“Echiche ndị aga E Buru n’Uche: Ọgbụgba ndụ Ahụ,” Bianụ, Soro M—Maka Ebe Obibi na Nzukọ nsọ: Agba Ochie 2026 (2026)
“Ọgbụgba ndụ Ahụ,” Bịanụ, Soro M: 2026
Echiche ndị aga Eburu n’Uche
Ọgbụgba ndụ Ahụ
Gburugburu Agba Ochie, ị ga na-agụ mgbe niile mkpụrụokwu ahụ ọgbụgba ndụ. Taa anyị na-ewekarị ọgbụgba ndụ niile dị ka nkwa dị nsọ nke Chineke, mana niime ụwa gboo, ọgbụgba ndụ niile bụkwa akụkụ dị mkpa nke mmekọrịta ndị mmadụ na ibe ha. Maka nchekwa na nlanarị, ndị mmadụ kwesịrị inwe ike tụkwasị ibe ha obi, ma ọgbụgba ndụ bụ ụzọ iji chekwaa ntụkwasị obi ahụ.
Ya mere mgbe Chineke gwara Enọk, Noa, Mosis na ndị ọzọ okwu banyere ọgbụgba ndụ niile, Ọ nọ na-akpọku ha ịbanye niime mmekọrịta ntụkwasị obi ha na Ya. Anyị na-akpọ nke a ọgbụgba ndụ ọhụrụ dị ebighị ebi ma ọ bụ ọgbụgba ndụ nke Ebraham—ihe nrụtụaka nye ọgbụgba ndụ nke Chineke na Ebraham na Sera mere ma mgbe ahụ megharịa ọhụrụ ha na ụmụ ụmụ ha Aịzịk na Jekọb (a na-akpọkwa Izrel). Niime Agba Ochie, a maara ya nnọọ dị ka “ọgbụgba ndụ ahụ.” Ị ga-ahụ na Agba Ochie bụ akụkọ nke ndị mmadụ hụrụ onwe ha dị ka ndị nketa nke ọgbụgba ndụ a—ndị ọgbụgba ndụ.
Ọgbụgba ndụ nke Ebraham na-aganiihu ịdị mkpa taa, kacha nke nye Ndị nsọ Ụbọchi ikpeazụ a. Maka Gịnị? Niihi na anyị bụkwa ndị ọgbụgba ndụ, ma anyị bụ ma anyị abụghị ụmụ ụmụ kpọmkwem nke Ebraham, Aịzịk, na Jekọb. Maka nzube nke a, ọ dị mkpa ịghọta ihe ọgbụgba ndụ nke Ebraham bụ na otu o si metụta anyị taa.
Gịnị bụ Ọgbụgba ndụ nke Ebraham?
Ebraham chọbuuru “ịbụ onye nsiso nke ezi omume dị ukwuu karịa” (Ebraham 1:2), ya mere Chineke kpọkuru ya ịbanye na mmekọrịta ọgbụgba ndụ. Ebraham abụghị onye mbụ na-enwe ọchịchọ nke a, ma ọ bụghị onye mbụ ịnata ọgbụgba ndụ. Ọ bụ, mgbe ihe niile gasịrị, ọgbụgba ndụ ebighị ebi. Ebraham chọrọ “ngọzi niile nke ndị nna nna” (Ebraham 1:2)—ngọzi niile nke enyere site n’ọgbụgba ndụ nye Adam na Iv ma emesịa nye ndị mmadụ chọsiri ngọzi ndịa ike.
Ọgbụgba ndụ nke Chineke na Ebraham gbara kwere nkwa ngọzi ndị dị ịtụnaanya: nketa oke ala, ọtụtụ ụmụ ụmụ, ohere ruo emume nsọ niile nke ọkwa nchụaja, na aha nke a ga-asọpụrụ site na ndudugandu na-abịa. Mana nlekwasị anya nke ọgbụgba ndụ nke a abụghị nnọọ maka ngọzi niile Ebraham na ezi na ụlọ ya ga-anata manakwa maka ngọzi ha ga-abụ nye ụmụ Chineke ndị ọzọ. “Ị ga-abụ ngọzi,” ka Chineke mara ọkwa, “ma niime gị ka ezi na ụlọ niile nke ụwa ga-anata ngọzi” (Jenesis 12:2-3).
Ọgbụgba ndụ nke a o nyere Ebraham, Sarah, na ụmụ ụmụ ha ohere dị ogo n’etiti ụmụ Chineke? Naanị nʻechiche na ọ bụ ohere iji gọzie ndị ọzọ. Ezi na ụlọ nke Ebraham ka ọ dịịrị “iburu ozi nke a na Ọkwa nchụaja nye mba niile,” na-ekesa “ngọzi niile nke ozi ọma, nke bụ ngọzi niile nke nzọpụta, ọbụna nke ndụ ebighị ebi” (Ebraham 2:9, 11). Ịbụ ndị ọgbụgba ndụ nke Chineke apụtaghị na anyị dị mma karịa ndị ọzọ; ọ pụtara na ha nwere ọrụ inyere ndị ọzọ aka dịrị mma karịa.
