“Maachị 9–15. ‘Onyenwe anyị Nọnyeere Josef’: Jenesis 37-41,” Bianụ, Soro M—Maka Ebe Obibi na Nzukọ nsọ: Agba Ochie 2026 (2026)
“Maachị 9–15. ‘Onyenwe anyị Nọnyeere Josef’,” Bịanụ, Soro M: 2026
Josef na Ụmụnne Ya ndị nwoke, site n’aka Sam Lawlor
Maachị 9-15: “Onyenwe anyị Nọnyeere Josef”
Jenesis 37–41
Anyị maara na Chineke na-agọzi ndị tụkwasịrị obi na Ya ma debe iwu nsọ Ya niile. Mana mgbe ụfọdụ ọ naghị eyi otu ahụ. Mgbe ụfọdụ onye ahụ tụkwasịrị obi na Chineke ka a na-emegbu ma gbahapụ site n’aka ndị otù ezi na ụlọ. Mgbe ụfọdụ onye ahụ kara obi jụ imebi iwu mmekọrịta ka a na-ebokwa ebubo. Mgbe ihe dị ka nke ahụ mere anyị, e nwere ike nwaa anyị iwere Chineke iwe. Anyị nwere ike na-eche, “Kedụ uru ịgba mbọ ime ihe ziri ezi ebe ọ dị ka naanị ihe ọ na-eme bụ ka ndụ ratukwuo ahụ?”
Josef, nwa Jekọb, gakwaara eche otu ahụ. Mgbe ụfọdụ, nwoke nke a kwesịrị ntụkwasị obi na-eme nke ọma; mgbe ọzọ, o yiri ka dị ka ọ na-ekwesị ntụkwasị obi karịa, otú ahụ ka o na-ezute ihe isi ike karịa. Mana Josef adịghị mgbe ọ hapụrụ Onyenwe anyị, ma Onyenwe anyị adịghị mgbe ọ hapụrụ Josef. Nke ahụ apụtaghị na Onyenwe anyị gbochiri ihe ọjọọ site na-imere Josef, mana site na ya niile, “Onyenwe anyị nọnyeere ya” (Jenesis 39:3).
Nchepụta niile maka Ọmụmụ ihe N’Ebe Obibi na na Nzukọ nsọ
Jenesis 37:1–28; 39; 41:9–45
Onyenwe anyị ga-anọnyere m n’ihe isi ike m.
Mgbe na mgbe, ịhu ọma yiri ka ọ gbahapụrụ Josef, mana Onyenwe anyị emeghị ma ọlị. Dị ka ị na-agụ akụkọ nke Josef, tụgharịa uche ajụjụ niile dị ka ndị a: Gịnị ka Josef mere iji nọrọ Onyenwe anyị nso? Kedụ otu Onyenwe anyị siri “nọnyere ya”? (lee Jenesis 39; 40:1–19; 41:9–45). Gịnị ka ị na-amụta site nʻakụkọ nke Josef nke nwere ike inyere gị aka mata nnọnyere nke Onyenwe anyị niime ndụ gị?
I nwekwara ike jụọ ụdị ajụjụ yiri nke a banyere ndụ gị. Kedụ ihe aka ebe ị hụworo na Onyenwe anyị ahapụbeghị gị n’oge mnwale? Tulee otu i nwere ike iji kesaa nhụmiihe gị na ndị otù ezi na ụlọ na ndudugandu dị niihu (lee 1 Nifaị 5:14).
Nʻezie, ị ga-enwe mnwale ndị ọzọ n’ọdịniihu. Kedụ ihe i nwere ike ime iji hụ na mnwale ndị a adọpụghị gị site n’ebe Onyenwe anyị nọ? Tulee ide akwụkwọ ozi iji gbaa ọdịniihu gị ume ịnọ Ya nsọ n’agbanyeghị ihe ọ bụla. I nwere ike gụnyekọta nghọta ndị dị niime ndụ nke Josef ma ọ bụ ozi nke Okenye D. Todd Christofferson Mmekọrịta Anyị na Chineke” (Liahona, Me 2022, 78–81).
Lee kwa Jọn 14:18; Ndị Rom 8:28; Alma 36:3; Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 121:7–8; “Nọnyere M!,” Abụ, no. 166.
Jenesis 37:5–11; 40; 41:1–38
Ọ bụrụ na m kwesịrị ntụkwasị obi, Onyenwe anyị ga-edu m ma kpatee mmụọ m.
Josef nwere onyinye nke ịghọta ozi sitere n’aka Onyenwe anyị site na nrọ. Kedụ ihe i nwere ike ịmụta site na Jenesis 37:5–11; 40:5–8; 41:14–25, 37–38 banyere ịnata na ịghọta mkpughe site n’aka Onyenwe anyị? Iji maa atụ, gịnị ka i nwere ike ịmụta site n’ọmụmaatụ nke Josef mgbe mkpughe yiri ka o siri ike nghọta? (Lee Jenesis 40:8; 41:16).
