2025
Anyị Na-eso Jizọs Kraịst site na Isonye Ya nʻỌrụ Ya
Jun 2025


“Anyị Na-eso Jizọs Kraịst site na Isonye Ya nʻỌrụ Ya,” Liahona, Jun 2025.

Ozi Liahona Kwa Ọnwa, Jun 2025

Anyị Na-eso Jizọs Kraịst site na Isonye Ya nʻỌrụ Ya

Anyị na-esonye nʻọrụ nke Onye Nzọpụta mgbe anyị na-elekwasị anya nʻebumnobi Ya niile, dobe iwu nsọ Ya niile, ma hụrịta ibe anyị nʻanya.

Kraịst na Onye Ọchịchị Nta Bara Ọgaranya

Nkọwa nʻuju sitere na Kraịst na Onye Ọchịchị Nta Bara Ọgaranya, site n’aka Heinrich Hofmann

Mgbe emere anyị baptizim, anyị na-amalite usoro ahụ nke iwekwasị onwe anyị aha nke Jizọs Kraịst. Akụkụ nke usoro a na-egosi na anyị sonyere Onye Nzọpụta n’ọrụ Ya. Onyeisi Dallin H. Oaks, Onye Ndụmọdụ nke Mbụ na Otù Ndịisi Mbụ, dere, “Otu niime ihe ndị kachasị pụta ihè banyere iwekwasị onwe anyị aha nke Kraịst [bụ] ịdị na njikere na nkwa iwekwasị onwe anyị ọrụ nke Onye Nzọpụta na alaeze Ya.”

Ọrụ nke Onye Nzọpụta bụ “iwete na mmezu anwụghị anwụ na ndụ ebighị ebi nke mmadụ” (Mozis 1:39). Anwụghị anwụ bụ onyinye na-enweghị atụ nke Jizọs Kraịst buworịị ụzọ nye site na Mbilite nʻọnwụ Ya. Ndụ ebighị ebi, ka o sila dị, abụghị otu ihe dị ka anwụghị anwụ. Ndụ ebighị ebi bụ onyinye kachasị Chineke nwere ike inye mmadụ (lee Ozizi na Ogbụgba ndụ niile 14:7). Ọ bụ ibi ndụ ruo ebighị ebi dị ka ndị ezi na ụlọ nʻihu Ya. Maka anyị ịnata ndụ ebighị ebi, anyị ga-abụrịrị ndị na-eso ụzọ Jizọs Kraịst kwesịrị ntụkwasị obi. Nke a pụtara anyị na-anata ozi ọma ahụ eweghachitere site na-inwe okwukwe niime Onye Nzọpụta na Aja mgbaghara mmehie Ya, na-echegharị, eme baptizim, ịnata onyinye nke Mmụọ Nsọ, ime na idobe ọgbụgba ndụ niile nke tempụl na ịnagide ruo ọgwụgwụ. Ịnagide ruo ọgwụgwụ gụnyere isonye Onye Nzọpụta n’ọrụ Ya.

Isonyesị Ike Nʻọrụ

Anyị na-esonye nʻọrụ nke Onye Nzọpụta mgbe anyị na-enyere ụmụ Chineke aka ịbụkwa ndị na-eso ụzọ Jizọs Kraịst kwesịrị ntụkwasị obi. Nke a gụnyere ikwusa ozi ọma Ya, si otu ahụ na-achịkọta Izrel gbasasịrị agbasa, site na-imezu oke na ọrụ ndị dị niime Nzukọ nsọ nke Onye Nzọpụta na site na-ịgbalị ịdị ka Ya. “Ihe ịga nke ọma anyị [nʻọrụ Ya] adabereghị nʻotu ndị ọzọ si họrọ ịzaghachi [anyị], nʻọkpụkpọ oku [anyị] niile, ma ọ bụ omume ndị na-egosị obi ọma [anyị] sitere nʻobi.” Onyeisi Russell M. Nelson kwusiri ike na, “Oge ọbụla i mere ihe ọbụla nke nyeere onye ọbụla aka—nʻakụkụ abụọ nke akwa mgbochi—zọpụ otu nzọm ụkwụ ruo na-ime ọgbụgba ndụ ha na Chineke ma ha ịnata emume nsọ niile dị oke mkpa nke baptizim na tempụl, ị na-enye aka ịkpokọta Izrel.”

Ime ka ọrụ nke Onye Nzọpụta bụrụ ọrụ anyị, anyị na-elekwasị anya nʻebumnobi Ya niile, dobe iwu nsọ Ya niile, ma hụrịta ibe anyị nʻanya. Ka anyị na-arụ ọrụ Ya nʻụzọ Ya (lee Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 51:2), enwere ihe ụfọdụ anyị kwesịrị ichepụta nʻonwe anyị. Onye Nzọpụta gwara Ndị nsọ ndị gbakọtara na Jackson County, Missouri:

“N’ihi na lee, ọ dịghị mma na m ga na-enye iwu n’ihe niile; n’ihi na onye ahụ nke a na-amanye n’ihe niile, onye ahụkwa bụ onye ume ngwụ ma ọbụghị nwa odibo maara ihe; ya mere ọ naghị anata ụgwọ ọrụ.

