“Ụzọ Ọgbụgba ndụ Ahụ Na-enye Ọn̄ụ,” Liahona, Feb. 2026.
Ozi Liahona Kwa ọnwa, Febrụwarị 2026
Ụzọ Ọgbụgba ndụ ahụ Na-enye Ọn̄ụ
Ịdị egwu na ịdị ukwuu nke ndị otù ezi na ụlọ ejikọtara ọnụ nʻihu Nna na Ọkpara na-ewete ịdị egwu na an̄ụrị karịrị akarị na mkpụrụ obi m ma mejuputa m na mmụọ nke obi ekele.
Okenye Patrick Kearon na nwunye ya, Jennifer
Mgbe Izrel na Elizabeth Haven Barlow hapụrụ Nauvoo, Illinois, gawa Salt Lake Valley na 1848, ha hapụrụ nwata nwoke a mụrụ ọhụrụ eliri nʻobere ebe ana eli ozu na Nauvoo. Obere Jamis Nathaniel Barlow, nwa mbụ ha, nwụrụ obere oge amụchara ya na Me 1841.
Site na ọpụpụ ha gawa Salt Lake Valley, Izrel na Elizabeth enweghị mgbe ọbụla ha tụrụanya ile anya ọzọ nʻelu ili nke nwa ha nwoke. Ma mgbe a kpọrọ Izrel ije mishọn na England ka afọ ole ma ole gachara, ọ gafere site na Nauvoo dị ka ọ na-emega njem nʻọwụwa anyanwụ. Nʻarịrịọ nke Elizabeth, ọ kwụsịrị ịchọpụta ili nke nwa ha nwoke ma buru ahụ ya gaa kpoo nʻebe ana eli ozu, nʻọwụwa anyanwụ nke obodo ahụ mepere emepe.
Ka otu ụbọchị ịchọ nʻefu gasịrị, Izrel chọrọ enyemaka site nʻaka ndị na-eli ozu na gburugburu ebe ahụ. Ụbọchị nke sotere, ha chọtara ili ahụ, a hụrụ ebe dị nso nʻebe nwa nwanne Jemis Meri nọ. Na mwute, igbe ozu ndị ahụ erekaala ma gbajisịa. Na-akwụkwọ ozi o degaara nwunye ya, Izrel dere, “Ya mere a tụgharịrị m ma kpebie na m ga-ahapụ ha ebe ahụ tutu ruo ọdịniihu.”
Ọ gabeghị ebe dị anya site nʻebe ili ahụ mgbe ọ nụrụ otu olu. Na-echeta nhụmiihe ahụ, o dere, “Ọ dasighị ike, mana pụta ezigbo ihè nʻuche m nke na m enweghị ike ịmajọ ya: ʻPapa, ahapụkwala m ebe a.ʻ” Izrel tụgharịrị nʻebe ili ahụ, na-ekpebi iwepụ nwata nwoke ya ahụ nʻikpeazụ. “E nwere ụdị ịda jụụ pụrụ iche na obi izu ike nke m na-enwebughị na mbụ. … Nke a bụ ihe m maara m ga-ekwu: na ọ dịbeghị mgbe m kacha nwee mkpachara anya nʻọrụ ọbụla m rụworo na ndụ m.
Na Septemba 2, 1853, Izrel Barlow na ndị na-eli ozu bugara ahụ nke Jemis na Meri na kpọmkwem ebe ana eli ozu na Nauvoo, na-enye ebe ahụ akara site “nʻokwute nʻisi na nʻụkwụ nke ili ndị ahụ.”
Izrel gwara Elizabeth na mgbe ọ nọọrọ nʻakụkụ ebe ili ahụ, “e nwere m ọchịchọ ịranye onwe m na ihe niile m nwere ike ịkpọ nke m nʻaka Onyenwe anyị, ka e wee gụnye m nʻitozu okè ịpụta mụ na [Jemis] nʻụtụtụ Nke Mbụ nke Mbilite nʻọnwụ.”
Nnyefe onwe nke Izrel na ozi ọma nke Jizọs Kraịst, tinyekwara ikwanyere ugwu ọgbụgba ndụ niile dị nsọ, na-enye Kraịst ohere ime ndụ ebighị ebi—nke kachasị ukwuu na ngọzi niile—na-ekwe omume maka ya , ndị nna nna ya ha, na ụmụ ụmụ ya.
Nke a bụkwa eziokwu maka onye ọbụla niime anyị.
Foto site nʻaka Jerry Garns, enwere ike ịkọpị ya maka ojiji nke Nzukọ nsọ naanị
Nkwa niile Dị nsọ
Nna anyị nke Eluigwe na Ọkpara Ya, Jizọs Kraịst, hụrụ onye ọbụla niime anyị naanya karịa ihe niile anyị nwere ike iche. Enweghị ebe ọbụla ịhụnaanya Ha kachasị pụta ihè karịa site na ngọzi niile ekwere na nkwa metụtara ọgbụgba ndụ niile enyere anyị na baptizim na niime ụlọ nke Onyenwe anyị.
