Come, Follow Me
Appendix B: Maka Praịmarị—Ịkwado Ụmụaka maka Oge ndụ n’Ụzọ Ọgbụgba ndụ nke Chineke


“Appendix B: Maka Praịmarị—Ịkwado Ụmụaka maka Oge ndụ n’Ụzọ Ọgbụgba ndụ nke Chineke,” Bịanụ, Soro M—Maka Ebe Obibi na Nzukọ nsọ: Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 2026 (2026)

“Appendix B,” Bịanụ, Soro M: Agba Ochie 2026

A man baptizing a young girl.  They are standing in the font.

Appendix B

Maka Praịmarị—Ịkwado Ụmụ Gị maka Oge ndụ n’Ụzọ Ọgbụgba ndụ nke Chineke

Niime ọnwa ndị nwere Sọnde ise, ndị nkuzi Praịmarị ka a na-agba ume idochi nhazi Bịanụ, Soro M atụpụtara na Sọnde nke ise jiri otu ihe ọmụmụ ma ọ bụ karịa site niihe ndịa eji amụ ihe.

Ụkpụrụ niile na Emume nsọ niile nke Ozi ọma nke Jizọs Kraịst.

Ozizi nke Kraịst na-akuziri anyị otu esi alaghachikwuru Chineke.

Mgbe Jizọs Kraịst pụtara nye ndị nọ na Emerịka, Ọ kuziiri ha ozizi Ya. O kwuru na anyị pụrụ ịbanye alaeze nke Chineke ọ bụrụ ma anyị nwee okwukwe, chegharịa, mee baptizim, nata Mmụọ Nsọ, ma nagide ruo ọgwụgwụ (lee 3 Nifaị 11:31–40; lee kwa Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 20:29). Ihe omume ndị dị n’okpuru pụrụ inyere gị aka kuziere ụmụntakịrị na ụkpụrụ ndị a na emume nsọ ndị a ga-enyere anyị aka bịarute Onye Nzọpụta nso n’oge ndụ anyị niile.

Ịmụtakwu ọzọ banyere ozizi nke Kraịst, lee 2 Nifaị 31.

Ihe omume ndị Ga-ekwe omume

  • Nye ụmụntakịrị foto ndị nke nọchitere okwukwe niime Jizọs Kraịst, nchegharị, baptizim, na emume nnabata (lee Akwụkwọ Nka Ozi ọma, nọs 1, 111, 103, na 105). Gụọ ma soro ụmụntakịrị gụpụta edide nke Okwukwe nke anọ, ma rịọ ha iwelite foto ha mgbe akpọrọ ụkpụrụ ma ọ bụ emume nsọ ahụ. Nyere ụmụntakịrị aka ghọta otu ụkpụrụ na emume nsọ nke ọbụla si enyere anyị aka dịrịzie karịa dị ka Nna nke Eluigwe na Jizọs Kraịst.

  • Kedụ otu i nwere ike i si nyere ụmụntakịrị aka ghọta na okwukwe, nchegharị, baptizim, na emume nnabata abụghị emume naanị otu mgbe mana ike mmetụta uto nke ime mmụọ anyị n’oge ndụ anyị niile? Inwere ike gosi ha foto nke otu mkpụrụ na otu nnukwu osisi (ma ọ bụ see ihe ndị a na bọọdụ). Nyere ha aka chee maka ihe ndị na-enyere mkpụrụ ahụ aka too ghọọ nnukwu osisi, dị ka mmiri, aja, na anwụ. Nyere ha aka hụ na ndị a dị ka ihe ndị anyị na-eme iji garuo Chineke nso oge niile nke ndụ anyị—iwulite okwukwe anyị niime Jizọs Kraịst, na-echegharị ụbọchị ọbụla, na-ebi ndụ ọgbụgba ndụ baptizim anyị, na-eri oriri nsọ, na-anata Mmụọ Nsọ.

  • Kọọrọ ụmụntakịrị akụkọ banyere fayakraka site n’ozi Okenye Dale G. Renlund “Kedụ Otu Ichegharị si Enyere M aka Nwee Obi ụtọ?” (Friend, Dez. 2017, 12–13, ma ọ bụ Liahona, Dez. 2017, 70–71; lee kwa vidiyo “Nchegharị: Nhọrọ nke Ọńụ” [Ọba akwụkwọ nke Ozi ọma]). N’ebe dị iche iche n’oge akụkọ ahụ, kpọkuo ụmụntakịrị ahụ iche banyere ụdị mmetụta nwere ike ịbịa Okenye Renlund n’obi. Gịnị mere anyị ji enwe ọńụ mgbe anyị chegharịrị? Kesaara ụmụntakịrị ọn̄ụ na ịhụnaanya i nweteworo mgbe ị rịọworo Nna nke Eluigwe ịgbaghara gị.

