Come, Follow Me
Jenụwarị 26–Febụwarị 1. “Kuziere Ụmụ Gị Ihe Ndị a N’efu”: Jenesis 5; Mosis 6


“Jenụwarị 26–Febụwarị 1. “Kuziere Ụmụ Gị Ihe Ndị a N’efu: Jenesis 5; Mosis 6,” Bịanụ, Soro M—Maka Ebe Obibi na Nzukọ nsọ: Agba Ochie 2026 (2026)

“Jenụwarị 26–Febụwarị 1. ‘Kuziere Ụmụ Gị Ihe Ndị a N’efu’,” Bịanụ, Soro M: 2026

Adam na Iv

Dị mma Karịa Paradaịs, site n’aka Kendal Ray Johnson

Jenụwarị 26–Febụwarị 1: “Kuziere Ụmụ Gị Ihe Ndị a N’efu”

Jenesis 5; Mosis 6

Ọtụtụ niime Jenesis 5 bụ ndepụta nke ndudugandu dị n’etiti Adam na Iv na Noa. Anyị na-agụ ọtụtụ aha, mana anyị anaghị amụ ọtụtụ ihe banyere ha. Emesịa anyị na-agụ ahịrị nke na-akpake akpake mana enweghị nkọwa: “Ma Inọk sooro ụzọ Chineke: ruo na a hụkwaghị ya, niihi na Chineke kpọọrọ ya” (Jenesis 5:24). N’ezie e nwere akụkọ so amaokwu ahụ! Mana na-enweghị nkọwa ọzọ, ndepụta nke ndudugandu ebidoghachie.

N’ekele, Mosis 6 kpughere nkọwa niile nke akụkọ nke Inọk—ma ọ bụ akụkọ dị egwu. Anyị na-amụ maka ịdị umeala n’obi nke Inọk, obi ịda mba ya niile, ike nke Chineke hụrụ niime ya, na nnukwu ọrụ ọ rụrụ dị ka onye amụma nke Chineke. Anyị nakwa aghọtazi ọdịdị ezi na ụlọ nke Adam na Iv dị ka ọ na-aganiihu site na ndudugandu niile. Anyị na-agụ maka “oke ike ọchịchị” nke Setan manakwa maka ndị nne na nna ndị kuziiri ụmụaka “ụzọ niile nke Chineke” (Mosis 6:15, 21) Kacha nke dị oke ọnụ ahịa bụ ihe anyị na-amụ banyere ozizi ndị nne na nna ndịa na-akuzi: okwukwe niime Jizọs Kraịst, nchegharị, baptizim, na ịnata Mmụọ Nsọ (lee Mosis 6:50–52). Ozizi ahụ, dị ka ọkwa nchụaja na-esote ya, “dị adị na mmalite [ma] ga-adị na nsọtụ nke ụwa kwa” (Mosis 6:7).

akara ngosi ihe ọmụmụ

Nchepụta niile maka Ọmụmụ ihe N’Ebe Obibi na na Nzukọ nsọ

Mosis 6:26–36

Mmehie na-ebelata ike anyị ịhụ, inwe mmetụta, na ịnụ ihe niile nke Chineke.

Dị ka ị na-amụ Mosis 6:26–36, kedụ ihe ị na-amụ banyere mmetụta niile nke mmehie? Kedụ otu i siworo hụ mmetụta ndị a? Kedụ njirimara ndị Inọk nwere nyeere ya aka merie mmetụta ndị a? Kedụ otu Chineke siri gọzie ya niihi nke ahụ?

Mosis 6:26–47

akara ngosi semịnarị
Chineke na-akpọ m ịrụ ọrụ Ya agbanyeghị adịghị ike m niile.

Ọ bụrụ ma o ju gị anya nʻihe Onyenwe anyị kpọworo gị ime, ịnọghị naanị gị. Ọbụna Inọk chere otu ahụkwa mgbe Onyenwe anyị kpọrọ ya ịbụ onye amụma. Dị ka ị na-agụ Mosis 6:26–36, chọọ maka ihe kpatara o jiri ju Inọk anya na ihe Onyenwe anyị kwuru iji nye ya mgbam ume.

Niime amaokwu ndịa 37–47, i nwereike chọọ maka ụzọ niile Onyenwe anyị siri kwadoo Inọk ma nye ya ike ịrụ ọrụ Ya (lee kwa Mosis 7:13). I nwere ike tụnyere nhụmiihe nke Inọk ya na nke ndị amụma ndị ọzọ ọ dịịrị ka ha etozughị etozu, dị ka Mosis (lee Ọpụpụ 4:10–16), Jeremaya (lee Jeremaya 1:4–10), Nifaị (lee 2 Nifaị 33:1–4), na Moronaị (lee Ịta 12:23–29). Kedụ ihe i chere Chineke na-achọ ka gị mụta site na akwụkwọ nsọ ndị a banyere ọrụ ya O nyeworo gị ịrụ?

