2025
Atụmatụ nke Chineke maka Ezi na ụlọ Ga-adị Ebighị ebi
Dizemba 2025 Liahona


“Atụmatụ nke Chineke maka Ezi na ụlọ Ga-adị Ebighị ebi,” Liahona, Dez. 2025.

Ozi Liahona Kwa ọnwa, Dizemba 2025

Atụmatụ nke Chineke maka Ezi na ụlọ Ga-adị Ebighị ebi

Ezi na ụlọ nke nabatara atụmatụ nke Chineke, nwee ịhụnaanya dị ka Onye Nzọpụta siri nwee ịhụnaanya, ma na-akwanyere ọgbụgba ndụ ha ugwu otu ụbọchị ga-eketa okè ngọzi niile nke ndụ ebighị ebi na uju nke ọńụ.”

foto nke Tempụl São Paulo Brazil

Na nso nso ngwụcha nke ije ozi nʻuju oge m, a n̄ụrịrị m ọn̄ụ mgbe e nyere m onyinye dị nsọ ma rachie m nye ndị nne na nna m na Tempụl São Paulo Brazil.

Ndị nne na nna m, Apparecido na Mercedes, sitere na mgbakwasa okpukperechi dị iche iche, mana nhụmiihe niile nke ndụ ha kwadoro ha ịnabata ozi ọma eweghachitere.

Azụlitere nna m na ezigbo ezi na ụlọ mana ọbụghị niihe gbasara okpukperechi. Na-agbanyeghị, dị ka nwa okoroọbịa o nwere mmasị nʻokpukperechi. Ọ gụrụ Baịbụlụ, gaa klaasị Baịbụlụ niile, ma mụọ ndụ nke Jizọs Kraịst. Ọmụmụ ihe ya niile kpataara ya inwe oke mmasị ma nʻozi ọma nke Onye Nzọpụta na ezi na ụlọ, hapụ ya inwe ọchịchọ ilụ onye ya na uche nke ya makọrọ.

Ma nʻaka nke ọzọ, nne m sitere na ezi na ụlọ okpukperechi dị omimi. Ha nabatara ụkpụrụ niile nke ozi ọma gaa ofufe nzukọ nsọ niile, ma nʻikwesị ntụkwasị obi na-eme ihe gbasara okpukperechi ha. Itolite na gburugburu ebe obibi ahụ, nne m ghọrọ ụdị mmadụ onye na-anaghị ahapụ ịga ọgbakọ nzukọ nsọ.

Ma site otu a, mgbe ndị nne na nna m mechara ọlụlụ ma a mụọ mụ na ụmụnne m atọ ndị nwoke, ha mere ka ike kwere ha ịzụlite anyị niime ìhè nke ọmụma ihe nke ụkpụrụ niile nke ozi ọma ha. Otu ụbọchị dada m, onye bụụrụ onye otù nke Nzukọ nsọ Ahụ nke Jizọs Kraịst nke Ndị nsọ Ụbọchị ikpeazụ a na-adịghị nkọ, gwara nna m, “Onye ọma m, i nwere ụmụ nwoke anọ. Ọ bụrụ nʻezie na ị chọrọ ịzụlite ezi na ụlọ hiwere isi niime Kraịst ma nwee Chineke niime ezi na ụlọ gị, i kwesịrị ịga nzukọ nsọ m.”

Nna m nụrụ ihe o kwuru, mana o nweghị ihe ọbụla o mere tutu ruo ụbọchị ahụ ndị mgbasa ozi ọma nʻuju bịara izisa ozi nʻogige anyị, kụọ aka nʻọnụ ụzọ anyị, ma malite ikuziri anyị ihe. Ọ matara ọsịsọ na ha nọchitere anya nzukọ nsọ nke dada m gbaworo ya ume ime nnyocha.