    4:36

    Repentance: A Joyful Choice

Baptizim

Jizọs Kraịst hiwere ọmụmaatụ nye m mgbe e mere Ya baptizim.

Ọbụladị na Jizọs enweghị njọ, e mere Ya baptizim iji hiwe ọmụmaatụ zuru oke nke nrube isi nye Nna nke Eluigwe (lee 2 Nifaị 31:6–10).

Iji mụtakwuo banyere baptizim, lee Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 20:37; Isiokwu niile na Ajụjụ niile, “Baptizim,” Ọba akwụkwọ nke Ozi ọma.

Ihe omume niile ndị Ga-ekwe omume

  • Gosi otu foto nke baptizim nke Onye Nzọpụta na baptizim nke onye ọzọ (ma ọ bụ lee Akwụkwọ Nka Ozi ọma, ọnụọgụgụ 35 na ma ọ bụkwanu ọnụọgụgụ 103 ma ọ bụ ọnụọgụgụ 104). Rịọ ụmụntakịrị ahụ ikesa ihe bụ ndịiche na ihe bụ otu ụdị ihe ahụ n’etiti foto abụọ ahụ. Gụkọtanu ọnụ Matiu 3:13–17 ma ọ bụ “Isi nke 10: Jizọs Emewo Baptizim” niime Akụkọ ndị dị na Agba Ọhụrụ, 26-29. Kwe ụmụntakịrị ahụ ịtụ aka niihe ndị dị niime foto ndị ha na-anụ niime akụkọ ndị ahụ. Gwa ụmụntakịrị ahụ banyere ịhụnaanya gị maka Onye Nzọpụta na ọchịchọ gị isoro Ya.

    1:52

    Chapter 10: Jesus Is Baptized

  • Gee ntị na ma ọ bụ gụọ egwu banyere baptizim, ụdị dị ka “Mgbe Emere Jizọs Kraịst Baptizim” (Akwụkwọ Ukwe Ụmụntakịrị, 102). Kedụ ihe anyị na-amụ banyere baptizim site na egwu a? Gụọ 2 Nifaị 31:9-10, ma kpọkuo ụmụntakịrị ige ntị maka ihe mere Jizọs Kraịst jiri mee baptizim. Kpọkuo ha iji aka see foto nke onwe ha n’ụbọchị baptizim ha.

A pụrụ m ịhọrọ ịgba ọgbụgba ndụ mụ na Chineke ma mee baptizim.

Ịkwadobe maka baptizim pụtara nnukwu ihe karịa ịkwado maka otu mmemme. Ọ pụtara ịkwado ịgba ọgbụgba ndụ ma emesịa na-edebe ọgbụgba ndụ ahụ n’oge ndụ niile. Tulee otu i nwere ike i si nyere ụmụntakịrị aka ghọta ọgbụgba ndụ ha ga-agba ha na Nna nke Eluigwe mgbe ha mere baptizim, nke gụnyere nkwa niile Ọ na-ekwe ha na nkwa niile ha na-ekwe Ya.

Ihe omume ndị Ga-ekwe omume

  • Kọwaa na ọgbụgba ndụ bụ nkwa dị n’etiti mmadụ na Nna nke Eluigwe. Dị ka anyị na-agba mbọ idebe nkwa anyị nye Chineke, Chineke na-ekwe nkwa ịgọzi anyị. Dee n’elu bọọdụ Nkwa m niile nye Chineke na Nkwa nke Chineke niile nye M. Gụkọtanu ọnụ Mozaya 18:10, 13 na Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 20:37, ma nyere ụmụntakịrị aka depụta nkwa niile ha chọtara n’okpuru isiokwu ndị dabara adaba (lee kwa Dallin H. Oaks, “Ọgbụgba ndụ Baptizim Gị,” Friend, Feb. 2021, 2–3). Kesaa otu Nna nke Eluigwe siworo gọzie gị dị ka ị na-agba mbọ idebe ọgbụgba ndụ baptizim gị.

