“Owuwu Nauvoo,” Friend, Septemba 2025, 26–28.
Ozi nke Friend Kwa Ọnwa, Septemba 2025
Owuwu Nauvoo
Onyenwe anyị gwara Ndị nsọ ịgbakọta nʻebe ọhụrụ. Ọ bụ ebe dị nso na-akụkụ otu nnukwu osimiri, ebe ala dị mmiri na pọtọ pọtọ. O yighị ka ebe dị mma iji wuo obodo ukwu. Mana Onye amụma Josef Smit maara na site nʻenyem aka nke Onyenwe anyị, ha pụrụ ime ya amaa mma.
Ndị nsọ rụsiri ọrụ ike iji mee ya ebe dị mma obibi. Josef kpọrọ obodo ukwu ahụ Nauvoo, nke pụtara “ebe mara mma.”
Onyenwe anyị chọburu Ndị nsọ Ya iwu tempụl na Nauvoo. Ndị ahụ malitere ịrụ ọrụ ọsọ ọsọ.
Onyenwe anyị nwererịị nnukwu ngọzi inye ndị Ya. Niime tempụl, ha ga-eme ọgbụgba ndụ niile, ma ọ bụ kwe nkwa ndị pụrụ iche, ha na Onyenwe anyị. Ha gakwa amụ ihe banyere atụmatụ obi ụtọ nke Nna nke Eluigwe maka ụmụ Ya niile.
Ndị nsọ rụsiri ọrụ nʻiwu tempụl ahụ. O were ogologo oge, mana ha nwere obi ụtọ ịmụta banyere nkwa ndị pụrụ iche nke Onyenwe anyị nwere maka ha na tempụl Ya.
Ihu akwụkwọ a na-ete agba
Tempụl Bụ Ụlọ nke Onyenwe anyị
Ngosipụta sitere n’aka Corey Egbert
Olee otu o si emetụta gị mgbe ị na-ahụ tempụl?
© 2025 site n’aka Intellectual Reserve, Inc. Ikike niile edokwara. Ebipụtara na USA. Nkwado n’asụsụ Bekee: 6/19. Nkwado ntụgharị asụsụ: 6/19. Ntụgharị asụsụ nke Ozi Friend Kwa Ọnwa, Septemba 2025. Igbo. 19640 593