2025
Chọta Ọn̄ụ na Njem Ozi ọma Gị
Julaị 2025


“Chọta Ọn̄ụ na Njem Ozi ọma Gị,” Liahona, Julaị 2025.

Ozi Liahona Kwa ọnwa, Julaị 2025

Chọta Ọn̄ụ na Njem Ozi ọma Gị

Nʻikpeazụ, mpụtara nke igosị ịhụnaanya anyị maka Onyenwe anyị site na-idobe iwu nsọ Ya niile bụ ngọzi niile na-eweta an̄ụrị na ọn̄ụ.

ndị otù Nzukọ nsọ na-amụmụ ọnụ ọchị na Thaịland

Foto nke ndị otu Nzukọ nsọ ọn̄ụ juru obi nọ na Thailand site n’aka Christina Smith

Ebe m naara eje ozi dị ka onye ndu mishọn na Japan ụfọdụ afọ gara aga, a gara m ọgbakọ ngwụcha izu ụka nʻotu obodo ukwu dị niime ime obodo nʻotu mpaghara dị anya nke mishọn anyị. Onyeisi distrikt ahaziwo maka mụ ịgba otu nwoke sonyere Nzukọ nsọ otu afọ gara aga ajụjụ ọnụ ma na-achọ ịnata tempụl rekọmendị. Ọ tụrụanya ịnata onyinye dị nsọ nke onwe ya na ma ọ bụ ka mmemme otu afọ baptizim ya na-erute.

Nʻoge mkparịta ụka anyị, onye otù ọhụrụ a kọwara ka ekele si ju ya obi maka ngọzi niile bara ụbara ọ nataworo nʻafọ ahụ kemgbe o mere baptizim. Ọ na-enwe an̄ụrị ịdị na-aga nzukọ oriri nsọ kwa izuụka na nzukọ niile ndị ọzọ. Ọ bịara tinye onwe ya nʻụzọ dị omimi niihe omume niile nke ngalaba nta ya. Ebe m nọ, o gosịpụtara obisiike ọgbụgba ndụ na-apụta site na nghọta ebum nʻobi ozi ọma ya, nke bụ ugbua isi akụkụ ndụ ya. Ọ bụ onye na-eso ụzọ Kraịst atọghatara atọghata nke nwetaworo mgbanwe nke obi dị ike (lee Mozaya 5:2).

Mkparịta ụka anyị fọdụrụ sooro nsoro nwere olileanya. Anyị kparịtara ụka emume nsọ niile na ọgbụgba ndụ niile nke ga-abụ akụkụ nke nhụmiihe tempụl ya. Ọ zara ee nye ajụjụ niile nke ọbụla a na-ajụkarị ndị metụtara ịnata rekọmend tempụl.

Site na-ajụjụ ọnụ ahụ, e chetara m ịgwa onyeisi distrikt ụdị obi ụtọ m nwere izute nwoke gbapụtaraihe otu ahụ. A gwara m ya otu o si masị m na ndị mgbasa ozi ọma na ndị otù achọtawo, ma nye ọzụzụ ime mmụọ, udị nwoke nke a nwere ugwu ma nwe uru ọ bara.

O riri m ọnụ mgbe onyeisi distrit ahụ kọwara na mgbe nwoke a malitere ịnata ihe ọmụmụ niile site nʻaka ndị mgbasa ozi ọma ma na-abịa nzukọ nsọ kemgbe otu afọ gara aga, ọ bụụrụ onye na-enweghị ebe obibi ma nọ nʻọnọdụ oke ihe isi ike—ruwere ọnọdụ—a na-amaghị ka esi eme ya. Onyeisi distrit mesịrị kọwaa otu ọmụmụ ozi ọma na ntọghata nke nwanne nwoke nke a siri ruo na mgbanwe ya dị ebube ka ọnwa ole ma ole gasịrị, tinye ya nʻụzọ nke ndabere onwe ma nʻihe nke ime mmụọ ma ihe nke anụ ahụ ma na-enye ya uche nke ebumnuuche na ọn̄ụ.

Ozi ọma ahụ nyere ya onyonyoo were anya nke ebumnuuche nke ndụ ya. Eziokwu niile nke ozi ọma doro anya ma dị oke ọnụ ahịa wetara azịza nye ajụjụ niile dị mkpa banyere ndụ anụ ahụ, malite na mmata ihe na “Chineke bụ Nna anyị nke Eluigwe, ma anyị bụ ụmụ Ya. … Chineke maara anyị nʻonwe anyị ma hụ anyị naanya.” Nʻatụmatụ Ya, “Nna nke Eluigwe … enyewo ọtụtụ onyinye na nduzi niile iji nyere anyị aka ịlọghachi n’ihu Ya.”

