Liahona
Ndị Nketa okè Ọdịdị Sinachi
Jenụwarị 2026 Liahona


“Ndị Nketa okè Ọdịdị Sinachi,” Liahona, Jen. 2026

Ozi Liahona Kwa Ọnwa, Jenụwarị 2026

Ndị Nketa okè Ọdịdị Sinachi

(2 Pita 1:4)

Mmata ihe nke atụmatụ nke nzọpụta na-ewete ọmarịcha echiche, na-eme ka anyị nwee ọn̄ụ, ma na-agba anyị ume imeri aka mgba anyị niile na mkpagbu anyị niile.

ngosipụta nke Kraịst na-akpọ mmadụ abụọ ndị na-eso ụzọ

Kraịst Na-akpọ Mmadụ Abụọ Ndị Na-eso ụzọ, site nʻaka Gary E. Smith

Onye Ozi Pita na-echetere anyị na maka ndị na-eso ụzọ nke Jizọs Kraịst, “ike Ya sinachi enyewo anyị niile ihe niile metụtara ndụ na ịdị ka chi, site na mmata ihe nke ya onye nke kpọworo anyị ruo ebube na omume ọma:

“Ebe esiteworo na ya nye anyị nkwa niile dị oke ukwuu ma dị oke ọnụ ahịa: na site na ihe ndị a unu nwere ike bụrụ ndị nketa okè ọdịdị sinachi” (2 Pita 1:34; nkwusike agbakwunyere).

Atụmatụ Nna nke Eluigwe na-akọwa eziokwu niile na nkwa niile dị oke ukwuu ma dị oke ọnụ ahịa na-akọwapụta njirimara na ebumnuuche ebighị ebi anyị.

Dị ka akọwara niime “Ezi na ụlọ Ahụ: Ọkwa A Mara nye Ụwa”:

“Ndi mmadụ niile—nwoke na nwanyi—ka e kere n’oyiyi nke Chineke. Nke ọbụla bụ nwa nwoke ma ọ bụ nwa nwanyị mmụọ a hụrụ naanya nke nne na nna nke eluigwe, ma, n’ụdị ahụ, nke ọbụla nwere ụdị okike na onyinye chi sinachi. …

“N’ebe obibi ndụ tupu abịa n’ụwa, ụmụ ndị nwoke na ndị nwanyi nke mmụọ maara ma fee Chineke ofufe dị ka Nna ha nke Ebighị ebi ma nabata atụmatụ Ya site na nke ụmụ Ya nwere ike iji nweta anụ ahụ ma rite mmetụta nke ụwa ịganiihu chee ihu n’izu okè ma n’ikpeazụ chọpụta ebe nketa ha sinachi dị ka ndị nketa nke ndụ ebighị ebi.

Nna nke Eluigwe na-ekwe ụmụ Ya nkwa na ọ bụrụ na ha soro iwu niile nke atụmatụ Ya na ọmụmaatụ nke Ọkpara Ya Ọ Hụrụ naanya, debe iwu nsọ niile, ma nagide nʻokwukwe ruo ọgwụgwụ, ha “ga-enwe ndụ ebighị ebi, onyinye nke kachasị onyinye niile nke Chineke” (Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 14:7).

Ọrụ nke Chineke lekwasịrị anya nʻelu nganiihu na mbuli elu nke ụmụ Ya. Akụkụ atụmatụ Ya niile ka ahaziri ịgọzi ụmụ Ya ndị nwoke na ndị nwanyị niihi “uru mkpụrụ obi niile dị ukwuu na anya [Ya]” (Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 18:10).

Atụmatụ nke Nna

Na kansụl ndụ tupu ndụ anụ ahụ, Nna nke Eluigwe gosịrị ụmụ Ya nke mmụọ atụmatụ Ya maka nganiihu na obi ụtọ ebighị ebi ha.

“Anyị ga-eme otu ụwa n’ebe ndị a nwere ike ibi;

“Anyị ga-anwale ha jiri nke a,” Onye-nwe kwuru, “ ịhụ ma ha ga-eme ihe nile bụ ihe ọbụla Onye-nwe Chineke ha ga-enye ha n’iwu.”

“Na ha ndị nke debeworo ohere ndụ nke mbụ ha ka a ga-atụkwasịrị n’elu ha; na ha ndị nke na-edebeghị ohere ndụ nke mbụ ha a gaghị enwe otuto niime otu alaeze ha na ndị ahụ bụ ndị debeworo ohere ndụ nke mbu ha; na ndị ahụ bụ ndị na-edebe ohere ndụ nke abụọ ga-enwe otuto a ga-atụkwasịrị ha n’elu isi ha niile ruo mgbe niile na mgbe niile.

“Ma Onyenwe wee sị: Onye ka m ga-eziga? Ma otu onye wee zaa dịka Ọkpara nke Mmadụ: Ebe a ka m nọ, ziga m. Ma onye ọzọ wee zaa na-asi: Ebe a ka m nọ, ziga m. Ma Onyenwe wee sị: Aga m eziga onye nke mbụ.

