Come, Follow Me
Jenụwarị 5–11. “Nke a Bụ Ọrụ M na Ebube M”: Mosis 1; Ebraham 3


“Jenụwarị 5–11. ‘Nke a Bụ Ọrụ M na Ebube M’: Mosis 1; Ebraham 3,” Bianụ, Soro M—Maka Ebe Obibi na Nzukọ nsọ: Agba Ochie 2026 (2026)

“Jenụwarị 5–11. ‘Nke a Bụ Ọrụ M na Ebube M’,” Bịanụ, Soro M: 2026 2026

kpakpando na nebula dị n’igwe

Jenụwarị 5–11: “Nke a Bụ Ọrụ M na Ebube M”

Mosis 1; Ebraham 3

Baịbụl jiri okwu ndị a malite “na mmalite Chineke kere eluigwe na ụwa” (Jenesis 1:1). Mana kedụ ihe nọọrọ ebe ahụ tupu “mmalite” nke a? Ma maka gịnị ka Chineke jiri kee ihe nke a niile? Site n’aka Onye amụma Joseph Smith, Onyenwe anyị enyetụwo ihè maka ajụjụ ndịa.

Na-ịmaatụ, O nyere anyị ndekọihe nke ọhụ nʻebe Ebraham hụrụ ịdị adị anyị dị ka mmụọ niile “tupu ụwa adịrị” (lee Ebraham 3:22–28). Onyenwe anyị nyekwara anyị ntụgharị asụsụ mmụọ kpakere ma ọ bụ ntụgharị nke isi mbụ ruo na isii nke Jenesis, a kpọrọ akwụkwọ nke Mosis—nke na-ejighị “na mmalite” bido. Kama, ọ malitere jiri nhụmiihe nke Mosis nwetere nke na-egosi ọnọdụ ụfọdụ maka akụkọ Okike. Nʻigwe, akwụkwọ nsọ ụbọchị ikpeazụ ndị a bụ ebe dị mma iji bido ọmụmụ ihe anyị nke Agba Ochie niihi na ha na-aza ụfọdụ ajụjụ kachasị mkpa ndị nwere ike ịkọwa ihe ọgụgụ anyị: Onye bụ Chineke? Onye ka anyị bụ? Gịnị bụ ọrụ nke Chineke, ma gịnị bụ ọnọdụ anyị niime ya? Isi mmepe nke Jenesis ka e nwere ike ịhụ dị ka azịza nke Onyenwe anyị nyere arịrịọ nke Mosis: “Meere nwa odibo gị ebere, O Chineke, ma gwa m ihe gbasara ụwa nke a, na ndị bi niime ya, nakwa eluigwe niile” (Mosis 1:36).

akara ngosi ihe ọmụmụ

Nchepụta niile maka Ọmụmụ ihe N’Ebe Obibi nakwa na Nzukọ nsọ

Mosis 1

akara ngosi semịnarị
Dị ka nwa Chineke, e nwere m akara aka sinachi.

“Ọ bụrụ na Onyenwe anyị naara agwa gị okwu n’onwe gị,” Onyeisi Russell M. Nelson kuziri, ihe mbụ Ọ ga-ahụ na ị ghọtara bụ ezi njirimara gị” (“Nhọrọ niile maka mgbe Ebighị ebi” [ofufe nro gburugburu ụwa maka ndị dimkpa nta, Me 2022], Ọba akwụkwọ Ozi ọma). Ọ pụtara na Setan ga-anwa ịgbagwoju gị anya n’otu ihe ahụ kwa. Chọọ nsoro nke a niime ozi nke Chineke nyere Mosis niime Mosis 1:4, 6 na niime ozi niile nke Setan niime Mosis 1:12. Kedụ ihe ị na-amụta site na amaokwu ndị a banyere ndịiche niile dị nʻetiti Chineke na Setan?

Onyeisi Nelson akuziwo kwa, “Otu i si eche echiche banyere onye ị bụ n’ezie na-emetụta fọrọ nke nta ka ọ bụrụ mkpebi niile i ga-eme” (“Nhọrọ niile maka mgbe Ebighị ebi”). Tulee idepụpta nhọrọ niile ị na-eme niihi na njirimara gị dị ka nwa Chineke na-abịa tupu aha ndị ọzọ.

Kedụ amaokwu ma ọ bụ nkebiokwu ndị agbakwunyere niime Mosis 1 na-enyere gị aka ghọta uru gị sinachi? I nwekwara ike gụkwuo ozi nke Onyeisi Nelson niime nkeji nke “Nhọrọ niile maka mgbe Ebighị ebi” a na-akpọ “Nke Mbụ: Mara eziokwu banyere onye ị bụ.” Kedụ ihe na-akpate mmụọ gị ime iji mee njirimara gị dị ka nwa Chineke ihe eji amata gị kachasị mkpa?

