“Febrụwarị 2–8. ‘Onyenwe anyị Kpọrọ Ndị Ya Zayọn’: Mosis 7,” Bịanụ, Soro M—Maka Ebe Obibi na Nzukọ nsọ: Agba Ochie 2026 (2026)
“Febrụwarị 2–8. ‘Onyenwe anyị Kpọrọ Ndị Ya Zayọn’,” Bịanụ, Soro M: 2026
Inọk Hụrụ Oge A Kara aka, site n’aka Jennifer Paget
Febụwarị 2-8: “Onyenwe anyị Kpọrọ Ndị Ya Zayọn”
Mosis 7
Gburugburu agụgụala, ndị mmadụ agbalịwo inwete ihe Inọk na ndị ya mejuputara: ihiwe ezigbo obodo ebe na-enweghị ogbenye ma ọ bụ ọgbaaghara. Dị ka ndị nke Chineke, anyị na-nwekwa ọchịchọ nke a. Anyị na-akpọ ya iwu Zayọn, ma ọ gụnyere—na mgbakwunye ilekọta ndị ahụ nọ na mkpa na ịkwado udo—na-agba ndụ, na-ebikọta ọnụ n’ezi omume, ma na-abụrụ otu anyị n’ibe anyị na Jizọs Kraịst, “Eze nke Zayọn” (Mosis 7:53). Ọ bụrụ na ụwa, obodo gị, ma ọ bụ ezi na ụlọ gị abụchaghị ihe ị chọrọ ka ọ bụrụ, ọ dị mma ịjụ, Kedụ otu Inọk na ndị ya si mee ya? Kedụ otu ha siri bụrụzie “ndị nwere otu obi na otu uche” (Mosis 7:18) na-agbanyeghị esemokwu gbara ha gburugburu? N’etiti ọtụtụ uju Mosis 7 na-enye anyị banyere Zayọn, otu nke bara uru n’onwe ya maka Ndị nsọ Ụbọchi ikpeazụ a nwere ike bụrụ nke a: Zayọn abụghị naanị obodo ukwu—ọ bụ ọnọdụ nke obi na mmụọ. Zayọn, dị ka Onyenwe anyị kuziworo, bụ ndị “dị ọcha n’obi” (Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 97:21). Ya mere elemaanya ụzọ kachasị mma iji wuo Zayọn bụ ịmalite niime obi nke onwe anyị na ebe obibi nke anyị.
Nchepụta niile maka Ọmụmụ ihe N’Ebe Obibi na na Nzukọ nsọ
E nwere m ike inye aka wuo Zayọn.
Mgbe Onye amụma Joseph Smith mụtara na mbụ banyere Inọk na Obodo ukwu nke Ịdị nsọ ya, a kpakere mmụọ ya. Ọ “maara n’ụbọchị ahụ abịawo mgbe Onyenwe anyị ọzọkwa ga-ehiwe Zayọn n’elu ụwa” (Ndị Nsọ, 1:108-9), ma ọ malitere ọchịchọ oge ndụ iji wuo Zayọn. Ị na-agụ Mosis 7 nwere ike kpatee mmụọ gị ịganiihu na mgbalị ahụ taa.
I nwere ike bido site na-inyochasị ajụjụ niile “Gịnị bụ Zayọn?” na “Kedụ otu o si dị iche site na ndị ọzọ nọ n’ụwa?” Tulee idepụta azịza niile na-abịara gị dị ka ị na-amụ Mosis 7, kachasị amaokwu ndịa 16–21, 27, 53, 62–69.
Azịza gị niile nye ajụjụ ndị a nwere ike mee ya e doo anya na anyị ka nwekwara nnukwu ọrụ ịrụ iji wuo Zayọn. Ya mere kedụ otu anyị ga-esi eme ya? O nwere ike inye aka iche banyere oge ndị i nwere mmetụta na i nwererịị “otu obi na otu uche” gị na otu onye (Mosis 7:18). O nwere ike ọ bụ niime ngalaba ukwu, ezi na ụlọ, ma ọ bụ otù n’ụlọ ọrụ ma ọ bụ n’ụlọakwụkwọ. Kedụ ihe ndị mmadụ na-eme iji kepụta ịdị n’otu ziri ezi.
Nke a bụ ụfọdụ akụrụngwa ndị ọzọ nke i nwere ike inyochagharị iji chọta nchepụta na mkpate mmụọ. Họrọ otu ma ọ bụ karịa iji mụọ ihe, ma emesịa dedata ihe iji nwee mkpatemmụọ iwu zayọn:
-
Ndị Filipi 2:1–4; 4 Nifaị 1:15–18; Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 97:21; 105:5.