Ụdịrị ngọzi ahụ ka nwoke a nwere, nke dịkwa adị nye ụmụ Chineke niile site nʻozi ọma nke Jizọs Kraịst.

Ebumnuuche nke Ndụ

Niihi na Jizọs Kraịst weghachitere ozi ọma Ya site nʻaka Onye amụma Joseph Smith, “anyị ghọtara ebumnuuche nke ndụ, banyere onye anyị bụ,” ka Onyeisi M. Russell Ballard (1928-2023) mara nʻọkwa. Nʻama ikpeazụ ya nye Nzukọ nsọ, Onyeisi Ballard, mgbe ahụ bụ Onye Na-arụ ọrụ dị ka Onyeisi nke Kworum ndị Ozi Iri na abụọ, kwuru:

Anyị maara onye Chineke bụ; anyị maara onye Onye Nzọpụta bụ niihi na anyị nwere Joseph, onye banyere niime ọdọ ọtụtụ osisi dị ka nwanta nwoke, na-achọ mgbaghara nke mmehie ya niile. …

“Ọ na-atụ m naanya, ma o doro m anya na ọtụtụ niime unu makwaara, n’otu esi gọzie anyị ịmara ihe anyị maara banyere ebumnuuche nke ndụ, ihe mere anyị jiri nọrọ ebe a, ihe anyị kwesịrị ịnọ na-agbalị ime ma mejuputa niime ndụ anyị kwa ụbọchi.”

Maka ndị otù nke Nzukọ nsọ Ahụ nke Jizọs Kraịst nke Ndị nsọ Ụbọchị ikpeazụ a, mmataihe ahụ gunyere inwe nghọta banyere “atụmatụ zuru oke” nke mgbapụta nke Chineke. Nke amakwa dị ka “nnukwu atụmatụ nke an̄ụrị,” “atụmatụ nke mgbapụta,” na “atụmatụ nke ebere” (Alma 42:8, 11,15), ọ “na-ewepụ ihe omimi nke ndụ na ejighị nʻaka site nʻọdịniihu anyị.” Ihe dị oke mkpa nye atụmatụ ahụ bụ “ozizi nke Kraịst,” nke bụ isi ebumnuuche nke ndụ.

Niihi na anyị nwere ozi ọma, anyị maara na anyị bụ ụmụ Chineke, ezitere nʻụwa inwe mnwale, inwe nnụcha, na akwadoro “ịkpọpụta site na mbilite nʻọnwụ nke ndị nwụrụ anwụ, site na mmeri na ebube nke Nwa Atụrụ” (Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 76:39). Anyị maara iwu nsọ niile ma enwewo ntuzi aka “nke zuru oke nke mere na anyị maara ihe dị mma site nʻihe ọjọọ” (2 Nefi 2:5). Anyị maara na anyị nọ n’ụwa inye ịhụnaanya na ije ozi. Ma anyị makwa na Onye Nzọpụta akpọwo anyị imeri ụwa na inyere ndị ọzọ aka imekwa otu ahụ (lee Jọn 16:33; Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 64:2) ime nkwadobe maka Ọbịbịa nke Ugboro Abụọ Ya.

Dị ka anyị na-elekwasị Ya anya, ihe Joseph Smith kpọrọ “ụda ozi ọma nke Onyenwe anyị Jịzọs Kraịst na-enye ọn̄ụ” ga-agba anyị ume nʻoge ụbọchị ihe isi ike niile ma weta uru na ebumnuuche nye ndụ anyị niile na ndụ niile nke ndị ọzọ.

Jizọs Kraịst

Ikpere Ọbụla Ga-egbu nʻAla, site n’aka Dan Wilson, e nwere ike agaghị akọpị akọpị

Nrube isi, Ngọzi niile, Ọn̄ụ

Chineke enyewo anyị ohere nhọrọ omume ọma nke ọ ga-abụ na anyị ga-enye nkọwapụta maka nhọrọ anyị niile (lee Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 101:78; 2 Nefi 2:16). Dị ka otu akụkụ nke ”mmegide niime ihe niile” (2 Nefi 2:11), a na-enye Setan ohere ịnwa anyị ijihie ohere nhọrọ anyị.

Mana Onyenwe anyị Jizọs Kraịst, “ebe Ọ maara ọdachi ga-adakwasị mmadụ niile bi n’ụwa” nʻụbọchị anyị, kpọrọ Onye amụma Joseph Smith, “gwa ya okwu site n’eluigwe, ma nyekwa ya iwu nsọ niile” (Ozizi na Ọgbụgbandụ niile 1:17). Nsoro ahụ nke Onyenwe anyị ga-esi kpughee iwu nsọ na uche Ya niile nye onye amụma Ya na-aganiihu nʻụbọchị anyị site na Onyeisi Russell M. Nelson—maka otu ihe ahụ kwa. Chineke na-achọ iduba anyị na an̄ụrị niime ndụ nke a na ruo na ebube nke selestịal na ndụ nke na-abịa abịa.

