“Jenụwarị 12–18. ‘Ma Mmalite Chineke Kere Eluigwe na Ụwa’: Jenesis 1-2; Mosis 2-3; Ebraham 4-5,” Bianụ, Soro M—Maka Ebe Obibi na Nzukọ nsọ: Agba Ochie 2026 (2026)
“Jenụwarị 12–18. ‘Na Mmalite Chineke Kere Eluigwe na Ụwa’,” Bịanụ, Soro M: 2026
Jenụwarị 12–18: “Na Mmalite Chineke Kere Eluigwe na Ụwa”
Jenesis 1–2; Mosis 2–3; Ebraham 4–5
Niihi na ụwa gbara anyị gburugburu mara oke mma ma dịrị ebube, ọ na-ara ahụ iche ụwa mgbe ọ “na-enweghị ọdịdị, na dịrị efu” ma “ghere oghe ma tọgbọrọ n’efu” (Jenesis 1:2; Ebraham 4:2). Otu ihe akụkọ Okike na-akuziri anyị bụ na Chineke nwere ike, ka oge na-aga, kee ihe dị ebube site nʻihe ahazighị ahazi. Nke ahụ na-enyeaka icheta mgbe ndụ yiri ọgbaghara. Nna nke Eluigwe na Jizọs Kraist bụ Ndị Okike, ma ọrụ okike Ha na anyị agwụbeghị. Ha nwere ike ime ìhè achakee nʻoge ndị ọchịchịrị gbara niime ndụ anyị. Ha nwere ike iji ndụ mejupụta oghere anyị. Ha nwere ike ịgbanwe anyị ịghọ ndị ekere eke sinachi anyị kwesịrị ịbụ. Nke ahụ bụ ihe ọ pụtara ịbụ onye ekere n’oyiyi nke Chineke, dị ka ọdịdị Ya dị (lee Jenesis 1:26). Anyị nwere ike mmepụta ịbụ dị ka Ya: ebuliri elu, nwee ebube, bụrụ nke eluigwe.
Maka nchịkọta nke akwụkwọ nke Jenesis, lee “Jenesis” niime Ọkọwa okwu Baịbụl.
Nchepụta niile maka Ọmụmụ ihe N’Ebe Obibi na na Nzukọ nsọ
Jenesis 1:1–25; Mosis 2:1–25; Ebraham 4:1–25
“Site n’aka Onye M Mụrụ Naanị Ya ka m kere ihe ndị a nile.”
Na-agbanyeghị anyị amaghị ihe niile banyere otu esi kee ụwa, ọ dị mmasị ịmara ihe Chineke họrọworo ikpughe banyere Okike. Kedụ ihe Chineke na-akuziri gị banyere ya niime Jenesis 1:1–25; Mosis 2:1–25; na Ebraham 4:1–25? Gịnị mere O ji chọọ gị ịmara ihe ndị a? Dị ka ị na-atụgharị uche na nkọwapụta ndị a, i nwekwara ike tulee ihe ha na-akuziri gị banyere Nna nke Eluigwe, Jizọs Kraịst, ụwa, na onwe gị.
Imejupụta ọmụmụ ihe gị, tulee ịgụ amaokwu ndị a dị ka ị pụrụ nọrọ n’etiti okike niile nke Chineke ma ọ bụ mgbe ị na-ege ntị nye ukwe dị ka “Ihe Niile Ekereke nke Chineke na Eze Anyị” (Abụ, no. 62). I nwere ike chọta foto ndị nke okike niile Ya na-enyere gị aka nwee mmetụta nsọpụrụ maka Onye Okike. Tulee ikesa foto ndịa, ya na ama gị, gị na ndị ọzọ.
Lee kwa Ozizi na Ogbụgba ndụ niile 101:32–34.
Ubi nke Iden, site n’aka Grant Romney Clawson
Jenesis 1:26–27; Mosis 2:26–27; Ebraham 4:26–27
Ekere m site n’Oyiyi nke Chineke.
Dị ka ị na-agụ Jenesis 1:26–27; Mosis 2:26–27; and Ebraham 4:26–27, tụgharịa uche ihe ọ pụtara ị bụ onye ekere “n’oyiyi” ma ọ bụ “ọdịdị,” nke Chineke nwoke na nwanyị. Kedụ ihe mere o ji dịrị gị mkpa ịmara eziokwu niime amaokwu ndị a? Ịma atụ, kedụ otu eziokwu ndị a si emetụta ụzọ anyị si ahụ onwe anyị, ndị ọzọ, na Chineke? Kedụ otu ha ga-esi enyere gị aka mgbe i nwere mmetụta na-adịghị mma banyere onwe gị?
