“A Gọziri site nʻIkike na Ike Ọkwa nchụaja,” Liahona, Sept. 2025.
Ozi Liahona Kwa Ọnwa, Septemba 2025
A Gọziri site nʻIkike na Ike Ọkwa nchụaja
Ndị otù Nzukọ na-eji ike nke Chineke nʻije ozi na ịgọzi ndị ọzọ niime Nzukọ nsọ, nʻebe obibi, na gburugburu ụwa.
Aka ebe anyị nye ụwa bụ na ọkwa nchụaja dị nsọ nke Chineke dị oke mkpa nʻimejupụta ọrụ nke nzọpụta na mbuli elu Ya, na Ọ weghachitewo ọkwa nchụaja nʻụwa maka ebumnuche ahụ, ma na a na-enye ya site nʻaka Nzukọ nsọ Ahụ nke Jizọs Kraịst nke Ndị nsọ Ụbọchị ikpeazụ a.
Mkpa Ikikere na Ike Ọkwa nchụaja dị
Jizọs Kraịst bụ onyeisi Nzukọ nsọ ahụ. Nzukọ nsọ ahụ bụ ngwa ọrụ O hiwere iji mejupụta ọrụ dị oke mkpa nke ịgbapụta ụmụ mmadụ niime ọgbọ ozi ọma ikpeazụ nke a dị nnọọ ka niime ọgbọ ahụ mgbe O biiri nʻelu ụwa. Site na Nzukọ nsọ:
-
Ọ pụrụ ịma ọkwa ozi ọma Ya na gburugburu ụwa.
-
Ọ pụrụ inye baptizim na ọgbụgba ndụ ndị ọzọ niile—ọbụna ụzọ ọgbụgba ndụ ruo alaeze seletịal Ya.
-
Ọ pụrụ ijikọta ezi na ụlọ niile ọnụ maka mgbe ebighị ebi.
-
Ọ pụrụ inye onyinye niile nke nzọpụta, ọbụna nye ndị ahụ nwụwororịị na-enweghị ha.
-
Ọ pụrụ ije ozi nye mkpa niile ana ahụ anya nke ụmụ Chineke oge ugbu a.
Iji mejupụta ebumnuche ndị a gbara ọkpụrụkpụ, na ịkwado maka nlọghachite nke Onye Nzọpụta, Nzukọ nsọ nwere mkpa odudu, ikikere, na ike nke Chineke na-aganiihu. Nzukọ nsọ Ahụ bụ “nzukọ nsọ bụ ziri ezi na nke dị ndụ” (Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 1:30) niihi na Kraịst tinyere niime ya odudu na ike Ya site nʻọkwa nchụaja Ya,”Ọkwa nchụaja Dị nsọ, site nʻUsoro nke Ọkpara nke Chineke” (Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 107:3).
Mana a sị na ọ bụghị maka ọkwa nchụaja nke a dị nsọ, Nzukọ nsọ gaara abụ n’ụzọ dị mkpa nzukọ nkịtị nke ụwa, na-eme ihe dị mma niime ụwa mana na-enweghị ike iji mepụta ebumnuche ahụ kachasị maka ịkwado ụmụ ndị nwoke na ụmụ ndị nwanyị nke Chineke maka ọn̄ụ nke ndụ ebighị ebi nʻihu Ya. Site na ọkwa nchụaja nke a, na ntụghe niile iji duzie ọrụ ọkwa nchụaja nke a, enwere ma ikike ma usoro ime ihe niime Nzukọ nsọ.
“Niime Nzukọ nsọ, ikike ọkwa nchụaja niile ka a na-eji arụ ọrụ nʻokpuru ntuzi aka nke ndị ahụ ji ntụghe niile nke ọkwa nchụaja.
“Ndị otù Nzukọ nsọ ndị nwoke tozuru okè na-anata ikike ọkwa nchụaja site na inyefe ọkwa nchụaja na ichi echichi baa na ọkwa ọrụ niile nke ọkwa nchụaja. Ndị otù Nzukọ nsọ niile nwere ike iji ikike enyere ha ji rụọ ọrụ dị ka edopụrụ ha iche ma ọ bụ kenye ha ọrụ inye aka mejupụta ọrụ nke Chineke.”
Site na ntụghe niile nke ọkwa nchụaja, ihe ndị kacha Onyenwe anyị mkpa ga-emeri mgbe niile. Ọ dịghị onye nwere ike ịkwado ajenda nke onwe nke na-adabaghị na ntuzi aka Ya. Ọ dịghị onye nwere ike ime nke ọma nʻọrụ nchụaja ụgha, na-achọ uru nke onwe na nsiso nke onwe.
