2025
Owuwu Nauvoo
Septemba 2025


“Owuwu Nauvoo,” Friend, Septemba 2025, 26–28.

Ozi nke Friend Kwa Ọnwa, Septemba 2025

Owuwu Nauvoo

Ndị nsọ isimbụ bi niime ụlọikwuu nʻakụkụ ikpere mmiri nke Osimiri Mississippi

Onyenwe anyị gwara Ndị nsọ ịgbakọta nʻebe ọhụrụ. Ọ bụ ebe dị nso na-akụkụ otu nnukwu osimiri, ebe ala dị mmiri na pọtọ pọtọ. O yighị ka ebe dị mma iji wuo obodo ukwu. Mana Onye amụma Josef Smit maara na site nʻenyem aka nke Onyenwe anyị, ha pụrụ ime ya amaa mma.

Onyeikom bu osisi nʻubu ya, otu ịnyịnya na wagọnụ bu ngwa ndị eji arụ ụlọ, na obere ụlọ osisi.
Josef Smit na ndịikom ndị ọzọ na-edo brik dị ka ha na-ewu ụlọ

Ndị nsọ rụsiri ọrụ ike iji mee ya ebe dị mma obibi. Josef kpọrọ obodo ukwu ahụ Nauvoo, nke pụtara “ebe mara mma.”

Josef Smit na-atụ otu ebe nʻelu ugwu nta aka maka tempụl.

Onyenwe anyị chọburu Ndị nsọ Ya iwu tempụl na Nauvoo. Ndị ahụ malitere ịrụ ọrụ ọsọ ọsọ.

Josef Smit na-akuziri Ndị nsọ ndị ọzọ ihe niime ụlọ

Onyenwe anyị nwererịị nnukwu ngọzi inye ndị Ya. Niime tempụl, ha ga-eme ọgbụgba ndụ niile, ma ọ bụ kwe nkwa ndị pụrụ iche, ha na Onyenwe anyị. Ha gakwa amụ ihe banyere atụmatụ obi ụtọ nke Nna nke Eluigwe maka ụmụ Ya niile.

Ha rụzuru Tempụl Nauvoo

Ndị nsọ rụsiri ọrụ nʻiwu tempụl ahụ. O were ogologo oge, mana ha nwere obi ụtọ ịmụta banyere nkwa ndị pụrụ iche nke Onyenwe anyị nwere maka ha na tempụl Ya.

Ihu akwụkwọ a na-ete agba

Tempụl Bụ Ụlọ nke Onyenwe anyị

Ihuakwụkwọ a na-ete agba nke Ihe Omume tempụl PDF

Ngosipụta sitere n’aka Corey Egbert

Olee otu o si emetụta gị mgbe ị na-ahụ tempụl?