Nrube isi nye iwu nsọ niile nke Chineke ga-abịa site na nraranye anyị nye na ịhụnaanya maka Ya. Onyenwe anyị Jizọs Kraịst nʻOnwe Ya mara ọkwa na ịhụ Chineke naanya bụ “nke mbụ na nnukwu iwu nsọ” (lee Matiu 22:37-38). O nyekwuru nghọta mgbe Ọ mara ọkwa, “Ọ bụrụ na ị hụrụ m naanya, debe iwu nsọ m niile” (Jọn 14:15).

E nwere ụgwọ maka ịhụ Onyenwe anyị naanya na idobe iwu nsọ Ya niile. Nʻọgbọ nke a Ọ kọwara “otu iwu, na-enweghị mgbagha nʻeluigwe …, nʻelu nke ngọzi niile gbakwasịrị ụkwụ—

“Ma mgbe anyị natara ngozi ọbụla site nʻaka Chineke, ọ bụ site na nrube isi nye iwu ahụ n’elu nke ọ gbakwasịrị ụkwụ” ((Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 130:20–21).

Site otu a, mpụtara nʻikpeazụ nke igosị ịhụnaanya anyị maka Onyenwe anyị site na-idobe iwu nsọ Ya niile bụ ngọzi niile na-eweta an̄ụrị na ọn̄ụ.

Ile ndụ anya site na anya nke ozi ọma eweghachitere na mkpughe nke oge ugbua na-eme ka o doo anyị anya nke ọma. Site na nhụnuuche doro anya nke nsiri pụta sinachi na akaraka anyị, anyị maara na “ihe ndị ama ama ga-eme ka ndụ anụ ahụ [anyị] bụrụ nke kacha mma o nwere ike ị bụbụrụ otu ihe ndị ahụ nke ga-eme ka ndụ [anyị] mgbe ebighị ebi kacha mma o nwere ike bụrụ!”

Mmechi

E mechiri m ebe m malitere, na-echeta nhụmiihe m ọtụtụ afọ gara aga mụ na onye atọghatara mgbe na-adịghị anya na Japan. Site na nrụsi ọrụ ike ya na nrụsi ọrụ ike nke ndị mgbasa ozi ọma na ndị otù, ọ chọtara ozi ọma nke Jizọs Kraịst eweghachitere. Nʻịchọta ozi ọma ahụ, ọ chọpụtakwara ebumnuuche ya, nke bawanyere echiche ya. Ọ chọpụtakwara nnukwu atụmatụ nke an̄ụrị. Nrube isi nye atụmatụ nke ọgbụgba ndụ ozi ọma niile wetaara ya ngọzi niile na ọn̄ụ, na-ebuli ya niihe nke anụ ahụ na nke ime mmụọ.

Njem ya na-eduba na ị bụ onye otù na Nzukọ nsọ nke Jizọs Kraịst nyere ya ohere ịghọ onye aka ebe nke Jizọs Kraịst. Okenye Patrick Kearon nke Kworum nke Ndị ozi Iri na abụọ enyewo nkọwa banyere ọn̄ụ na-esote:

“Niihi atụmatụ dị ịhụnaanya nke Nna nke Eluigwe maka onye ọbụla niime ụmụ Ya, na niihi ndụ mgbapụta na ozi nke Onye Nzọpụta anyị, Jizọs Kraịst, anyị nwere ike—ma kwesịrị—ịbụ ndị kachasị enwe ọn̄ụ n’elu ụwa! Ọbụna dị ka ifufe niile nke ndụ dị niime ụwa na-enwekarị nsogbu na-efe anyị n’isi, anyị nwere ike zulite uche nke ọn̄ụ na-eto eto ma na-anọgide ya na udo nke ime mmụọ niihi olileanya anyị niime Kraịst na nghọta anyị banyere ọnọdụ nke onwe anyị niime ọmarịcha atụmatụ nke obi ụtọ.”

Ana m enye ekele maka, na ama banyere, ozi ọma nke Jizọs Kraịst eweghachitere, tinyekwara nnukwu atụmatụ nke obi ụtọ agbakwunyere nʻụzọ dị omimi nke ukwuu niime ya. Ana m akpọku unu isoro keta oke mkpụrụ niile nke ozi ọma na inwetakwu mmetụta ọn̄ụ niime ndụ nke a na njem unu na-eme chewe ihu na ndụ ebighị ebi.