  • Gosi ụmụntakịrị foto niile banyere ihe ndị Jizọs Kraịst mere n’oge ije ozi Ya (maka ụfọdụ ọmụmaatụ, lee Akwụkwọ Nka Ozi ọma, ọnụọgụgụ 33–49). Kwe ụmụntakịrị ikwu banyere ihe Jizọs na-eme na foto nke ọbụla. Gụọ Mozaya 18:8–10, 13, ma kpọkuo ụmụntakịrị ige ntị maka ụzọ ndị ha nwere ike iji debe ọgbụgba ndụ nke baptizim (lee kwa “Ọgbụgba ndụ Baptizim Nke m,” Liahona, Aug. 2023, 10–11). Kedụ otu ọgbụgba ndụ nke baptizim si emetụta agwa anyị ụbọchị niile? Kpọkuo ụmụntakịrị ise eserese foto nke onwe ha n’oge ha na-enyere mmadụ aka otu Jizọs ga-esi eme.

Emume nnabata

Mgbe emere m baptizim ma nabata m, ana m aghọ onye otù nke Nzukọ nsọ Ahụ nke Jizọs Kraịst nke Ndị nsọ Ụbọchị ikpeazụ a.

Ịghọ onye otù nke Nzukọ nsọ Ahụ nke Jizọs Kraịst nke Ndị nsọ Ụbọchị ikpeazụ a na-ewete ọtụtụ ngọzi, gụnyere ohere ọma niile maka ụmụntakịrị ịbụ ndị nsonye dị nkọ n’ọrụ nke Chineke.

Ihe omume ndị Ga-ekwe omume

  • Kpọkuo otu onye ka mere baptizim ma anabata ya nso nso a ịbịa na klas ma kesaa ihe ọ dị ka ya ịnabata ya. Rịọ onye nke a ikwu banyere ihe ọ pụtara nye ya ịbụrụzi onye otù Nzukọ nsọ Ahụ nke Jizọs Kraịst nke Ndị Nsọ Ụbọchị Ikpeazụ a. Nyere ụmụaka ahụ aka chee maka ụzọ ndị ha nwere iji debe ọgbụgba ndụ ha nke baptizim dị ka ndị otù Nzukọ nsọ. Kesaa otu ime ihe ndị a siworo nyere gị aka nwete mmetụta ọńụ nke ịbụ onye otù Nzukọ nsọ nke Kraịst.

  • Gosi otu foto nke ndị mmadụ nọ na Mmiri niile nke Mọmọn (lee Akwụkwọ Nka Ozi ọma, ọnụ ọgụgụ 76), ma rịọ ụmụntakịrị ịkọwa ihe ha hụrụ niime foto ahụ. Kọọ akụkọ nke Alma na ndị ya na-eme baptizim ebe ahụ (lee Mozaya 18:1–17; “Alma nʻebe Mmiri niile nke Mọmọn,” niime Akụkọ niile nke Akwụkwọ nke Mọmọn). Nyochagharịa Mozaya 18:8-9 ma kpọkuo ụmụntakịrị ime ihe ndị ga-enyere ha aka cheta ihe niile ndị ahụ dị njikere ime dị ka ndị otù Nzukọ nsọ Kraịst. Kesaa nhụmiihe banyere mgbe ịhụworo ndị otù Nzukọ nsọ na-eje ozi n’ụzọ ndị a.

    2:41

    Alma at the Waters of Mormon

Mgbe anabatara m n’emume nnabata, ana m anata onyinye nke Mmụọ Nsọ.

Mgbe anyị mere baptizim ma anabata anyị, Nna nke Eluigwe na-ekwe nkwa na anyị “nwere ike mgbe niile nwee Mmụọ ya ịnọnyere [anyị]” (Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 20:77). Onyinye nke a dị ịtụnaanya sitere na Chineke ka akpọrọ onyinye nke Mmụọ Nsọ.

Maka ịmụtakwu karịa ihe banyere onyinye nke Mmụọ Nsọ, lee Gary E. Stevenson, “Mkpalite niile nke Mmụọ,” Liahona, Nov. 2023, 42–45; Isiokwu niile na Ajụjụ niile, “Onyinye nke Mmụọ Nsọ,” Ọba akwụkwọ Ozi ọma.

Ihe omume ndị Ga-ekwe omume

  • Gụọ Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 33:15, ma rịọ ụmụntakịrị ahụ ige ntị maka onyinye pụrụ iche nke Nna nke Eluigwe na-enye anyị mgbe anyị mere baptizim ma anabata anyị. Inyere ha aka mụtakwuo banyere otu onyinye nke Mmụọ Nsọ ga-esi enyere ha aka, nyochakọta ọnụ Jọn 14:26; Ndị Galesha 5:22–23; 2 Nifaị 32:5; 3 Nifaị 27:20. I nwekwara ike nyochagharịa edide ahụ “Onyinye Pụrụ iche” (Liahona, Aug. 2023, 18–19).

