“Maachị 2–8. ‘Kwe ka Chineke Merie’,” Bianụ, Soro M—Maka Ebe Obibi na Nzukọ nsọ: Agba Ochie 2026 (2026)
“Maachị 2–8. ‘Kwe Ka Chineke Merie” Bịanụ, Soro M: 2026
Esau Eree Oke nna Ya, site n’aka Glen S. Hopkinson (nkọwa)
Maachị 2-8: “Kwe Ka Chineke Merie”
Jenesis 24– 33
Kedụ otu i si enwetere onwe gị ngọzi site n’aka Chineke? I nwere ike kwuo na nkọwapụta nke Jekọb, nwa nwa Ebraham na Sera, bụ akụkọ nke otu nwoke onye matara azịza nye ajụjụ ahụ. N’omenaala ebe ọpara na-anata ngọzi oke nna, Jekọb bụ nke abụọ a mụrụ, na-ejide ikere ụkwụ nke ejima ya nwoke, Esau. Aha ahụ “Jekọb” pụtara “supplanter”—onye na-anọchite onye ọzọ. Jekọb biri ndụ kwesịịrị aha ahụ site na-ịgbalị, karịa otu oge, ịnọchite Esau dị ka onye nrite nke ngọzi oke nna niihi na Esau etozughị oke ya (lee Jenesis 25:30–34; 26:34–35; 27:36) Nsonazụ ya bụ nsogbu niime ezi na ụlọ, ma Jekọb bịara gbafuo niime alaịkpa maka ndụ ya.
Mgbe ọtụtụ afọ gara, Chineke nyere Jekọb iwu ịlaghachi ebe obibi. N’ụzọ, Jekọb, nʻobi umeala, ọzọkwa chọrọ ngọzi site n’aka Chineke. Akwụkwọ nsọ na-akọwa oge nke a dị ka “ịgba mgba” nye Jekọb, ma o kwuputara na ya agaghị ada mba “ewezuga ma ị gọziri m” (Jenesis 32:26). Mgbe ahụ ka ihe mmụta bịara—na ngọzi ahụ. Chineke gbanwere aha Jekọb ịghọ Izrel—nke pụtara, nʻetiti ihe ndị ọzọ, “kwe ka Chineke Merie.” Izrel mụtara na ịnata ngọzi nke Chineke ndị kacha baa uru, ngọzi ọgbụgba ndụ Ya niile, ọ dịghị mkpa ịnọchi nke onye ọzọ. Ngọzi Ya niile abụghị ihe a na-azụ azụ ma ọ bụ nwụchie ma ọ bụ rite na mmeri. Ọ na-enye ha nʻefu nye ndị niile na-ebi ndụ kwesịrị aha nke Izrel—ndị kwere ka Chineke merie na ndụ ha.
Nchepụta niile maka Ọmụmụ ihe N’Ebe Obibi na na Nzukọ nsọ
Jenesis 24
Ọlụlụ di na nwunye ọgbụgba ndụ dị oke mkpa nye atụmatụ ebighị ebi nke Chineke.
Mgbe ị na-agụ Jenesis 24, jụọ onwe gị ihe kpatara Ebraham jiri hụta ọlụlụ di na nwunye nke nwa ya nwoke Aịzik ịdị oke mkpa. Gịnị mere ọlụlụ di na nwunye si dị oke mkpa nye Chineke?
Kedụ njirimara ndị ị na-ahụ niime Ribeka nke ga-enyeaka mee ka alụmdi na ezi na ụlọ sie ike? (lee kacha nke amaokwu ndịa 15–28, 57–61).
Lee kwa Isiokwu niile na Ajụjụ niile, “Ọlụlụ di na nwunye,” Ọba akwụkwọ maka Ozi ọma.
Jenesis 25:29–34
E nwere m ike ịkpọ ihe ndị dị ebighị ebi ihe karịa ihe nke ụwa.
N’omenaala nke Aịzik na Ribeka, nwa nwoke kacha okenye na-anata oke nna ahụ, nke pụtara ihe nketa kacha, ya na oke na ọrụ kacha nke ilekọta ezi na ụlọ ahụ. Dị ka ị na-agụ Jenesis 25:29–34, tụgharịa uche ihe mere Esau jiworo dị njikere ịhapụ oke nna ya na mgbanwe maka nri. Kedụ ihe mmụta ndị ị na-achọta maka onwe gị niime nkọwapụta nke a? O nwere ike inye aka idepụta ihe abụọ: (1) ngọzi ebighị ebi niile Chineke na-achọ inye gị na (2) ihe nke ụwa ndị nwere ike imegharị gị anya. Mgbe ahụ i nwere ike gụọ edereede ahụ, idochi “oke nna” jiri ihe sitere na ndepụta nke mbụ na “nri agwọrọ agwọ” jiri ihe sitere na nke abụọ. Kedụ otu ị ga-esi elekwasị anya n’Onye Nzọpụta na ngọzi ebighị ebi niile nke Ozi ọma Ya?
