“Ọgbụgba ndụ niile, Ike, na Nkwa niile,” Liahona, Ọkt. 2025.
Ozi Liahona Kwa Ọnwa, Ọktoba 2025
Ọgbụgba ndụ niile, Ike, na Nkwa niile
Tempụl nọ nʻetiti ike na nchekwa ahụ ekwere ndị kwesịrị ntụkwasị obi na nkwa tupu Ọbịbịa nke Ugboro abụọ nke Onyenwe anyị Jizọs Kraịst.
Ngosipụta nke Josef Smith site n’aka Dan Burr
Na Me 1833, nna nna nke ukwuu m nke anọ Asahel Perry na ụfọdụ ndị enyi mere njem site na mpaghara ugwu New York ruo Kirtland, Ohio. Ha abụraghị ndị otù nke Nzukọ nsọ nke eweghachitere ọhụrụ, mana ha chọrọ izute Onye amụma Josef Smith. Ha rutere nʻoge ịga kansụl nke mbụ emere iji kparịta ụka banyere owuwu nke Tempụl Kirtland.
Mgbe amalitesịrị kansụl ahụ, Onye amụma weputara atụmatụ nke owuwu tempụl ahụ. Emesịa ọ kpọkuru ndị nọ ebe ahụ ka ha gosipụta mmetụta ha banyere nnukwu ọrụ nke a. Ọtụtụ zaghachiri na Nzukọ nsọ dara nnukwu ogbenye iji malite ụdị ọrụ dị otu a. Ha tụrụ arọ ịrụ ụlọ nke dị ntakịrị nke na-agaghị efu nnukwu ego.
Nʻoge mkparịta ụka na-esote, Nna nna Perry na ndị enyi ya bịakọtara ọnụ, wepụta ego ha, ma tinyekọta ya ọnụ. Ha nwere ego ga-ezuru ha iji kwụọ ụgwọ nlaghachi ha ma tụọ ụtụ nke owuwu tempụl ahụ? Ka nkeji ole ma ole gara, nna nna m bịakwutere Josef Smith, wepụta mkpụrụ ego olaedo dollar ise, ma nye ya Onye amụma ahụ. (Ụdị mkpụrụ ego ahụ taa ga-eru narị kwuru narị dollars!)
Josef guzooro niihu ndị kansụl ma welie mkpụrụ ego ahụ elu. Emesịa, jiri olu dị ike, o kwuru na “ọrụ ahụ amalitewo na Ụlọ [nke Onyenwe anyị] ka a ga-ewu dịka otu nsoro a egosipụtara” site nʻaka Onyenwe anyị Jizọs Kraịst siri dị.
Oteghi aka ezi na ụlọ Perry esonye Nzukọ nsọ na Kirtland, nata ngọzị niile nke tempụl ha ka afọ ole ma ole gara niime Tempụl Nauvoo, ma emesịa mee njem gafee ala larịị niile ruo Utah.
Mgbe emesiworo nraranye nke Tempụl Kirtland na 1836, ọ dịziworo ezigbo ntakịrị ịba Ndị nsọ Ụbọchi ikpeazụ a ndị chọrọ ịga nraranye ya. Dịka Nzukọ nsọ na-etolite, otu ahụ ka ọnụọgụgụ nke Ndị nsọ na-eme nzukọ nʻezi si na-etolitekwa. Onyeisi James E. Faust (1920–2007), onye jere ozi dịka onyeisi stek m mgbe m bụ nwa okoroọbịa na onye nkuzi m mgbe akpọrọ m ịbụ Onye Ji Ikike Zuru ọha na 2007, kwuru nke a banyere tempụl nke abụọ nke Nzukọ nsọ:
“Tupu arụsịa Tempụl Nauvoo na 1846, Ndị nsọ ga-ezukọta nʻezi, ọtụtụ mgbe nʻakụkụ tempụl, ị nụrụ okwu nke Josef na ndị ndu Nzukọ nsọ ndị ọzọ. Mgbe ụfọdụ puku kwuru puku ndị mmadụ bịara ọgbakọ ndị a”—mgbe ụfọdu ọbụna oge ihu igwe na-adịghị mma.
“Dịka [Okenye] George A. Smith kwuru nʻụzọ na-atọ ọchị ejiri mara ya, ʻNʻụbọchị niile nke Onye amụma Josef … [Nzukọ nsọ] mere nnọọ ọfụma mgbe a nọ nʻezi.ʻ”
Anyị nwere obi ekele maka nʻụbọchị anyị, Nzukọ nsọ Ahụ nke Jizọs Kraịst nke Ndị nsọ Ụbọchị ikpeazụ a na-eme ọfụma nʻezi, niime ụlọ, ma gburugburu uwa niile. Ime ọfụma nke ahụ gụnyere owuwu nke ọtụtụ tempụl nʻọnụọgụgụ ahụtụbeghị mbụ “dịka otu nsoro ahụ ewepụtara siri dị”—nsoro nke gụnyere mgbe niile ngọzi niile, ido nsọ, okwukwe, na ịchụ aja.