  • Niihu klas, rịọ nne na nna nke otu nwata ma ọ bụ karịa niime ụmụntakịrị ahụ ikesa otu ha siworo nwete ngọzi niihi na ha nwere onyinye nke Mmụọ Nsọ. Kedụ otu O si enyere ha aka? Kedụ otu ha si anụ olu Ya?

  • Gụkọtanụ ọnụ otu egwu banyere Mmụọ Nsọ, ụdị dị ka “Mmụọ Nsọ Ahụ” (Akwụkwọ Ukwe Ụmụntakịrị, 105). Nyere ụmụntakịrị ahụ aka ghọta ihe egwu ahụ na-akuziri anyị banyere otu Mmụọ Nsọ nwere ike i si enyere anyị aka.

Mmụọ Nsọ nwere ike ịgwa m okwu n’ụzọ dị ọtụtụ.

Ụmụntakịrị ndị matara olu nke Mmụọ ka a ga-akwado ịnata mkpughe nke onwe iji duo ha gburugburu ndụ ha. Nyere ha aka ghọta na enwere ọtụtụ ụzọ ndị Mmụọ Nsọ nwere ike i si agwa anyị okwu.

Ihe omume ndị Ga-ekwe omume

  • Nyere ụmụntakịrị aka chee maka ụzọ ndị dị iche iche anyị nwere ike iji kwuoro otu enyi onye bi ebe dị anya okwu, dị ka ide leta, iziga email, ma ọ bụ ikwu okwu n’ekwe ntị. Kuziere ha na Nna nke Eluigwe nwere ike ikwuru anyị okwu n’ụzọ dị iche iche site na Mmụọ Nsọ. Jiri ozi nke Onyeisi Dallin H. Oaks “Kedụ Otu Nna nke Eluigwe Si Ekwuru Anyị Okwu?” inyere ụmụntakịrị aka ghọta ụzọ ndị dị iche iche Mmụọ Nsọ nwere ike i si ekwu okwu nye uche na obi anyị (Friend, Maachị 2020, 2–3, ma ọ bụ Liahona, Maachị 2020, F2–F3).

  • Kesaa otu nhụmiihe mgbe Mmụọ Nsọ gwara gị okwu, ma ọ bụ site n’echiche gị, ma ọ bụ site na mmetụta dị niime obi gị (lee Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 6:22–23; 8:2–3; lee kwa Henry B. Eyring, “Mepee Obi Gị nye Mmụọ Nsọ,” Liahona, Aug. 2019, F2–F3). Gbaa ama nye ụmụntakịrị na Mmụọ Nsọ nwere ike inyere ha aka n’ụzọ ndị yiri nke a.

  • Nyere ụmụntakịrị aka mata oge ndị ahụ ha nwere mmetụta Mmụọ—n’ịmaatụ, oge ịgụ egwu banyere Onye Nzọpụta ma ọ bụ oge ime otu ihe obi ebere maka ndị ọzọ. Nyere ha aka mata mmetụta ime mmụọ niile nke Mmụọ Nsọ na-ewete, kacha nke mkpali Ya niile ime ihe. Gịnị mere i jiri na-eche na Mmụọ Nsọ na-enye anyị mmetụta ndị a? Nyere ụmụntakịrị aka chee maka ihe ndị anyị kwesịrị ime iji nụrụ Mmụọ Nsọ na-ekwuru anyị okwu. Kwuo banyere ihe ị na-eme iji nụrụ Mmụọ nke ọma.

Oriri nsọ

Mgbe m na-eri oriri nsọ, ana m echete aja nke Onye Nzọpụta ma gbaa ndụ mụ na Ya.

Mgbe anyị na-eri oriri nsọ, anyị na-agba ndụ ịcheta mgbe niile Onye Nzọpụta, wekwasị onwe anyị aha Ya, ma debe iwu nsọ Ya niile.

Ịmụtakwu karịa, lee Matiu 26:26–30; 3 Nifaị 18:1–12; Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 20:77, 79.