Inọk na-ekpe ekpere

Ọhụụ Ka Onyenwe anyị Kpọliteworo (Mosis 6:36), site n’aka Eva Timothy

Ndị Ozi na ndị amụma ụbọchị ugbu a egosipụtawo mmetụta niile yiri nke Inọk mgbe ha kọwara otu o si metụta ịnata ọkpụkpọ oku ha. Ịma atụ, lee ama nke Okenye Ulisses Soares niime “Ndị amụma Na-ekwu okwu site N’ike nke Mmụọ Nsọ” (Liahona, Me 2018, 98–99).

Kedụ ihe i nwere ike ịmụta site n’aka ndị amụma na ndị ozi banyere mmetụta gị niile nke etozughị etozu? Olee mgbe i nweteworo mmetụta enyemaka nke Onye Nzọpụta mgbe Ọ rịọrọ gị ime ihe ndị siri ike? Tulee idedata nhụmiihe ole ma ole n’ọdịniihu gị mgbe ị ga-enwe mkpa ịdabere n’enyemaka nke Onye Nzọpụta. Kedụ otu ị ga-esi ezute ihe omume ndị a jiri okwukwe niime Jizọs Kraịst?

Lee kwa David A. Bednar, “Nọgide niime M, ma Mụ onwe m niime Gị; Ya mere Soro M Jee ije,Liahona, Me 2023, 123–25; “Aga M Aga Ebe Ị Chọrọ Ka M Gaa,” Abụ, no. 270.

Mosis 6:48–68

Ozi ọma nke Jizọs Kraịst ka akuziri site na mmalite.

Niihi na anyị nwere akwụkwọ nke Mosis, anyị maara na Chineke nọworịị na-akuziri ụmụ Ya otu esi achọta mgbapụta kemgbe Adam na Iv. Dị ka ị na-amụ Mosis 6:48-68, chọgharịa maka ihe anyị ahaghị ịma ma mee iji nwee mgbapụta. Mata ajụjụ nke Adam niime amaokwu 53. Enwewo mgbe ọbụla i chere nke ahụ? Kedụ ihe ị na-amụ site n’azịza nke Onyenwe anyị niime amaokwu ndịa 53–65? I nwere ike chee maka amaokwu ndị a dị ka ozi nke Onyenwe anyị na nzukọ baptizim nke Adam. Kedụ ihe ị na-amụ banyere baptizim site na ozi Ya? Gịnị mere i ji chee na Ọ tụnyere baptizim ya na ịbụrụ onye a “mụgharịrị ọzọ”? (Amaokwuamaokwu 59). Kedụ ihe i nwere ike ime iji gaaniihu bụrụ onye a “mụgharịrị ọzọ” gburugburu ndụ gị?

Chọọ ihe atụ niile. Niime akwụkwọ nsọ, ihe ndị eji nʻaka ma ọ bụ ihe omume niile ka e nwere ike igosipụta ma ọ bụ bụrụ ihe atụ eziokwu ime mmụọ niile, kacha nke eziokwu niile banyere Onye Nzọpụta (lee Ikuzi ihe n’Ụzọ nke Ọnye Nzọpụta, 7). Ihe atụ ndị a nwere ike bawanye nghọta gị maka Ya na ozizi Ya. Ịma atụ, kedụ ihe ị na-amụ site na ihe atụ niile nke obi niile na ntị niile niime Mosis 6:27, anya niile na ụrọ niile niime Mosis 6:35, ma ọ bụ mmiri niime Mosis 6:59–60?

Mosis 6:51–62

“Kuziere ụmụ gị ihe ndị a n’efu.”

Mgbe a kuzichara Adam eziokwu niile nke ozi ọma nke Jizọs Kraịst, niime Mosis 6:51–63, Onyenwe anyị gwara Adam ikuziri ha ndudugandu ndị dịniihu. Tulee idepụta eziokwu ndị a. (O nwere ike inye aka ikewa edereede n’obere otu amaokwu niile, dị ka amaokwu ndịa 51–52, 53–57, 58–60, 61–63). Gịnị mere eziokwu ndị a jị baa uru nye ndudugandu nke taa na-eto eto? Kedụ ihe ọzọ i nwere ike ịmụta site na nkuzi niile nke Onyenwe anyị nye ndị nne na nna niime Mozaya 4:14–15 na Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 68:25–28; 93:40–50?

Ị na-agụ banyere “akwụkwọ ncheta” nke ezi na ụlọ Adam na Iv debere nwere ike kpakee mmụọ gị ma ọ bụ nke ezi na ụlọ gị iji mepụta akwụkwọ ncheta nke onwe gị. Kedụ ihe i chere Onyenwe anyị ga-achọ gị ịgụnye? Tulee ichekwa ozi site na akwụkwọ ncheta dị na FamilySearch.org.

