Ozi Maka Ume nke Ndị Ntoroọbịa Kwa Ọnwa, Jenụwarị 2026
Soro M Jee ije
Isiokwu Ndị Ntoroọbịa 2026 ga-enye aka ichetere gị na mgbe ị nọ Chineke nso, Ọ ga-eso gị eje ije—mgbe niile.
Site nʻaka ekpe ruo aka nri: Tamara W. Runia, Onye ndụmọdụ nke Mbụ; Emily Belle Freeman, Onyeisi; na Andrea Muñoz Spannaus, Onye ndụmọdụ nke Abụọ
Ị Nọghị Naanị Gị
Agwawo gị ime ihe i na-echeghị na i nwere ike? Ikekwe obi esighị gị ike ma ọ bụ enwechaghị akọ na uche, ma ọ bụ ị na-echegbu na ndị ọzọ ga-achị gị ọchị ma katọọ gị. Ọ bụrụ na i chewo otu a, ị nọghị naanị gị.
Puku kwuru puku afọ gara aga, e nwere otu nwoke ana akpọ Enọk. Chineke rịọrọ Enọk ikwusa nchegharị nye ndị ahụ—ụfọdụ ndị kachasị nwee obi ọjọọ ụwa hụworo.
Enọk echeghị na ya nwere ike imeli ya. Ọ gwara Chineke na ya dị oke nta, enweghị onye hụrụ ya naanya, ma ọ dịịrị “nwayọ na-ikwu okwu” (see Mosis 6:31).
Mana Chineke kwere Enọk nkwa. Ọ gwara nwoke ahụ egwu dị, “Gaaniihu ma mee dị ka m nyere gị nʻiwu” ma “ugwu ukwu niile ga-esi n’ihu gị gbalaga, ma osimiri niile ga-esi n’ụzọ ha chigharịa; ma gị ga-anọgide niime m, ma Mụ onwe m niime gị; ya mere soro m na-eje ije” (Mosis 6:32, 34).
“Soro m na-eje ije.” Ụdị ọmarịcha okù dị mfe.
Chineke kwere Enọk nkwa na ọ bụrụ na anyị ga-enwe obi ike zuru iji malite, mgbe ahụ Chineke ga-anọnyere gị mgbe niile. Chineke ga-eme Enọk dike ma gbaa ya ume imekwu ma nyere ya aka ghọọ karịa ka o nwere ike iche.
Otu niime ọtụtụ aha nke Onye Nzọpụta bụ Imanuel, ma ọ bụ “Chineke nọnyere anyị” (Matiu 1:23). Ọ dị niime aha na eke nke Onyenwe anyị isoro anyị jee ije. Nhọrọ ahụ bụ nke anyị—anyị ọ ga-esoro ya jeekwa ije?
Ụbọchị ugbu a, anyị na-ele Enọk dị ka nwoke okwukwe na nnukwu onye amụma na onye ndu. Mana tupu Enọk onye amụma, enwere Enọk nta nwere obi abụọ nʻonwe ya mana ka họọrọ isoro Chineke jee ije.
Mgbe ndụ siri ike, mgbe ọdịghị gị ka i zuru ezu, cheta nkwa nke Onyenwe anyị nye Enọk, na gị. Ọ ga-eso gị eje ije. Ọ gaghị ahapụ gị naanị gị, ọbụghị nʻotu nzọụkwụ.
Imanuel. Nọnyere anyị. Chineke nọnyere gị!
Otù Ndịisi Zuru ọha NdịInyom Nta
Site nʻaka ekpe ruo aka nri: David J. Wunderli, Onye ndụmọdụ nke Mbụ; Timothy L. Farnes, Onyeisi; na Sean R. Dixon, Onye ndụmọdụ nke Abụọ
Jiri enyemaka Ya, Ị Pụrụ Ime Ihe Niile
Dị ka unu ndịikom nta, Onyenwe anyị rịọrọ Enọk imejuputa oke na ọrụ niile nke ọkwa nchụaja dị mkpa. Ọrụ Ya bụ ikwusa nchegharị nye ndị ajọọ omume. Enọk kwuputara obi abụọ ya. “A bụ [m] ọbụna nwata,” ka o kwuru. “Mmadụ niile kpọrọ m asị … ana m ekwu okwu nwayọ nwayọ; ya mere a bụ m nwa odibo gị?” (Mosis 6:31).
Onyenwe anyị zaghachiri jiri ike na mmasi obi ike. “Gaaniihu ma mee dị ka m nyere gị nʻiwu. … Meghee ọnụ gị, ma ọ ga-ejuputa … . Mmụọ M ga-adakwasị gị … ; ugwu ukwu niile ga-agbalaga niihu gị … ; ya mere soro m jee ije” (Mosis 6:32, 34).
Enọk matara na mgbe Onyenwe anyị nyere anyị ọrụ, anyị anaghị eme ya naanị anyị. Mgbe anyị mere ma debe ọgbụgba ndụ niile anyị na Kraịst, anyị na-eso Ya eje ije ma kere okè nʻike Ya—anyị na-aghọ ngwa ọrụ nʻaka Ya.
Dị ka Enọk, i nwere ọrụ dị mkpa: ije ozi nlekọta, ije ozi niime tempụl, inye oriri nsọ, ịmụ akwụkwọ nsọ, na-ebi ụkpụrụ ozi ọma niile, ichegharị, ịkwado maka mishọn, na ndị ọzọ. O pụrụ ijupụta obi. O nwere ike dị gị ka itozughị. Nke ahụ Dị Mma. Ọ bụghị maka ime ya naanị onwe. Ọ bụ maka ịhọrọ taa—taa na ụbọchị niile—isoro Chineke jee ije.
Jiri enyemaka Ya, ị pụrụ ime ihe niile. Ọ ga-agba gị ume, gbaghara gị, ma nye gị ike karịrị ike eke gị. Ọ hụrụ gị naanya! Dị ka Ndịisi Zuru ọha Ndịikom Nta, anyị hụrụ gị naanya ma na-atụ anya isoro gị inyochagharị isiokwu 2026 na-akpate mmụọ: “Soro M Jee Ije.”
Otù Ndịisi Zuru ọha nke NdịIkom Nta
© 2025 site n’aka Intellectual Reserve, Inc. Ike niile ka edokwara. Ebipụtara na USA. Nkwado n’asụsụ Bekee: 6/19. Nkwado ntụgharị asụsụ: 6/19. Ntụgharị asụsụ nke Ozi Maka Ume nke Ndị Ntoroọbịa Kwa Ọnwa, Jenụwarị 2026. Igbo. 19934 593