“Febrụwarị 16–22. Ị Bụ Nnukwu Onye Nsiso nke Ezi omume”: Jenesis 12–17; Ebraham 1–2,” Bianụ, Soro M—Maka Ebe Obibi na Nzukọ nsọ: Agba Ochie 2026 (2026)
“Febrụwarị 16–22. ‘Ị Bụ Nnukwu Onye Nsiso nke Ezi omume’,” Bịanụ, Soro M: 2026
Melkizedek Na-agọzi Ebram, site n’aka Walter Rane (nkọwa)
Febrụwarị 16-22: “Ị Bụ Nnukwu Onye Nsiso nke Ezi omume”
Jenesis 12–17; Ebraham 1–2
Niihi ọgbụgba ndụ Chineke na ya mere, Ebraham ka akpọworo “nna ndị kwesịrị ntụkwasị obi” (Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 138:41) na “Enyi Chineke” (James 2:23). Nde kwuru nde taa na-akwanyere ya ugwu dị ka nna nna ha kpọmkwem, ma ndị ọzọ ka akpọbataworo niime ezi na ụlọ ya site na ntọghata nye ozi ọma nke Jizọs Kraịst. Otu ọ dị Ebraham n’onwe ya sitere n’ezi na ụlọ nsogbu pụta—nna ya, onye hapụworo ezi ofufe nke Chineke, nwara iji Ebraham chụọ aja nye arụsị ụgha niile. Na-agbanyeghị nke a, ọchịchọ nke Ebraham bụụrụ “ị bụ nnukwu onye nsiso nke ezi omume” (Ebraham 1:2), ma nkọwapụta nke ndụ ya gosiri na Chineke kwanyeere ọchịchọ ya ugwu. Ndụ Ebraham guzooro dị ka ama na na-agbanyeghị ihe agụgụala ezi na ụlọ nke mmadụ bụwooro, ọdịniihu nwere ike juputa n’olile anya.
Nchepụta niile maka Ọmụmụ ihe N’Ebe Obibi na na Nzukọ nsọ
Chineke na-agọzi m niihi okwukwe m na ọchịchọ ezi omume m niile.
“Anyị niile ka ike mmetụta ezi na ụlọ anyị [na] omenaala anyị metụrụ,” Okenye Neil L. Andersen kuziri, “ma otu ọ dị e kwere m na-enwere niime anyị ebe anyi nwere ikike pụrụ iche ijikwata ma kepụta n’otu n’otu. … N’ikpeazụ, ọchịchọ ime obi anyị ka a na-enye ndụ ma a na-ahụ ha na nhọrọ anyị niile na omume anyị niile” (“Zụọ Ọchịchọ Gị niile, ka Okenye Andersen nyere ndụmọdụ,” ChurchofJesusChrist.org). Tulee otu Ebraham 1:1-19 si egosipụta ihe Okenye Andersen kuziri. Ajụjụ ndị dị ka ndị a nwere ike nye aka:
-
Gịnị ka Ebraham na-achọ? Kedụ otu ọchịchọ ya niile si pụta ihe n’omume ya niile? Kedụ otu Chineke siri kwadoo ọchịchọ ya niile?
-
Gịnị bụ ọchịchọ gị niile? Kedụ otu ha siri pụta ihè n’omume gị niile? Kedụ otu Chineke si na-akwado gị?
-
Kedụ ozi amaokwu ndị a nwere maka ndị ezi na ụlọ ha anaghị achọ ezi omume?
Otu niime ọchịchọ nke Ebraham na Sera kachasị ukwuu—ịmụ nwa—ka emejuputaghị ruo ọtụtụ afọ (lee Jenesis 15:1-6). Kedụ ihe ị na-amụta site na Ndị Hibru 11:8-13 banyere otu Ebraham na Sera si gabiga mnwale nke a? Kedụ otu Onye Nzọpụta si enyere gị aka “nabata” nkwa Ya niile, ọbụna ọ bụrụ na ha “tere anya”?
Lee kwa “Nnapụta nke Ebraham” (vidiyo), Ọba akwụkwọ Ozi ọma.
Deliverance of Abraham
Jenesis 12:1–3; 13:15–16; 15:1–6; 17:1–8, 15–22; Ebraham 2:6–11
Chineke chọrọ ka m gbaa ma debe ọgbụgba ndụ mụ na Ya.
Gịnị mere o jiri dị mkpa nye gị ịmara banyere ọgbụgba ndụ Chineke na Ebraham gbara? Niihi na Chineke na-achọ ka gị na Ya gbaa otu ụdị ọgbụgba ndụ ahụ. O kwere nkwa na ọgbụgba ndụ nke a ga-aganiihu niime ụmụ ụmụ nke Ebraham, ma ọ bụ “mkpụrụ,” ma na “ka ha raa natara Ozi ọma nke a ka a … ga-agụnye mkpụrụ gị” (lee Ebraham 2:10-11). N’ụzọ ọzọ, ọgbụgba ndụ ahụ na-aganiihu niime gị—mgbe i mere baptizim ma zukwuo oke mgbe i mere ọgbụgba ndụ niime tempụl (lee Ndị Gale 3:26–29; Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 132:30–32).
