2025
Eziokwu nke Ndụ Anyị Niile
Ọgọst 2025


”Eziokwu nke Ndụ Anyị Niile,” Liahona, Ọgọ. 2025.

Ozi Liahona Kwa Ọnwa, Ọgọst 2025

Eziokwu nke Ndụ Anyị Niile

Nna anyị nke Eluigwe ekpughewo eziokwu niile metụtara oge anyị gara aga, nke ugbu a na nke ọdịniihu, gụnyekwara otu esi anata onyinye ahụ kachasị ibe ya.

N.K. Whitney & Co. store

Niime ọnụ ụlọ ahụ ngwongwo juru nke dị n’ụlọ elu ahụ ebe Newel K. Whitney na-azụ ahịa n’obodo Kirtland, Ohio n’ọnwa Jenụwarị 22, 1833, ndị okenye nke Nzukọ nsọ gbakọtara ha na Onye amụma Josef Smit. N’ọnwa Dizemba nke afọ gara aga, Josef natara mkpughe nke tuziri ya aka ihiwe ụlọ akwụkwọ nke ebumnuche ya bụ ịkwadọ ndị ụmụnne nwoke maka mishọn.

“Ma enyewom unu iwu-nsọ,” ka Onyenwe anyị kwuru, “na unu ga-akuzi otu onye nye ibe ya ozizi ahụ nke alaeze.

“Jiri nụ ịrụsi ọrụ ike kuzie ihe ma amara nke m ga-anọnyere unu, ka e wee kuziere unu n’ụzọ zuru oke karịa n’atụtụ, n’ụkpụrụ, n’ozizi, n’iwu nke ozi-ọma, n’ihe nile nke metụtara ala-eze nke Chineke, nke dị mkpa maka unu ịghọta; …

“Ka unu wee nwee ike nọrọ na njikere n’ihe niile mgbe m ga-ezipu unu ọzọ imejupụta ọkpụkpọ-oku nke m kpọworo unu, na mgbasa ozi nke m nyeworo unu ikike ime” (Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 88:77–78, 80).

“Ụlọakwụkwọ nke Ndị Amụma” nke a dị ka akpọrọ ya, rọpụtara mwụkwasa nke ime mmụọ dị ịtụnaanya. Ọtụtụ ndị ndu Nzukọ nsọ nke mbido ahụ ka akuziiri ihe n’ebe ahụ. Taa ụwa bụ nnọọ ebe dị ezigbo iche, mana odudu nke Onyenwe anyị nyere mgbe ahụ ka dịkwa mkpa ruo taa. Anyịnwa kwa, ga-achọrịrị ọmụma ihe na eziokwu “nke ihe niile dị ka ha dị, na dị ka ha dịịrị, na dị ka ha ga-adị n’oge na-abịa abịa ” (Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 93:24).

nwanyị na-atule n’uche akwụkwọ ọ na-agụ

Ọchụchọ Anyị maka Eziokwu

N’oge nke a anyị bi nime ya, ọmụma ihe karịrị akarị dị adị nye anyị karịa otu ọ dị mbụ. N’oge gara aga, ọ bụrụ na ị chọrọ ịmata otu ihe, ị ga aga na ọba akwụkwọ ma chọta ya. Taa intanetị na ngwaọrụ eji n’aka na-arọpụta ohere ịnwete ozi agwụghị agwụ ndị anyị nwere ike ịchọta ozugbo ozugbo.

Ọ na-amasị Onyenwe anyị mgbe e jiri akụrụngwa niile dịịrị anyị rụọ ọrụ dị mma, mana O nyewo ndụmọdụ nke a uru ya na-adịgide: “Jiri nụ irụsi ọrụ ike chọọ na kuziere otu onye nye ibe ya okwu niile nke amamihe, e chọọ nụ site n’akwụkwọ niile kachasị mma okwu niile nke amamihe, chọọ mmụta ọbụna site n’ịmụ ihe nakwa site na okwukwe” (Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 88:118). Ọ na-agba anyị ume ka anyị mụta banyere ụwa gbara anyị gburugburu (lee Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 88:79; 93:53), mana n’oge ahụ anyị na-achọ eziokwu, anyị kwesịrịrị ịlekwasị anya na Chineke, onye “ghọtara ihe niile, ma ihe niile nọ n’ihu ya, … ma ọ karịrị ihe niile, ma n’ime ihe niile, … ma ihe nile bụ site na ya, ma nke ya” (Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 88:41).