Ọkwa nchụaja na-arụkwa ọrụ dị egwu niime ebe obibi nke ndị otù Nzukọ nsọ. Onyeisi Dallin H. Oaks, Onye ndụmọdụ nke Mbụ niime Otù Ndịisi Mbụ kuziri, “Ụkpụrụ ahụ nke kwuru na ikike ọkwa nchụaja ka enwere ike iji rụọ ọrụ naanị n’okpuru ntuziaka nke onye ahụ ji ntụghe niile maka ọrụ ahụ dị oke mkpa niime Nzukọ nsọ, mana nke a emetụtaghị ezi na ụlọ.” Ndị Nna na-eduzi ma na-eji ọkwa nchụaja arụ ọrụ niime ezi na ụlọ ha—ịdụ ndụmọdụ, ime nzukọ ezi na ụlọ niile, inye ngọzi niile nke ọkwa nchụaja ma ọ bụ nke ọgwụgwọ nye ndị otù ezi na ụlọ ma ọ bụ ndị ọzọ, na ihe ndị ọzọ—na-ajụghị maka ntuzi aka ma ọ bụ inye ikike site nʻaka onye ji ntụghe niile nke ọkwa nchụaja.
“Otu ụdị ụkpụrụ ahụ dabakwara mgbe onye nna anọghị ya ma onye nne abụrụ onye ndu ezi na ụlọ. Onye nne na-edu niime ebe obibi ya ma bụrụ ngwa ọrụ n’iwete ike na ngọzi niile nke ọkwa nchụaja niime ezi na ụlọ ya site na onyinye dị nsọ na nrachi nke ya niime tempụl.”
Mweghachite nke Ọkwa nchụ aja ahụ nʻoge Ụbọchị Anyị
Me 15, 1829
Mweghachite nke ikike ọkwa nchụaja niime ọgbọ ikpeazụ nke a garaniihu nʻusoro ahaziri ahazi, ịgbago nʻotu nʻotu. Dị ka akwụkwọ nsọ nke tọrọ ntọala maka ọgbọ nke anyị, Akwụkwọ nke Mọmọn, ka anọ na-atụgharị asụsụ ya na 1829, Onyenwe anyị malitere itinye ndokọ ọkwa nchụaja Ya nʻọnọdụ. Na nzaghachi nye ekpere ajụjụ nke Joseph Smith na Oliver Cowdery gbasara baptizim, Jọn Omee Baptizm bilitere nʻọnwụ pụtara ma nyefee nʻisi ha Ọkwa nchụaja nke Erọn, bụ ọkwa nchụaja “ji ntụghe niile nke ije ozi nlekọta nke ndị mmụọ ozi, na nke ozi ọma nke nchegharị, na nke baptizim site na imikpu na mmiri maka mgbaghara nke mmehie niile” (Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 13:1). Site na ikike ahụ, Josef na Oliver mere baptizim otu onye ibe ya ma emesịa ndị ọzọ, dị ka ahaziri Nzukọ nsọ nke ọma.
Ngwa ngwa Me 15, 1829 gasịrị
Mgbe na-eteghị anya Jọn Omee Baptizm pụtara, Ndịozi mgbe ochie Pita, Jemis, na Jọn pụtara ma nyefee ọkwa nchụaja dị elu karịa, ma ọ bụ ọkwa nchụaja, Melkizedek, gụnyere “ntụghe niile nke alaeze m, na ọgbọ nke ozi ọma maka … uju nke oge niile” (Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 27:13; leekwa 128:20).
Eprel 3, 1836
Ikike ọkwa nchụaja ọzọ a chọrọ sotere mgbe, niime Tempụl Kirtland, ndị amụma mgbe ochie atọ, Mozis, Elias, na Elijah, bịakwutere Josef na Oliver ma nyefee ha ntụghe niile nke mkpokọta Izrel na nke ọrụ ahụ metụtara tempụl niile nke Onyenwe anyị (lee Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 110:11–16).
Oge Summer 1829–Eprel 1835
Mkpughe niile e doro nsọ ugbu a niime Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile kuziiri Onye amụma Josef Smit ihe gbasara ichi ndịikom echichi baa nʻọkwa ọrụ niile nke ọkwa nchụaja (Melkizedek) dị elu karịa na ọkwa nchụaja nke (Erọn) nke nkwado; ịkpọ ndị ọrụ ọkwa nchụaja, dị ka ndị bishọp; na nhazi nke kworum niile nke kansụl niile nke ọkwa nchụaja.
1835–1973
Ntuzi aka site nʻibu amụma na-aganiihu idu otù ọkwa nchụaja na ịrụ ọrụ niime Nzukọ nsọ. Ịmaatụ, ahaziri kworum ndị Iri Asaa a haziri nʻoge Kirtland iji nyere Kworum nke Ndị Iri na a bụọ aka. Mgbe nnukwu ọpụpụ ahụ ruo na Ọdịda Anyanwụ na mgbasasị nke ndị otù Nzukọ nsọ nʻofe obosara mpaghara mba ndị ọzọ gasịrị, kworum ndị a ka enyere ọrụ ịrụ niime stek niile nke Nzukọ nsọ.
