Liahona
Mmeri nke Onye Nzọpụta Anyị Anyị Hụrụ naanya
Liahona Eprel 2026


Mmeri nke Onye Nzọpụta Anyị Anyị Hụrụnaanya," Liahona, Epr. 2026.

Ozi Liahona Kwa Ọnwa, Eprel 2026

Mmeri nke Onye Nzọpụta Anyị Anyị Hụrụnaanya

Enweghị okwu niile enwere ike iji akọwa ịdị ukwuu nke onyinye dị oke ọnụ ahịa nke Jizọs Kraịst. Enweghị ike ma ọlị achọ ya n’aka onye ọzọ. Ọ tara ahụhụ "otu mgbe maka mmadụ niile."

ili tọgbọrọ n’efu

Dị ka ọtụtụ afọ gafeworo, abawanyewo m na-ịdị umeala dị ka m cheworo echiche gbasara ya, mụọ ihe, ma nweta nkasi obi dị ukwuu niime onyinye nke Onye Nzọpụta na-enweghị atụ, Aja mgbaghara mmehie nke Jizọs Kraịst. Ọ gaara ara uche mmadụ ahụ ịmalite ịghọta otu akaraka nke ụmụ mmadụ jiri gbanwee kpam kpam niihi ihe mere na Getsemane, n’elu obe, na n’ebe ili.

Anyị Niile Na-enweta Obi mgbawa na Ntaram ahụhụ

Niime ọkpụkpọ okù m dị ka Onyeozi, emewo m njem ọtụtụ ebe ma nwewo ohere nke izute ụmụntakịrị, ndị ntoroọbịa, na ndị dimkpa karịchaa na gburugburu ụwa niile. Enwere oge ndị nke nnukwu ọn̄ụ, mana otu ihe m jiworo anya m hụ ma nwee mmetụta niime ala ala obi m bụ na na-ịgbakwunyere obi ụtọ na ọn̄ụ, ndụ nwekwara oge nke obi mgbawa na ahụhụ.

Enweghị m ike echefu ịnọdụ ala mụ na obere ụmụntakịrị anọ nke ndị nne na nna ha lara mmụọ n’ike niihi onye wakporo ha n’ebe obibi ha mgbe ụmụ ha nọ n’ụra, ma ọ bụ izute otu nwanyị onye nke emetọrọ mgbe ọ bụ nwata nwanyị site n’aka ikwu ya atụkwasịrị obi, ma ọ bụ nọdụ ọdọ n’akụkụ àkwá nke otu nwata nwanyị nke nwere ihe mgbu ụbụrụ isi ka ọ dasịrị site n’elu igwe ma ga-anwụ mgbe na-adịghị anya, ma ọ bụ na-ege ntị na akwá nke otu nwanyị nke di ya rafuru ma ọgbụgba ndụ tempụl ya niile a nọrọ n’ụzọ dị egwu ọtụtụ afọ.

A hụwo m mgbu nke di na nwunye nke nwa toro dimkpa na-ekwenyezighị n’eziokwu niile nke ozi ọma ma chọọ ịtụnwụ okwukwe nke ndị ọzọ nọ na ezi na ụlọ ahụ. Ejewo m leta ndị nne na nna na ndị enyi nọ na nchegbu nke otu nwa okoroọbịa enwere nchekube onye nke wepụrụ ndụ nke onwe ya. Enwewo m mwute nke dị ka chị banyere ndị ahụ na-emewo mmehie ma na-ezie achọwo ichegharị na mmebi nke ndị ahụ mmehie ahụ metụtara.

Ahụwo m obi mgbawa na nrịanrịa nke ụbụrụ isi maka onye na-ata ahụhụ nakwa ndị ahụ na-ata ahụhụ na-enweghị onye mara dị ka ha na-eleanya ma nweghị ike inye ezigbo aka. Ahụwo m oke ihe nfunarị nke onwe onye nke ụkwụtụkwụ eke, iju mmiri niile, ebili mmiri niile, ọkụ, na ala ọmajijiji kpatara. Ahụtawo m kwapụkwapụ n’ọtụtụ mba sitere na nsogbu ndọrọ ndọrọ ọchịchị, agha niile, na mbibi, na nhuju anya na-abịa mgbe ihe anatụghị anya dakwasịrị ndị aka h dị ọcha ma na-achọ ime ihe ziri ezi.