Niihi ebumnuuche ahụ, i nwere ike na-achọ ịmụ Ebraham 2:6–11 ma depụta ihe, kpọmkwem, Chineke kwere Ebraham na Sera na nkwa (lee kwa Jenesis 12:1–3; 13:15–16; 15:1–6; 17:1–8, 15–22). Kedụ otu ngọzi ndịa si tụnyere gị?
Ụfọdụ niime nkwa ndị a nwere myiri ndị dị ebighị ebi. Kedụ otu nkwa niile dị ka ala nketa ma ọ bụ nnukwu ụmụ ụmụ si emezu ruo ebighị ebi? (lee Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 131:1–4; 132:20–24, 28–32).
Ewezuga ikwe nkwa ngọzi niile, Chineke gwara Ebraham ị “bụ ngọzi” (Jenesis 12:2; nkwusi ike agbakwunyere). Gịnị ka i chere nke ahụ pụtara? Kedụ otu ị ga-esi a bụ ngọzi? (lee Ebraham 2:11).
Ikuzi banyere ọgbụgba ndụ niile, Okenye Dale G. Renlund kwuru maka ebili mmiri ndị dị niime Osimiri Amazon, ma Onyeisi Emily Belle Freeman kwuru banyere ịga ije n’ụzọ nkume juputara jiri nkwonkwoụkwụ gbajiri agbaji (lee “Inweta Ike nke Chineke site na Ọgbụgba ndụ niile,” Liahona, Me 2023, 35–37; “Ije ije na Mmekọrịta gị na Kraịst,” Liahona, Nov. 2023, 76–79). Chọgharịa otu ma ọ bụ abụọ nke ozi ndị a maka ahịrịokwu ndị na-enye aka zaa ajụjụ “Gịnị mere Chineke si chọọ ka mụ na Ya gbaa ndụ?”
Kpọkuo ndị mmadụ ikuziri ibe ha. Ọ bụrụ na ị na-akuziri ezi na ụlọ gị ma ọ bụ klas Nzukọ nsọ banyere ọgbụgba ndụ niile, tulee inye onye ọbụla akụkụ ozi nke Okenye Renlund ma ọ bụ nke Onyeisi Freeman ịmụ. Emesịa ha nwere ike kesaara ndị ọzọ nọ n’ezi na ụlọ ma ọ bụ klas ihe ha mụworo. Nke a na-ekwe ndị mmadụ ịgba ama nye ma mụta site n’aka onye n’ibe ya, ma nke ahụ na-akpọku Mmụọ. (Lee Nkuzi ihe n’Ụzọ nke Ọnye Nzọpụta, 26.)
Lee kwa Isiokwu niile na Ajụjụ niile, “Ọgbụgba ndụ nke Ebraham,” Ọba akwụkwọ Ozi ọma; “Echiche ndị aga E Buru n’Uche: Ọgbụgba ndụ Ahụ,” niime akụrụngwa nke a.
Ọgbụgba ndụ nke Ebraham, site n’aka Dilleen Marsh (uju)
Jenesis 14:18–19; Ntụgharị asụsụ Joseph Smith, Jenesis 14:25–40
“Melkizedek bụ nwoke okwukwe.”
Chee na ị na-akọwa Melkizedek nye onye na-amaghị ya. Gịnị ka ị ga-ekwu? Chọọ maka nchepụta dum niime Ntụgharị asụsụ Joseph Smith, Jenesis 14:26–27, 33–38 (niime appendix Baịbụl); Alma 13:13–19; Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 107:1–4. Kedụ njirimara yiri Kraịst ị na-ahụ niime nkọwa Melkizedek ndị a? Kedụ otu ọmụmụ ihe gị nke ndụ nke Melkizedek si emetụta ụzọ i si ahụ Ọkwa nchụaja Melkizedek?
Jenesis 14:18–24; Ntụgharị asụsụ Joseph Smith, Jenesis 14:36–40
Ebraham kwuru otu ụzọ n’ụzọ iri.
Kedụ ihe ị na-amụ banyere agwa Ebraham gbasara akụ na ụba site na Jenesis 14:18–24 na Ntụgharị asụsụ Joseph Smith, Jenesis 14:36–40 (niime appendix Baịbụl)? Ịma atụ, mata azịza ya nye eze nke Sọdọm niime Jenesis 14:23. Kedụ otu irube isi nye iwu nke ịkwụ otu ụzọ n’ụzọ iri si metụta uche gị maka ego?