1973–Ruo ugbu a
Nʻokpuru ọchịchị nke Ndịisi Spencer W. Kimball (1895–1985), Ezra Taft Benson (1899–1994), na Gordon B. Hinckley (1910–2008), Ndị iri asaa na ndị kworum ha malitere ịrụ ọrụ kpọmkwem nʻokpuru Kworum nke Ndị iri na abụọ na ogo Nzukọ nsọ zuru ọha na niime mpaghara niile nke Nzukọ nsọ. Kworum niile dị na ogo stek ka emesịrị kwụsị mgbe ahụ. Taa, kworum iri na abụọ nke Ndị Ji Ikike Zuru ọha na Ndị Mpaghara Iri Asaa na-enyere Ndịozi aka “nʻihiwe nzukọ nsọ na ịchịkwa ihe omume niile bụ otu ụdị ihe niime mba niile” (Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 107:34). Kworum Ndị Iri Asaa ndị ọzọ agbakwunyere ka enwere ike ikepụta dị ka Nzukọ nsọ na-amụba.
Okenye Christofferson na-ekele ụmụnne ndị nwoke Sampson na Daniel Amako nọ na Gambia, Ọdịda Anyanwụ Afrịịka, na Febrụwarị 2022.
Ọkwa nchụaja: Ike iji Gọzie
N’otu mkpụrụokwu, ebumnuche nke ikike na ike ọkwa nchụaja nke Jizọs Kraịst weghachitere bụ iji gọzie. Ọ na-ekwe ndị otù Nzukọ nsọ iji ike nke Chineke rụọ ọrụ nʻije ozi na ịgọzi ndị ọzọ niime Nzukọ nsọ, nʻebe obibi, na gburugburu ụwa. Ndị otù na-esonye Onye Nzọpụta nʻimejupụta ọrụ nke nzọpụta na mbuli elu Ya, etinye onyinye na ike Chineke n’ọrụ gafere nke onwe ha iji nyere alaeze nke Chineke aka tolite ijupụta nʻụwa (lee Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 65:2, 5–6).
Onyenwe anyị akọwaala na “ọkwa nchụaja [Melkizedek] nke a dị ukwuu karịa na-enye ozi ọma ahụ ma ji ntụghe nke ihe omimi niile nke alaeze, ọbụna ntụghe nke mmata ihe nke Chineke.
“Ya mere, n’emume nsọ niile dị na ya, ike ahụ nke ndụ iyi Chineke na-apụta ìhè.
“Ma ọ bụghị site na emume nsọ ndị dị na ya, na ikike nke ọkwa nchụaja, ike nke ndụ iyi Chineke agaghị apụta ìhè nye ụmụ mmadụ n’anụ ahụ” (Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 84:19–21).
Emume nsọ niile, nʻezie, bụ mmemme niile ma ọ bụ oriri nsọ niile eji ọkwa nchụaja na-enye nke anyị na Chineke na-agba ndụ, bido na baptizim ma na-aganiihu na ọgbụgba ndụ niile anatara niime ụlọ nke Onyenwe anyị. Ọ bụ site na-idebe ọgbụgba ndụ ndị a ka a na-esi enwogharị anyị site na ndịikom na ndịinyom “eke” ghọọ ndị nsọ (lee Mozaya 3:19) site na amara aja mgbaghara mmehie nke Kraịst ma ghọọ ma ndị ziri ezi ma ndị e doro nsọ—ndị na-enweghị ụta ma ndị na-enweghị ntụpọ—nʻihu Chineke (lee Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 20:29–31; 3 Nefi 27:16-20).
Nn̄omi nke a sitere na “Mweghachite nke Uju nke Ozi ọma nke Jizọs Kraịst: Ọkwa Afọ Narị Abụọ nye Ụwa,” site nʻaka Otù Ndịisi Mbụ na Kansụl nke Ndị Ozi Iri na Abụọ, kwupụtara nchikọta dabara adaba:
“Anyị na-ama ọkwa na Nzukọ nsọ Ahụ nke Jizọs Kraịst nke Ndị nsọ Ụbọchị ikpeazụ a, ahaziri na Eprel 6, 1830, bụ Nzukọ nsọ Agba Ọhụrụ nke Kraịst eweghachitere. Nzukọ nsọ a dabeere na ndụ zuru oke nke isi nkùnkù ya, bụ Jizọs Kraịst, na Aja mgbaghara mmehie Ya na-enweghị nsọtụ na Mbilite n’ọnwụ Ya mere eme. Jizọs Kraịst ọzọkwa akpọwo Ndịozi ma nyewo ha ikikere nke ọkwa nchụaja. Ọ na-akpọku anyị niile ịbịakwute Ya na Nzukọ nsọ Ya, ịnata Mmụọ Nsọ, emume nsọ nke nzọpụta, na inwete ọńụ na adịgide.”
© 2025 site n’aka Intellectual Reserve, Inc. Ikike niile edokwara. Ebipụtara na USA. Nkwado n’asụsụ Bekee: 6/19. Nkwado ntụgharị asụsụ: 6/19. Ntụgharị asụsụ nke Ozi Liahona Kwa Ọnwa, Septemba 2025.. Igbo. 19604 593