“Dizemba 29–Jenụwarị 4. Ama Mbụ nke Jizọs Kraịst: Ndubata nye Agba Ochie,” Bianụ, Soro M—Maka Ebe Obibi na Nzukọ nsọ: Agba Ochie 2026 (2026)
“Ndubata nye Agba Ochie,” Bịanụ, Soro M: 2026
Dizemba 29-Jenụwarị 4: Ama Mbụ nke Jizọs Kraịst
Ndubata nye Agba Ochie
Mgbe ị na-atule ịmụ Agba Ochie na-afọ nke a, kedụ otu o si emetụta gị? Ịnụ ọkụ n’obi? Ejighị n’aka? Ịtụ egwu? Mmetụta nʻuche ndị a niile kwere nghọta. Agba Ochie bụ otu niime nchịkọta odide ochie niile kachasị ochie nọ nʻụwa, ma nke a pụrụ ime ya ma ịkpali akpali ma ị na-eyi egwu. Odide ndị a sitere na omenaala mgbe ochie nke nwere ike ịdị ka ihe mba ọzọ ma mgbe ụfọdụ ihe na-edoghịanya ma ọ bụ ọbụna erughị obi ala. Ma otu ọ dị niime odide ndị a anyị na-ahụ ndị mmadụ na-enwe nhụmiihe ndị yiri ndị ama ama. Anyị na-amata isiokwu niile nke ozi ọma na-agba aka ebe banyere ịdị nsọ nke Jizọs Kraịst na ozi ọma Ya. Ee, ndị dị ka Abraham, Sarah, Hannah, na Daniel biri ndụ nke mere na, n’ụzọ ụfọdụ, dịịrị ezigbo iche site na nke anyị. Mana ha nwetekwara nhụmiihe ọńụ ezi na ụlọ na esemokwu ezi na ụlọ, oge ndị nke okwukwe na oge ndị nke ejighị n’aka, na mmeri niile na ọdịda niile—dị ka anyị niile na-enweta. Kacha nke, ha tinyere okwukwe nʻọrụ, nwee nchegharị, gbaa ndụ, nwete nhụmiihe nke ime mmụọ, na ghara ịda mba na nkwa ekwere maka Onye Nzọpụta. Dị ka anyị na-amụ otu Chineke si rụọ ọrụ niime ndụ ha, anyị nakwa ahụ Ya niime ndụ nke anyị, ma anyị na-eso ọbụ abụ na-asị: “Okwu gị bụ oriọna nye ụkwụ m, na ihè nyekwa ụzọ m. … Ya mere ọ masịrị nwa odibo gị” (Abụ ọma 119:105, 140).
Nchepụta niile maka Ọmụmụ ihe N’Ebe Obibi na Nzukọ nsọ
Agba Ochie na-agba ama banyere Jizọs Kraịst.
Otu ụzọ iji chọpụta ọzụzụ ime mmụọ bara ụba niime Agba Ochie bụ ịchọ Achịcha nke Ndụ, Jizọs Kraịst (lee Jọn 6:48). Ịmaatụ, kedụ otu i si ahụta Onye Nzọpụta niine ihe ndịa sotere?
-
Achịcha (Ọpụpụ 16:4, 11–15; Jọn 6:35)
-
Nwa atụrụ eji chụọ aja (Ọpụpụ 12:3–5; Jọn 1:29)
-
Agwọ brass ahụ (Ọnụọgụgụ 21:4–10; Jọn 3:14)
-
Jona (Jona 1:4–17; Matiu 12:38–41)
Gịnị ka ọmụmatụ ndị a na-akuzi banyere Ya? Kedụ nrụtụaka ndị ọzọ nye Jizọs Kraịst nọ niime Agba Ochie ka ị maara rịị nke ọma?
Niime ozi ya “Jizọs Kraịst Bụ Akụ ahụ,” Okenye Dale G. Renlund gbara anyị ume “icheta ma na-elekwasị anya mgbe niile na Jizọs Kraịst” (Liahona, Nov. 2023, 98). Tulee ịgụ ozi ya, na-achọgharị ihe ndị i nwere ike ime iji chọta Jizọs Kraịst na-abụghị naanị niime Agba Ochie manakwa niime ndụ gị.
Lee kwa “Ụdị niile ma ọ bụ Ọdịmara niile nke Kraịst” niime Odudu nye Akwụkwọ nsọ niile, “Jizọs Kraịst,” Ọba akwụkwọ Ozi ọma; “Chọọ Onyenwe anyị Mgbe Ọ Dị Ngwa Ngwa,” Akwụkwọ ukwe Ụmụntakịrị, 108.
Chọgharịa maka ọdịmara niile na-agba banyere Jizọs Kraịst. Onyenwe anyị kuziiri Adam, “Ihe niile nwere oyiyi ha, ma ihe niile ka ekere ma mee igba ama maka m” (Mosis 6:63). Ma ị na-amụ ihe ma ị na-akuzi ihe, ilekwasị anya na Jizọs Kraịst pụrụ inyere gị aka chọta mpụtara niime akwụkwọ nsọ ma bawanye ịhụnaanya gị maka na okwukwe niime Ya. (Lee Nkuzi ihe n’Ụzọ nke Onye Nzọpụta, 7.)