“Otu niime nchepụta uche ndị kachasị mkpa banyere okpukperechi ekpughere bụ nke gbasara ọgbụgba ndụ dị nsọ,” Onyeisi Russell M. Nelson (1924-2025) kuziri. “Nʻasụsụ iwu, ọgbụgba ndụ nʻụzọ niile gosịpụtara nkwekọrịta dị nʻetiti mmadụ abụọ ma ọ bụ karịa. Mana nʻọnọdụ okpukperechi, ọgbụgba ndụ bara nnukwu uru karịa nke a. Ọ bụ nkwa dị nsọ dị nʻetiti anyị na Chineke.”
Nkwa niile dị nsọ anyị na-eme ma na-edebe na-agọzi anyị. Nna nke Eluigwe na Onye Nzọpụta anyị Jizọs Kraịst chọrọ ịkpọkete anyị nso nʻebe Ha nọ. Ha chọrọ inyere anyị aka mụta ma too nʻokwukwe na nghọta. Ha chọrọ inye anyị onyinye dị nsọ site nʻike nke eluigwe. Ha chọrọ ka anyị chọta ọgwụgwọ na udo niime ụwa ebe ụdịrị ngọzi ndị ahụ na-amị amị. Ha chọrọ ka anyị nwete an̄ụrị niime ndụ nke a na niime ndụ nke na-abịa abịa. Na-asọpụta site nʻịhụnaanya nke a zuru okè, Ha na-enye anyị ohere ịbata na njikọ nke ọgbụgba ndụ anyị na Ha. Anyị nwere ngọzi nke inyefegharị onwe anyị na ọgbụgba ndụ ndị ahụ kwa izu ụka nʻoge nzukọ oriri nsọ.
Anyị na-eri oriri nsọ na mmụọ nke obi ekele niihi na anyị nwere ngọzi nke an̄ụrị nke iwekwasị onwe anyị aha nke Jizọs Kraịst, na-echeta Ya na ịhụnaanya Ya maka anyị egosịpụtara site nʻonyinye nke Aja mgbaghara mmehie Ya—nke mere na Ọ tara ahụhụ, gbaa ọbara, ma nwụọ niihi anyị. Oriri nsọ nakwa agọzi anyị site na ohere kwa izu ụka igosị ịdị njikere anyị idobe iwu nsọ Ya niile, megharịa ọhụrụ ọgbụgba ndụ anyị niile, ma mee ọgbụgba ndụ ọhụrụ (lee Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 20:77, 79).
“Ọtụtụ mgbe, ana m anụ nkwuputa ahụ na anyị na-eri oriri nsọ iji megharịa ọhụrụ ọgbụgba ndụ ndị anyị mere na baptizim. Ebe nke ahụ bụ eziokwu, ọ kacha bụrụ eziokwu karịa nke ahụ,” ka Onyeisi Nelson kwuru. “Emewo m ọgbụgba ndụ ọhụrụ. Unu emewo ọgbụgba ndụ ọhụrụ. … Ugbu a na nzaghachi nke [Onyenwe anyị] kwuru okwu ahụ na anyị ga-enwe Mmụọ Ya mgbe niile ịnọnyere anyị. Olee ụdị ngọzị dị otu a!”
Mgbe anyị chegharịrị ma rie oriri nsọ nʻobi ọcha, anyị na-anata Mmụọ Nsọ na “nsachapụ site na mmehie ka aga a sị na e mere anyị baptizim ọzọ. Nke a bụ olileanya na ebere Jizọs na-enye onye ọ bụla n’ime anyị.”
Lee ụdịrị an̄ụrị ichegharị na inwe mgbaghara site na ịhụnaanya mgbapụta nke Kraịst na-ewete!
Foto nke Tempụl Nauvoo Illinois site n’aka Jennifer Rose Maddy
Ụlọ nke Ọn̄ụ Ya
Mgbe ọ ghọchara Onyeisi Nzụkọ nsọ Ahụ nke Jizọs Kraịst nke Ndị nsọ Ụbọchị ikpeazụ a, Onyeisi Nelson kwuru okwu ọtụtụ ugboro banyere ụzọ ọgbụgba ndụ, malite site na ozi ọha nke mbụ ya dị ka Onyeisi Nzụkọ nsọ ahụ. Anyị na-abanye ụzọ ahụ site na “nchegharị na baptizim site na mmiri” (2 Nefi 31:17), ọ sịrị nʻoge mmemme ọzọ, ma “emesịa anyị abanye ya kpamkpam karịa niime tempụl.”