Ihe omume ndị Ga-ekwe omume

  • Kpọkuo ụmụntakịrị ite agba “Jizọs Dubatara Oriri nsọ nye Ndị Nifaị” niime Akwụkwọ Otite agba nke Akụkọ Akwụkwọ nsọ niile: Akwụkwọ nke Mọmọn (2019), 26. Gwa ha ịrụtụ aka n’ihe ndị mmadụ na-eche banyere ya niime foto ahụ. Gụọrọ ụmụntakịrị ahụ akụkụ ụfọdụ nke 3 Nifaị 18:1–12 ma ọ bụ “Jizọs Na-ekesa Oriri nsọ,” niime Akụkọ niile nke Akwụkwọ nke Mọmọn. Kedụ ihe anyị nwere ike ime iji na-echeta Jizọs Kraịst n’oge oriri nsọ?

  • Rịọ ụmụntakịrị ịgwa gị ụfọdụ ihe ndị ha kwesịrị ị dị na-echeta ime, dị ka i kechi eriri akpụkpọ ụkwụ ha ma ọ bụ ịkwọ aka ha tupu ha erie nri. Gịnị mere o ji dị mkpa icheta ihe ndị a? Gụọrọ ụmụntakịrị Moronaị 4:3, ma kpọkuo ha ige ntị maka ihe anyị kwere nkwa icheta mgbe anyị na-eri oriri nsọ. Gịnị mere o ji dị mkpa icheta Jizọs Kraịst? Nyere ụmụntakịrị ahụ aka ghọta otu achịcha na mmiri nke oriri nsọ si enyere anyị aka cheta ihe Jizọs meworo maka anyị (lee Moronaị 4:3; 5:2).

  • Dee n’elu bọọdụ ahụ “Ana m ekwe nkwa i …” Gụọrọ ụmụntakịrị ahụ ekpere oriri nsọ niile (lee Ozizi na Ọgbụgba niile 20:77, 79). Mgbe ha nụrụ nkwa anyị na-ekwe nye Chineke, kwụsịtụ ma nyere ha aka mezuo ahịrị okwu nọ n’elu bọọdụ site na nkwa ahụ ha nụrụ.

  • Gịnị ka ọ pụtara iwekwasị onwe anyị aha nke Jizọs Kraịst? Inyere ụmụntakịrị aka zaa ajụjụ nke a, kesaa otu ọmụmaatụ nke ihe anyị na-etinye aha anyị na ya. Gịnị mere anyị ji etinye aha anyị n’elu ihe ndị a? Gịnị mere Jizọs Kraịst ga-eji achọ itinye aha Ya n’isi anyị? Tulee ikesa nkọwa nke a sitere n’aka Onyeisi Russell M. Nelson: “Iwekwasị onwe anyị aha nke Onye Nzọpụta gụnyere ịma ọkwa na ịgbara ndị ọzọ akaebe—site n’omume anyị na okwu anyị—na Jizọs bụ Kraịst ahụ” (“Aha Ziri ezi nke Nzukọ nsọ,” Liahona, Nov. 2018, 88).

Ike, Ikike, na Ntụghe niile nke Ọkwa nchụaja

Chineke na-agọzi ụmụ Ya site ike ọkwa nchụaja.

Ụmụ Chineke niile—nwanyị na nwoke, nwa nta na agadi—na-anata ike nke Chineke dị ka ha na-edebe ọgbụgba ndụ niile ha na Ya gbara. Anyị na-agba ndụ mgbe anyị natara emume nsọ ọkwa nchụaja dị ka baptizim (lee Akwụkwọ Ntuziaka Izugbe: Ije ozi na Nzukọ nsọ Ahụ nke Jizọs Kraịst nke Ndị Nsọ Ụbọchị ikpeazu a, 3.5, 3.6, Ọba akwụkwọ nke Ozi ọma). Ịmụtakwu karịa, lee Russell M. Nelson, “Akụ niile nke Ime Mmụọ,” Liahona, Nov. 2019, 76–79; “Ụkpụrụ niile nke Ọkwa nchụaja,” isi nke 3 niime Akwụkwọ Ntuziaka Izugbe.

Ihe omume ndị Ga-ekwe omume

  • Nyere ụmụntakịrị aka mata ngọzi niile ha natara niihi ọkwa nchụaja. Inye ha ụfọdụ nchepụta, i nwere ike gosi vidiyo “Ngọzi niile nke Ọkwa nchụaja” (Ọba akwụkwọ nke Ozi ọma). Tulee idepụta ngọzi ndị a na bọọdụ. Gịnị mere ngọzi ndị a si dị anyị mkpa? Gbaa ama na ngọzi ndị a na-abịara anyị niihi Jizọs Kraịst na ike ọkwa nchụaja Ya.