Jizọs Kraịst bụ Jehova nke Agba Ochie.
Onyeisi Dallin H. Oaks kuziri: “Nna kọwara Ọkpara Ọ Mụrụ Naanị Ya, Jizọs Kraịst, dị ka Onye Nzọpụta na Onye Mgbapụta anyị ma nye anyị iwu ị ‘nụrụ Ya.’ Site na nduzi nke a anyị kwubiri na ndekọihe niile nye akwụkwọ nsọ nke okwu ekwuru ekwu site n’aka ‘Chineke’ ma ọ bụ ‘Onyenwe anyị’ na-abụkarị mgbe niile okwu niile nke Jehova, Onyenwe anyị bilitere nʻọnwụ, Jizọs Kraịst” (“Nkuzi niile nke Jizọs Kraịst,” Liahona, Me 2023, 102).
The Teachings of Jesus Christ
Mgbe ndị ndu nke ndị Juu mara Jizọs aka banyere njirimara Ya, Ọ mara ọkwa, “Tupu a mụọ Abraham, Mụ onwe m nọ ya.” Mkpụrụokwu ndị a kụjara ndị mmadụ ahụ nụrụ Jizọs, ma ha dị njikere ịtụ Ya okwute (lee Jọn 8:58–59). Tulee ịgụ Ọpụpụ 3:13–15; 6:3–5 iji hụ ihe kpatara ụfọdụ ndị Juu jiri wee oke iwe niihe Jizọs kwuru.
Gịnị mere o ji dịrị gị ịrịba ịmara na Jizọs Kraịst bụ Jehova?
Onyenwe anyị weghachitere ọtụtụ “ihe ndị dị mfe nghọta ma dị oke ọnụ ahịa” site nʻaka Joseph Smith.
Niime otu ọhụ, Onyenwe anyị gosiri Nifaị ọbịbịa nke Baịbụl, na-akọwa na “ọtụtụ ihe ndị dị mfe nghọta ma dị oke ọnụ ahịa” ka aga esite na ya ewepụ. Tulee ịgụ 1 Nifaị 13:21–29, 38–42, na-achọ otu Onyenwe anyị si tụọ atụmatụ “ime ka amata ihe ndị dị mfe nghọta ma dị oke ọnụ ahịa.” Dị ka otu 2 Nifaị 3:12 siri dị, kedụ otu Baịbụl na Akwụkwọ nke Mọmọn si arụkọta ọrụ ọnụ?
Dị ka ị na-amụ Agba Ochie n’afọ nke a, ị gakwa amụ ụfọdụ “akwụkwọ ndị ọzọ” Nifaị hụrụ nʻọhụ. Ndị a gụnyere:
-
Akwụkwọ nke Mosis, akụkụ ntụgharị asụsụ Baịbụl nke Joseph Smith. Ọ na-eweghachite eziokwu niile na nkọwapụta niile ahụghị niime ederede Jenesis 1-6 nke ugbu a.
-
Akwụkwọ nke Abraham, nke ekpugheere Joseph Smith dị ka o nyochara papyri ndị Ijipt mgbe ochie (lee Isiokwu niile na Ajụjụ niile, “Akwụkwọ nke Abraham,” Ọba akwụkwọ Ozi ọma).
-
Ederede dị iche iche sitere na Ntụgharị asụsụ Joseph Smith, nke ụfọdụ niime ha na-apụta ihè na nkọwada niile, mgbakwunye nke Baịbụl, na Odudu nye Akwụkwọ nsọ.
Nke a bụ ụfọdụ ọmụmaatụ nke nkọwapụta Agba Ochie eweghachitere site n’aka Joseph Smith: Zayọn Obodo ukwu nke Ịnọk (Mosis 7:18–19), ọhụ nke Abraham banyere kansụl niime eluigwe (Abraham 3:22–28), na ije ozi nke Melkizedek (Ntụgharị asụsụ Joseph Smith, Jenesis 14:25–40). Gịnị kpatara nkọwapụta ndị a si “dị mfe nghọta ma dị oke ọnụ ahịa” nye gị?
Adam na Iv Na-achụ Aja, site n’aka Keith Larson (uju)
Agba Ochie na-enyere m aka ghọta mmekọrịta ọgbụgba ndụ mụ na Chineke.
