2025
Ndụ Nke a Gasịa: Azịza niile nye Ụfọdụ Ajụjụ
Julaị 2025


Ozi Maka Ume nke Ndị Ntoroọbịa Kwa Ọnwa, Julaị 2025

Ndụ Nke a Gasịa

Azịza nye Ụfọdụ Ajụjụ

Atụmatụ nke Nna nke Eluigwe nwere ike inye anyị nhụnuuche na udo gbasara ndụ ma anwụsịa.

ubube nọ na urukpuru

Ngosipụta sitere n’aka Thomas Arnaud

Gịnị na-eme mgbe anyị nwụsịrị?

Nke a bụ ikekwe ajụjụ ahụ dị niime okpukperechi niile. Azịza ndị anyị na-enwe site na Jizọs Kraịst na ozi ọma Ya dị ike. Ndụ nke a abụghị nsọtụ. Niihi na Jizọs Kraịst bilitere nʻọnwụ, mmụọ anyị na ahụ anyị ga-ejikọtakwa ọnụ, ma anyị niile ga-ebilitekwa nʻọnwụ otu ụbọchị.

Ee, enwere uju ndị ọzọ gbasara ndụ mgbe ọnwụ gasịrị nke anyị na-enwetawo site na mkpughe nke oge ugbua nke nwere ike ịza ajụjụ ndị ọzọ anyị nwere ike inwe. Nke a bụ ụdị ajụjụ ole ma ole dị ka nke ahụ, ya na nke nke azịza ụfọdụ.

Kedụ otu ahụ ndị nke mmụọ dị ka ya?

Mmụọ bụ ihe dị ka umi, naanị na “ọkacha dị mma ma ọ bụ kacha dị ọcha” (Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 131:7). Ahụ ndị nke mmụọ dị ka ahụ nke ndị dimkpa mmadụ.

Ebee ka ala mmụọ dị?

Ebe a, na gburugburu anyị niile.

Gịnị na-eme niime ala mmụọ?

Niime ihe ndị ọzọ, mmụọ ndị nabatara ozi ọma ka ahaziri ikwusa ozi ọma nye mmụọ ndị nke na-anabatabeghị ozi ọma. Mmụọ ndị ahụ nwere ike họrọ ịnabata ma ọ bụ jụ ya.

Kedụ otu ahụ ndị bilitere nʻọnwụ dị ka ya?

Ahụ ndị bilitere nʻọnwụ enweghị ike ịnwụ anwụ, bụ anụ ahụ na ọkpụkpụ, ma zuchara oke. Ha dị ebube ma maa mma. “Enweghị ihe ọbụla ọzọ kacha maa mma ile anya karịa nwoke ma ọ bụ nwanyị si nʻọnwụ bilie.”

Gịnị na-eme niime ala Alaeze Selestịal?

Ndị nọ nʻogo alaeze seletịal kachasị elu na-abịa dị ka Nna anyị nke Eluigwe ma nwete nhụmiihe nke ọn̄ụ nʻuju. Ha na-anata ihe niile nke Nna nwere. Ha na-esonye nʻọrụ na ebube Ya. A rachiri ha nʻalụmdi maka ebighị ebi ma ugbua na-ebi na ezi na ụlọ dị ebighị ebi, na-enwe ụmụ nke mmụọ dị ebighị ebi nke onwe ha.

Kedụ maka ndị na-enweghị mgbe ha mere ọlụlụ niime ndụ nke a?

Nna nke Eluigwe bụ onye ikpe ziri ezi nʻụzó zuru oke ma dị obi ebere. “Onyenwe anyị ekwewo nkwa na nʻebighị ebi niile enweghị ngọzi ga-akwa ụmụ ya ndị nwoke na ndị nwanyị na-edebe iwu nsọ niile, ma guzosie ike na ọgbụgba ndụ ha, ma chọọ ihe ziri ezi.”