    3:5

    Blessings of the Priesthood

  • Nyere ụmụntakịrị aka chọta foto niile nke gosipụtara otu Chineke si eji ike Ya agọzi anyị. Na-ịmaatụ, ha nwere ike chọta otu foto nke ụwa O kere maka anyị, ọmụmaatụ nke ịgwọ ndị ọrịa, na emume nsọ niile dị nsọ O wetewooro maka anyị (lee Akwụkwọ Nka Ozi ọma, nọs 3, 46, 104, 105, 107120). Kesaa ihe mere i jiri enwe obi ekele maka ọkwa nchụaja na ngọzi niile o wetere. Nyere ụmụntakịrị aka chee maka nhụmiihe niile mgbe ha nwetere ngọzi site n’ike ọkwa nchụaja nke Chineke.

  • Otu niime isi ụzọ ndị anyị si anata ngọzi niile nke ike nke Chineke niime ndụ anyị bụ site n’emume nsọ niile nke ọkwa nchụaja (lee Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 84:20). Iji nyere ụmụntakịrị ahụ aka mụta eziokwu nke a, i nwere ike depụta akwụkwọ nsọ ndị a sotere na bọọdụ: 3 Nifaị 11:21–26, 33 (baptizim); Moronaị 2 (emume nnabata); Moronaị 4–5 (oriri nsọ). Ụmụntakịrị ahụ nwere ike họrọ n’otu n’otu otu niime edereede ndị a ma chọpụta emume nsọ ọ kọwara. Kpọkuo ụmụntakịrị ikesa otu ha siworo nwete ngọzi n’onwe ha site na-ịnata emume nsọ ọkwa nchụaja niile.

  • Nyere ụmụntakịrị aka ghọta na ha ga-anata ike site n’aka Chineke dị ka ha mere baptizim ma debe ọgbụgba ndụ nke baptizim ha. Jụọ ụmụntakịrị otu ike nke a ga-esi enyere ha aka.

Ọrụ nke Chineke ka ọtụghe niile nke ọkwa nchụaja na-eduzi ma emejuputara ya site n’ikike nke ọkwa nchụaja.

Mgbe ọbụla edopụrụ iche otu onye maka otu ọkpụkpọ oku ma ọ bụ ekenye ọrụ inye aka n’ọrụ Chineke, o nwere ike iji ikike ọkwa nchụaja e nyefere ya rụọ ọrụ. Na mgbakwunye, ndị nwoke ndị otù Nzukọ nsọ tozuru oke ka e nwere ike inyefe ọkwa nchụaja nʻisi ha ma chie ha echiche nʻotu ọkwa ọrụ dị niime ọkwa nchụaja. Ojiji nke ikike ọkwa nchụaja niile dị niime Nzukọ nsọ ka eduziri site n’aka ndị ndu ji ntụghe niile nke ọkwa nchụaja, dị ka onyeisi stek, bishọp, na ndịisi kworum. Ntụghe niile nke ọkwa nchụaja bụ ikike nke iji duzie otu esi etinye ọkwa nchụaja n’ọrụ na-ịrụ ọrụ nke Onyenwe anyị.

Ihe omume ndị Ga-ekwe omume

  • Soro ụmụntakịrị gụọ Mak 3:14–15, ma gosi ha otu foto nke ihe omume akọwara ebe ahụ (dị ka Akwụkwọ Nka Ozi ọma, ọnụ ọgụgụ 38). Jụọ ụmụntakịrị ma ha ahụtụwo onye edopụrụ iche maka ọkpụkpọ oku ma ọ bụ echiri echichi na ọkwa nke ọkwa nchụaja (ma ọ bụ gwa ha maka nhụmiihe ndị i nweteworo). Kedụ otu nke ahụ si yie ihe Onye Nzọpụta jiri Ndị ozi Ya mee? Nyere ụmụntakịrị aka depụta na bọọdụ ọkpụkpọ oku niile ma ọ bụ ọkwa niile nke ọkwa nchụaja nke e nwere ike inye ndị otù Nzukọ nsọ, dị ka onye nkuzi ma ọ bụ onye ndu niime otu otù. Isote ọkpụkpọ oku ma ọ bụ ọkwa ọrụ ọbụla, i nwere ike dee ihe onye nwere ọkpụkpọ oku ahụ ma ọ bụ ọkwa ọrụ ahụ nwere ikikere ịrụ. Gwa ụmụntakịrị ahụ otu ịbụ onye edopụrụ iche site n’aka otu onye jiri nduzi nke ọtụghe ọkwa nchụaja niile siworo nyere gị aka jee ozi.