Agba Ochie bụ akụkọ otu Chineke si na-achọ ime anyị “akụ Ya pụrụ iche” site na ọgbụgba ndụ (Ọpụpụ 19:5). Niihi nke ahụ, ụzọ dị mma iji kwadoo ịgụ Agba Ochie bụ ịmụ banyere ọgbụgba ndụ niile—ọgbụgba ndụ ebighị ebi nke Chineke kpọmkwem enyere ndị amụma mgbe gboo dị ka Abraham, Izik, Jekọb, na ụmụ ụmụ ha. Ma ụzọ dị mma iji mụọ banyere ọgbụgba ndụ bụ ịmụ ozi nke Onyeisi Russell M. Nelson “Ọgbụgba ndụ Dị Ebighị ebi” (Liahona, Ọktoba 2022, 4-11).
Dị ka ị na-agụ, jụọ onwe gị: Gịnị kpatara ọgbụgba ndụ ji dịrị m mkpa? Kedụ “ụdị ịhụnaanya na ebere pụrụ iche nke m na-anata site nʻaka Chineke dị ka m na-edebe ọgbụgba ndụ mụ na Ya? Dị ka ị na-agụ Agba Ochie n’afọ nke a, na-ele anya maka ihe ndị Chineke chọrọ ikuziri gị banyere mmekọrịta ọgbụgba ndụ gị na Ya.
Lee kwa Jeremaya 31:31–34.
Maka ọzọ, lee mbipụta niile nke ọnwa nke a nke Liahona na magazin niile nke Maka Ume nke Ndị Ntoroọbịa
Nchepụta niile maka Ikuziri Ụmụntakịrị
E nwere m ike ịmụ maka Jizọs Kraịst niime Agba Ochie.
-
Mkpụrụokwu na omenaala nke Agba Ochie nwere ike raa ụmụntakịrị ahụ nghọta, mana i nwekwara ike inyere ha aka hụta Jizọs Kraịst niime akara niile na akụkọ niile. Elemaanya gị na ụmụ gị nwere ike lee anya na eserese dị n’okpuru, Onye amụma Aịzaya Buru Amụma Ọmụmụ nke Kraịst. Kwe ka ụmụ gị rụtụ aka na nkọwa ndị ha hụrụ. Dọrọ uche ha, kpọmkwem, ruo na nwa ọhụrụ Jizọs. I nweziri ike soro ha gụọ ihe Aịzaya dere banyere ọmụmụ nke Onye Nzọpụta niime Aịzaya 7:14; 9:6. Kesaara ụmụ gị otu o si emetụta gị banyere ịchọgharị Onye Nzọpụta niime Agba Ochie n’afọ nke a.
Aịzaya Edee ihe banyere Ọmụmụ nke Kraịst (Onye amụma Aịzaya Ebụọ Amụma Ọmụmụ nke Kraịst), site n’aka Harry Anderson
-
Gị na ụmụ gị nwekwara ike gụọ Abụ ọma 23 ma ọ bụ Aịzaya 53:3-9 ma chọta mkpụrụokwu ndị na-echetere gị maka Jizọs Kraịst. Kedụ ihe mkpụrụokwu ndị a na-akuzi banyere ndụ na Aja mgbaghara mmehie Ya?
Nna nke Eluigwe chọrọ ka mụ na Ya gbaa ndụ.
-
Ọgbụgba ndụ niile bụ isiokwu dị mkpa niime Agba Ochie. Iji dubata isiokwu nke a nye ụmụ gị, gị na ha nwere ike kwuo banyere nkwa niile ha na-ekwe ma na-edebe ha na ndị ezi na ụlọ na ndị enyi na ihe kpatara idebe nkwa ndị ahụ si dị mkpa. I nweziri ike mgbe ahụ lee anya na foto nke baptizim ma kwuo banyere nkwa, ma ọ bụ ọgbụgba ndụ, anyị na Chineke na-eme mgbe anyị mere baptizim (lee Mozaya 18:10, 13). I nwekwara ike gosi otu foto nke tempụl ma kesaa mmetụta gị niile banyere ọgbụgba ndụ ndị anyị na-eme ebe ahụ.
-
Ihe omume nke izu ụka nke a nwere ike inyere ụmụ gị aka nwee mmasị ime ma debe ọgbụgba ndụ ha na Nna nke Eluigwe. Unu nwekwara ike gụọ egwu banyere ime ọgbụgba ndụ niile, dị ka “Mgbe E Mere M Baptizim” (Akwụkwọ Ukwe Ụmụntakịrị, 103).
Jizọs Kraịst bụ Jehova nke Agba Ochie.
-
Ụmụ gị ha amarala onye ọbụla na-aza aha dị iche iche na ntọ dị iche iche? Elemaanya onye nne na nna ma ọ bụ onye nkuzi ka ana akpọ aha dị iche n’ọrụ, nʻebe obibi, ma na nzukọ nsọ. Kwurịta maka aha ndị ahụ; mgbe ahụ gụkọta Ọpụpụ 6:3 ọnụ ma kpọkuo ụmụ gị ịchọta aha niile nke e jiri mara Jizọs Kraịst tupu amụọ Ya (lee kwa Ntụgharị asụsụ Joseph Smith niime nkọwada c).
Maka ihe ndị ọzọ, lee mbipụta nke ọnwa nke a nke magazin Friend