Ihè Dị ebube—Tempụl Kirtland, site n’aka Glen S. Hopkinson, enweghị ikike ịkọpị ya
Gịnị Kpatara Eji Nwee Ọtụtụ Tempụl?
“Ndị bu anyị ụzọ ebuwo amụma na ọtụtụ tempụl ga-ejuputa mpaghara Ugwu na Ndịda Emerịka, agwa etiti niile nke Pacifik, Europe, na ebe ndị ọzọ,” Onyeisi Eza Taft Benson (1899–1994) kwuru ọtụtụ iri afọ gara aga. “Ọ bụrụ na ọrụ mgbapụta nke a ka a ga-eme nʻogo otu o kwesịrị, narị kwuru narị nke tempụl ka a ga-achọ”
Onyeisi Russell M. Nelson kwuru na anyị na-ewu tempụl nʻọnụọgụgụ ahụtụbeghi mbụ taa “niihi na Onyenwe anyị nyere anyị ntuziaka ime otu ahụ. Ngọzị niile nke tempụl na-enye aka kpọkọta Izrel na ala ndị dị ndụ ma ndị nwụrụ anwụ. Ngọzị ndị a na enyekwa aka iji kwadoo ndị ga-enye aka ịkwado ụwa maka Ọbịbịa nke Ugboro Abụọ nke Onyenwe anyị!”
Nʻekpere nranranye ya nke Tempụl Kirtland, Josef Smith kpere ekpere ”na ndị niile ga-abata n’ọnụ ụzọ ụlọ nke Onyenwe anyị wee nwee ike nwee mmetụta nke ike gị. …
“Ma anyị na-arịọ gị, Nna dị nsọ, ka ndị odibo gị wee pụọ site n’ụlọ nke a bụrụ ndị a akwadoro site n’ike gị, na ka aha gị dakwasị nʻisi ha, ma ka ebube gị gbaa ha gburugburu, ma ka ndị mmụọ ozi gị bụrụ ndị na-eche ha nche” (Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 109:13, 22; nkwusi ike agbakwunyere; leekwa amaokwu nke 23).
Mgbe m gụrụ amaokwu ndị ahụ, ana m eche maka ọhụ nke Nefi banyere ụbọchi ikpeazụ ndị a. Leba anya nʻokwu ndị yiri nke a: “Ma o wee ruo na mụ onwe m, Nefi, hụrụ ike nke Nwa atụrụ nke Chineke, na ọ dakwasịrị n’isi ndị nsọ nke nzukọ nsọ nke Nwa atụrụ ahụ, na n’isi ndị ọgbụgba ndụ nke Onyenwe anyị, ndị ekposasịrị na mbara elu ụwa niile; ma ngwa ọgụ ha ji bụ ezi omume na ike nke Chineke na nnukwu otuto” (1 Nefi 14:14; nkwusi ike agbakwụnyere).
Ekwere m na tempụl ndị nke ụbọchị ikpeazụ a na-arụ oke ọrụ dị mkpa na mmejuputa amụma nke Nefi ma nọkwa nʻetiti nye nchekwa na ike ahụ ekwere ndị kwesịrị ntụkwasị obi na nkwà tupu Ọbịbịa nke Ugboro abụọ.
Ọtụtụ afọ gara aga, mgbe m na-eje ozi dịka bishọp nke ngalaba ukwu nke mahadum, agwa nke otu nwa agbọghọ nọ na ngalaba ukwu m metụtara m nʻobi nʻụzọ pụrụ iche. Ọ ka na-emetụta m nʻobi ruo taa. Unu mara ya dịka Onyeisi Emily Belle Freeman, Onyeisi Zuruọha Ndịiyom Nta. Nʻokwu o kwuru nʻọgbakọ zuru ọha emere na nso nso a, ọ kuziri na site na tempụl, Jizọs Kraịst na-ebuli anyị elu ruo nʻogo ime mmụọ dị elu.
“Oge ọbụla m kufere ọnụ ụzọ nke ụlọ Ya, ana m enweta nhụmiihe mmekọrịta ọgbụgba ndụ mụ na Ya dị omimi karịa,” ka Onyeisi Freeman kwuru. “E dowo m nsọ site na Mmụọ Ya, enyefewo m onyinye site nʻike Ya, ma dopu iche iwu alaeze Ya.”
Ike Ekwere na nkwa
Onyeisi Nelson ekwuwo ọtụtụ mgbe banyere ike nke Jizọs Kraist nke dị adị site na ọgbụgba ndụ niile nke tempụl. “Ịnyakudo onwe unu na Onye Nzọpụta pụtara na unu nwere ohere ruo n’ume na ike mgbapụta Ya,” ka o kwuru. Onyeisi Nelson akụziwokwa:
“Dị ka anyị na-edobe ọgbụgba ndụ anyị niile nke tempụl, anyị na-enwete nnukwu ohere ruo nʻike Onyenwe anyị nke na-agba ume. Niime tempụl, anyị na-anata nchekwa megide ọpịpịa ihe nke ụwa.”