Onye Nzọpụta ahụ jidere aka nke otu onye

Aka Na-agwọ ọrịa, site n’aka Kobly Larsen, nwere ike agaghị akọpị ya

Onye Nzọpụta Na-enyere Anyị aka

Na-ikwu okwu banyere Aja mgbaghara mmehie nke Jizọs Kraịst, Onyeisi James E. Faust (1920-2007), Onye ndụmọdụ Nke abụọ niime Otù Ndịisi Mbụ, kwuru: "Ndị emejọrọ nwere ike ime ihe ha nwere ike ime iji merie mnwale ha, ma Onye Nzọpụta ga-enyere ndị ya aka dị ka otu adịghị ike ha siri dị’ [Alma 7:12]. O ga-enyere anyị aka buru ibu arụ anyị. Ụfọdụ mmerụahụ na-egbu oke mgbu ma dị omimi nke mere na ha enweghị ike ala ma enweghị enyem aka sitere nʻike dịkarị elu na olileanya maka ikpe ziri ezi zuru okè na mweghachi na ndụ nke na-abịa abịa. …Ọ ghọtara ihe mgbu anyị ma ga-eso anyị eje ije ọbụna nʻoge ihe kachasị dịrị anyị njọ."

Ọ na-adịkarị m na ịhụnaanya nke Onye Nzọpụta nọ m nso na ngọzi niile ekwere na nkwa na-adịghị agwụ agwụ site na Aja mgbaghara mmehie nke Jizọs Kraịst. O kpuchiteghị anyị site na nhụmiihe niile nke ndụ rara ahụ nke na-eweta mgbu na-enweghị atụ, mana O chekwara anyị site na ahụhụ na-adịghị ebi ebi na nchụpụ site n’ebe Nna nke Eluigwe nọ ma nye anyị ohere, site na ahụhụ Ya gbara ihe niile okirikiri, ime ka okwe omume inwe ọn̄ụ zuru okè na an̄ụrị dị ebighị ebi n’ihu Chineke.

Onyeisi Dallin{sp}H. Oaks cheteere anyị: "Nʻogo kachasị elu, enyemaka ndụ anụ ahụ nke Chineke kachasi ike bụ onyinye Ya nke Onye Nzọpụta, Jizọs Kraịst, onye ga-ata ahụhụ ịkwụ ụgwọ ma wetere anyị mgbaghara maka mmehie ndị echegharịrị. Aja mgbaghara mmehie ahụ dị ebere ma dị ebube kọwara ihe mere okwukwe niime Onyenwe anyị Jizọs Kraịst ji bụrụ ụkpụrụ mbụ nke ozi ọma. Aja mgbaghara mmehie Ya ʻna-ewete na mmezu mbilite n’ọnwụ nke ndị nwụrụ anwụ’ (Alma 42:23, ma ọ ʻchụrụ [aja] maka mmehie niile nke ụwa’ (Alma 34:8), na-ehichapụ mmehie niiLe anyị chegharịrị ma na-enye Onye Nzọpụta anyị ike inyere anyị aka niime adịghị ike nke ndụ anụ ahụ anyị niile."

Onye Nzọpụta nọ na Getsemani

Uju sitere na Ekpere na Getsemane, site nʻaka DeL Parson, enwere ike ịkọpị maka iji mee ihe naanị na Nzukọ nsọ

Emume Dị mkpa nke Ebighị ebi

Mgbe m na-eche echiche banyere ahụhụ nke mụ onwe m hụworo, nke dị obere na-enweghị ngwụcha iji tụnyere ndị ahụ niile biworo ma ọ bụ ga-ebi n’ụwa, a pụghị m, site n’okwu niile ọbụla nke m maara, ịkọwa mmetụta niile nọ m n’obi maka ihe meworo niime obi na uche na ahụ na mkpụrụ obi nke Onye Nzọpụta n’oge niile dị nsọ nke gụnyere ahụhụ niile maka mmehie niile na mgbu nke ndị niile ekere eke.