  • Kpọkuo ụmụntakịrị iche maka ihe ekwesịrị iji ọtụghe emepe, dị ka ụgbọala ma ọ bụ ọnụ ụzọ. Gịnị na-eme ma ọ bụrụ na i nweghị ọtụghe ya? Gụkọtanụ ọnụ Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 65:2, ma kesaa ama gị banyere ịdị mkpa nke inwe ọtụghe ọkwa nchụaja niile. Unu nwekwara ike kirie vidiyo “Kedụ Ebe Ọtụghe niile Nọ?” (Ọba akwụkwọ nke Ozi ọma) ma chọọ maka ihe Okenye Gary E. Stevenson na-akuzi banyere ọtụghe ọkwa nchụaja niile.

    2:51

    Where Are the Keys?

Tempụl na Atụmatụ nke Obi ụtọ

Tempụl bụ ụlọ nke Onyenwe anyị.

Tempụl niile bụ otu akụkụ atụmatụ nke Nna nke Eluigwe maka ụmụ Ya. Niime tempụl niile, anyị na-eme ọgbụgba ndụ ndị dị nsọ anyị na Ya, nata onyinye dị nsọ jiri ike ọkwa nchụaja, nata mkpughe, mee emume nsọ niile maka ndị nna nna anyị ha nwụrụ anwụ, ma arachie nye ezi na ụlọ anyị niile maka ebighị ebi. Ihe nke a niile kwere omume niihi Jizọs Kraịst na aja mgbaghara mmehie Ya.

Kedụ otu i nwere ike iji nyere ụmụntakịrị ndị i na-akuziri ihe aka mata ịdị nsọ nke ụlọ nke Onyenwe anyị ma kwadoo onwe ha itozu oke isonye n’emume nsọ niile nke tempụl. Tulee inyochagharị akụrụngwa ndị a: Russell M. Nelson, “Tempụl ahụ na Ntọala nke Ime Mmụọ Gị,” Liahona, Nov. 2021, 93–96; “Ihe Mere Ndị nsọ Ụbọchi ikpeazụ a si Arụ Tempụl niile,” temples.ChurchofJesusChrist.org.

onye ntoroọbịa nọ na tempụl

Tempụl niile bụ otu akụkụ atụmatụ nke Nna nke Eluigwe maka ụmụ Ya.

Ihe omume ndị Ga-ekwe omume

  • Gosi otu foto tempụl ma ọ bụ karịa. Jụọ ụmụntakịrị ahụ ihe mere tempụl ji bụrụ ebe pụrụ iche. Rụtụ aka na n’elu tempụl ọ bụla bụ ihe odide nke a: “Ịdị nsọ nye Onyenwe anyị—Ụlọ nke Onyenwe anyị.” Jụọ ụmụntakịrị ahụ ihe ha chere “Ịdị nsọ nye Onyenwe anyị” nwere ike ịpụta. Gịnị mere eji akpọ tempụl ụlọ nke Onyenwe anyị? Kedụ ihe nke a na-akuziri gị banyere tempụl? Ọ bụrụ na otu niime ụmụntakịrị ahụ agawo na tempụl, ha nwekwara ike kesaa otu o si metụta ha mgbe ha gara ebe ahụ. Ọ bụrụ na ị gawo na tempụl, kesaa otu ọnụnọ nke Onyenwe anyị siworo metụta gị ebe ahụ, ma kwuo banyere ihe mere tempụl ji bụrụ ebe dị nsọ nye gị.

  • Gụkọta ọnụ Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 97:15–17. Rịọ ụmụntakịrị ịchọta ihe Onyenwe anyị na-atụ anya site n’aka ndị mmadụ batara ụlọ nsọ Ya. Gịnị mere o jiri dị mkpa na anyị tozuru oke ịbanye ụlọ Ya? Dị ka akụkụ mkparịta ụka nke a, gwa ụmụntakịrị okwu banyere rekọmmend tempụl, gụnyere otu esi anata otu. I nwere ike kpọkuo otu niime ndị otu bishọp ikesara ha ihe ajụjụ ọnụ rekọmend tempụl dị ka ya na ajụjụ niile nke a na-ajụ na ya.

Niime tempụl, anyị na Chineke na-agba ndụ.

Onyeisi Russell M. Nelson kuziri, “Jizọs Kraịst na-akpọku anyị isoro ụzọ ọgbụgba ndụ laghachi ebe obibi nye Nne na nna anyị nke Eluigwe ma nọrọ anyị na ndị anyị hụrụ naanya” (“Bịanụ, Soro M,” Liahona, Me 2019, 91). Nyere ụmụntakịrị aka ghọta na ụzọ ọgbụgba ndụ gụnyere baptizim, emume nnabata, na onyinye dị nsọ nke tempụl na nrachi.