Ìhè na Eziokwu

Otu niime ihe ndị masịrị ndị nne na nna m nʻisi mbụ niime ozi ọma nke Jizọs Kraịst eweghachitere bụ ịdị mkpa Nzukọ nsọ tinyere ezi na ụlọ na nkuzi ahụ nke na-ahụ na “ọtụtụ ọrụ nzọpụta na mbuli elu nke Chineke ka a na-emezu site na ezi na ụlọ.” Tupu emee ha baptizim, ndị nne na nna m nwere ezigbo afọ ojuju site nʻihe ha na-amụ nke mere na ha kpọkuru ndị agbata obi isonye ha maka ọmụmụ ihe si nʻaka ndị mgbasa ozi ọma.

Foto ndị nke nne na nna Okenye Soares

Otu niime ihe ndị masịrị ndị nne na nna m nʻisi mbụ niime ozi ọma nke Jizọs Kraịst eweghachitere bụ ịdị mkpa Nzukọ nsọ tinyere ezi na ụlọ.

Mgbe ha na ndị mgbasa ozi ọma zutere, ma gaaniihu ịmụ ozi ọma mgbe baptizim ha gasịrị, ndị nne na nna m mụtara ụzọ “esi azụlite ụmụ [ha] niime ìhè na eziokwu” na otu esi nʻụzọ ime mmụọ “ahazi nʻusoro ụlọ nke onwe [ha]” (Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 93:40, 43).

Ha mụtara na “ezi na ụlọ bụ isi ihe na atụmatụ nke Onye Okike maka akaraka dị ebighị ebi nke ụmụ Ya” ma na “an̄ụrị niime ndụ ezi na ụlọ bụ ihe a ga-akachasị enweta mgbe ehiwere ya nʻelu nkuzi niile nke Jizọs Kraịst.”

Ha mụtara na “alụm di na nwunye niile na ezi na ụlọ niile gara nke ọma ka e hiwere ma na-elekọta n’ụkpụrụ nke okwukwe, ekpere, nchegharị, mgbaghara, nsọpụrụ, ịhụnaanya, ọmịiko, ọrụ na ihe omume mmeghariahụ niile kwesịrị ekwesị.”

Ha mụtara na ezi na ụlọ niile nwere ike ịdị ebighị ebi nakwa “otu ụdị mmekọrịta nke ọha nọ n’etiti anyị ebe a ga-anọ n’etiti anyị ebe ahụ, naanị a ga-agbakwunye ya ebube dị ebighị ebi” (Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 130:2).

Ma ha mụtara na “ebumnuuche nke nkuzi niile, ihe omume niile niime Nzukọ nsọ ma emesịa bụ na ndị nne na nna na ụmụ ha nwere obi ụtọ nʻebe obibi, rachie na alụmdi ebighị ebi, ma ejikọta ha na ndudugandu ha niile.”

Site na ọmụma ihe ahụ, ha chọrọ ka arachie ha dị ka ezi na ụlọ ga-adị ebighị ebi.

Anya Lekwasịrị Ebighị ebi

Mgbe emesịrị nne na nna m baptizim, ha nọọrọ na-eme ihe ha na-amụta, na-apụ site nʻụwa na-abanye na alaeze ozi ọma. Ha rụrụ ọrụ iji jikọta ezi na ụlọ anyị site na inwe nnọkọ mgbede nʻebe obibi na ọmụmụ akwụkwọ nsọ nke ezi na ụlọ, na-aga ọgbakọ Nzukọ nsọ niile nʻikwesị ntụkwasị obi, na ị na-eme ọrụ agụgụala ezi na ụlọ. Site na mbọ ndị ahụ chuwere ihu na ịdị nʻotu, ha tụrụanya ikepụta ezi na ụlọ hiwere isi na atụmatụ nke nzọpụta nwere anya lekwasịrị ebighị ebi.

Na 1965, afọ mgbe e mere nne na nna m baptizim, tempụl kachasị dị nso na São Paulo, Brazil, nọ na Mesa, Arizona, ihe ruru maịlụ 6,000 (9,650 km) nʻịdị anya. Ime njem dịịrị ezigbo oke ọnụ maka ezi na ụlọ anyị, ya mere nne na nna m cheere tutu ruo nraranye nke Tempụl São Paulo Brazil na 1978 tupu ha enwee ike nata emume nsọ niile nke tempụl ha ma nwee nrachi. N’oge ahụ, a naara m eje ozi mishọn na Rio de Janeiro.