Lee kwa “A Bụ M Nwa Chineke,” Hymns (1985), no. 301; “Ezigbo Njirimara Anyị” (vidiyo), Ọba akwụkwọ Ozi ọma; Isiokwu niile na Ajụjụ niile, “Ụmụ Chineke,” Ọba akwụkwọ Ozi ọma.

3:39

Our True Identity

nne, nna, na nwa ọhụrụ na-amụ amụ

Mosis 1:12–26

Site na enyem aka nke Onyenwe anyị, e nwere m ike iguzogide Setan.

Dị ka Mosis 1 na-egosi nke ọma, nhụmiihe niile nke ime mmụọ apụtaghị na-agaghị ma ọlị anwa anyị ọnwụnwa ọzọ. Nʻezie, otu ụzọ aghụghọ nke Setan bụ ịnwa anyị inwe obi abụọ na nhụmiihe ndị a. Dị ka ị na-agụ azịza nke Mosis nyere Setan niime amaokwu 12-26, kedụ ihe ị na-amụta nke nwere ike inyere gị aka guzosie ike nʻama nke ahụ ị nataworo? Kedụ ihe ọ bụ nke nʻikpeazụ nyeere Mosis aka merịa Setan.

Ihe mmụta ọzọ sitere na nhụmiihe nke Mosis bụ na Setan na-anwa anyị ọnwụnwa jiri adịgboloja nke eziokwu na ike nke Chineke. Chee maka ụfọdụ vashọn adịgboloja nke ụmụ ihe, dị ka osisi aka kpụrụ, ma ọ bụ nwa baby. Kedụ otu ị ga-esi amata na ha bụ adịgboloja? Emesịa tulee adịgboloja niile nke Setan na-eji taa iji nwaa gị ọnwụnwa. Gịnị ka ị ga-amụta site na Mosis 1:13-18 banyere otu esi amata ma jụ adịgboloja ya niile? Kedụ otu Onyenwe anyị ga-esi enyere gị aka? (Lee Mosis 1:24–26).

Lee kwa Matiu 4:1–11; Gary E. Stevenson, “Eduhiekwala M,” Liahona, Nov. 2019, 93–96; “A Bụ M Ọkpara Chineke” (vidiyo), Ọba akwụkwọ Ozi ọma.

6:31

I Am a Son of God

Ịmụ ihe nʻebe obibi ka e nwere ike ịhazi mana nwekwara ike bụrụ nke a na-eyighi eyi. “Ohere nkuzi niile niime ezi na ụlọ na-emekarị mgbe na mgbe nʻụzọ a na-eyighị eyi, oge ụbọchị niile—mgbe a na-eri nri, a na-arụ ọrụ ụlọ, a na-egwuri egwu niile, [ma ọ bụ] na-eme njem” (Ikuzi ihe n’Ụzọ nke Ọnye nzọpụta, 31) Ịmaatụ, na mgbakwunye ịgụ banyere otu Mosis si guzogide Setan niime Mosis 1, i nwere ike were oge ole ma ole nʻoge nri mgbede dị ka ezi na ụlọ kwuo okwu banyere otu i siri guzogide ike mmetụta nke onye iro.

Mosis 1:27–39; Ebraham 3

Ọrụ na ebube nke Chineke bụ iji nyere m aka nwete ndụ ebighị ebi.

Mgbe ọ hụchara ọhụ nke okike nke Chineke, Mosis gwara Onyenwe anyị: “Gwa m … ihe kpatara ihe ndị a si dị otu a” (Mosis 1:30). Gịnị na-amasị gị banyere azịza nke Onyenwe anyị niime Mosis 1:31–39? Kedụ ndịiche dị n’etiti anwụghị anwụ na ndụ ebighị ebi? (Lee Isiokwu niile na Ajụjụ niile, “Ndụ Ebighị ebi,” Ọba akwụkwọ Ozi ọma). Kedụ otu Jizọs Kraịst si enye aka weta ha abụọ na mmezu? Ebraham hụkwara ọhụ, edekọrọ niime Ebraham 3. Kedụ ihe ị na-achọta niime amaokwu nke 24-26 nke nwere ike inye aka zaa arịrịọ nke Mosis.

Ebraham 3:22–28

E biri m ndụ dị ka mmụọ tupu a mụọ m n’elu ụwa.

Anyị maara obere ihe banyere ndụ tupu ndụ anụ ahụ anyị. Mana ọtụtụ niime ihe ndị anyị maara pụtara site na ọhụ nke Ebraham dị niime Ebraham 3:22-28. Dị ka ị na-agụ amaokwu ndị a, depụta eziokwu ndị ị hụrụ—gụnyere eziokwu niile banyere onwe gị na banyere Jizọs Kraịst. Gịnị mere eziokwu ndị a jị baara gị uru? Kedụ ndịiche nke a nwere ike ime niime ndụ gị?

Leekwa Isiokwu niile na Ajụjụ niile, “Ndụ tupu ndụ anụ ahụ,” Ọba akwụkwọ Ozi ọma.