-
Ulisses Soares, “Ụmụnne nwoke na Ụmụnne nwanyị niime Kraịst,” Liahona, Nov. 2023, 70–73.
-
D. Todd Christofferson, “Otu niime Kraịst,” Liahona, Me 2023, 77–80.
Chineke na-achọ ndị Ya ịbụrụ “ndị nwere otu obi na otu uche” (Mosis 7:18).
Jizọs Kraịst bụ “Eze nke Zayọn.”
Kedụ ihe ọ pụtara nye gị inwe Jizọs Kraịst dị ka Eze gị? Mata aha ndị ọzọ banyere Jizọs Kraịst niime amaokwu nke a. Kedụ ihe ha na-akuziri gị banyere Ya? Kedụ ihe i chere ọ pụtara ịbata “n’ọnụ ụzọ ama ma [rịgoro] elu site n’aka [Ya]”?
Lee kwa “Bịa, O Gị Eze Ndị Eze,” Abụ, no. 59.
Chineke ebee akwa—ma n̄ụrịa ọn̄ụ—maka ụmụ Ya.
Ụfọdụ ndị na-ahụ Chineke dị ka onye dị n’ebe dị anya onye na-adịghị enwe mmetụta site n’ihe mere anyị. Inọk nwetere nghọta dị iche banyere Chineke n’ọhụ edekọrọ niime Mosis 7. Kedụ ihe ọ mụtara banyere Chineke—ma kedụ ihe ị mụtara—niime amaokwu ndịa 28-40? Gịnị mere i jiri chee na ọ tụrụ Inọk naanya ịhụ Chineke na-ebe akwa? Kedụ ihe kpatara o ji dị mkpa na anyị ga-amata na Ọ na-ebe akwa?
Dị ka ọhụ ahụ na-aganiihu, Inọk bekwara akwa. Mana Chineke kesaakwara ya ihe ọ kwesịrị iji maka ya n̄ụrịa ọn̄ụ. Chọọ ha niime Mosis 7:41–69. Kedụ ihe ị na-amụta site n’ọhụ nke Inọk nwere ike inyere gị aka “bulie obi gị elu, ma nwee obi ekele,” na-agbanyeghị “obi ọjọọ” dị niime ndụ gị (amaokwu 44)?
Lee kwa Jeffrey R. Holland, “The Grandeur of God,” Liahona, Nov. 2003, 70–73.
Jizọs Kraịst ga-abịa ọzọ n’ụbọchị ikpeazụ ndị a.
Ọhụ nke Inọk, kachasị ihe edekọrọ niime Mosis 7:59–67, bụ otu niime amụma agụgụala mbụ nke Ọbịbịa nke Ugboro Abụọ nke Onye Nzọpụta. Kedụ ihe na-amasị gị banyere otu amaokwu ndịa si kọwaa ụbọchị ikpeazụ ndị a? Ịmaatụ, tulee otu i chere esi emezu amụma niile sitere na amaokwu 62. . Kedụ ihe nkebiokwu ndị a na-akuziri gị banyere ọrụ nke Chineke n’ụbọchị ikpeazụ na-abịa abịa?
Lee kwa Henry B. Eyring, “Ụmụnne nwanyị niime Zayọn,” Liahona, Nov. 2020, 67–69.
Maka ihe ndị ọzọ, lee mbipụta niile nke ọnwa nke a nke Liahona na magazin niile Maka Ume nke Ndị Ntoroọbịa.
Nchepụta niile maka Ikuziri Ụmụntakịrị
Chineke na-achọ anyị ịbụrụ “ndị nwere otu obi na otu uche.”
-
Iji nyere ụmụ gị aka mụta banyere Inọk na Zayọn, i nwere ike jiri “Inọk Onye amụma” niime Akụkọ Agba Ochie niile (19–21) ma ọ bụ amaokwu nke abụọ nke “Soro Onye Amụma” (Akwụkwọ ukwe Ụmụntakịrị, 110-11). Emesịa i nwere ike rịọ ụmụ gị inyere gị aka kọgharịa akụkọ ahụ na mkpụrụokwu nke onwe ha. Foto niile nke Inọk dị na ndepụta nke a nwere ike inye aka.
