma kwukọrịta ihe na-eme (lee Jenesis 48:8-9). Ọ bụrụ ma ọ dị mkpa, kọwaa na Jekọb, nna nke Josef, chọbuuru inye ezi na ụlọ ya ngọzi niile nke ọkwa nchụaja. Elemaanya i nwere ike kesaara ibe unu nhụmiihe ọbụla unu nataworo enyemaka site n’aka Chineke site na ngọzi nke ọkwa nchụaja. Gịnị bụ ụfọdụ ebumnuuche ndị anyị nwere ike ịrịọ maka ngọzi nke ọkwa nchụaja?
Jenesis 45:5–11
Nna nke Eluigwe zitere Jizọs Kraịst ịzọpụta m.
-
Kedụ otu i nwere iji nyere ụmụ gị aka hụ Onye Nzọpụta niime akụkọ nke Josef na-azọpụta ezi na ụlọ ya site na ụnwụ? Tulee ime chaatị jiri kọlum abụọ akpọrọ Josef na Jizọs Kraịst. Nyere ụmụ gị aka chọgharịa na mkpị akwụkwọ nsọ ndị a sotere ma dejuo chaatị jiri ihe ndị Josef na Jizọs nwekọtara ọnụ: Jenesis 37:3 na Matiu 3:17; Jenesis 37:26–28 na Matiu 26:14–16; Jenesis 45:5–7 na Luk 4:18; na Jenesis 47:12 na Jọn 6:35.
-
Jụọ ụmụ gị ihe ọ pụtara ịzọpụta ma ọ bụ gbapụta mmadụ. Ọ bụrụ na onye ọbụla niime ha enweworịị nhụmiihe ịbụ onye azọpụtara ma ọ bụ gbapụta site na ihe ọjọọ, kpọkuo ha ikesa ya. Kedụ otu Josef siri zọpụta ụmụnne ya ndị nwoke? (lee Jenesis 42:1–3; 45:5-7). Mgbe ahụ i nwere ike lekọta anya na foto nke Onye Nzọpụta ma rịọ ụmụ gị ikwu banyere otu Jizọs siri azọpụta anyị.
Maka ihe ndị ọzọ, lee mbipụta nke ọnwa nke a nke magazin Friend .