Tụgharịa uche otu Onyenwe anyị si na-ekpughere gị uche Ya. Kedụ ihe i na-eme iji tinye mkpughe O nyeworo gị nʻọrụ? Kedụ otu i si achọ odudu ndị ọzọ sitere na Ya?’
Josef Na-akọwa Nrọ niile nke Butler na nke Baker, site n’aka François Gérard
Jenesis 39:1–20
Site na enyem aka nke Onyenwe anyị, e nwere m ike ịgbanarị ọnwụnwa.
Ọ bụrụ ma Josef gaara enye ndụmọdụ otu esi agbanarị ọnwụnwa nke ime njọ mmekọ ahụ, kedụ ihe i chere ọ ga-ekwu? Chee banyere nke a dị ka ị na-agụ banyere nhụmiihe ya niime Jenesis 39. Ịma atụ, tulee otu Josef nwere ike iji zaghachi ajụjụ dị ka ndị a:
-
Ọ bụrụ na enweghị onye ọzọ maara ihe m na-eme, kedụ oke ihe ọ bụ? (lee amaokwu ndịa 8-9).
-
Ana m anwa ịgbanarị ya, mana ọnwụnwa ahụ eyighị ka ihe ga-akwụsị (lee amaokwu 10).
-
Gịnị ka m ga-eme mgbe m nọ n’ọnọdụ ebe ọnwụnwa siri ike? (lee amaokwu 12).
Kedụ otu i ga-esi akọwa ihe kpatara irube isi nye iwu mmekọrịta si dị mkpa? (lee Maka Ume nke ndị Ntoroọbịa: Odudu maka Ime Nhọrọ niile, 23-28).
Ọmụmaatụ nke Josef, n’ezie, nwere ike ịdaba n’ụdị ọnwụnwa ndị ọzọ. Buru nhụmiihe nke Josef n’obi, tulee ịtụ atụmatụ maka izere na ịguzogide ọnwụnwa. Ịma atụ, i nwere ike chee maka otu ọnwụnwa ma dedata ọnọdụ niile iji zere na otu i ga-esi “agbanarị” mgbe ọnwụnwa malitere.
|
Ọnwụnwa | |
|
Ọnọdụ niile iji zere | |
|
Atụmatụ iji zaghachi |
Ebe a bụ akwụkwọ nsọ ndị ọzọ nwere ike inyere atụmatụ gị aka. Kedụ ihe ị na-amụta site na nke ọbụla banyere otu Onye Nzọpụta nwere ike isi nyere gị aka guzogide ọnwụnwa? Matiu 4:1–11; 1 Ndị Kọrịnt 10:13; 1 Nifaị 15:23–24; 3 Nifaị 18:17–18.
Dị ka ị na-eme atụmatụ gị, o nwekwara ike nye aka iche banyere oge ndị gara aga mgbe i zeere ma ọ bụ guzogide ọnwụnwa nke ọma. Kedụ otu Onyenwe anyị si nyere gị aka? (Lee 2 Nifaị 4:18–33).
Jenesis 41:15-57
Onyenwe anyị ga enyere m aka kwadoo maka ohere nke ndị nwere ike ịpụta.
Ntapịa Josef mere nrọ nke Fero dugara ruo na ụfọdụ ndụmọdụ dị mma na nke na-ekwe omume maka nlanarị ụnwụ (lee Jenesis 41:15-57). Tulee ụdị ozi ime mmụọ ndị Onyenwe anyị nwere ike inwe maka gị niime nkọwapụta nke a. Kedụ otu i siri chee na Ọ chọrọ gị ikwado maka ihe isi ike n’ọdịniihu gị?
Lee kwa Devid A. Bednar, “Anyị Ga-anwale Ha N’ebe a,” Liahona, Nov. 2020, 8–11.
Maka nchepụta ndị ọzọ, lee mbipụta niile nke ọnwa nke a nke Liahona na magazin niile Maka Ume nke Ndị Ntoroọbịa
Nchepụta niile maka Ikuziri Ụmụntakịrị
Jenesis 37
E nwere m ike inwe obi ọma n’ebe ndị ezi na ụlọ m nọ.