Niime eziokwu niile nke Chineke nyeworo anyị, otu niime ntọala kachasị mkpa maka ndụ anyị n’elu ụwa bụ na Ọ bụ Nna anyị nke Eluigwe. Anyị bụ ụmụ Ya ndị nwoke na nwanyị nke mmụọ. Ọ mazuru ma hụ anyị naanya n’ụzọ zuru okè. Ma dịka ụmụ Ya nke mmụọ, anyị niile nwere eke na akaraka si na chi. Ịghọta na ịnabata eziokwu ebighị ebi ndịa na-enye anyị ejirimara, ugwu na ebumnuche nke gọziri ma duzie anyị n’oge ndụ anyi tupu nke ụwa ma ọ ga aga niihu mee otu a ugbu a ma ebighị ebi.

ndị na-agafe site na akwa mgbochi

Anyị Nọnyeburu Nna site na Mmalite

Dịka anyị na-achọ eziokwu niile dị nime ihe niile “dịka ha dịịrị,” anyị na-achọpụta okwu niile ndịa sitere n’ọnụ Onye Nzọpụta anyị, Jizọs Kraịst: “Ma ugbu a, n’ezie a sị m unu, a nọ m na mmalite mụ na Nna, ma a bụ m Onye e Buru Ụzọ mụọ,” ma “unu nọ kwarịị na mmalite unu na Nna” (Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 93:21, 23).

Tupu ndụ anyị n’ụwa, anyị gara otu kansụl n’eluigwe ebe Nna anyị nke Eluigwe wepụtara nnukwu atụmatụ an̄ụrị nke Ya. Onye amụma Josef Smit kuziiri na ebumnuche Chineke nwere maka atụmatụ Ya bụ ịnye anyị “ohere iji gaa niihu ka ya [ma] … nata mbuli elu dị ka ya.” Ọrụ na otuto nke Chineke bụ “iwete na mmezu anwụghị anwụ na ndụ ebighị ebi nke mmadụ” (Mozis1:39).

Anyị tinyere ohere nhọrọ anyị n’ọrụ ma họrọ isoro atụmatụ nke Nna nke Eluigwe. Agọziwo anyị na amụrụ anyị n’ụwa nke a, ebe anyị ga aga niihu na-enwe ohere nhọrọ ma nwete nhụmihe ndụ ịnwụ anwụ, mụta ihe, ma gaa niihu rute ndụ ebighị ebi.

N’oge oge ndụ anụ ahụ anyị, anyị ga-ezuterịrị ọtụtụ ịma aka na ndọla azụ. Mana okwesịghị ka anyị zute mkpagbu nke ndụ naanị anyị. Josef Smit kuziri na Nna nke Eluigwe, “Nnukwu Nna nke eluigwe niile[,] na-elekwasị ezinaụlo ụmụ mmadụ niile anya jiri obi nlekọta nke onye nna.”

Nna anyị nke Eluigwe “Nna nke obi ebere, nakwa Chineke nke nkasị obi niile,” ga agọzi anyị, bulie ma kasịe anyị obi “niime nsogbu anyị niile, ka anyị site nʻụzọ dị otu a nwee ike ịkasị ndị ọzọ niile nọ na nsogbu dị iche iche obi, inyere ha aka dị ka anyị onwe anyị sị nata inyeaka site nʻaka Chineke.” (2 Ndị Kọrịnt 1:3–4). Dịka otu akụkụ dị mkpa nke atụmatụ Ya, Nna nke Eluigwe arọpụtawo ụzọ maka ịlaghachikwutere Ya.

Ubi nke Getsemane, Izrel

Ụzọ iji rute Nna anyị

Eziokwu nke “maka ihe nile dịka ha dị n’ezie” (Jekọb 4:13) doro anya: anyị enweghi ike erute akara aka anyị n’uju dịka ụmụ nke Nna anyị nke Eluigwe n’onwe anyị. Jizọs Kraịst, Nwa mbụ nke Nna niime mmụọ, gbara ndụ ịbụ Onye Nzọpụta na Onye Mgbapụta anyị.

Jizọs Kraịst, “Onye Nna Mụrụ Nanị Ya, jupụtara n’amara ma n’eziokwu, … bịara ma biri n’anụ arụ, ma biri n’etiti anyị” (Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 93:11). Ọ bịara igosi anyị ụzọ esi achọta an̄ụrị, nkọwa, na ọn̄ụ niime ndụ nke a na mgbe ebighị ebi.

“N’ihi na Chineke hụrụ ụwa n’anya nke ukwuu nke na o nyere Ọkpara ọ mụrụ naanị ya, ka e wee ghara ibibi onye ọ bụla nke nwere okwukwe na ya, kama ka o nwee ndụ ebighị ebi.”

“Maka Chineke ezitaghị Ọkpara ya nime ụwa ka ọma ụwa ikpe; kama na site na ya ụwa ga-enwe nzọpụta.” (Jọn 3:16–17).

Nhụmiihe Onye Nzọpụta nwere n’ụwa dị mkpa. Ọ “nataghi n’uju ya na mbụ, mana ọ nọgidere site n’amara ruo n’amara” (Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 93:12). O tolitere tutu mgbe “ọ natara uju nke ebube nke Nna ahụ; ma “ike nile, ma n’elu igwe ma n’ụwa, ma ebube ahụ nke Nna nọnyere ya, n’ihi na ọ nọ kwa n’ime ya” (Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 93:16–17). Onye Nzọpụta kuziri:

“E nye m unu okwu ndia nile ka unu wee nwee ike ghọta ma mata otu kwesịrị iji fee-ofufe, ma mata ihe ị na-efe ofufe, ka i nwee ike ịbịakwute Nna n’aha m, ma n’ozuzu oge nke m nata uju nke ya.