Dị nnọọ ka iri oriri nsọ na-echetara anyị maka ọgbụgba ndụ anyị niile na ngọzi ndị so ha, otu ahụ kwa ka ịrụ ọrụ nnọchite anya niime tempụl dị. Dịka anyị na-eme ọtụtụ emume nsọ na nnọchịte anya maka ndị ahụ nwụworo anwụ, anyị na-echeta nkwa ndị dị nsọ anyị meworo na ngọzi ndị e kwere nkwa anyị ga-anata.
Site nʻụzọ ọgbụgba ndụ, anyị na-abụ ndị so eketa okè nye ngọzi niile ekwere nkwa nye Abraham, Aịzik, Jekọb, na ụmụ ụmụ ha. Na-agbanyeghị ngọzi ndị ahụ e kwere na nkwa, Abraham, Aịzik, na Jekọb ebighị ndụ dị mfe, ma ọ bụghị ma anyị nwa kwa. Dị ka ha, anyị na-ezute ihe isi ike, ịdọ aka na ntị, na nfunarị dị ka ana “anwale anyị niime ihe niile” (Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 136:31; leekwa 101:4-5). Mana dị ka ndị amụma na Ndị Nsọ ezi omume mgbe ochie, anyị maara onye anyị ga-atụkwasị obi (lee 2 Nefi 4:19).
Ndụ anụ ahụ anyị bụ naanị nwa mgbe nta nʻịdị adị anyị, mana oge ahụ—na-ara ezigbo ahụ mgbe ụfọdụ—bụ maka ịdị mkpa dị ebighị ebi. Ee, Nna anyị nke Eluigwe chọrọ ka anyị mụta ihe ma too etoo. Ma, ee, uto ahụ mgbe ụfọdụ na-agụnye ndakpọ olileanya na ntaram ahụhụ. Mana Ọ chọrọ ka ndụ anyị maa mma ma nwee olileanya. Niihi nke a, na ime ka njem anyị ịlaghachikwuru Ya dị mfe, O nyewo Onye Nzọpụta, onye bụ “onye nkwa” nke ọgbụgba ndụ anyị nke anyị na Nna Ya. Site na Aja mgbaghara mmehie nke Jizọs Kraịst, Nna mejuputara nkwa niile ekwere ụmụ Ya niime tempụl.
Site na ịhụnaanya na aja mgbaghara mmehie, Onye Nzọpụta anyị ahụwo maka ma gwọọ ihe niile anyị ga-ezute na ndụ. Ma niihi ụlọ Ya dị nsọ—ụlọ nke ọn̄ụ Ya—ihe niile ga-adị mma na-agbanyeghị ihe isi ike. Balm nke idobe ọgbụgba ndụ na-azachapụ mwute, mgbu, iru uju, na ndakpọ olileanya. Anyị ekwesịghị ichegbu onwe anyị ma ọ bụ tụọ egwu. Kama, anyị kwesịrị ịn̄ụrị ọn̄ụ na ụgwọ nke mgbapụta anyị a bụrụwo ihe akwụrụ ụgwọ ya (lee 1 Ndị Korịnt 6:20) ma na-atọwo ụzọ ọgbụgba ndụ ruo na ndụ ebighị ebi.
Ụzọ ọgbụgba ndụ nʻezie bụ ụzọ nke ịhụnaanya mgbapụta. Dị ka anyị na-akwanyere ọgbụgba ndụ ndị anyị na-eme niime tempụl ugwu, anyị na-anata ngọzị nke ike, ịhụnaanya, ebere, nghọta, na olileanya kacha dị ukwuu. Ịdị egwu na ịdị ukwuu nke nrachi niile nke tempụl—banyere ndị otù ezi na ụlọ ejikọtara ọnụ nʻịhụnaanya maka mgbe ebighị ebi niile—na-ewete ịdị egwu na an̄ụrị karịrị akarị na mkpụrụ obi m ma mejuputa m na mmụọ nke obi ekele.
“Mgbe ọbụla ụdị ihe ọgba aghara ọbụla mere niime ndụ gị, ebe kachasị mma iji nwee nchekwa nke ime mmụọ bụ ibi ndụ niime ọgbụgbandụ gị niile nke tempụl!” Onyeisi Nelson nyere ndụmọdụ. A maara m site na nhụmiihe nke ndụ anụ ahụ m ndị dị ụtọ na ndị dị ilu ịbụ eziokwu nke okwu ndị ahụ dị.
Jamis Nathaniel Barlow, nwa mbụ nke Izrel na Elizabeth Barlow, nwụrụ obere oge amụchara ya na Me 1841. Ka ọtụtụ afọ gasịrị, arachiri ya site na nnochite anya nye nne na nna ya niime Tempụl Logan Utah.
