Come, Follow Me
Echiche ndị aga E Buru n’Uche: Ụlọ nke Izrel


“Echiche ndị aga E Buru n’Uche: Ụlọ nke Izrel,” Bianụ, Soro M—Maka Ebe Obibi na Nzukọ nsọ: Agba Ochie 2026 (2026)

“Ụlọ Izrel,” Bịanụ, Soro M: 2026

akara echiche

Echiche ndị aga Eburu n’Uche

Ụlọ nke Izrel

Otu ebe niime alaịkpa ọwụwa anyanwụ nke Canaan, Jekọb nʻụjọ cheere maka izute ejima ya nwoke, Esọ. Oge ikpeazụ Jekọb hụrụ Esọ, ihe ruru afọ 20 gara aga, Esọ chọbuuru igbu ya. Jekọb nọọrọ abalị niile na mgba, na-achọ ngọzi site nʻaka Chineke. Niihi okwukwe nke Jekọb, ịdịgide adịgide, na mkpebi ya siri ike, Chineke zara ekpere ya niile. Na-abalị ahụ aha Jekọb ka agbanwere ịbụ Izrel, aha nke pụtara, n’etiti ihe ndị ọzọ, “nọgidesie ike ya na Chineke” (Jenesis 32:28, nkọwada b).

Osimiri Jabbok

N’akụkụ Osimiri Jabbok, Jekọb natara aha ahụ Izrel.

Nke a bụ oge mbụ aha ahụ Izrel pụtara niime Baịbụl, ma ọ bụ aha na-anọgidesi ike gburugburu akwụkwọ ahụ na gburugburu agụgụala niile. Aha ahụ na-eteghị anya bịara na-arụtụ aka karịa naanị otu onye. Izrel nwere ụmụ nwoke 12, ma ndị ụmụ ụmụ ha ka a maara n’ukwu dị ka “ụlọ nke Izrel,” “ebo niile nke Izrel,” “ụmụ nke Izrel,” ma ọ bụ “Ndị Izrel.”

Gburugburu agụgụala niile, ụmụ Izrel jiri nnukwu agbụrụ ha kpọrọ nnukwu ihe nihi otu ha siri bụrụ ụmụ ụmụ sitere nʻotu niime ebo iri na abụọ nke Izrel. Agbụrụ ha bụ akụkụ dị mkpa nke ọgbụgba ndụ njirimara ha. Onye Ozi Pọl mara ọkwa na ya bụ “onye si nʻebo nke Benjamin” (Ndị Rom 11:1). Otu ebumnuuche Lehi jiri ziga ụmụ ya ndị nwoke Jerusalem bụ ịnata epekele niile nke bras nwere niime ya “akụkọ agbụrụ nke ndị nna nna ya ha” (1 Nifaị 5:14). Lehi chọpụtara na ya bụ agbụrụ nke Josef, ma nghọta nke ụmụ ụmụ ya nye njikọ ha ruo ụlọ nke Izrel dịịrị mkpa nye ha n’afọ ndị sotere.

Niime Nzukọ nsọ taa, i nwere ike nụ banyere Izrel na nkọwa dị ka “mkpokọta nke Izrel.” Anyị na-agụ banyere “Onye Mgbapụta nke Izrel,” “Olileanya nke Izrel,” na “Unu Ndị Okenye nke Izrel.” N’ọnọdụ ndị a, anyị anaghị ekwu ma ọ bụ na-agụ banyere alaeze nke Izrel mgbe gboo ma ọ bụ mba ugbu a akpọrọ Izrel. Kama, anyị na-ekwu maka ndị nke gbakọtaworo site na mba niile nke ụwa niime Nzukọ nsọ nke Jizọs Kraịst. Anyị na-ekwu maka ndị nke na-anọgidesi ike na Chineke, ndị na-achọsiike maka ngọzi Ya niile, na ndị, site na baptizim, abụrụwo ndị ọgbụgba ndụ Ya. N’okwu niile nke Onyeisi Russell M. Nelson, ịbụ Izrel pụtara “ikwe ka Chineke merie niime ndụ anyị, … ikwe Chineke bụrụ mmetụta kachasị sie ike niime ndụ anyị.”

Ngọzi onye petrak gị na-ama ọkwa njikọ gị nye otu niime ebo niile nke ụlọ nke Izrel. Nke ahụ bụ ihe karịrị otu agụgụala ezi na ụlọ dị mmasị. O nwekwara nrụtụaka n’oge gị ugbua na ọdịniihu gị. Ịbụ akụkụ nke ụlọ nke Izrel pụtara na i nwere mmekọrịta gị na Nna nke Eluigwe na Jizọs Kraist. Ọ pụtara na gị, dị ka Ebraham, kwesịrị “ịbụ ngọzi” nye ụmụ Chineke (Jenesis 12:2; Ebraham 2:9-11) Ọ pụtara, nʻokwu niile nke Pita, na “unu bụ ndudugandu ahọọrọ ahọ, ọkwa nchụaja dị ebube, mba dị nsọ, ndị pụrụ iche; na ndị ga-egosi otuto ya onye kpọpụtaworo unu site n’ọchịchịrị baa na ihè ya dị ịtụnaanya” (1 Pita 2:9). Ọ pụtara na “ga-ekwe ka Chineke merie”—na ị bụ onye “na-anọgidesi ike na Chineke” dị ka ị na-asọpụrụ ọgbụgba ndụ gị na Ya.

agbụrụ ezi na ụlọ

Agbụrụ Ezi na ụlọ nke Jekọb (Izrel), site n’aka Brent Evans

Hụba ama

  1. Lee kwa Jenesis 32:24–32. E nwere mpụtara ndị ọzọ maka aha nke Izrel, gụnyere “Chineke na-achị,” “Chineke na-alụ ma ọ bụ na-anọgidesiike,” na “Kwe ka Chineke merie.”

  2. Lee Alma 26:36; 3 Nifaị 20:25.

  3. Abụ (1985), nọs. 6, 259319.

  4. Russell M. Nelson, “Kwe ka Chineke Merie,” Liahona, Nov. 2020, 92.