Come, Follow Me
Febụwarị 9–15. “Noa Nwetere Amara n’Anya nke Onyenwe anyị”: Jenesis 6–11; Mosis 8


“Febụwarị 9–15. ‘Noa Nwetere Amara n’Anya nke Onyenwe anyị’: Jenesis 6–11; Mosis 8,” Bianụ, Soro M—Maka Ebe Obibi na Nzukọ nsọ: Agba Ochie 2026 (2026)

“Febụwarị 9–15. ‘Noa Nwetere Amara n’Anya nke Onyenwe anyị,” Bịanụ, Soro M: 2026

ụmụanụmanụ na Noa na ezi na ụlọ ya si nʻụgbọ Noa na-apụ guzoro nʻelu nkume

Jehova Na-edebe Nkwa, site n’aka Sam Lawlor

Febrụwarị 9-15: “Noa Nwetere Amara n’Anya nke Onyenwe anyị”

Jenesis 6–11; Mosis 8

Ibi ndụ nʻụbọchị ikpeazụ ndị a, anyị nwere ebumnuuche pụrụiche iji gee ntị nʻakụkọ nke Iju mmiri ahụ. Mgbe Jizọs Kraịst kuziri otu anyị kwesịrị i si tụọanya maka Ọbịbịa Ya nke Ugboro Abụọ, O kwuru, “Dị ka ọ dị n’ụbọchị niile nke Noa, otu ahụ ka ọ ga-adịkwa n’ọbịbịa nke Nwa nke Mmadụ” (Joseph Smith—Matiu 1:41). Na mgbakwunye, mkpụrụokwu ndị na-akọwa ụbọchị nke Noa, dị ka “iru unyi” ma “juputa n’ọgba aghara,” nwere nnọọ ike ịkọwa oge anyị n’ụzọ dị mfe (Jenesis 6:12-13; Mosis 8:28). Akụkọ Tọwa nke Babel yikwara ihe dabara n’ụbọchị anyị, site nʻihe ọ kọwara maka mpako nke mgbagwoju anya ma emesịa nkewa sotere.

Nkọwapụta mgbe gboo ndị a bara uru na-abụghị naanị niihi ha gosiri anyị na ajọọ omume na-emegharị onwe ya oge ochie agụgụala niile. Kacha nke, ha na-akuziri anyị ihe a ga-eme banyere ya. Noa “nwetere amara n’anya nke Onyenwe anyị,” (Mosis 8:27). Ma ezi na ụlọ niile nke Jared na nwanne ya nwoke chigharịkwutere Onyenwe anyị ma echekwara ha site na mgbagwoju anya na nkewa dị na Babel (lee Ita 1:33–43). Ọ bụrụ ma anyị chee uche otu esi edebe onwe anyị na ezi na ụlọ anyị na nchekwa nʻoge nrụrụ aka na ọgba aghara, akụkọ niile dị niime isi ndị a nwere ọtụtụ ihe ikuziri anyị.

akara ngosi ihe ọmụmụ

Nchepụta niile maka Ọmụmụ ihe N’Ebe Obibi na na Nzukọ nsọ

Jenesis 6; Mosis 8

akara ngosi semịnarị
E nwere nchekwa ime mmụọ na-isoro onye amụma nke Onyenwe anyị.

Ị na-ahụ ihe ọbụla niime nkọwa nke ụbọchị nke Noa nke yiri ọnọdụ ndị dị n’ụbọchị nke anyị? Kpọmkwem, lee anya na Mosis 8:15–24, 28 Kedụ isiokwu ndị ị hụrụ ekwugharịrị?

Otu myiri dị mkpa ị ga-ahụ bụ na Chineke kpọrọ Noa ịbụ onye amụma, ma Ọ kpọwo onye amụma taa kwa. Tulee idepụta eziokwu niile ị na-amụ banyere ndị amụma sitere na Mosis 8:13–30. Kedụ otu onye amụma anyị dị ndụ si dịrị ka Noa? N’ezie, onye amụma nke Onyenwe anyị taa anaghị adọ anyị aka na ntị maka Iju mmiri ma ọ bụ na-akpọku anyị inye aka wuo ụgbọ. Mana kedụ ihe ọ na-adọ anyị aka na ntị banyere? Ma kedụ ihe ọ na-akpọku anyị ime? Inye aka zaa ajụjụ ndị a, i nwere ike nyochagharịa otu isi sitere na Nkuzi niile nke Ndịisi nke Nzukọ nsọ niime Ọba akwụkwọ Ozi ọma, kacha ebe nkeji “Ọkpụkpọ oku niile na Ngọzi niile E kwere nkwa”. Elemanya i nwere ike họrọ otu ịdọ aka na ntị na otu ọkpụkpọ oku nke yiri ihe dị mkpa nye gị.