Inyere gị aka chee banyere ajụjụ ndị a, gbalịa mejupụta ahịrịokwu dị ka nke a: “Niihi na a maara m na-ekere m n’oyiyi nke Chineke, a họọrọ m i …” Na-enyocha “Ahụ gị dị nsọ” niime Maka Ume Ndị Ntoroọbịa: Odudu maka Ime Nhọrọ niile (ihu akwụkwọ 22-29) nwere ike inye aka. Tulee ịhọrọ ihe ị ga-eme iji gosipụtara Chineke na ị maara na ahụ gị dị nsọ.
Niime vidiyo “Okike nke Chineke Kachasị ukwuu” (Ọba akwụkwọ Ozi ọma), Onyeisi Russell M. Nelson na-agba ama maka ịdị ebube nke ahụ mmadụ. Dị ka ị na-ele vidiyo nke a, jụọ onwe gị, “Kedụ otu Nna nke Eluigwe si chọọ m inwe mmetụta banyere ahụ m?” Kedụ otu nke a si dị iche site n’ozi ndị i nwere ike ịnụ site n’aka ndị ọzọ?
God's Greatest Creation
Ụfọdụ ndị nwere ike kwuo na ịbụ onye e kere nʻoyiyi nke Chineke pụtara na echiche anyị niile, mmetụta niile, na ochịchọ niile ka a kwadoro site nʻaka Ya ma na ọ dịghị mkpa ka anyị (ma ọ bụ enweghị ike) ime nke ọma karịa. Kedụ ihe ị ga-ekwu maka nke ahụ? Kedụ nghọta ndị i nwetere site na Mozaya 3:19 na Ita 12:27?
Lee kwa Russell M. Nelson, “Ahụ Gị: Onyinye Dị Ebube Ịhụnaanya,” Liahona, Aug. 2019, 50–55.
Jenesis 1:27–28; 2:18–25; Mosis 3:18, 21–24; Ebraham 5:14–18
Alụm di na nwunye n’etiti otu nwoke na otu nwanyị ka Chineke kwadoro.
“Adam na Iv ka ejikọtara ọnụ na alụmdi maka oge na maka mgbe ebighị ebi niile site n’ike nke ọkwa nchụaja [ahụ] dị ebighị ebi” (Russell M. Nelson, “Ihe mmụta site n’aka Iv,” Ensign, Nov. 1987, 87). Tụgharịa uche na nke a dị ka ị na-agụ Jenesis 1:27–28; 2:18–25; Mosis 3:18, 21–25; na Ebraham 5:14–19. Kedụ otu i nwere ike i si lezie alụmdi site nʻịdị nsọ Chineke nyeworo ya?
Lee kwa 1 Ndị Kọrịnt 11:11; “Ezi na ụlọ: Ọkwa a mara nye Ụwa,” Ọba akwụkwọ Ozi ọma.
Jenesis 1:28; Mosis 2:28; Ebraham 4:28
Ọ dị m n’aka ilekọta okike niile nke Chineke.
Kedụ ihe Jenesis 1:28; Mosis 2:28; na Ebraham 4:28 na-atụpụta banyere oke na ọrụ anyị nʻebe okike niile nke Chineke nọ? Kedụ ihe Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 59:16–21 na 104:13–18 na-agbakwunye na nghọta gị?
Lee kwa Gérald Caussé, “Ịbụ Onye nlekọta Anyị n’elu Ụwa,” Liahona, Nov. 2022, 57–59; Isiokwu niile na Ajụjụ niile, “Nlekọta Gburugburu ebe obibi na Nchekwa,” Ọba akwụkwọ Ozi ọma.
Jenesis 2:2–3; Mosis 3:2–3; Ebraham 5:2–3
Chineke gọziri ma doo Ụbọchị izuike nsọ.
Chineke mere Ụbọchị izuike nsọ, ma Ọ na-arịọ anyị i debe ya nsọ. Dị ka ị na-agụ Jenesis 2:2–3; Mosis 3:2–3; na Ebraham 5:2–3, chee banyere ihe ọ pụtara ime Ụbọchị izuike “ihe ngọzi” nye gị.
Lee kwa Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 59:9–13; “Ụbọchị izuike Bụ Ihe ọńụ” (vidiyo), Ọba akwụkwọ Ozi ọma.
Highlight: The Sabbath Is a Delight
Maka ihe ndị ọzọ, lee mbipụta niile nke ọnwa nke a nke Liahona na magazin niile nke Maka Ume nke Ndị Ntoroọbịa.