Lee kwa Matiu 6:19–33; M. Russell Ballard, “Cheta Ihe ndị Kacha Dị mkpa,” Liahona, Me 2023, 105–7.
Jekọb nọ na Betel, site n’aka James Smetham
Jenesis 28
Ọgbụgba ndụ niile nke ụlọ nke Onyenwe anyị na-ewete ike nke Chineke niime ndụ m.
Mgbe o dinara na pilo nke okwute, Jekọb rọrọ nrọ na-agbanwe ndụ. Ọ bụ ụdị nhụmiihe dị nsọ na Jekọb kpọrọ ebe ahụ Betel, ma ọ bụ “ụlọ nke Chineke,” na-ekwupụta, “N’ezie Onyenwe anyị nọ n’ebe a” (Jenesis 28:16).
Dị ka ị na-agụ Jenesis 28, i nwere ike jụọ onwe gị ihe mere nhụmiihe nke a si dịrị nsọ nye Jekọb. Kedụ ihe ọ nọ na-agabiga n’oge ahụ? Kedụ otu o nwere ike na-eche n’obi ya? I nwekwara ike chọọ mkpụrụokwu na nkebiokwu ndị dị niime amaokwu ndịa 10-22 na-echetere gị maka ụlọ nke Onyenwe anyị. Kedụ mmetụta ndị ị natara banyere Chineke, ụlọ Ya, na ọgbụgba ndụ Ya niile?
Na ngwụcha ndepụta nke a bụ eserese e tere agba na-egosipụta nrọ Jekọb; i nwere ike rụtụ ya aka dị ka ị na-agụ. Ọ bụrụ na ọ dịịrị gị imepụta ngosipụta nka nrọ ya nke gị, gịnị ka i ga-eme? Kedụ eziokwu ndị sitere na akụkọ ahụ ka ị ga-anwa igosi?
Abụ ahụ “Nso nso, Chineke M, nye Gị” (Abụ, no. 100) dabeere na nhụmiihe nke Jekọb. Kedụ njikọ ndị ị na-ahụ n’etiti egwu nke a na Jenesis 28:10–22? Kedụ otu tempụl nke a si enyere gị aka dịkwuo nso nye Chineke? Tụlee ịchọ azịza niile nye ajụjụ nke a dị niime ozi nke Onyeisi Russell M. Nelson “Tempụl na Ntọala Ime Mmụọ Gị” (Liahona, Nov. 2021, 93–96). I nwekwara ike na-achọ inyochagharị ọgbụgba ndụ niile na ngọzi niile nke ụlọ nke Onyenwe anyị niime Akwụkwọ Ntuziaka Izugbe, 27.2 (Ọba akwụkwọ Ozi ọma). Kedụ otu idebe ọgbụgba ndụ ndị a si ewete ike nke Chineke niime ndụ gị?
Nwee ekeereuche. E nwere ọtụtụ ụzọ ndị esi amụta ihe site na akwụkwọ nsọ agụpụ naanị nnọọ ịgụ ha. Ụfọdụ ndị na-achọta na ha na-aghọta akwụkwọ nsọ nke ọma ma ọ bụrụ ma ha see eserese niile nke nkọwapụta ahụ. Ndị ọzọ na-achọta nghọta ime mmụọ n’egwu dị nsọ metụtara akwụkwọ nsọ ahụ. Ebelatakwala onwe gị nye otu ụzọ eji amụ ihe; dị njikere ịnwa ụzọ dị iche iche esi eme ihe.
Jenesis 29:31–35; 30:1–24
Onyenwe anyị na-echete m na mnwale m niile.
Dị ka ị na-agụ Jenesis 29:31–35 na 30:1–24, chọọ maka mkpụrụokwu ndị na-akọwa ebere nke Chineke nye Rachel na Leah. Tụgharịa uche otu Chineke siworo “lekwasị anya na mkpagbu [gị]” ma “cheta” gị (Jenesis 29:32; 30:22).
Jenesis 32–33
Onye Nzọpụta pụrụ ịgwọ ezi na ụlọ m.
Dị ka Jekọb lọghachiri na Kenan, ọ “tụrụ oké egwu ma nwee obi erughị ala” banyere otu nwanne ya nwoke, Esau, ga-esi anabata ya (Jenesis 32:7). Dị ka ị na-agụ Jenesis 32–33, tụgharịa uche maka mmekọrịta nke ezi na ụlọ nke onwe ha—elemaanya kacha nke nwere mkpa ọgwụgwọ. Ikekwe akụkọ nke a nwere ike kpateemmụọ gị ịkpọtụrụ mmadụ. Ajụjụ ndị dị ka ndị a nwere ike duo ọgụgụ gị:
-
Kedụ otu Jekọb siri kwadoo izute Esau?