“Ma onye nke abụọ were iwe, ma o debeghị ohere ndụ nke mbụ ya; na, n’ụbọchị ahụ, ọtụtụ wee sochie ya” (Ebraham 3:24–28).

Buru nʻuche na naanị otu atụmatụ ka egosịrị niime kansụl ndụ tupu ndụ anụ ahụ—atụmatụ nke Nna. Nna anyị nke Eluigwe ajụghị ajụjụ a, “Gịnị ka anyị ga-eme?” Ọ nʻaghị achọ ntụnye uche, na-achọ nrụaka niile, ma ọ bụ na-arịọ amụma niile. Kama, O gosịrị isi mmewere nke atụmatụ Ya ma jụọ, “Onye ka M ga-eziga?” Isi ajụjụ Ya lekwasịrị anya nʻisi onye aga eziga itinye nʻọrụ iwu niile na ọnọdụ niile nke atụmatụ Ya.

Nsonazụ niile nke nnupu isi nke onye iro ka akọwakwara niime akwụkwọ nsọ niile.

“Ya mere, n’ihi na Setan nupuru isi megide m, ma chọọ ka o bibie ohere nhọrọ nke mmadụ, nke Mụ onwe m … nyeworo ya, na kwa, ka m nye ya ike nke m … , m wee mee ka a chụda ya;

“Ma o wee ghọọ Setan, … ekwensu ahụ, nna nke okwu ụgha niile, iduhie na ime ka ụmụ mmadụ kpuo isi, na iduba ha na ndọkpụ n’agha n’ọchịchọ obi ya, ọbụna ka ha ra bụ ndị na-agaghị an̄a ntị n’olu okwu m” (Mosis 4:3–4; nkwusi ike agbakwunyere).

Lucifa egosịghị atụmatụ ọbụla na kansụl ndụ tupu ndụ anụ ahụ nke ọnụ ọgụgụ kacha nke ndị sonyere akwadoghị. Ọ bụghị onye ana emere ebere dara ntuli aka. Ọ nupuru isi! Mpako, okomoko, na ichere naanị onwe kpatere nnupuisi ya megide atụmatụ nke Nna.

Atụmatụ nke Nna na Ozi ọma nke Onye Nzọpụta

Atụmatụ ahụ na-akọwa ọrụ niile nke Nna na Ọkpara ahụ nke na-eme ka ngọzi niile nke ndụ ebighị ebi dị adị nye ụmụ mmadụ niile.

Ozi ọma nke Jizọs Kraịst mejupụtara ụzọ site nʻebe anyị nwere ike ịnata ngọzi niile ekwere nkwa nʻatụmatụ nke Chineke, ọbụna ozizi, ụkpụrụ niile, emume nsọ niile, na ọgbụgba ndụ niile ndịikom na ndịinyom ahaghị ikwere na isoro. “Enweghị aha ọzọ ọbụla enyere nʻokpuru eluigwe ma ọ bụghị ma ọ bụ Jizọs Kraịst nke a … site nʻebe enwere ike isi zọpụta mmadụ” (2 Nefi 25:20). Nʻezie, Onyenwe anyị Jizọs Kraịst bụ “ụzọ, eziokwu, na ndụ ahụ: ọ dịghị onye na-abịakwute Nna, ma ọ bụghị site na [Ya]” (Jọn 14:6; nkwusi ike agbakwunyere).

Onyeisi Russell M. Nelson kọwara:

“Atụmatụ ahụ na-achọ Okike, ma nke ahụ na-achọkwa ma Ọdịda ma Aja mgbaghara mmehie. Ndị a bụ akụrụngwa ntọala atọ nke atụmatụ. Okike nke ụwa ahụ dịka paradise bịara site nʻaka Chineke. Ndụ anụ ahụ na ọnwụ batara niime ụwa site na Ọdịda nke Adam [lee 2 Nefi 2:25; Mosis 6:48]. Ndụ apụghị ịnwụ anwụ na ịdị adị nke ndụ ebighị ebi ka Aja mgbaghara mmehie nke Jizọs Kraịst wetere [lee 2 Nefi 2:21–28]. …

“… Anyị na-abịa nʻụwa maka obere oge, nagide mnwale niile na ọnwụnwa niile, ma kwadoo ịganiihu na ibuli elu ruo nlọta dị ebube nʻebe obibi [lee Abụ ọma 116:15; Alma 42:8]. Echiche na omume niile anyị niile dị ka [niime ndụ anụ ahụ] nʻezie ga-enwekwu ebumnuuche ọ bụrụ ma anyị ghọta atụmatụ nke Chineke ma juru nʻobi ekele maka na nrube isi nke iwu nsọ Ya [lee Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 59:20–21].”

Etutu aha niile nke Atụmatụ ahụ niime Akwụkwọ nke Mọmọn

Anyị na-amụta eziokwu niile dị mkpa site na-ịchọpụta na ịmụ ọtụtụ etutu aha niile dị iche iche maka atụmatụ nke Nna niime Akwụkwọ nke Mọmọn: Ama Ọzọ nke Jizọs Kraịst. Iji maa atụ, tụlee ngwaele etutu aha ndị ahọpụtara sotere:

“Atụmatụ obi ebere nke nnukwu Onye Okike” (2 Nefi 9:6).