Emume ahụ dị mkpa banyere ebighị ebi niile malitere mgbe Jizọs gara "n’ebe akpọrọ Getsemane" (Matiu 26:38) n’Ugwu ukwu Olivs na mpụta mgbidi niile nke obodo ukwu Jeruselem. Ọ gwara ndị na-eso ụzọ Ya, "Mkpụrụ obi M nọ nʻoke mwute, ọbụna ruo nʻọnwụ" (Matiu 26:38).

O kpere ekpere, na-asị, "O Nna M, ọ bụrụ na o kwere omume, kwee ka iko nke a gafere m: otu ọbụla o siri dị ọ bụghị ka m si chee, mana dị ka i siri chọọ" Matiu 26:39). Ọ lọghachikwutere ndị na-eso ụzọ Ya, hụ ka ha na-ehi ụra, pụọkwa ọzọ, ma kpee ekpere nke ugboro abụọ. "O Nna m, ọ bụrụ na iko nke a agaghị agabiga m, ma ọ bụghị ma m n̄ụrụ ya, ka emee uche gị. … Ma [O] kpere ekpere nke ugboro atọ, na-ekwukwa otu ụdịrị okwu ahụ" (Matiu 26:42, 44).

Jizọs n̄ụrụ iko ilu ahụ ma taa ahụhụ karịrị ka anyị bụ mmadụ pụrụ ịghọta ma n’ubi ama ma n’elu obe. Na-emeghị mmehie, O wekwasịrị Onwe Ya mmehie anyị niile, nke mere na dị ka anyị na-abịakwute Ya ma chegharịa, aga ebupụ mmehie anyị niile na ibu arụ anyị niile site nʻahụ anyị (lee 2 Ndị Kọrint 5:21).

Ahụhụ, ọnwụ, na aja mgbaghara mmehie nke Jizọs Kraịst abụworịị ihe atụrụanya ya ogologo oge. Ikwu okwu afọ 700 tupu ọmụmụ nke Jizọs, Aịzaya buru amụma na "Onyenwe anyị ebukwasịwo onwe ya mmehie nke anyị niile" (Aịzaya 53:6). Jizọs kwuru okwu banyere inye ndụ Ya dị ka "ụgwọ nke mgbapụta" (Matiu 20:28; leekwa 1 Timoti 2:6) "maka mgbaghara nke mmehie niile" (Matiụ 26:28 maka ndị niile ga-ekwere na Ya ma chegharịa site na mmehie ha. Pita kọwara otu O "Jiri taa ahụhụ maka mmehie [anyị] niile" (1 Pita 3:18, na site na ọnya Ya niile anyị nwetere ọgwụgwọ (lee 1{ Pita 2:24). O mere ihe na enweghị onye ọzọ pụrụ ime iji mee ka anyị lọghachi niihu Nna anyị. "Echirụrụ Ya ahụ maka mmehie anyị niile" (Aịzaya 53:5).

Site na ntaram ahụhụ ahụ na Getsemane, iru uju Ya garaniihu—nrafu sitere nʻaka onye Ya na ya soro jee ije, ime akaje nʻihu ndị ọchịchị na-ezighị ezi, mgbu nke ahụ Ya apịara ihe, okpu eze ogwu eyiwere Ya nʻisi site nʻaka ndị agha obi ọjọọ na ndị na-enweghị obi ebere (lee Jọn 18:2-3, 12-14; Mak 15:15-20), na osisi dị arụ akpọnyere Ya na azụ dị ka Ọ na-eje ebe Gọlgọta (leejọn 19:16-17).

N’elu obe, arịrị dị egwu enwetere na Getsemane lọghachiri nke ọjọọ nke mmadụ na-enweghị ike idi. Jizọs Kraịst, Ọkpara Chineke, naani buru ibu ọrụ dị nsọ site n’aka Nna Ya ịtọgbọ ndụ Ya. Ndị agha na ndị ọchịchị enweghị ike iwepụ ya site nʻaka Ya (lee jọn 10:18). Na nkwanye ugwu na obi umeala, Jizọs hudatara isi ala ma kwuo, "Ọ gwụsiwo" (Jọn 19:30).