Ngosipụta site nʻaka Allen Garns
Kpọkọta Ha nʻEbe obibi
Mgbe Izrel sịchara nwa ya nwoke nta nọọ nke ọma, o degaara nwunye ya akwụkwọ, “Echiche nke iwezuga onwe m nʻebe dị anya, enwetụbeghị na ndụ m ọzọ ịlọghachi nʻebe ili [Jemis], kechie eriri ikpeazụ nke ịhụnaanya nke m bu tutu ya etiwaa na-anyammiri nʻelu ili ya.”
Chee dị echiche na nnukwu anyammiri—anyammiri nke ọn̄ụ nʻoge nke a—ka ebere na Disemba 4, 1889. Nʻụbọchị ahụ, obere nwa Jemis Nathaniel Barlow ka arachiri ya na nne na nna ya niime Tempụl Logan Utah. Nʻoge ahụ, Izrel anwụwo, ya mere ndị ọzọ guzooro dị ka ndị nnọchi anya maka ya na Jemis.
Nwanne nwanyị Kearon na mụ nwere mmetụta na nnukwu ọmịiko pụrụ iche maka Izrel na Elizabeth. Ọkpara anyị, a kpọrọ Sean, nwụrụ nʻoge ịwa obi mgbe ọ ka gbara naanị izu ụka atọ. Nke a bụụrụ oke ihe nfunarị nye anyị. Nʻoge ahụ, anyị naara eche ma anyị ga-anyakwa ndụ. Anyị liri ya nʻobere ili na-agbawa obi na Ingland. Ka afọ iri na ise gasịrị, a gwara ezi na ụlọ anyị ka anyị siri nʻebe obibi anyị na United Kingdom pụọ gaa ozi nʻuju na Nzukọ nsọ, ma anyị hapụrụ obere ili ahụ nʻazụ.
Obere nwa anyị efunahụghị anyị nʻụzọ njem ụkwụ ọdịda anyanwụ, ma anyị ataghị ahụhụ ihe isi ike nke Barlows ọnụ apụghị ịkọ, mana anyị nwere mmalite nghọta nke ihe ha gabigara. Ili nwa anyị nwoke amụrụ ọhụrụ nọ ebe tere ezigbo aka, otu ọ dị ka ndị nke Barlow, anyị nwere okwukwe na-anọgide na Mbilite nʻọnwụ nke Jizọs Kraịst na ọdịdị ebighị ebi nke ezi na ụlọ anyị site na ọgbụgba ndụ nrachi dị nsọ.
Anyị niile nwere ndị nna nna ochie na ndị ọzọ anyị hụrụ naanya gafee ili ndị na-asị anyị, “Ahapụkwala m ebe a.” Niihi Ọgbụgba ndụ niile nke Tempụl, enweghi onye ekwesịrị ịhapụ n’azụ. Okù anyị bụ ịhụ ha naanya, jeere ha ozi, ma nye aka kpọkọta ha nʻebe obibi.
Nna anyị nke Eluigwe hụrụ anyị , unu na mụ naanya. O nyewo anyị tempụl niile nke ọ ga-abụ na “ihe ọbụla ọ bụ [anyị] kere agbụ nʻelu ụwa ka aga eke agbụ nʻeluigwe” (Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 128:8; leekwa Matiu 18:18). O zitere Okpara Ya igbubi agbụ niile nke ọnwụ, na-egbughe ụzọ maka njikọ mgbe ebighị ebi na njikọta ọnụ ezi na ụlọ dị ebighị ebi.
Nke ahụ bụ ihe mere anyị jiri nwee emume nsọ niile. Nke ahụ bụ ihe mere anyị jiri na-eme ọgbụgba ndụ niile. Nke ahụ bụ ihe mere anyị jiri na-ewu tempụl niile. Nke ahụ bụ ihe mere anyị jiri na-aranye onwe anyị nʻọrụ na ebube Chineke (lee Mosis 1:39). Ma nke ahụ bụ ihe mere anyị jiri na-ebe akwa ọn̄ụ, ebe anyị maara na njikọta ọnụ dị ebighị ebi cheere anyị na ndị anyị hụrụ naanya nʻihu nke Nna na Ọkpara.
Ka anyị chọta ọn̄ụ na udo dị ka anyị na-edebe ọgbụgba ndụ anyị niile ma sonye Onyenwe anyị nʻọrụ nchekwa Ya dị ebube.
© 2026 site n’aka Intellectual Reserve, Inc. Ikike niile ka edokwara. Ebipụtara na USA. Nkwado n’asụsụ Bekee: 6/19. Nkwado ntụgharị asụsụ: 6/19. Ntụgharị asụsụ nke Ozi Liahona Kwa ọnwa, Febrụwarị 2026. Igbo. 19933 593