“Emume nsọ nke [Onye Nzọpụta] niile dị oke mkpa na-ekekọta anyị na Ya site na ọgbụgba ndụ niile nke ọkwa nchụaja dị nsọ. Mgbe ahụ,dị ka anyị na-edobe ọgbụgba ndụ anyị niile, Ọ na-enye anyị onyinye site nʻike ọgwụgwọ Ya nke na-agba ume. Ma oh, lee ka anyị ga-esi achọ ike nke Ya nʻụbọchị ndị n’abịa abịa.”
“Ike ezi omume na nke ime mmụọ nke ndị nke anyị chọrọ ugbu a ugbu a na maka ụbọchị ndị na-abịa abịa bụ ike nke Chineke Nna na Okpara Ya, Jizọs Kraịst. Anyị na-enwete ohere ruo nʻike Ha site na-ime ma idebe ọgbụgba ndụ niile anyị na Ha gbara.”
Ike nke eluigwe dị oke mkpa, ụmụnne m ndị nwoke na ndị nwanyị, niihi na anyị bi niime ụwa nwere oke ajọọ omume. Ma enweghi ike ahụ, anyị agaghị enwe ike “ịnagide ụbọchị nke ọbịbịa ya” ma ọ bụ “guzoro mgbe ọ ga-apụta” (Malakaị 3:2). Anyị amaghị mgbe ụbọchị ahụ ga-abụ, mana eziteworịị onye ozi Ya iji “kwadoo ụzọ ahụ” maka ọbịbịa Ya (Malakaị 3:1). Ka ọ dị ugbu a, ụwa ejighi nwayọ nwayọ na-erute nʻụbọchị ahụ.
Anyị chọrọ ike ahụ ekwere ndị kwesịrị ntụkwasị obi na nkwa inyere anyị aka:
-
Kwe ka Chineke nwee mmeri niime ndụ anyị.
-
Chegharịa ma bịarute Onyenwe anyị nso.
-
Gọzie, kasie obi, duo, ma jee ozi nlekọta.
-
“Nagide mnwale anyị niile, ọnwụnwa niile, na obi mgbu niile nʻụzọ dị mma karịa” (lee Mosaia 3:19).
-
Chọta udo na ọn̄ụ niime Kraịst dịka anyị na-aga ije nʻụzọ ọgbụgba ndụ.
-
Kwadoo “maka ụbọchị nke nrepịa” na “ọdachi nke ajọọ mmadụ” (Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 109:46).
-
Rụzuo ọrụ nke Onyenwe anyị tupu Ọbịbịa nke Ugboro abụọ Ya.
Foto banyere dome nke Tucson Arizona Temple site nʻaka James Whitney Young
Ndị nche nke Nzọpụta
Ọrụ na otuto nke Nna nke Eluigwe bụ “iwete na mmezu anwụghị anwụ na ndụ ebighị ebi nke mmadụ” (Mozis1:39). Tempụl ọbụla guzooro dịka onye nche nọ nʻụwa nke atụmatụ nke nzọpụta nke Chineke, na-atụ aka nʻọrụ ahụ dị mkpa nke Onye Nzọpụta nʻọrụ na otuto ahụ.
Jiri ngwa ọgụ nke ike Ya, nwoke na nwanyị ọbụla na-edebe ọgbụgba ndụ—ma ha emewo ọlụlụ ma ọ bụghị—onye kwesịrị ntụkwasị obi na-idebe ọgbụgba ndụ niile nke tempụl ka a ga-agọzi niime ndụ nke a ma na ndụ nke na-abịa abịa.
Onyeisi Nelson ekwewo nkwa na: “Ngwụcha ahụ nke onye ọbụla niime anyị na-agbalị bụ inwete onyinye ike niime ụlọ nke Onyenwe anyị, arachikọtara dịka ndị ezinaụlọ, kwesịrị ntụkwasị obi nye ọgbụgba ndụ ndị emere niime tempụl nke na-eme anyị etozuo oke maka onyinye nke Chineke kacha ibe Ya—nke bụ ndụ ebighị ebi. Emume nsọ niile nke tempụl na ọgbụgba ndụ niile i na-eme ebe ahụ bụ isi ihe eji agba ndụ gị ume, alụm dị na nwunye gị, na ezinaụlọ gị, na ike gị iji guzogịde mbuso agha niile nke onye iro. Ofufe gị n’ime tempụl na ije ozi gị n’ebe ahụ maka ndị nna nna ochie gị ga eji mkpughe nke onwe bara ụbara na udo gọzie gị, ma ga-agba nkwenye gị ịnọrọ n’ụzọ nke ọgbụgba ndụ ume.”
Dịka Onyeozi nke Onyenwe anyị Jizọs Kraịst, ana m agba akaebe na ihe ndị a bụ eziokwu.
© 2025 site n’aka Intellectual Reserve, Inc. Ike niile ka edokwara. Ebipụtara na USA. Nkwado n’asụsụ Bekee: 6/19. Nkwado ntụgharị asụsụ: 6/19. Ntụgharị asụsụ nke Ozi Liahona Kwa Ọnwa, Ọktoba 2025. Igbo. 19611 593