-
Ị na-agụ banyere mmetụta niile siri ike niime ezi na ụlọ nke Josef nwere ike kpatee mkparịta ụka banyere otu anyị ga-esi akpasị ndị otù ezi na ụlọ anyị agwa. Ịkọ akụkọ nke Josef na ụmụnne ya ndị nwoke site na Jenesis 37, i nwere ike jiri foto niile dị niime ndepụta nke a ma ọ bụ niime “Nrọ Mkpate mmụọ nke Josef” (niime Akụkọ Agba Ochie niile, 47-51). Kwe ka ụmụ gị kekọrịta ihe nkọwa ndị ha maara banyere akụkọ ahụ. I nwere ike rịọ ụmụ gị iche na ha nọ n’ezi na ụlọ nke Josef. Gịnị ka ha gaara ekwu ma ọ bụ mee iji bụrụ ome udo niime ezi na ụlọ ahụ? Ịma atụ, kedụ ihe ọ pụtara “ikwu okwu n’ụzọ udo” niime ezi na ụlọ anyị? (amaokwu 4). Kedụ otu Jizọs Kraịst sị bụrụ ome udo niime ezi na ụlọ nke Chineke?
2:17Joseph’s Inspired Dreams
Jenesis 37:18–28; 39:20–23; 41:38
Chineke pụrụ inyere m aka mgbe ihe ọjọọ mere.
-
Mgbe ụmụ gị zutere oge ndị siri ike, ha kwesịrị ịmara na Onyenwe anyị ga-anọnyere ha, dị ka Ọ nọnyeere Josef. Ikekwe i nwere ike nyere ụmụ gị aka depụta ihe ndị siri ike nke mere Josef (lee Jenesis 37:23–28; 39:20; ma ọ bụ “Nrọ Mkpake mmụọ nke Josef” na “Josef niime Ijipt,” niime Akụkọ Agba Ochie niile, 47–51, 52–56). Mgbe ha chọpụtara ihe isi ike nke ọbụla, kpọkuo ụmụ gị ikwugharị, “Onyenwe anyị Nọnyeere Josef” (Jenesis 39:2).
2:17Joseph’s Inspired Dreams
2:50Joseph in Egypt
-
Ikekwe ụmụ gị nwere ike nyochagharịa Jenesis 39:1–3, 20–23 maka ọmụmaatụ nke ọbụla nke nkebiokwu a “Onyenwe anyị Nọnyeere Josef” na nkebiokwu ndị yiri ibe ha. Kwe ha ikesa ihe ha chere nkebiokwu nke a pụtara. Kedụ otu anyị ga-esi amata na Onyenwe anyị nọnyeere anyị? Gwa ibe unu banyere otu o si emetụta gị na Chineke nọnyeere gị n’oge ịma aka.
Josef nke Ijipt nọ niime Ụlọ mkpọrọ, site n’aka Jeff Ward (uju)
Jenesis 39:7–12
Site na enyem aka nke Onyenwe anyị, e nwere m ike ịgbanarị ọnwụnwa.
-
N’ebe a bụ ihe ọmụmụ mkpanaka nke nwere ike inyere ụmụ gị aka soro ọmụmaatụ Josef nke ịgbanarị site n’ebe nwunye Pọtịfa nọ: Jiri magnet abụọ ji nọchite anya Jizọs Kraịst na Setan. Jiri nwa obere ihe mkpanaka igwe, dị ka klip akwụkwọ, ji nọchite anya anyị. Mgbe ahụ kwe ụmụ gị ịhụ otu ike mmetụta magnet n’ihe mkpanaka igwe ji sie ike karịa mgbe ha kwagara ihe mkpanaka ahụ nso ya. Kedụ otu nhụmiihe nke Josef niime Jenesis 39:7–12 si kọwaa ezi okwu nke a. Gịnị ka anyị nwere ike ime iji pụọ site na mmehie ma garuo nso n’ebe Jizọs nọ? Vidiyo ahụ “Ọnwụnwa Nʻapụ dị ka Anyị Na-achọ Kraịst niime Echiche Niile” (Ọba akwụkwọ Ozi ọma) na otu egwu dị ka “A Chọrọ M Gị Awa Niile” (Abụ, no. 98) nwere ike inye aka na mkparịta nke a.
2:58Temptation Fades as We Seek Christ in Every Thought
Jiri egwu. “Abụ na egwu nsọ ndị ọzọ nwere ike inyere ụmụ gị aka nwete mmetụta ịhụnaanya nke Chineke, nwete mmetụta nke Mmụọ, ma mụta eziokwu niile nke ozi ọma. Olu egwu niile, ahịrịụda niile, na ndakọrịta mfe niile nwere ike nyere ụmụ gị aka cheta eziokwu niile nke ozi ọma maka afọ ndị na-abịa. Dị ka gị na ụmụ gị na-agụ egwụ, nyere ha aka chọpụta ma ghọta ụkpụrụ niile akuziri niime egwu ndị ahụ” (Ikuzi ihe n’Ụzọ nke Onye Nzọpụta, 32).
-
Nyere ụmụ gị aka chee maka ọnwụnwa niile ha zuteworo. Kwe ha igosipụta otu ha nwere ike iji “gbanarịa” site n’ọnwụnwa ndị a.
Maka ihe ndị ọzọ, lee mbipụta ọnwa nke a nke magazin Friend