“Jenụwarị 19–25. Ọdịda nke Adam na Iv: Jenesis 3-4; Mosis 4-5,” Bianụ, Soro M—Maka Ebe Obibi na Nzukọ nsọ: Agba Ochie 2026 (2026)
“Jenụwarị 19–25. Ọdịda nke Adam na Iv,” Bịanụ, Soro M: 2026
Adam na Iv, site n’aka Douglas M. Fryer
Jenụwarị 19–25: Ọdịda nke Adam na Iv
Jenesis 3–4; Mosis 4–5
Na mbụ, akụkọ nke Ọdịda nke Adam na Iv nwere ike yie dị ka ihe ọdachi. A chụpụrụ Adam na Iv site nʻọmarịcha Ubi nke Iden. Ezitara ha niime ụwa nke mgbu, mwute, na ọnwụ (lee Jenesis 3:16-19). Ma ekewapụrụ ha site n’ebe Nna ha nke Eluigwe nọ. Mana eziokwu ndị eweghachitere site n’aka Onye amụma Joseph Smith niime akwụkwọ nke Mosis nyere anyị echiche pụrụ iche maka Ọdịda ahụ.
Ee, Ubi nke Iden mara mma. Mana Adam na Iv nwere mkpa karịrị ọmarịcha gburugburu niile. Ha nwere mkpa—ma anyị niile nwere mkpa—ohere ito eto. Ịhapụ Ubi nke Iden bụ nzọụkwụ mbụ dị mkpa chewere ihu nʻịlaghachikwuru Chineke ma n’ikpeazụ dịrịzie dị ka Ya. Nke ahụ pụtara izute mmegide, ime nhọrọ niile, ime mmejọ niile, ịmụta ichegharị, na ịtụkwasị obi na Onye Nzọpụta, onye Aja mgbaghara mmehie ya na-eme nganiihu ekwe omume na “ọńụ nke mgbapụta Anyị” (Mosis 5:11). Ya mere mgbe ị na-agụ banyere Ọdịda nke Adam na Iv, elekwasịkwala anya n’ihe yiri ihe ọdachi mana n’ihe ndị kwere omume—ọ bụghị maka paradaịs funahụrụ Adam na Iv mana n’ebube nke nhọrọ ha kwere anyị ịnata.
Nchepụta niile maka Ọmụmụ ihe N’Ebe Obibi na na Nzukọ nsọ
Jenesis 3; Mosis 4
Ọdịda ahụ bụ akụkụ atụmatụ nke Chineke dị mkpa.
Ọ bụ eziokwu na nhọrọ Adam na Iv dubara n’ọtụtụ ihe isi ike anyị na-ahụbiga na ndụ anụ ahụ. Mana nke ahụ apụtaghị na anyị ga-akwa mmakwaara na nhọrọ ha. Dị ka ị na-agụ Jenesis 3 na Mosis 4, i nwere ike jụọ onwe gị, gịnị mere Ọdịda jiri dị mkpa na atụmatụ nke Chineke?
Dị ka otu Mosis 5:9-12 siri dee, kedụ otu Ọdịda ahụ si metụta Adam na Iv? Kedụ otu i ga-esi etinye mkpụrụokwu ha niime nhụmiihe gị niile nʻụwa nke a dara ada? Kedụ ihe ọzọ ị na-amụta site na 2 Nifaị 2:19-25?
Lee kwa Mozaya 3:19; Alma 12:21–37; na Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 29:39–43.
Ịhapụ Iden, site n’aka Annie Henrie Nader
Jenesis 3:1–7; Mosis 4:22–31; 5:4–15
Jizọs Kraịst na-enye olileanya na mgbapụta.
