Ozi Maka Ume nke Ndị Ntoroọbịa Kwa Ọnwa, Jun 2025
Kedụ ka m ga-esi mara na echegharịwo m nʻezie ma agbagharawo m?
Ịbịazu Oke Nʻuju, site nʻaka Jenedy Page
Onyenwe anyị ekwuwo: “ Onye ahụ nke chegharịworo site na mmehie ya niile, onye ahụkwa ka agbaghaara, ma Mụ onwe m, Onyenwe unu anaghị echetakwa ha ọzọ.
“Site na nke a unu ga-amata na ọ bụrụ na mmadụ echegharịa site na mmehia ya niile—lee ọ ga-ekwuputa ha ma jụ ha.”(Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 58:42–43).
Site na ezi nchegharị, anyị nwere ike nata mgbaghara. “Mgbe ị na-enweta nkasị obi sitere na Mmụọ, ị ga-enwe ike mata na ike mgbaghara mmehie nke Onye Nzọpụta na-arụ ọrụ niime ndụ gị.” Ma ọ bụrụ na anyị dapụ ọzọ, anyị nwekwara ike ichegharị ọzọ, nweta mgbaghara, ma nọgide na-agbalị.
Na mgbakwunye, Okenye Dieter F. Uchtdorf nke Kworum ndi Ozi Iri na abụọ akụziwo: “Setan ga-agbalị ime ka anyị kwere na a dịghị agbaghara anyị mmehie anyị niihi na anyị nwere ike icheta ha .” Setan bụ onye ụgha. … Chineke ekweghị nkwa na anyị agaghị echeta mmehie anyị. Icheta ga-enyere anyị aka izere imekwa otu ụdị mmehie ndị ahụ ọzọ. Ma ọ bụrụ na anyị anọgide na-eziokwu ma kwesị ntụkwasị obi, a ga-eme ka ncheta nke mmehie anyị niile dị nro nʻọdịniihu.”
© 2025 site n’aka Intellectual Reserve, Inc. Ikike niile ka edokwara. Ebipụtara na USA. Nkwado n’asụsụ Bekee: 6/19. Nkwado ntụgharị asụsụ: 6/19. Ntụgharị asụsụ nke Ozi Maka Ume nke Ndị Ntoroọbịa Kwa Ọnwa, Jun 2025. Igbo. 19629 593