Nchepụta niile maka Ikuziri Ụmụntakịrị
Jenesis 1:1–25; Mosis 2:1–25; Ebraham 4:1–25
Jizọs kere ụwa.
-
Kedụ otu ị ga-esi eme ka ọmụmụ ihe banyere Okike bụrụ ihe na-enye obi ụtọ nye ụmụ gị? I nwere ike kpọrọ ha gaa nchọgharị ụdị ihe dị iche iche n’ezi nke e mere n’oge Okike nke ọbụla. Ụmụ gị nwekwara ike lee anya na foto ihe niile Jizọs kere (lee “Okike nke Ụwa” niime Akụkọ Agba Ochie niile, 8–12). Mgbe ahụ gị na ụmụ gị nwere ike kwuo banyere otu o si emetụta gị banyere Jizọs Kraịst mgbe i gụsịrị banyere Okike.
-
Tulee ikwekọta otu egwu ọnụ banyere ọmarịcha ụwa anyị, ụdị dị ka “Nna M nke Eluigwe Hụrụ M Naanya” (Akwụkwọ Ukwe nke Ụmụntakịrị, 228-29). Ikekwe ụmụ gị nwere ike gbakwunye n’egwu ahụ ihe ndị ọzọ Chineke keworo na-enyere ha aka nwete mmetụta ịhụnaanya Ya.
Nyere ụmụ gị aka gosipụta onyinye ekemekeuche ha. “Mgbe ị kpọkuru ụmụ gị ise ihe, wuo ihe, tee agba, ma ọ bụ dee ihe metụtara otu ụkpụrụ ozi ọma, i na-enyere ha aka ghọtazie nke ọma ụkpụrụ ahụ ma nye ha ihe ncheta eji nʻaka banyere ihe ha mụtaworo” (Ikuzi ihe n’Ụzọ nke Ọnye Nzọpụta, 32).
Jenesis 1:26–27; Mosis 2:26–27; Ebraham 4:26–27
E kere m n’oyiyi nke Chineke.
-
Ụmụ gị nwere ike nweta uche nke nsọpụrụ na nkwanye ugwu maka ahụ nke onwe ha na nke ndị ọzọ dị ka ha na-amụ na ekere anyị niile n’oyiyi nke Chineke. Iji nyere ha aka ghọta ihe nke a pụtara, i nwere ike kwe ụmụ gị lee anya na oyiyi ha n’enyo ma ọ bụ foto mgbe ị na-agụrụ ha Mosis 2:26-27. I nwekwara ike gosi ha otu obere ụmụ anụmanụ ọtụtụ mgbe “na-eyikarị” ndị nne na nna ha (lee foto dị na nchịkọta nke a, iji maa atụ). Nke a nwere ike duba na mkparịta ụka banyere ihe mere o ji dị mkpa nye gị ịmara na ekere gị n’oyiyi nke Nna gị nke Eluigwe.
-
Gị na ụmụ gị nwere ike na-enwe ańụrị ise ahụ mmadụ ma chakaa ihe osise ndị ahụ ịghọ pọzụụl. Dị ka ụmụ gị n’etinyekọta pọzụụl ha ọnụ, ha nwere ike kwuo banyere ụzọ ha nwere ike isi gosi Nna nke Eluigwe na ha nwere obi ekele maka ahụ ha.
Jenesis 2:2–3; Mosis 3:2–3; Ebraham 5:2–3
Ụbọchị izuike dị nsọ.
-
Dị ka ị na-agụ Mosis :2-3, gwa ụmụ gị ka ha gee ntị maka ihe Chineke mere nʻụbọchị nke asaa. Nyere ụmụ gị aka chọta ma ọ bụ see foto niile nke ihe ndị ha nwere ike ime na Sọnde iji mee ya ụbọchị dị nsọ na dị iche site nʻụbọchị ndị ọzọ. Kesaara ibe unu ihe mere o ji dị gị mkpa idebe Ụbọchị izuike nsọ.
-
Nyere ụmụ gị aka gosipụta nụzọ egwuregwu ịkọwara otu enyi ihe kpatara ha jiri họrọ ime ihe ndị na-enye Nna nke Eluigwe na Jizọs nsọpụrụ nʻụbọchị Sọnde. Tụnye uche na ha na-eji Jenesis 2:2-3 na nkọwa ha niile. Kedụ otu idebe Ụbọchị izuike nsọ si egosi ịhụnaanya anyị maka Nna nke Eluigwe na Jizọs Kraist?
Maka ihe ndị ọzọ, lee mbipụta magazin Friend nke ọnwa nke a.