-
Nke a bụ otu ụzọ iji nyere ụmụ gị aka ghọta ihe ọ pụtara ịbụ ndị “nwere otu obi na otu uche” (Mosis 7:18): Jiri akwụkwọ mepụta obi ma chakaa ya irighiri irighiri, nke zuru nwa nke ọbụla inwe otu. Kwe ka ha dee aha ha nʻelu ibe nke ha ma rụkọọ ọrụ ọnụ itikọta obi ahụ ọnụ. Dị ka ha na-eme ya, i nwere ike kwuo banyere ihe ndị na-amasị gị banyere nwata nke ọbụla.
-
Nyere ụmụ gị aka gụọ ọnụ ugboro ole mkpụrụokwu ahụ “Zayọn” pụtara niime Mosis 7:18–21, 62–63, 68–69. Oge ọbụla ha chọtara mkpụrụokwu ahụ, nyere ha aka chọpụta ihe amaokwu ahụ na-ekwu banyere Zayọn (lee kwa Odudu nye Akwụkwọ nsọ, “Zayọn,” Ọba akwụkwọ Ozi ọma). Kedụ otu anyị ga-esi adịtụkarị ka ndị ahụ akọwara niime amaokwu ndị a?
Kwadoo ọmụmụ akwụkwọ nsọ nke onwe. Ma ị na-akuziri ezi na ụlọ gị n’ebe obibi ma ọ bụ klass na Sọnde, otu niime ụzọ ndị kachasị ibe ha i nwere ike iji nyere ndị ọzọ aka wuo okwukwe niime Jizọs Kraịst na-anọgide bụ inyere ha aka hiwe omume nke ịchọ nhụmiihe nke onwe jiri akwụkwọ nsọ. Kesaa nhụmiihe niile i na-enwe n’akwụkwọ nsọ, ma gbaa ezi na ụlọ ma ọ bụ ndị otù klas ume iji kesaa nhụmiihe ha. Mgbe anyị nụrụ banyere otu ịgụ akwụkwọ nsọ si agọzi ndị ọzọ, mgbe ụfọdụ a na-akpate mmụọ anyị ịchọkwa ụdị ngọzi ndị a site n’aka Onyenwe anyị. (Lee Ikuzi ihe n’Ụzọ nke Ọnye Nzọpụta, 25.)
Nna nke Eluigwe chọrọ ka m họrọ isoro Ya.
-
Iji dubata Mosis 7:32–33 nye ụmụ gị, i nwere ike kwuoro ha banyere otu nhọrọ nke ha mere na nso nso a. Emesịa i nwere ike gụkọta amaokwu ndị ahụ ọnụ iji chọpụta ihe Nna nke Eluigwe chọrọ ka anyị họrọ. Kedụ nhọrọ ndị anyị nwere ike ime iji gosi na anyị họọrọ Ya? Elemanya ụmụ gị nwere ike were oge n’otu n’otu iji mee ejije otu niime nhọrọ ndị ahụ ebe ndị ọzọ na-anwa ịkọta ihe ihe omume ahụ nọchitere.
Jizọs ga-alọghachi n’elu ụwa.
-
Niime Mosis 7:59, Inọk jụrụ Onyenwe anyị otu ajụjụ. Kpọkuo ụmụ gị ịchọta ya, ma emesịa rịọ ha ịchọta azịza niime amaokwu 60. I nwekwara ike isoro ha kwuo okwu banyere otu mgbe ha naara atụ anya otu onye ịlọghachi n’ebe obibi. Jụọ ha otu o siri metụta ha na ihe ha mere iji jikere. Kedụ otu anyị ga-esi adị njikere maka nlọghachi nke Jizọs?
-
Tulee igosi foto ndị nke oge mgbe Onye Nzọpụta pụtara kwute ndị mmadụ (dị ka Akwụkwọ Nka Ozi ọma, nọs 60, 82, 83, na 84). Gịnị ka ndị ahụ na-eme na foto ndị ahụ? Kedụ otu ndị ahụ siri chee mgbe ha zutere Jizọs? I nwekwara ike gụọ egwu banyere Ọbịbịa nke Ugboro Abụọ nke Onye Nzọpụta, dị ka “Mgbe Ọ Ga-abịa Ọzọ” (Akwụkwọ ukwe Ụmụntakịrị, 82–83), ma jụọ ụmụntakịrị ihe ha chere ọ ga-adị ka ya mgbe Jizọs ga-abịa ọzọ. Kwe ka ụmụntakịrị kesaa otu o si emetụta ha banyere ịhụ Jizọs mgbe Ọ ga-abịa ọzọ.
Maka ihe ndị ọzọ, lee mbipụta nke ọnwa nke a nke magazin Friend