Ngwụcha oge nke ndụ anụ ahụ Ya bịara na mmezu. Enweghị okwu niile ndị enwere ike iji akọwa ịdị ukwuu nke onyinye dị oke ọnụ ahịa Ya. Enweghị ike ma ọlị achọ ya n’aka onye ọzọ. Jizọs Kraịst tara ahụhụ "otu ugboro maka mmadụ niile" (Ndị Hibru 10:10).

O bilitewo!

Site nʻozi Ya dị nsọ emezuworo, Ọ ga-abụ ugbu a onye mbụ nʻagụgụala ụmụ mmadụ niile ibilite site na ndị nwụrụ anwụ baa na ndụ anwụghị anwụ (lee  1Ndị Kọrịnt 15:21-23).

Nye ndịinyom nọ n’ebe ili, ndị mmụọ ozi sịrị:

"Olee ihe unu ji achọ onye dị ndụ n’etiti ndị nwụrụ anwụ?

"Ọ nọghị ebe a, mana o biliwo" (Luk 24:5-6).

Nye Ndịozi Ya, Ọ sịrị, "Leenụ aka m na ụkwụ m, na ọ bụ mụ onwe m" (Luk 24:39). Emesịa, "[ihe karịrị] narị mmadụ ise hụrụ ya … ozugbo" (1 Ndị Kọrịnt 15:6). Ndị aka ebe hụrụ Onye Nzọpụta bilitere n’ọnwụ. Ọ nwụghị anwụ. Ọ dịịrị ndụ.

Jizọs Kraịst tibiri ụdọ igwe niile na ịga niile nke agbụ ebighị ebi nke ọnwụ maka onye niile nke biworo ma ọ bụ ga-ebi nʻụwa (lee 1 Ndị Kọrịnt 15:22). O meriri ihe niile bụ onye iro anyị; onye iro nke ọnwụ ka azachapụrụ ruo ebighị ebi.

Onyeisi Russell M. Nelson (1924-2025) kwuru: "Jizọs Kraịst wekwasịrị Onwe Ya mmehie unu niile mgbu unu niile, obi mgbuunu niile, na adịghị ikeunu niile. Unu ekwesịghị ibu ya naanị unu! Ọ ga-agbaghara unu ma unu chegharịa. Ọ ga-agọzi unu nye unu ihe unu chọrọ. Ọ ga-agwọ mkpụrụ obi unu tiwara etiwa. Dị ka unu na-anyakudo onwe unu na Ya, ibu arụ unu ga-adị mfe. Ọ bụrụ na unu ga-eme ma na-edobe ọgbụgba ndụ niile isoro Jizọs Kraịst, unu ga-ahụta na oge ihe mgbu niile nke ndụ unu bụ nwa mgbe nta. Aga ʻeloba mkpagbu unu niile niime ọn̄ụ nke Kraịstʻ [Alma 31:38]"

Dị ka otu onye na Ndịozi Ya echiri echichi, a hụtawo m oge nke ime mmụọ na nke onwe nke na-enyewo m aka ebe dị irè na nke doro anya na Ọ dị ndụ. Nʻoge Ista nke a, ka okwu ndị a nonyere anyị nʻụzọ dị nro niime uche anyị na nʻobi anyị: "Ka m ghara ichefu, O Onye Nzọpụta, na Ị gbara ọbara ma nwụọ niihi m," dị ka anyị na-an̄ụrị na-ekwe ukwe:

O biliwo! O bilitewo! …

E meriwo ọnwụ; mmadụ e nwerewo onwe ya.

Kraịst enwewo mmeri.

Hụba ama

  1. James E. Faust, " Aja mgbaghara mmehie Ahụ: Olileanya Anyị Kachasị Ukwuu," Liahona, Jen. 2002, 22.

  2. Dallin H. Oaks, "Enyemaka Sinachi maka Ndụ anụ ahụ," Liahona, Me 2025, 104.

  3. Maka nkeji edemede 10 na-esote, lee Neil L. Andersen, Jizọs bụ Kraịst ahụ (2023), 28-35.

  4. Russell M. Nelson, "Onyenwe anyị Jizọs Kraịst Ga-Abịa Ọzọ," Liahona, Nọv. 2024, 122.

  5. "Nʻobi Umeala, Onye Nzọpụta Anyị," Abụ niile, nọ. 172.

  6. O Biliwo!" Abụ niile, nọ. 199.