Ihe dị ka ọnwa abụọ tupu mishọn m abịa na ngwụcha na Febrụwarị 1980, onyeisi mishọn m nyere mụ na onye nsiso m ohere ime njem anyị na ndị otù stek sitere na Rio de Janeiro gaa tempụl na São Paulo ka m nwee ike nwete onyinye dị nsọ ma rachikọta nye nne na nna m. Dị ka nne na nna m, echewo m ọtụtụ afọ maka ngọzi ndị ekwere na nkwa nke emume nsọ niile na ọgbụgba ndụ niile nke tempụl.

Nhụmiihe ahụ gbanwere ka m si hụ ọdịniihu ma nye m ihè nke mbụ banyere ịbụ eziokwu nke okwu niile nke Onyeisi Russell M. Nelson kwuru na nso nso a: “Oge a nọ niime tempụl ga-enyere gị aka ka ị chee maka selestial ma nwete ọhụ nke onye ị bụ n’ezie, onye i nwere ike ịbụ, ma ụdị ndụ ị nwere ike inwe ruo mgbe ebighị ebi.

Nke nke oge m na tempụl nʻoge mmemme ahụ metụtara nʻụzọ dị omimi nke ukwuu oge ndị fọdurụ nʻozi mgbasa ozi ọma m. Site na ọhụ ọhụrụ ahụ, ịgba ama banyere tempụl na ịdị mkpa nke atụmatụ Chineke banyere ezi na ụlọ niile nwere mmetụta na-adịghị agwụ agwụ na ndụ m.

Mgbe mụ na nwanyị m, Rosana, lụrụ afọ abụọ ka ozi mishọn m gachara, arachiri anyị na tempụl ya na ọhụ ịzụlite ezi na ụlọ dị ebighị ebi nke onwe anyị. Na-ime otu ahụ, anyị rụkọtara ọrụ ọnụ ikewapụta omenaala ezi na ụlọ niile dị ka ndị nke ahụ ndị nne na nna anyị kuziwooro anyị, ha niile lekwasịrị anya na Onye Nzọpụta, nkuzi Ya niile, na nkuzi niile nke ndị amụma Ya ụbọchị taa.

Taa ụmụ anyị na-azụlite ụmụ ha site nʻotu ụdị ụkpụrụ ozi ọma niile nke an̄ụrị ahụ kwa. Gbasara anyị, ezi na ụlọ bụ ihe niile niihi na anyị ghọtara nnọ na-etiti nke ezi na ụlọ n’atụmatụ nke Chineke.

Dị ka Onye Ji Ikike Zuru ọha, e nwetara m ngọzi nke ịrachi ụmụ m atọ nye ndị lụrụ ha niime tempụl. Ileba anya niime anya ha oge ahụ ha gbisara nʻebe nchụaja niime tempụl bụụrụ nhụmiihe mara mma. E nwere m ike hụ ụmụ ụmụ m ịbụ ndị a gọziri agọzi sitekwa nʻụdị ụkpụrụ niile nke ozi ọma ahụ nne na nna m kuziwooro m nakwa mụ na Rosana akuziworo ha. E nwere m ike ịhụ ngọzi niile ahụ ịdị na-aganiihu na ndudugandu ndị na-abịa abịa. Ma echetaara m maka onye mere ka ihe niile kwe omume.

ụdị ihe ana ahụ anya dị iche iche NʻEbe Ọmụmụ nọ nʻebe ana ekonye ihe

Ihe Ncheta Ekeresimesi

Ezi na ụlọ nọ nʻetiti atụmatụ nke an̄ụrị nke Chineke, mana ọ bụrụ na-enweghị Onye Nzọpụta Jizọs Kraịst, atụmatụ ahụ agaraghị ekwe omume. Aja mgbaghara mmehie Ya na emume nsọ niile na ọgbụgba ndụ niile a hụrụ niime ozi ọma Ya mere ka nkwa nke mbuli elu kwe omume.