-
Kedụ ihe pụtara ihè nye gị banyere ekpere nke Jekọb achọtara niime Jenesis 32:9–12?
-
Kedụ ihe ị na-amụta banyere mgbaghara site na ọmụmaatụ nke Esau?
-
Kedụ otu Onye Nzọpụta si enyere anyị aka gwọọ mmekọrịta ezi na ụlọ?
Maka ihe ndị ọzọ, lee mbipụta niile nke ọnwa nke a nke Liahona na magazin niile Maka Ume nke Ndị Ntoroọbịa.
Nchepụta niile maka Ikuziri Ụmụntakịrị
Jenesis 24:10–21
Enwere m ike ịdị obi ọma nye ndị ọzọ.
-
Ime ọmụmaatụ dị mmasị nke obi ọma nke Ribeka pụta ìhè, i nwere ike gosi ụmụ gị foto dị n’okpuru ma ọ bụ ihu akwụkwọ ihe omume nke izu ụka nke a dị ka ị na-achịkọta akụkọ nke a dị niime Jenesis 24:10–21. Ụmụ gị nwere ike nwee obi ụtọ igosipụta akụkọ ahụ. I nwere ike duo otu mkparịta ụka banyere omume niile nke obi ọma gị na ụmụ gị hụworo.
-
Tulee ịgụkọta otu egwu ọnụ banyere obi ọma, dị ka “Obi ọma Na-amalite na M” (Akwụkwọ Ukwe Ụmụntakịrị, 145). Ụmụ gị nwere ike gee ntị maka mkpụrụokwu “obi ọma” (ma ọ bụ mkpụrụokwu yiri ya) ma guzoro mgbe ha nụrụ ya. Kedụ otu anyị nwere ike iji nwee obi ọma dị ka Ribeka?
Ndị Dike Agba Ochie, site n’aka Dilleen Marsh (nkọwa)
Jenesis 25:21–34
Ihe ndị dị ebighị ebi dị mkpa karịa ihe ndị nke elu ụwa.
-
Tụlee ojiji “Jekọb na Esau” (niime Akụkọ niile nke Agba Ochie, 38–41) iji nyere ụmụ gị aka ghọta akụkọ dị niime Jenesis 25:21–34. Ikekwe ụmụ gị nwere ike chee na Esau rịọrọ maka ndụmọdụ ha banyere ma ọ ga-ere oke nna ya maka nri agwọrọ agwọ. Kedụ ihe ha ga-agwa ya?
2:5Jacob and Esau
-
Kedụ ihe ndị dị mkpa ebighị ebi nye gị na ụmụ gị? Ikekwe ụmụ gị nwere ike chọta foto niile ma ọ bụ ihe ndị eji nʻaka nke nọchitere ihe ndị a. Kedụ otu anyị ga-esi egosi Onyenwe anyị na ihe ndị a dị mkpa nye anyị?
Jenesis 28:10–22
Ọgbụgba ndụ na-enyere m aka ịlaghachikwuru Nna nke Eluigwe.
-
Dị ka unu na-agụkọta Jenesis 28:10–22 ọnụ, i nwere ike jiri ubube ma ọ bụ ebe nzọụkwụ (ma ọ bụ foto dị ka nke ahụ nọ na ngwụcha ndepụta nke a) iji kwuo okwu banyere otu ọgbụgba ndụ anyị si dị ka ubube. Ikekwe ụmụ gị nwere ike mee ka aga asị ha na-arị elu ubube, ma na nzọụkwụ ọbụla, kwuo banyere oge niile mgbe anyị kwere nkwa irubere Chineke isi, dị ka mgbe anyị mere baptizim, rie oriri nsọ, ma ọ bụ gaa na tempụl. Kedụ otu ọgbụgba ndụ anyị si akpọta anyị nso nso ruo na Chineke?
Jenesis 32:6–11; 33:1–4
Nna nke Eluigwe na Jizọs Kraist pụrụ inyere m aka hụ ezi na ụlọ m naanya.
-
Idubata amaokwu ndị a, i nwere ike kọwaa na mgbe ọtụtụ afọ nke mmetụta ndị siri ike gasịrị, Jekọb nọ na-aga izute Esau ọzọ. Gụkọta Jenesis 32:6–11ọnụ. Kedụ otu o si metụta Jekọb? Kedụ ihe o mere iji nwete enyemaka? Gụkọta Jenesis 33:1–4 ọnụ iji chọpụta otu Onyenwe anyị siri zaa ekpere nke Jekọb. Ọ bụrụ na Jekọb na Esau nwere ike ịgwa anyị okwu taa, gịnị ka ha nwere ike ikwu iji nyere anyị aka mgbe enwere esemokwu niime ezi na ụlọ anyị?
Maka ihe ndị ọzọ, lee mbipụta nke ọnwa nke a nke magazin Friend.