Jenesis 16
Chineke na-anụ olu m.
Dị ka ị na-agụ Jenesis 16, i nwere ike chee banyere oge mgbe ọ dịrị gị ka a na-emegbu gị, dị ka Hagar chere. Mata na “Ishmel” pụtara “Chineke na-anụ.” Olee otu Chineke siworo gosi gị na Ọ nuwo gị?
Lee kwa “Ekpere Nzuzo,” Abụ, no. 144.
Maka ihe ndị ọzọ, lee mbipụta niile nke ọnwa nke a nke Liahona na magazin niile Maka Ume nke Ndị Ntoroọbịa.
Nchepụta niile maka Ikuziri Ụmụntakịrị
Jizọs Kraịst ga-edu m n’aka.
-
Dị ka gị na ụmụ gị na-agụ Ebraham 1:18 na 2:8, i nwere ike kpọkuo ha ka ha gee ntị maka otu akụkụ ahụ nke akpọrọ aha niime amaokwu abụọ ndị a. Ikekwe unu nwere ike mee egwuregwu n’ebe otu nwata na-emechi anya ha ma gị eduru nwata ahụ n’aka. Emesịa i nwere ike kwuo okwu banyere otu o si emetụta inwe Jizọs Kraịst duo anyị n’aka ma ọ bụ chekwaa anyị.
Jenesis 13:5–12
Enwere m ike ịbụ ome udo.
-
Ụmụ gị nwere ike nwee obi ụtọ ime ejije akụkọ ahụ sitere na Jenesis 13:5–12, mee ka a ga-asị ha bụ Ebraham, Lọt, na ndị na-azụ anụ. Kedụ otu anyị nwere ike i si soro ọmụmaatụ nke Ebraham nke ị bụrụ ome udo n’etiti ezi na ụlọ na ndị enyi anyị? Gbalịa igosipụta azịza ha niile.
Nhọrọ nke Lọt, site n’aka William Fredericks © Providence Collection/licensed from goodsalt.com
Jenesis 13:16; Jenesis 15:1–6; 17:1–8; Ebraham 2:9–11
Chineke chọrọ ka mụ na Ya gbaa ndụ.
-
Tulee igosi ụmụ gị otu komkom aja, kpakpando dị n’igwe abalị, ma ọ bụ foto dị na ngwụcha ndepụta nke a. Nke a nwere ike nyere ha aka ghọta nkwa niile Chineke kwere niime Jenesis 13:16; 15:1-6. Kwuo banyere otu i siworo mụta ịtụkwasị obi na nkwa niile nke Chineke mgbe ha yiri ihe na-ekweghị omume.
-
Ikuziri ụmụ gị banyere ọgbụgba ndụ niile, rịọ ha ịgwa gị banyere oge mgbe ha kwere nkwa ma ọ bụ mgbe mmadụ kwere nkwa nye ha. Ọ bụrụ ma o nye aka, kesaa ụfọdụ ọmụmaatụ nke onwe gị—gụnyere ọgbụgba ndụ niile i gbaworo gị na Chineke na baptizim ma ọ bụ niime tempụl. Kedụ otu ọgbụgba ndụ gị niile siri metụta mmekọrịta gị na Chineke? Họrọ nkebiokwu ole ma ole site na Jenesis 15:1–6; 17:1–8; Ebraham 2:9–11 iji kesaa ụfọdụ ngọzi niile Chineke kwere Ebraham na Sera na nkwa.
-
Inyere ụmụ gị aka kwadoo ịgba ọgbụgba ndụ ha na Chineke mgbe ha mere baptizim, i nwere ike jiri ụfọdụ ihe omume atụpụtara niime appendix A ma ọ bụ appendix B.
Ebraham 1:12–17; Jenesis 16:7–11
Chineke na-anụ olu m.
-
Mgbe ndụ Ebraham nọ na ọghọm, ọ kpọkuru Chineke. Mgbe Hagar nọ naanị ya niime alaịkpa, ọ mụtara na Chineke nụrụ olu ya. Tulee ikesa akụkọ abụọ ndị a nye ụmụ gị: “Ebraham na Sera” na “Hagar” niime Akụkọ niile nke Agba Ochie, 28–31, 32–33. Kedụ ihe anyị na-amụta banyere Chineke site n’akụkọ ndị a? Emesịa i nwere ike kesaara ibe unu nhụmiihe ndị ọzọ mgbe ọ metụtara gị na Chineke nụrụ olu gị. Otu ukwe dị ka “Ekpere nke Otu Nwata” (Akwụkwọ ukwe Ụmụntakịrị, 12-13) nwere ike kwusie ụkpụrụ ahụ ike.
Abraham and Sarah
Hagar
Maka ihe ndị ọzọ, lee mbipụta nke ọnwa nke a nke magazin Friend.