Onyeisi Nelson amawo ọkwa: “Mbuli elu bụ ihe dịịrị ezi na ụlọ. Naanị site na emume nsọ nzọpụta niile nke ozi ọma nke Jizọs Kraịst ka enwere ike isi ebuli ezi na ụlọ niile. Ihe kacha nʻikpeazụ nke anyị na-agbasi mbọ ya ike bụ na anyị na-enwe obi ụtọ dị ka ezi na ụlọ—nwere onyinye dị nsọ, nwere nrachi, ma kwadoo maka ndụ ebighị ebi nʻihu Chineke.”

Mgbe m na-eme nleta ebe ndị m na-ahụtubeghị mbụ, ana m agbalị ịchọta obere Ebe Ọmụmụ nke na-echetara mụ na Rosana banyere Onye Nzọpụta. Anọ m na-ewekọta nnọọ ihe buru ibu.

Ka m nọ na-eche echiche banyere Ebe Ọmụmị ndị ahụ dị umeala, mụ na nwanyị m tụgharịrị uche otu mgbe, “Olee ihe ọ bụ nʻezie nke kachasị dị anyị mkpa na ndụ?” Azịza ahụ, nʻeziokwu, bụ Onye Nzọpụta, ozi ọma Ya, na ezi na ụlọ anyị. Ichetara anyị banyere ịhụnaanya nke Nna anyị nke Eluigwe nwere maka anyị ma na ọ bụ site na Onye Nzọpụta ka nkwa nke ezi na ụlọ dị ebighị ebi na-aghọ ihe kwere omume, tupu ekeresimesi afọ ole ma ole gara aga anyị tụkwasịrị ihe Ebe ọmụmụ anyị niile nʻelu nnukwu ebe ana ekonye ihe abụọ dị nʻebe obibi anyị—ma hapụ ha nʻelu ebe ahụ kama iwepụ ha mgbe oge ezumiike Ekeresimesi gachara. Omenaala ahụ na-enyere anyị aka dote mmụọ nke Ekeresimesi niime ebe obibi anyị gburugburu afọ niile.

Ụbọchị niile ka anyị na-ele ihe ndị Ebe ọmụmụ ahụ anya, ha ji nwayọ echetara anyị banyere isi ọrụ nke Onye Nzọpụta niime ndụ anyị. Ha na-echetara anyị na udo nʻelu ụwa ugbu a (lee Luk 2:14) na an̄ụrị dị ebighị ebi niime ụwa na-abịa abịa dabeere na Onye Nzọpụta na ịkwanyere ọgbụgba ndụ niile anyị na Ya mere ugwu. Ma ha na-echetara anyị “na ọ bịara niime ụwa, ọbụna Jizọs, ka a kpọgbuo ya maka ụwa, na iburu mmehie niile nke ụwa, na ido ụwa nsọ, na ịsacha ya site na ajọọ omume ya niile;

“Na site na ya e nwere ike ịzọpụta mmadụ niile ndị Nna tinyere n’ike ya ma kee site na ya” (Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 76:41–42).

Dị nnọọ ka anyị mụtara eziokwu ndị a site nʻaka ndị nne na nna anyị, mụ na Rosana arụwo ọrụ inyefe ha nʻaka ụmụ anyị. Ugbu a ụmụ anyị na-akuziri ụmụ ha eziokwu ndị a kwa. Mkpụrụ niile ahụ akụnyere nʻobi nke ndị nne na nna anyị afọ 60 gara aga niime obere ebe obibi anyị amịpụtawo okoko ma mịa mkpụrụ “nke kachasị dị oke ọnụ ahịa, nke kachasị dị ụtọ karịa ihe niile dị ụtọ, na nke dị ọcha karịa ihe niile dị ọcha, ee, na-enweghị ntụpọ karịa ihe niile nke na-enweghị ntụpọ” (Alma 32:42).

Ana m agba ama na ezi na ụlọ ndị ahụ nke nabatara atụmatụ nke Chineke maka ezi na ụlọ niile, ma kwanyere ọgbụgba ndụ ha niile ugwu ga otu ụbọchị eketa oke ngọzi niile nke ndụ ebighị ebi na uju nke ọńụ” ha na ndị ha hụrụ naanya ma ha na Nna na Okpara ahụ.