“N’ihi na ọ bụrụ na unu edebe iwu-nsọ m nile unu ga-anata uju nke ya, ma nata otuto n’ime m dịka m n’ime Nna; ya mere, a sị m unu, unu ga-anata amara n’ihi amara. (Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 93:19–20).

Na Ubi nke Getsemane ma n’elu obe ahụ, Jizọs Kraịst wekwasịrị n’onwe Ya njọ niile nke ụwa ma taa ahụhụ iri uju niile na “mgbu niile na mkpagbu niile na ọnwụnwa niile n’ụdị ọbụla” (Alma7:11). Nke a “mere ka [Ya], … onye kachasị elu, ịma jijiji n’ihi mgbu, na ịgba ọbara site na ntakịrị oghere ọbụla.” (Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 19:18.). Naanị site na Jịzọs Kraịst na Aja mgbaghara mmehie na Mbilite n’ọnwụ Ya ka nzọpụta na mbuli elu ga esi ekwe omume.

Site na amara na aja mmehie nke Onye Nzọpụta, anyị ga enwe ike tolite tutu anyị anata uju ahụ ma enwee ike otu ụbọchị mee ka anyị zuo okè. Ọ bụrụ na anyị soro ọmụmatụ nke Onye Nzọpụta ma rubere iwu nsọ Ya isi, Ọ ga-eduru ma duo anyị n’ụzo nlaghachi ịbịakwute n’ebe ọnụnọ dị ebube nke Nna anyị nke Eluigwe.

nteji banyere Kraịst na-eje ije n’ụzọ ruo na Jerusalem

Kraịst N’ụzọ ahụ Eji eje Jerusalem, site n’aka Michael Coleman, nke e nwere ike agaghị akọpị akọpị

Ị ga Anara OnyinyeYa?

Niime eziokwu niile “maka ihe nile dị ka ha dị n’ezie” (Jekọb 4:13), anyị na-amụta na nhụmihe anyị nke ebighị ebi ka a ga-emezu site na nhọrọ anyị isoro Jizọs Kraịst ma nata onyinye niile nke Ọ na-enye. Akwụkwọ nsọ na-akuzi na anyị ga “an̄ụrị ọn̄ụ maka nke ahụ [anyị] dị na njikere ị nata.” Ọ dị obi mwute na ụfọdụ “enweghi mmasị n’inwe ọn̄ụ n’ime nke ha kwesịrị ịnata” (Ozizi na Ọgbụgba ndụ nile 88:32).

Onyeisi mishọn m, Okenye Marion D. Hanks (1921–2011), onye jere ozi dịka Onye Ji Ikike Zuru ọha, kuziri ndị mgbasa ozi ya na ịrịọ arịrịọ maka ihe ahụ anyị nwere mmasị ịnata ma nwee ọn̄ụ na ya bụ ụzọ anyị nwere ike iji mata ebe anyị nọ niime njem nke ime mmụọ anyị. “N’ihi na uru gịnị ka ọ baara mmadụ ọbụrụ na e nyere ya onyinye, ma o nataghị onyinye ahụ?” Dịka anyị na a nata onyinye niile nke Onye Nzọpụta site na iji obi niile chọo ma soro Ya, anyị ga an̄ụrị ọn̄ụ niime olile anya nke ndụ ebighị ebi ma “n’ime ya bụ onye ahụ nke bụ onye na-enye onyinye ahụ.” (Ozizi na Ọgbụgba-ndụ niile 88:33). Onyinye nke a enyere jiri ịhụnaanya bụ “nke kachasị ukwuu n’onyinye nile nke Chineke.” (Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 14:7).

Chineke bụ Nna anyị nke Eluigwe. Ọ maara ma hụkwa anyị naanya. Dịka anyị na-echigharị n’ebe Ọ nọ n’oge ọchụchọ anyị maka eziokwu, anyị nwere ike rapara na akọnuuche, nata amamihe, makuo eziokwu, hụ ezi omume naanya, ma rapara na ihè ahụ na-esi na Ya abịa (lee Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 88:40). Mgbe ahụ anyị ga aga niihu ogologo ndụ anyị niile tutu “ụbọchị ahụ ga-abịa mgbe [anyị] ga-aghọta ọbụna Chineke, ebe a ga-akpọlite [anyị] n’ime ya ma site na ya” (Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 88:49).

Nke ahụ ga-abụ ụbọchị dị ebube na nke ọn̄ụ.

Hụba ama

  1. Nkuzi niile nke Ndịisi Nzukọ nsọ: Joseph Smith (2011), 210, Ọba akwụkwọ Ozi ọma.

  2. Nkuzi niile: Josef Smit, 39.