Nne na nna m ka arachiri niime tempụl, mana ugbua ha agbaala alụkwaghịm. Onye ka arachiri m na ya?

Enwere ike a “mụwo gị nʻọgbụgba ndụ” (ya bụ, a mụrụ gị mgbe arachisịrị nne na nna gị niime tempụl), ma ọ bụ arachiwo gị rịị nye nne na nna gị niime tempụl mgbe ha mesịrị nrachi nye onye na ibe ya. Nʻụzọ ọbụla ọ bụ, ngọzi gị niile ga-anọgide nʻọrụ ọbụnadị na ndị nne na nna gị họọrọ ịgba alukwaghịm ma kagbuo nrachi ha.

Nhọrọ niile nke ndị nne na nna gị anaghị egbochi ngọzi gị niile. Ihe dị mkpa bụ gị ịnọgide kwesị ntụkwasị obi ma chọọ ngọzi niile nke tempụl nʻonwe gị. Gbasara nke ndị ezi na ụlọ gị, ị ga-atụkwasị obi nʻOnyenwe anyị ma chọọ nkasi obi Ya,” mara na “Nna nke Eluigwe ga-ahụ na onye ọbụla natara ngọzi niile nke ya bụ nwoke ma ọ bụ nwanyị chọrọ na ndị nhọrọ nabatara.”

Gịnị ga-eme ndị nke nwụrụ site na-igbu onwe ha?

Anyị amaghị ihe mere ndị nke nwụrụ site na-igbu onwe ha, ma anyị enweghị ike ikpe ha ikpe (dị ka ọ dịirị mmadụ niile, nʻikpeazụ). “Na-agbanyeghị mbọ kachasị mma nke ndị anyị hụrụnaanya, ndị ndu, na ndị ọkachamara, mmadụ igbu onwe ya abụchaghị ihe nwere mgbochi mgbe niile. …

“O zighị ezi mmadụ iwepụ ndụ nke onwe ya. Kosiladị, naanị Chineke nwere ikike ikpe ikpe nye echiche niile, omume niile, na ogo nke inye nkọwapụta nke mmadụ (lee 1 Samuel 16:7; Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 137:9). …

“Ndị ahụ nke onye ha hụrụ naanya nwụworo site na igbu onwe ya nwere ike inweta olileanya na ọgwụgwọ niime Jizọs Kraịst na Aja mgbaghara mmehie Ya.”

Hụba ama

  1. Lee Ita 3:16; Nkuzị niile nke Ndịisi Nzukọ Nsọ: Josef F. Smith (1998), 131–132.

  2. Lee Nkuzi niile nke Ndịisi Nzukọ nsọ: Brigham Young (1997), 279.

  3. Lee Ozizi na Ogbụgba ndụ nile 138.

  4. Lee Alma 11:45.

  5. Lee Luk 24:39.

  6. Lee Alma 11:43.

  7. Lorenzo Snow, Nkuzi niile nke Lorenzo Snow, ed. Clyde J. Williams (1996), 99.

  8. Lee Mozis 1:39

  9. Lee Abụọma 16:11; 3 Nefi 28:10; Ozizi na Ogbụgba ndụ nile 76:59, 62; 130:2; 132:19–23.

  10. Dallin H. Oaks, Ọkt. 1993 ọgbakọ zuru ọha (Ensign, Nov. 1993, 75).

  11. Lee Akwụkwọ Ntụzi aka Izugbe: Ije ozi na Nzukọ nsọ Ahụ nke Jizọs Kraịst nke Ndị nsọ Ụbọchi ikpeazu a, 38.4.2.8 , Ọba akwụkwọ Ozi ọma.

  12. Akwụkwọ Ntuziaka Izugbe, 38.4.2, Ọba akwụkwọ Ozi ọma.

  13. Akwụkwọ Ntụziaka Izugbe, 38.6.20 , Ọba akwụkwọ Ozi ọma.