Ọgbụgba ndụ nke a bụ ngọzi Ebraham nọọrọ na-atụanya ya. Mgbe ọ natasịrị ya, Ebraham kwuru n’obi ya, “Nwa odibo gị na-achọsi gị ike; ugbu a achọtawo m gị” (Ebraham 2:12).
Nke ahụ bụ ọtụtụ puku afọ gara aga, mana ọgbụgba ndụ nke a ka eweghachiteworo n’ụbọchị anyị. Ma a nọ na-emezu ya oge ugbu a niime ndụ ndị nke Chineke. Mmezu nke ọgbụgba ndụ ahụ na-abawanye n’ike n’ụbọchị ikpeazụ ndị a dị ka ọrụ nke Chineke na-aganiihu, na-agọzi ezi na ụlọ niile gburugburu ụwa. Ma onye ọbụla, dị ka Ebraham, na-achọ ịbụ nnukwu onye nsiso ezi omume—onye ọbụla na-achọsi Onyenwe anyị ike—nwere ike soro na ya.
Kedụ ihe Ọgbụgba ndụ nke Ebraham Pụtara nye M?
Ị bụ nwa nke ọgbụgba ndụ. Gị na Chineke na-agba ndụ mgbe emere gị baptizim na mgbe i riri oriri nsọ. Ma ị na-anata uju nke ọgbụgba ndụ site na emume nsọ niile dị nsọ nke tempụl.
Site n’ọgbụgba ndụ na emume nsọ ndị a, anyị na-aghọ ndị nke Chineke. Iwu jigidere anyị na Ya “site niihe nkedo niile dị ebighị ebi.” “Ozugbo anyị na Chineke gbara ndụ,” ka Onyeisi Russell M. Nelson kuziworo, “anyị na-ahapụ ọnọdụ nkiti ruo mgbe ebighị ebi. Chineke agaghị ajụ mmekọrịta Ya na ndị ahụ meworo ụdị njikọta ahụ ha na Ya. N’ezie, ndị ahụ niile ha na Chineke meworo ọgbụgba ndụ nwere ohere inwete ụdị ịhụnaanya na ebere pụrụ iche. … Niihi ọgbụgba ndụ anyị na Chineke, Ọ gaghị ma ọlị ada mba na mgbalị Ya inyere anyị aka, ma anyị agaghị ma ọlị ewerecha ndidi obi ebere Ya n’ebe anyị nọ.” Ị ga-ahụ nke a niime agụgụala nke ndị ọgbụgba ndụ nke Chineke niime Agba Ochie, ma ị ga-ahụkwa ya na ndụ nke gị onwe gị dị ka otu niime ụmụ ọgbụgba ndụ Ya.
Atụkwala Egwu, site n’aka Dan Wilson
Nke a bụ nghọta dị oke ọnụ ahịa enyere anyị niihi Mweghachite nke ọgbụgba ndụ nke Ebraham site n’aka Onye amụma Joseph Smith. Ya mere mgbe ị gụrụ banyere ọgbụgba ndụ niime Agba Ochie, echekwala nnọọ banyere mmekọrịta nke Chineke na Ebraham, Aịzik, na Jekọb. Cheekwa banyere mmekọrịta gị na Ya. Mgbe ị na-agụ banyere nkwa nke imerime ụmụ ụmụ, echekwala nnọọ banyere nde kwuru nde ndị taa na-akpọ Ebraham nna ha. Cheekwa banyere nkwa nke Chineke nye gị banyere ezi na ụlọ ebighị ebi niile na mbawanye dị ebighị ebi. Mgbe ị gụrụ banyere nkwa nke ala nketa, echekwala nnọọ banyere ala ekwere Ebraham na nkwa. Cheekwa banyere akaraka selestịal nke ụwa n’onwe ya—ihe nketa ekwere ndị “dị nwayọọ” ndị “na-echere Onyenwe anyị” (Matiu 5:5); Abụ ọma 37:9, 11). Ma mgbe ị na-agụ banyere nkwa ahụ na ndị ọgbụgba ndụ nke Chineke ga-agọzi ezi na ụlọ niile nke ụwa” (Ebraham 2:11), echekwala nnọọ banyere ije ozi nke Ebraham ma ọ bụ ndị amụma gbadatara site na Ya. Cheekwa banyere ihe i nwere ike ime—dị ka onye na-eso Jizọs Kraịst—ịbụ ngọzi nye ezi na ụlọ niile gbara gị gburugburu.