Lee kwa Dieter F. Uchtdorf, “Jizọs Kraịst Bụ Ume nke Ndị Nne na nna,” Liahona, Me 2023, 55–59; “Ịzụ ụmụ: Ịmetụ Obi niile nke Ndị ntoroọbịa Anyị,” “Mana Maka Gịnị?” (vidiyo niile), Ọba akwụkwọ Ozi ọma.

ezi na ụlọ na-agụkọ akwụkwọ nsọ ọnụ

Maka ihe ndị ọzọ, lee mbipụta niile nke ọnwa nke a nke Liahona na magazin niile Maka Ume nke Ndị Ntoroọbịa

akara ngosi nkeji ụmụntakịrị 01

Nchepụta niile maka Ikuziri Ụmụntakịrị

Mosis 6:26–34

Chineke pụrụ inyere m aka mee ihe ndị siri ike.

  • Mgbe akpọrọ Inọk oku ikwusa ozi ọma, o nwere nchekasị n’obi na ya ga-ada. Mana Chineke nyeere ya aka. Gụkọta ọnụ akụkọ nke a niime Mosis 6:26–34 (lee kwa “Inọk Onye amụma” niime Akụkọ niile nke Agba Ochie, 19–21). Gịnị mere Inọk si na-eche na ya enweghị ike ekwusa ozi ọma? (Lee Mosis 6:31). Kedụ otu Chineke siri nyere Inọk aka? (lee Mosis 6:32–34; 7:13).

  • Ụmụ gị nwere ike rite ọńụ ikesa ma ọ bụ igosipụta ịma atụ ndị ọzọ nke mgbe Chineke nyeere ndị mmadụ aka mee ihe ndị siri ike—ịma atụ, Noa, Devid, Amọn, Samuel Onye Laman (lee Akwụkwọ Nka Ozi ọma, nos. 7, 19, 7881). I nwekwara ike kesaa otu nhụmiihe nke onwe gị ma kwe ụmụ gị ikwu okwu banyere otu Chineke siri nyere ha aka mee ihe ndị siri ike.

Mosis 6:50–62

Okwukwe niime Kraịst, nchegharị, baptizim, na ịnata Mmụọ Nsọ na-akwado m ịlaghachikwuru Chineke.

  • Chineke kuziiri Adam ihe anyị kwesịrị ime iji laghachikwute Ya—inwe okwukwe niime Jizọs Kraịst, ichegharị, mee baptizim, ma nata onyinye nke Mmụọ Nsọ. Nyere ụmụ gị aka chọta ụkpụrụ ndị a niime Mosis 6:52, 57. Emesịa i nwere ike nyere ha aka dee nke nke okwu banyere otu niime ụkpụrụ ndị ahụ. Okwu nke ọbụla nwere ike gụnyere akwụkwọ nsọ sitere na Mosis 6, otu nhụmiihe, na otu ama. Kwe ha ikesara ibe ha okwu ha.

  • I nwekwara ike gosi foto niile nke na-anọchite ụkpụrụ ozi ọma nke mbụ (lee edide nke okwukwe nke anọ). Debe ha na ahịrị na-eduba nʻotu foto nke Jizọs Kraịst. Dị ka ị na-agụ Mosis 6:52, ụmụ gị nwere ike guzoro n’akụkụ foto nke ziri ezi mgbe ha nụrụ mkpụrụokwu ndị foto ahụ na-anọchite.

  • Ụmụ gị nwere ike na-enwe ọn̄ụ nke ikwe ukwe ndị nke na-akuzi ụkpụrụ ndị dị na Mosis 6:52, dịkwa ka “Okwukwe,” “Mgbe M Mere Baptizim,” na “Mmụọ Nsọ Ahụ” (Akwụkwọ ukwe Ụmụntakịrị, 96–97, 103, 105). Nyere ha aka chọta ụkpụrụ ndị a niime Mosis 6:52.

Mosis 6:57–58

Nna nke Eluigwe na-achọ ndị nne na nna ikuziri ụmụ ha ihe.

  • Iji gbaa ụmụ gị ume iji kwadoo ndị nne na nna ha n’ọrụ ha dị ka ndị nkuzi ozi ọma, tulee ịgwa otu nwata ịgụ Mosis 6:58 ma mata iwu nsọ Chineke nyere ndị nne na nna. Mgbe ahụ i nwere ike gosi otu foto nke Adam na Iv na-akuziri ụmụ ha ihe (dị ka nke ahụ nọ na ngwụcha ndepụta nke a) ma kwe ụmụ gị ikwu okwu banyere ihe ha na-ahụ na foto ahụ. Ụmụ gị nwere ike see foto nke ndị ezi na ụlọ ha dị ka ha na-agụkọta akwụkwọ nsọ ọnụ, na-ekpekọta ekpere ọnụ, ma ọ bụ na-egwurikọta egwu ọnụ.

Maka ihe ndị ọzọ, lee mbipụta nke ọnwa nke a nke magazin Friend

Adam na Iv na-akuziri ụmụ ha ihe n’okpuru otu osisi

Adam na Iv Na-akuziri Ụmụ Ha Ihe, site n’aka Del Parson

Ihu akwụkwọ ihe omume Prịamarị: Ozi ọma na-akuziri m otu esi alaghachikwuru Nna nke Eluigwe