“Atụmatụ nke Chineke anyị” (2 Nefi 9:13).

“Atụmatụ nke nzọpụta” (Jarọm 1:2; Alma 24:14).

“Atụmatụ nke mgbapụta” (Alma 12:25, 26, 30, 32, 33; 42:11, 13).

“Atụmatụ nke mweghachite” (Alma 41:2).

“Atụmatụ nke obi ụtọ” (Alma 42:16).

“Nnukwu atụmatụ nke obi ebere” (Alma 42:31).

Etutu aha nke ọbụla ndị a na-enyere anyị aka ghọtazi nke ọma nkwa niile ahụ dị oke ọnụ ahịa nke atụmatụ nke Nna ma na-eme ka echiche anyị dịkwuo mma banyere ebumnuuche niile na mpụtara nke ndụ anụ ahụ nke anyị.

Nke pụtara ihè, etutu aha nke akachasị eji eme ihe maka atụmatụ nke Chineke niime Akwụkwọ nke Mọmọn lekwasịrị anya nʻelu mgbapụta emere ya adị irè site na Aja mgbaghara mmehie nke Jizọs Kraịst.

Alma mara ọkwa, “Asị na ọ bụghị maka atụmatụ nke mgbapụta, nke a tọrọ site na ntọala nke ụwa, a garaghị enwe mbilite n’ọnwụ nke ndị nwụrụ anwụ; mana enwere atụmatụ nke mgbapụta a tọrọ, nke ga-eweta mbilite n’ọnwụ nke ndị nwụrụ anwụ” (Alma 12:25).

Ọ dụkwara ndụmọdụ, “Malite ikwere n’Ọkpara nke Chineke, na ọ ga-abịa ịgbapụta ndị ya, ma na ọ ga-ata ahụhụ ma nwụọ ịchụaja maka mmehie ha niile; ma na ọ ga-ebilite ọzọ site na ndị nwụrụ anwụ, nke ga-eweta na mmezu mbilite n’ọnwụ ahụ, na mmadụ niile ga-eguzoro n’ihu ya, ka ekpee ha ikpe n’ụbọchị ikpeazụ na ụbọchị ikpe ahụ, dị ka ọrụ ha niile siri dị” (Alma 33:22).

E Doziri Ụzọ ahụ

Mkpụrụobi anyị kwesịrị ịza nʻobi ekele dị ka anyị na-atule nnukwu atụmatụ nke nzọpụta nke Chineke, mgbapụta, mweghachite, ebere, na ọbi ụtọ. Mmata ihe nke atụmatụ Ya na-ewete echiche niile dị oke ọnụ ahịa, na-eme ka anyị nwee ọn̄ụ, ma na-agba anyị ume imeri aka mgba anyị niile na mkpagbu anyị niile.

Nna nke Eluigwe nwere oke agụụ maka anyị ịlọghachiri Ya nʻebe obibi Ọ na-akpọku anyị ma na-ekwe nkwa ngọzi niile, mana O nweghị ike amagide, manye, ma ọ bụ machie ntinye nʻọrụ anyị nke ohere nhọrọ O nyeworo anyị. Anyị ahaghị ime ihe na ịhọrọ ịlọghachiri Ya site na-isoro ọmụmaatụ nke Ọkpara Ya Ọ Hụrụ naanya.

ngosipụta nke aka nwata na-esetịpụ iru aka nke Jizọs Kraịst

Aka Ya Ka Setịpụkwara, site nʻaka Elizabeth Thayer

Ụzọ ahụ a kwadoro ya, ma ọ bụrụ na anyị ga-ele anya, anyị ga-adị ndụ ruo ebighị ebi” (Alma 37:46; nkwusi ike agbakwunyere).

Nʻoke ọn̄ụ ana m agba aka ebe na Nna nke Eluigwe bụ odee nke atụmatụ sinachi maka ụmụ Ya. Jizọs Kraịst bụ Onye Mgbapụta anyị na Onye Nzọpụta. Ma dị ka otu niime Ndịozi ụbọchị ikpeazụ nke Onyenwe anyị, ana m agba aka ebe na Ya nʻezie “bụ ụzọ ahụ, eziokwu, na ndụ ahụ” (Jọn 14:6; nkwusi ike agbakwunyere).

Hụba ama

  1. Ezi na ụlọ Ahụ: Ọkwa A Mara nye Ụwa,” Ọba akwụkwọ Ozi ọma.

  2. Russell M. Nelson, “Okike Ahụ,” Ensign, Me 2000, 84, 86.

  3. Maka nyocha zuru okè nke ọtụtụ etutu aha niile nke atụmatụ nke Chineke achọtara niime Akwụkwọ nke Mọmọn, lee Noel B. Reynolds, “Atụmatụ nke Nzọpụta na Akwụkwọ nke Mọmọn,” Religious Educator, vol. 21, no. 1 (2020), 31–53.