Okenye Allen D. Haynie kuziri, “Nna bi N’eluigwe zuru oke ma dị ịhụnaanya ahọrọwo nsoro nke ikpughe eziokwu nye ụmụ Ya site n’onye amụma” (“Onye amụma Dị ndụ maka Ụbọchi Ikpeazụ Ndị a,” Liahona, Me 2023, 25). Tulee ịmụ ozi nke Okenye Haynie, na-achọgharị ihe ndị kpatara inwe onye amụma ji bụrụ ihe iriba ama nke ịhụnaanya nke Nna nke Eluigwe. Kedụ otu isoro onye amụma nke Onyenwe anyị si nyeworo gị aka nwete mmetụta nchekwa ibi ndụ n’ụbọchị ikpeazụ ndị a?

Lee kwa Isiokwu niile na Ajụjụ niile, “Ndị Amụma,” Ọba akwụkwọ Ozi ọma; “Gịnị Mere Anyị Jiri Nwee Ndị Amụma” (vidiyo), Ọba akwụkwọ Ozi ọma.

1:37

Why Do We Have Prophets?

Jenesis 6:5–13

Iju mmiri ahụ bụ omume nke ebere Chineke.

Ụfọdụ ndị na-eche banyere ikpe ziri ezi nke Chineke na-izite Iju mmiri iji “bibie mmadụ” (Jenesis 6:7). Okenye Neal A. Maxwell kọwara na n’oge Iju mmiri ahụ, nrụrụ aka eruwo ogo mmebi ohere nhọrọ nke na-enweghị ike, n’ikpe ziri ezi, izite ụmụ mmụọ n’ebe a” (Anyị Ga-eji Nke a Anwale Ha [1982], 58). I nwekwara ike tulee otu Iju mmiri ahụ si bụrụ omume nke ebere. Kedụ ihe ị na-achọta niime Jenesis 6:5–13 na-egosi na obi ebere na ịhụnaanya nke Onyenwe anyị maka ndị ahụ?

Jenesis 9:8–17

Ihe aka ebe ma ọ bụ ọdịmara niile na-enyere m aka cheta ọgbụgba ndụ niile nke mụ na Onyenwe anyị.

Dị ka Jenesis 9:8-17, gịnị ka egwurugwu na-ewete niime uche gị? Gịnị ka Ntụgharị asụsụ Josesph Smith, Jenesis 9:21-25 (niime appendix Baịbụl) na-agbakwunye na nghọta gị? I nwekwara ike tulee idepụta ihe ndị ọzọ (dị ka ọdịmara niile, ihe ndị eji nʻaka, ma ọ bụ ihe ọbụla ọzọ) nke Chineke nyeworo gị iji chetara gị maka ọgbụgba ndụ gị niile. Gịnị ka ihe ndị a na-akuziri gị? Kedụ otu ha na-esi enyere gị aka cheta?

Lee kwa Gerrit W. Gong, “Na-echeta Ya Mgbe niile,” Liahona, Me 2016, 108–11; “Na Nsọpụrụ na Na-ịdị Nwayọọ Ugbu a,” Abụ, no. 185.

tọwa ebe ndịikom na-ete elu ya jiri ụdọ na nzọụkwụ

Tọwa nke Babel, site n’aka David Green

Jenesis 11:1–9

Isoro Jizọs Kraịst bụ naanị ụzọ irute Nna nke Eluigwe.

Nkọwapụta nke ndị nke Babel na-ewu tọwa na-ewete ndịiche dị mmasị nye nkọwapụta nke Inọk na ndị ya na-ewu Zayọn, nke ị mụrụ izu ụka gara aga. Otù ndị abụọ ahụ naara anwa irute eluigwe mana n’ụzọ dị iche iche. Kedụ otu ndị nke Zayọn si nwete eluigwe? (lee Mosis 7:18–19, 53, 62–63, 69 Kedụ ihe ị na-amụta site na Jenesis 11:1–9 na Helaman 6:26–28 banyere ndị nke Babel? Gịnị ka nke a na-akuziri anyị banyere mgbalị nke onwe anyị iji laghachi n’ihu Chineke? Gịnị ka Chineke weteworo iji nyere anyị aka “rute n’eluigwe”? (Jenesis 11:4; lee kwa Jọn 3:16).

Mụta ihe nke ọma. Ịmụta ihe nwere ike gụnye karịa naanị nnọọ ịgụ ihe ma ọ bụ ige ntị. Ịma atụ, mgbe ịmụ ihe banyere Tọwa nke Babel, gị na ezi na ụlọ gị ma ọ bụ klas nwere ike dee, n’elu mpempe akwụkwọ, ihe ndị na-akpọpụ anyị site niihu Chineke. Emesịa, n’elu mpempe akwụkwọ ndị ọzọ, i nwere ike dee ihe ndị na-akpọta anyị nso ruo Chineke. Hazie otu mpempe akwụkwọ nke mbụ n’ụdị nke tọwa ma otu nke abụọ n’ụdị nke tempụl.