Ihe omume ndị Ga-ekwe omume

  • Rịọ ụmụntakịrị inyere gị aka nyochagharịa ọgbụgba ndụ niile nke anyị na Chineke gbara mgbe anyị mere baptizim ma mgbe anyị na-eri oriri nsọ (lee Mozaya 18:10; Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 20:77, 79). Gosi otu foto nke tempụl, ma kọwaa na Nna nke Eluigwe nwere ngọzi karịrị akarị Ọ chọrọ inye anyị niime tempụl.

  • See otu ọnụ ụzọ ama na-eduga n’otu okporo ụzọ. Jụọ ụmụntakịrị ihe mere ha jiri chee na ọ na-enye aka inwe ụzọ a na-aga na ya. Gụkọtanụ ọnụ 2 Nifaị 31:17–20, ebe Nifaị tụnyere ọgbụgba ndụ nke baptizim na ọnụ ụzọ ama ma na-akpọku anyị ịganiihu n’okporo ụzọ ahụ mgbe emesịrị baptizim. E nwere ọgbụgba ndụ karịrị akarị ime mgbe emesịrị baptizim, gụnyere ọgbụgba ndụ emere niime tempụl. Kọwaa na Onyeisi Nelson akpọwo ụzọ nke a “ụzọ ọgbụgba ndụ.”

Niime tempụl, anyị nwere ike ime baptizim ma anabata maka ndị nna nna anyị ha ndị nwụworo anwụ.

Ozi ọma nke Jizọs Kraịst na-eme ya ekwe omume maka ụmụ Chineke niile ịlaghachi ibinyere Ya, ọbụrụgodi ma ha nwụọ na-amaghị ozi ọma. Niime tempụl, enwere ike ime anyị baptizim ma mee anyị nnabata maka ha.

Ihe omume ndị Ga-ekwe omume

  • Kwuo maka otu oge mgbe mmadụ meere gị ihe ị na-enweghị ike imere onwe gị. Kpọkuo ụmụntakịrị ikesa nhụmiihe ndị yiri ya. Kọwaa na mgbe anyị na-aga na tempụl, anyị nwere ike ịnata emume nsọ ndị dị nsọ dị ka baptizim maka ndị ọzọ nwụrụ anwụ. Kedụ otu anyị si na-abụ dị ka Jizọs mgbe anyị na-arụ ọrụ maka ndị nwụrụ anwụ? Kedụ ihe O mewooro anyị nke anyị na-enweghị ike imere onwe anyị?

  • Kpọkuo otu onye ntoroọbịa ma ọ bụ karịa mewooro baptizim maka ndị nna nna ha ha ikesa nhụmiihe ha. Jụọ ha ihe ọ dị ka ya niime tempụl. Gbaa ha ume ikesa otu o si metụta ha na-ịrụ ọrụ nke a maka ndị nna nna ha ha.

  • See otu osisi na bọọdụ, gụnyere mgbọrọgwụ niile na alaka niile. Rịọ ụmụntakịrị iche maka otu ezi na ụlọ si dị ka osisi. Nye mgbọrọgwụ niile ahụ aha Ndị nna nna ha, nye alaka niile aha ụmụ ụmụ, ma nye ogwe osisi ahụ aha Gị. Gụkọtanụ ọnụ ahịrị nke a sitere na Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 128:18: “Niihi na ma anyị enweghị ha [ndị nna nna anyị ha] enweghị ike ezu oke; ọbụghị ma ha nwere ike zuo oke ma enweghị anyị.” Jụọ ajụjụ ndị dị ka ndị a sotere: “Gịnị mere anyị ji na-achọ ndị nna nna anyị ha? Gịnị mere ndị nna nna anyị ha jiri na-achọ anyị? Kedụ otu ndị nne na nna anyị ha, nne na nna nke ukwu ha, na ndị nna nna ndị ọzọ siworo nyere anyị aka?” Kpọkuo ụmụntakịrị ịchọgharị nke fọdụrụ niime Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 128:18 maka nkebiokwu ndị na-akọwa otu anyị nwere ike i si nyere ndị nna nna anyị ha aka.

  • Tulee isoro ndị nne na nna nwata ọbụla ịchọta aha nke onye nna nna onye ekwesịrị imere emume nsọ niile niime tempụl (lee FamilySearch.org).