“Echiche ndị aga E Buru n’Uche: Ịgụ Agba Ochie,” Bianụ, Soro M—Maka Ebe Obibi na Nzukọ nsọ: Agba Ochie 2026 (2026)
“Ịgụ Agba Ochie,” Bịanụ, Soro M: 2026
Echiche ndị aga Eburu nʻUche
Ịgụ Agba Ochie
Mgbe Nifaị naara achọ ịkpate mmụọ ụmụnne ya ndị nwoke ịtụkwasị obi na Onyenwe anyị, o kesara akụkọ niile banyere Mosis na nkuzi niile sitere n’aka Aịzaya. Mgbe Onye Ozi Pọl chọbuuru ịgba ndị Kristian isimbụ ume inwe okwukwe niime nkwa niile nke Chineke, o cheteere ha banyere okwukwe nke Noa, Ebraham, Sarah, Rahab, na ndị ọzọ. Ma mgbe Jizọs Kraịst gwara ndị ndu nke ndị Juu “ịchọgharị akwụkwọ nsọ,” na-akọwa na ha “na-agba ama maka m” (Jọn 5:39), akwụkwọ nsọ ndị Ọ naara ekwu maka ha bụ odide niile anyị na-akpọ Agba Ochie.
N’ụzọ ọzọ, mgbe ị na-agụ Agba Ochie, ị na-agụ okwu niile nke kpaliteworo mmụọ, kasịe obi, ma gbaa ndị mmadụ nke Chineke ume ihe ruru puku kwuru puku afọ.
Mana ihe edere ogologo oge niile a gara aga o nwere ike n’ezie inyere gị aka chọta azịza nye nsogbu niile nke taa? Ee, o nwere ike! Karịsịa ọ bụrụ ma gị cheta onye Agba Ochie bụ maka ya n’ezie.
Ama nke Jizọs Kraịst
Ihe ọbụla bụ ihe ịma aka gị na ezi na ụlọ gị na-agabiga, azịza ya na-abụkarị Jizọs Kraịst. Ya mere ịchọta azịza niile niime Agba Ochie, chọọ Ya. Ọ gaghị adị mfe mgbe niile. I nwere ike kwesị itule na ndidi ma chọọ odudu ime mmụọ. Mgbe ụfọdụ nrụtụaka niile nye Ya yiri ka ihe doro anya, dị ka na ọkwa nke Aịzaya, “Amụworo anyị otu nwa, e nyewokwa anyị otu nwa nwoke: … ma aha ya ga-abụ … Ọkpara Eze nke Udo” (Aịzaya 9:6). N’ebe ndị ọzọ, Onye Nzọpụta ka egosipụtara nʻụzọ a na-akpọghị ya aha, site na akara niile na myirita niile—iji maa atụ, site na nkọwa niile nke iji anụmanụ achụ aja ma ọ bụ nkọwapụta nke Josef na-agbaghara ụmụnne ya ndị nwoke ma na-azọpụta ha site na ụnwụ.
Ìhè nke Ụwa, site n’aka Scott Sumner
Ọ bụrụ ma gị chọọ nnukwu okwukwe niime Onye Nzọpụta dị ka ị na-amụ Agba Ochie, ị ga-achọta ya. Elemaanya nke a nwere ike ịbụ ebumnuuche nke ọmụmụ ihe gị afọ nke a. Kpee ekpere ka Mmụọ ahụ duo gị ịchọta ma lekwasị anya n’ederede niile, akụkọ niile, na amụma niile nke ga-akpọta gị nso na Jizọs Kraịst.
Echekwara site na Chi
Atụkwala anya na Agba Ochie ga-egosipụta agụgụala zuru ezu ma dị kpọmkwem nke ụmụ mmadụ. Nke ahụ abụghị ihe odee na ndị nchịkọta isimbụ naara agbalị imepụta. Nchegbu ha kachasị bụ ikuzi ihe banyere Chineke—banyere atụmatụ Ya maka ụmụ Ya, banyere ihe ọ pụtara ịbụ ndị ọgbụgba ndụ Ya, na banyere otu esi achọta mgbapụta mgbe anyị jehere. Mgbe ụfọdụ ha na-eme ya site na-ịkọ ihe ndị mere mgbe gboo dị ka ha ghọtara ha, gụnyere akụkọ niile sitere na ndụ nke ndị amụma dị ukwuu. Jenesis bụ otu ọmụmaatụ nke a, ma otu ahụ ka ọ dị akwụkwọ ndị dị ka Joshua, Ndị Ọka ikpe, na 1 na 2 Ndị Eze. Mana ndị odee ọzọ nke Agba Ochie atụghị anya ịbụ nke agụgụala mgbe ọbụla. Kama, ha kuziri ihe site n’ọrụ nka niile dị ka abụ na agụmagụ. Abụ ọma na Ilu dabara na katigori nke a. Ma mgbe ahụ e nwere okwu ndị amụma dị oke ọnụ ahịa, dị ka Aịzaya na Malakaị, ndị kwuru okwu Chineke nye Izrel mgbe gboo—ma, site n’ọrụ ebube nke Baịbụl, ka na-agwakwa anyị okwu taa.