Maka ihe ndị ọzọ, lee mbipụta niile nke ọnwa nke a nke Liahona na magazin niile Maka Ume nke Ndị Ntoroọbịa.

akara ngosi nkeji ụmụntakịrị 01

Nchepụta niile maka Ikuziri Ụmụntakịrị

Jenesis 6:14–22; 7–8; Mosis 8:16–24

Isoro onye amụma nke Onyenwe anyị ga-agọzi mụ na ezi na ụlọ m.

  • Ọtụtụ ụmụntakịrị nwere ịhụnaanya n’akụkọ nke Noa na ụgbọ ahụ. Tulee inye ụmụ gị ohere niile iji kesaa ihe ha maara banyere ya. Iji nyere ha aka, i nwere ike jiri foto ndị dị niime ndepụta nke a, “Noa na Ezi na ụlọ Ya” niime Akụkọ Agba Ochie niile (22-25), na amaokwu nke atọ nke “Soro Onye Amụma” (Akwụkwọ Ukwe Ụmụntakịrị, 110-11). Ụmụ gị nwere ike nwee obi ụtọ ime ejije ụfọdụ akụkụ akụkọ ahụ—iji maa atụ, site na ime ka aga asị iji ngwa ọrụ ji wuo ụgbọ ma ọ bụ na-eje ije ka ụmụanụmanụ na-abanye nʻụgbọ.

  • Dị ka unu na-ekwukọrịta banyere Noa, nyere ụmụ gị aka hụ otu esi gọzie anyị inwe onye amụma nke Chineke taa. Nyere ụmụ gị aka chọgharịa na Mosis 8:16-24 iji chọta ihe ndị Noa kuziri nke ndị amụma nke Onyenwe anyị ka na-akuzi taa. Kedụ otu esiworo gọzie anyị mgbe anyị rubere isi nye nkuzi ndị a?

Jenesis 9:15–16

Chineke ga-edebe nkwa Ya niile nye m.

  • Ụmụ gị nwere ike na-enwe obi ụtọ ise ihe osise ma ọ bụ ite egwurugwu agba mgbe ị na-ekwu banyere ihe ọ na-anọchite (lee Ntụgharị asụsụ Joseph Smith, Jenesis 9:21-25 [niime appendix Baịbụl]). Kedụ ihe Chineke chọrọ ka Noa na ezi na ụlọ ya na-eche maka ya mgbe ọbụla ha hụrụ egwurugwu?

  • I nwekwara ike gosi ụmụntakịrị otu ihe i nwere na-echetere gị maka ihe dị mkpa niime ndụ gị, dị ka mgbanaka alụm di na nwunye, otu foto, ma ọ bụ jonaalụ. Kwe ka ụmụ gị kesaa ọmụmaatụ nke onwe ha. Nke a nwere ike duba na mkparịta ụka banyere ihe ndị na-enyere anyị aka cheta ọgbụgba ndụ anyị niile, dị ka oriri nsọ, nke na-enyere anyị aka cheta ọgbụgba ndụ baptizim anyị isoro Jizọs Kraịst (lee Ozizi na Ọgbụgba ndụ 20:75-79).

egwurugwu gbara abụọ

Chineke gwara ezi na ụlọ Noa na egwurugwu ga-abụ “ihe aka ebe nke ọgbụgba ndụ nke m gbara n’etiti mụ na gị” (Jenesis 9:12).

Jenesis 11:1–9

Isoro Jizọs Kraịst bụ naanị ụzọ irute eluigwe.

  • O nwere ike bụrụ ihe ọńụ iwu tọwa site n’okwute niile ma ọ bụ ihe mkpanaka ndị ọzọ gị na ụmụ gị. Dị ka ị na-eme otu a, kọwaa na ndị Babel chere na ha nwere ike irute eluigwe site na-iwu tọwa toro ogologo. I nweziri ike lekọta anya n’otu foto nke Onye Nzọpụta ma jụọ ụmụ gị otu O si enyere anyị aka ruo eluigwe. Emesịa unu nwere ike kwuoro ibe unu banyere ihe ndị i nwere ike ime iji soro Onye Nzọpụta.

  • Na mgbakwunye ịgụ akụkọ nke tọwa Babel niime Jenesis 11:1-9, gị na ụmụ gị nwere ike gụọ Helaman 6:28. Dị ka otu amaokwu nke a siri dị, gịnị mere ndị nke Babel jiri wuo tọwa? Gịnị mere iwu tọwa nke a jiri bụrụ ụzọ na-ezighị ezi iji rute eluigwe? Emesịa i nwere ike chọgharịa na 2 Nifaị 31:20-21 na Helaman iji chọta ụzọ ziri ezi iji rute eluigwe. Kedụ ndụmọdụ nke anyị ga-enye ndị nke Babel?

Maka ihe ndị ọzọ, lee mbipụta nke ọnwa nke a nke magazin Friend.

Ụgbọ nke Noa

Ụgbọ nke Noa, site n’aka Adam Klint Day. adamdayart.com

Ihu akwụkwọ ihe omume Prịamarị: Isoro onye amụma ga-agọzi mụ na ezi na ụlọ m