Akụkọ Adam na Iv bụ nke banyere olileanya na mgbapụta site n’aka Jizọs Kraịst. Ịhụ ihe kpatara ya, i nwere ike malite site na-ịchọ maka ndapụta niile nke Ọdịda niime Jenesis 3:1-7; Mosis 4:22-31 na ịkanye ma ọ bụ idepụta ihe ị chọpụtara. Kedụ otu ndapụta ndị a si emetụta gị? Mgbe ahụ i nwere ike nyochagharịa Mosis 5:4-15, na-achọ maka atụmatụ nke Chineke na ịgbapụta anyị site na mmetụta ndị a. Gịnị mere Adam na Iv jiri nwee obi ekele mgbe mmụọ ozi letachara ha? Kedụ ihe ị na-amụta site n’aka ha banyere atụmatụ nke Nna nke Eluigwe?
Lee kwa “Niihi Ya” (vidiyo), Ọba akwụkwọ Ozi ọma.
Because of Him
Jenesis 3:16; Mosis 4:22
Kedụ ihe ọ pụtara na Adam “ga-achị n’isi” Iv?
Ederede nke akwụkwọ nsọ nke a mgbe ụfọdụ ka aghọtaghiere na ọ pụtara na iwu kwadoro di ịkpasu nwunye ya agwa na-ejighị obi ebere. N’oge anyị taa, ndị amụma nke Onyenwe anyị akuziwo na di na nwunye kwesịrị ịhụ onwe ha dị ka ndị nsiso nha na-imejuputa oke na ọrụ ha sinachi niime ezi na ụlọ (lee “Ezi na ụlọ: Ọkwa A Mara nye Ụwa” [Ọba akwụkwọ Ozi ọma]). Okenye Dale G. Renlund na Nwanne nwanyị Ruth Lybbert Renlund kọwara na di nwere ezi omume “ga-achọ ije ozi; ọ ga-anakwere mperi ma rịọ mgbaghara; ọ ga-adị nkọ na-inye otuto; ọ ga na-eche maka mmasị niile nke ndị otù ezi na ụlọ; nnukwu arọ nke oke na ọrụ ọ ga-eweta ga-emetụ ya iji wetere ‘ihe ndị dị mkpa nke ndụ na nchekwa’ maka ezi na ụlọ ya; ọ ga-akpasị nwunye ya agwa jiri nkwanye ugwu na ndịiche kachasị ibe ya. … Ọ ga-agọzi ezi na ụlọ ya” (Ọkwa Nchụaja Melkizedek: Ịghọta Ozizi ahụ, Ibi ndụ Ụkpụrụ niile [2018], 23).
E nwere m mkpa ohere nhọrọ na mmegide iji too.
Okenye Dale G. Renlund kuziri, “Ebumnoobi nke Nna anyị nke Eluigwe na-ịzụ ụmụ abụghị ime ka ụmụ Ya mee ihe ziri ezi; ọ bụ ime ụmụ Ya họrọ ime ihe ziri ezi ma n’ikpeazụ dịrị ka Ya” (“Họrọ Gị n’Ụbọchị Taa,” Liahona, Nov. 2018, 104). Kedụ ihe mere o ji dị oke mkpa n’atụmatụ nke Nna nke Eluigwe na anyị ga-ahọrọ ime ihe dị mma?
Dị ka ị na-agụ Mosis 4:1-4, chọọ ihe Nna nke Eluigwe na Jizọs Kraist mere iji chekwaa ike gị iji họrọ—ohere nhọrọ gị. Kedụ otu i ga-esi enwete ike nchekwa ha? Maka echiche ndị ọzọ, tulee ịmụ nkeji “Mee nhọrọ ndị mmụọ kpakere” niime Ume nke ndị Ntoroọbịa: Odudu maka Ime Nhọrọ niile (4-5).
Tuleekwa ịgụ ihe Lehi kuziri banyere ohere nhọrọ niime 2 Nifaị 2:11–20, 25–30. Gịnị mere mmegide si dị mkpa maka ohere nhọrọ? Kedụ otu i ga-esi egosi obi ekele nye Jizọs Kraịst maka inye gị “ohere ị họrọ”? (2 Nifaị 2:27).