Ndị amụma ndịa niile, ndị ọbụ abụ, na ndị nchịkọta ha maara na okwu ha niile ka ndị mmadụ na gburugburu ụwa niile ga-agụ afọ puku kwuru puku ma emesịa? Anyị amaghị. Mana anyị na-enwe ịtụnaanya na nke a bụ kpọmkwem ihe meworonu. Mba dị iche iche biliri ma daa, obodo ukwu dị iche iche ka e meriri, ndị eze biri ma nwụọ, mana Agba Ochie nọfere ha niile, site na ndudugandu ruo na ndudugandu, site na odee ruo na odee, site na ntụgharị asụsụ ruo na ntụgharị asụsụ. Nʻezie ụfọdụ ihe furu efu ma ọ bụ emegharịrị, ma otu ọ dị ọbụladị ọtụtụ ka echekwara n’ụzọ dị ebube.
Onye amụma Agba Ochie, site n’aka Judith A. Mehr (nkọwa)
Ndị a bụ nnọọ ihe ole ma ole ịga etinye n’uche dị ka ị na-agụ Agba Ochie n’afọ nke a. Chineke chekwara odide mgbe gboo ndị a niihi na Ọ maara gị na ihe ndị ị na-agabiga. Ọ kwadowo ozi ime mmụọ maka gị niime okwu ndị a, nke ga-akpọketa gị nso nʻebe Ọ nọ ma hiwe okwukwe gị niime atụmatụ Ya na Ọkpara Ya Ọ Hụrụ Naanya. Elemanya Ọ ga-eduba gị nʻotu edereede ma ọ bụ nghọta nke ga-agọzi onye ị maara—ozi ị nwere ike ikesara otu enyi, otu onye otù ezi na ụlọ, ma ọ bụ Onye nsọ ibe gị. E nwere ọtụtụ ohere ndị e nwere ike isi mee ha. Ọ bụ na nke ahụ adịghị enye obi ụtọ iche bara ya echiche?
Nifaị kwuru, “Mkpụrụ obi m na-enwe mmasị niime akwụkwọ nsọ” (2 Nifaị 4:15). E nwere ike ọ ga-adịkwa gị otu ahụ dị ka ị gụrụ ọtụtụ otu ụdị okwu ndị ahụ Nifaị gụrụ—ihe anyị na-akpọ ugbu a Agba Ochie.
Akwụkwọ ndị dị niime Agba Ochie
Na vashọn Agba Ochie ndị Kristian kachasị, akwụkwọ niile ka ahaziri n’ụzọ dị iche site otu esiri hazie ha mgbe ebuzọ chịkọta ha n’otu nchịkọta. Ya mere Baịbụl ndị Hibru kere akwụkwọ niile n’ụzọ katigori atọ—iwu, ndị amụma, na odide niile—ọtụtụ Baịbụl ndị Kristian kachasi na-ahazi akwụkwọ niile na katigori anọ: iwu (Jenesis-Ditronomị), agụgụala (Joshua-Esta), Akwụkwọ Ukwe niile (Job-Abụ ndị Abụ), na ndị amụma (Aịzaya-Malakaị).
Gịnị mere katigori ndị a si dị mkpa? Niihi na ịmata ụdị akwụkwọ nke ị na-amụ nwere ike nyere gị aka ghọta otu ị ga-esi amụ ya.
Nke a bụ otu ihe ị ga-eburu n’uche dị ka ị na-amalite ịgụ “iwu ahụ,” ma ọ bụ akwụkwọ ise mbụ nke Agba Ochie. Akwụkwọ ndị a, nke adịmbụ gụnyere ha Mosis, nweere ike bụrụ na ọ gafewo site n’aka ruo n’aka nke imerime ndị odee na ndị nchịkọta kemgbe ọtụtụ oge. Ma anyị nwere ike ịma na, nʻọtụtụ narị afọ gara aga, “ọtụtụ akụkụ ndị dị mfe nghọta ma dị oke ọnụ ahịa” ka ewepụrụ site na Baịbụl (lee 1 Nifaị 13:23-26). Rute ugbua, akwụkwọ niile nke Mosis bụ okwu Chineke mmụọ kpatere, ọbụna agbanyeghị ha bụ—dị ka ọrụ ọbụla nke Chineke ezipụrụ site n’aka ndị pụrụ ịnwụ anwụ—n’okpuru adịghị ike niile nke mmadụ (lee Mosis 1:41; Edide niile nke Okwukwe 1:8). Okwu Moronaị niile, na-arụtụ aka na ndekọihe Akwụkwọ nke Mọmọn dị nsọ nke o nyere aka chịkọta, na-enye aka ebe a: “Ọ bụrụ na-enwere ndejọ ha bụ mmejọ niile nke ụmụ mmadụ; ya mere, amakwala ihe ndị nke Chineke ikpe” (aha ihuakwụkwọ nke Akwụkwọ nke Mọmọn). N’aka nke ọzọ, akwụkwọ nke akwụkwọ nsọ abụghị ihe kwesịrị ịgbanarị mperi si nʻaka mmadụ iji bụrụ okwu Chineke.