Maka ihe ndị ọzọ, lee mbipụta niile nke ọnwa nke a nke Liahona na magazin niile nke Maka Ume nke Ndị Ntoroọbịa.

akara ngosi nkeji ụmụntakịrị 01

Nchepụta niile maka Ikuziri Ụmụntakịrị

Mosis 1:1–4, 6, 12

A bụ m nwa Chineke.

  • Mgbe ị gụkọtachara ọnụ ozi nke Chineke nyere Mosis niime Mosis 1:4, tulee ikwe ka ụmụ gị lee onyonyoo ha na enyo ma na-enye onwe ha otu ụdị ozi ahụ: “A bụ m nwa Chineke.” Mgbe ahụ ha nwere ike inye ibe ha otu ụdị ozi ahụ: “Ị bụ nwa Chineke.” I nwekwara ike chọta foto niile nke ndị mmadụ dị iche iche ma kpọkuo ụmụ gị ịtụ ibe ha aka ma kwuo, “Onye a bụ nwa Chineke.” Kesaara ibe unu ihe mere i ji nwee obi ụtọ ịmara na unu bụ ụmụ Chineke. Kedụ otu ịmata nke a si agbanwe ụzọ i si akpasị ndị ọzọ agwa ma onwe gị?

  • Gị na ụmụ gị nwere ike tụnyere ozi nke Chineke nyere Mosis niime Mosis 1:4 ya na ozi nke Setan niime amaokwu 12. Kedụ otu ị ga-esi enyere ụmụ gị aka nwee ike mara ndịiche dị nʻetiti ozi nke Chineke nyere ha na nke Setan?

Jehova na-apụtakwute Mosis

Mosis Ahụ Jehova, site nʻaka Joseph Brickey (uju)

Mosis 1:6, 39

Nna nke Eluigwe nwere ọrụ nke m ga-arụ.

  • Dị ka gị na ụmụ gị na-agụ Mosis 1:6 i nwere ike gwa ha okwu banyere “ọrụ” Chineke nweburu maka Mosis. Tulee iji Akwụkwọ Nka Ozi ọma, nọs 13-16, ma ọ bụ Akụkọ niile nke Agba Ochie, ihu akwụkwọ 64-84, iji nyere ụmụ gị aka hụ ihe Mosis mejuputara site na-enyemaka nke Nna nke Eluigwe. Gịnị bụ ọrụ Chineke nwere maka anyị ịrụ? (lee, ịmaatụ, Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 11:20).

Mosis 1:12–26

E nwere m ike iguzogide ọnwụnwa niile nke Setan.

  • Dị ka gị na ụmụ gị na-amụ Mosis 1:12-26 nyere ha aka chọpụta ihe Mosis mere iji guzogide Setan (lee amaokwu ndịa 13, 15, 18, 20–22, 26). O nwere ike bụrụ ihe na-enye ha obi ụtọ igosipụta ihe ndị ha nwere ike ime iji guzogide ọnwụnwa (ụdị dị ka ikpe ekpere, isi ebe ahụ pụọ, ma ọ bụ ịrịọ maka enyemaka).

Ebraham 3:22–28

E biri m ndụ dị ka mmụọ tupu a mụọ m n’elu ụwa.

  • Ịmara banyere ndụ anyị dị tupu anyị abịa nʻụwa nwere ike kpakee mmụọ ụmụ gị ime nhọrọ ndị dabeere na eziokwu ndị dị ebighị ebi. Iji nyere ha aka mụọ banyere ya, i nwere ike nye ha ụfọdụ okwu ntụghe na nkebiokwu niile ka ha chọta niime Ebraham 3:22-28, dị ka “tupu e kee ụwa,” “mmụọ niile,” “kee ụwa,” ma “nwalee.” Kedụ ihe amaokwu ndị a na-akuziri anyị banyere ihe mere Nna nke Eluigwe jiri zite anyị n’ụwa?

  • Ukwe dị ka “Aga M Esoro Atụmatụ nke Chineke” (Akwụkwọ ukwe nke Ụmụntakịrị, 164-65) nwere ike kwusie ike ihe Ebraham 3 na-akuzi. E nwere ike gị akpọkuo ụmụ gị ise ihe osise niile dabara nʻokwu ndị ahụ.

  • Nyere ụmụ gị aka chee maka ọnọdụ niile nke ha nwere ịhọrọ ma ọ bụ hara ịhọrọ ime ihe Chineke gwara ha mee (lee Ebraham 3:25; lee kwa Maka Ume Ndị ntoroọbịa: Akwụkwọ Odudu maka Ime Nhọrọ niile). Kwe ka ha megharịa azịza ndị nwere ike ịdị nye ọnọdụ ndị a. Kedụ otu Onye Nzọpụta ga-esi enyere anyị aka mgbe anyị mere nhọrọ ọjọọ?

Maka ihe ndị ọzọ, lee mbipụta magazin Friend nke ọnwa nke a.

Mosis na-achụpụ Setan

Mosis Emeriwo Setan, site n’aka Joseph Brickley

Ihu akwụkwọ ihe omume Prịamarị 1: A bụ m nwa Chineke