Lee kwa Dallin H. Oaks, “Mmegide niime Ihe Niile,” Liahona, Me 2016, 114–17; Isiokwu niile na Ajụjụ niile, “Ohere nhọrọ,” Ọba akwụkwọ Ozi ọma; “Họrọ nke Ziri ezi,” Abụ, no. 239.
Bawanye nsonye. Ọtụtụ ihe omume ndị a na-amụ ka e nwere ike ime dị ka otu onye, ezi na ụlọ, ma ọ bụ klas; nʻobere otù dị iche iche; ma ọ bụ na mkpị na mkpị. Jiri ụzọ dị iche iche iji kwe ndị mmadụ isonye ndị nwere ike ma ọ bụghị otu a agaghị enwete ohere ọbụla. Maka ihe omume nke a, i nwere ike kpọkuo otu onye ma ọ bụ otù ịgụ Mosis 4 na akwụkwọ odudu Maka Ume nke Ndị Ntoroọbịa ebe otù ọzọ na-amụ amaokwu ndị dị niime 2 Nifaị 2. Ha nweziri ike kuziere ibe ha ihe ha mụtara na nkeji ha n’otu n’otu.
Setan na-achọ “iduhie ma mee ka m kpuo isi”.
Dị ka ị na-agụ Mosis 4:4–12; 5:13–33, tulee idepụta ụzọ niile nke Setan si gbalịa ịnwa Adam na Iv na ụmụ ha. Kedụ otu o si anwa ụdị ụmụ ihe ndị ahụkwa taa? Kedụ otu Nna nke Eluigwe si enyere gị aka guzogide aghụghọ Setan niile?
“Mụ onwe m, Onyenwe anyị Chineke … yiwere ha uwe.”
Mgbe ha richara mkpụrụ osisi amachibidoro nʻiwu, Adam na Iv gbalịrị ikpuchi ọtọ nke onwe ha. Emesịa, Onyenwe anyị kwere iyiwe ha uwe. Dị ka ị na-agụ Mosis 4:13–16, 27, tulee ndị a sotere:
-
Tulee ihe ịgba ọtọ na iyi uwe pụrụ ịnọchite niime akwụkwọ nsọ (lee, ịma atụ, Mkpughe 7:9, 13–15; 2 Nifaị 9:14; Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 109:22–26, 76). Kedụ ihe ị na-amụta site na nhụmiihe nke Adam na Iv maka ịgba ọtọ na iyi uwe?
-
Ọ bụrụ na i nwetewo onyinye dị nsọ niime tempụl, tulee ihe Adam na Iv nwere ike ịgwa gị banyere mkpa nke gament tempụl gị dị na ihe ọ na-anọchite anya ya.
Lee kwa “Uwe Tempụl Dị nsọ” (vidiyo), Ọba akwụkwọ Ozi ọma.
Sacred Temple Clothing
Chineke ga-anabata aja m niile ọ bụrụ ma m chụọ ha jiri obi dị njikere ma dị nrube isi.
Dị ka ị na-amụ Mosis 5:4–9, 16–26, tulee njirimara niile nke Adam na Iv na ụmụ ha ndị nwoke Ken na Abel maka ịchụ aja. Gịnị mere Onyenwe anyị si nabata aja nke Abel mana ọbụghị nke Ken?
Gịnị ka Onyenwe anyị gwara anyị ji chụọ aja? E nwere ihe ọbụla dị niime amaokwu ndị a na-ahazi ụzọ i si eche echiche banyere aja ndị ahụ?
Maka ihe ndị ọzọ, lee mbipụta niile nke ọnwa nke a nke Liahona na magazin niile nke Maka Ume nke Ndị Ntoroọbịa
Nchepụta niile maka Ikuziri Ụmụntakịrị
Jizọs Kraịst na-azọpụta anyị site na Ọdịda ahụ.
-
Iji nyere ụmụ gị aka ghọtazie Ọdịda nke Adam na Iv, i nwere ike kọpịa foto niile site na “Adam na Iv” (niime Akụkọ Agba Ochie niile, 13-16) ma chapụta ha. Mgbe ahụ unu nwere ike rụkọta ọrụ ọnụ itinye foto ndị ahụ n’usoro dị ka unu na-akparịta nhụmiihe niile nke Adam na Iv. Dị ka ị na-eme, kwuo banyere ihe kpatara o ji dị mkpa, niime atụmatụ nke Nna nke Eluigwe, maka Adam na Iv ịhapụ Ubi nke Iden.
-
Ụmụ gị nwere ike nwete mmetụta obi ekele maka Aja mgbaghara mmehie nke Jizọs Kraịst dị ka ha na-aghọta otu O si emeri mmetụta niile nke Ọdịda ahụ. Dị ka unu na-agụkọta Mosis 4:25; 6:48; Ndị Rom 5:12; 2 Nifaị 2:22–23ọnụ, nyere ụmụ gị aka chọta ụzọ ndị esi emeju ahịrịokwu nke a: “Niihi Ọdịda ahụ, Mụ onwe m …” Emesịa dị ka ị na-agụkọta Mosis 5:8–11, 14–15; 6:59; Alma 11:42ọnụ, ha nwere ike mejuo ahịrịokwu nke a “Niihi Jizọs Kraịst, Mụ onwe m …” Kesaara ibe unu obi ekele unu maka Jizọs Kraịst.
E nwere m ike ịhọrọ ezi ihe.
-
Tulee obere ihe nkuzi eji nʻaka iji dubata ụkpụrụ nke ohere nhọrọ: kpọkuo ụmụ gị ite ihu akwụkwọ ihe omume nke izu ụka nke a agba, mana nye ha naanị otu agba iji tee. Kedụ ihe mere ọ ga-eji akatụ mma inwe nhọrọ? Unu nweziri ike gụkọta Mosis 4:1-4 ọnụ ma kwuo banyere ihe mere Chineke si na-achọ ka anyị nwee ike ịhọrọ n’etiti ezi ihe na ajọọ ihe. Kedụ otu Nna nke Eluigwe na Jizọs Kraist si enyere anyị aka mee nhọrọ ndị dị mma?
-
Nyere ụmụ gị aka chee maka ma see foto nke ezi nhọrọ niile ha nwere ike ime iji soro Jizọs Kraịst. Ma ọ bụ unu nwere ike gụkọta ọnụ otu egwu banyere ime ezi nhọrọ niile, dị ka “Họrọ Ụzọ nke Ziri ezi” (Akwụkwọ Ukwe Ụmụntakịrị, 160-61). Unu nwere ike gwa onwe unu banyere oge mgbe i mere ezi nhọrọ ma kwuo banyere ụdị mmetụta i nwetere mgbe emesịrị.
Ọdịda Ahụ, nke si n’aka Robert T. Barrett
E nwere m ike ikpe ekpere nye Nna nke Eluigwe.
-
Mgbe Adam na Iv bịara pụọ Ubi nke Iden, ha enweghị ike ịnọnyere Nna nke Eluigwe ọzọkwa. Gụọ Mosis 5:4, 8 gị na ụmụ gị, ma nyere ha aka chọta ihe Adam na Iv mere iji nwete mmetụta ịnọ Ya nso ma nụrụ Ya. Kedụ ihe bụ ụfọdụ ihe ndị anyị nwere ike ịgwa Nna nke Eluigwe niime ekpere anyị niile?
Maka ihe ndị ọzọ, lee mbipụta nke ọnwa nke a nke magazin Friend
Na Nyiri nke Aja nke Onye A Mụrụ Naanị Ya nke Nna, site n’aka Mike Malm (lee Mosis 5:5-9)