“N’ezie a sị m, ụmụ mmadụ kwesịrị ịnọ n’oke agụụ n’ịchụso ihe ọma, ma mee ọtụtụ ihe site n’ọchịchọ nke onwe ha, ma na-eweta na mmezu nnukwu ezi omume.

“N’ihi na ike ahụ dị niime ha, niime nke ha bụ ndị-nnọchite anya nye onwe ha. Ma ọ bụrụ raa na ụmụ mmadụ na-eme ihe ọma ha agaghị etufu ụgwọ ọrụ ha ma ọlị” (Ozizi na Ọgbụgba ndụ 58:26–28).

Ka anyị na-eso Onye Nzọpụta, sonye Ya nʻọrụ Ya, ma nyere ndị ọzọ aka ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ Ya kwesịrị ntụkwasị obi, anyị na-akuzi ihe Ọ gaara-akuzi. Nʻihi na e nyeghị anyị ikike ikuzi ihe ọ bụla ọzọ (lee Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 52:9, 36), anyị na-elekwasị anya nʻozizi Ya nʻakwụsịghị akwụsị (lee Ozizi na Ogbụgba ndụ niile 68:25). Ọzọkwa, anyị na-elebara ndị ogbenye, nọ na mkpa, na ndị na-adịghị ike anya (lee Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 52:40). E mesiri okwu ndị a ike pụta ihè mgbe Onye Nzọpụta n̄omiri site nʻAịzaya nʻụlọ nzukọ dị na Nazareth.

“Mmụọ nke Onyenwe anyị nọnyeere m, niihi na o tewo m mmanụ ikuziri ndị ogbenye ozi ọma; o zitewo m ịgwọ ndị obi tiwara etiwa, ikwusa nnapụta nye ndị a dọkpụụrụ n’agha, na ime ka ndị isi hụ ụzọ, na ime ka ndị a na-echi ọnụ n’ala nwere onwe ha,

“Ikwusa afọ nke Onyenwe anyị anabatara anabata” (Luk 4:18–19; lee kwa Aịzaya 61:1–2).

Afọ nke Onyenwe anyị anabatara anabata na-arụ aka nʻoge mgbe a ga-ekpokwasị ngọzi niile nke ọgbụgba ndụ Chineke nʻisi ndị Ya. Anyị na-eso Jizọs Kraịst site na-ịkpọku ndị ọzọ ka ha nata ngọzi niile nke ime na idobe ọgbụgba ndụ ha na Chineke na site na-ilekọta ndị ogbenye ma ọ bụ ndị nọ na mkpa.

Isonye Jizọs Kraịst nʻọrụ Ya bụ ihe na-enye obi ụtọ niihi na ọrụ Ya niile, atụmatụ Ya niile, na ebumnuche Ya niile “agaghị enwe ihe ga-akwụsị ya, ọ bụghị ma ha ga-enwe ike aghọ ihe efu” (Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 3:1). Maka ndị nwere nkụda mmụọ, Onyenwe anyị nyere ndụmọdụ: “Ya mere, unu adala mba na-ime ihe ọma, n’ihi na unu na-atọ ntọala nke nnukwu ọrụ. Ma site n’ihe nta niile ka oke ihe si apụta” (Ozizi na Ọgbụgba-ndụ niile 64:33 Anyị na-ekwe ka Onyenwe anyị chegbuo onwe Ya banyere owuwe ihe ubi, ma anyị na-emekwa naanị oke anyị.

Obi na Uche dị Njikere

Ime nke gbasara anyị dị mfe karịa ka anyị nwere ike iche niihi na ọ dịghị mkpa anyị iweta akaraka ma ọ bụ ikike dị egwu nʻọrụ nke Onyenwe anyị. Ihe Ọ chọrọ bụ naanị ime mkpebi na ịdị njikere. Onyenwe anyị gwara Ndị Nsọ nọ na Kirtland, Ohio, “Lee, Onyenwe anyị na-achọ Obi na uche dị njikere” (Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 64:34) Onyenwe anyị nwere ike ime onye dị njikere enwee ike, mana O nweghi ike ma ọ bụ Ọ gaghị eme ka onye nwere ike adị njikere. Na-ikwu ya n’ụzọ ọzọ, ọ bụrụ na anyị emee mkpebi ma dị njikere, O nwere ike iji anyị mee ihe. Ma na-agbenyeghị otu anyị si nwee akaraka, Ọ gaghị eji anyị eme ihe ọ gwụla ma anyị dị uchu nʻọrụ Ya ma dị njikere inyere Ya aka.

Samuel na Anna-Maria Koivisto gosipụtara ịdị uchu na ịdị njikere. Obere oge ha mechara alụmdi, di na nwunye Koivistos hapụrụ Jyväskylä, Finland, gaa Göteborg, Sweden, ịchọ ohere dị iche iche maka ọrụ. Mgbe ha bịarutere, a kpọrọ Nwanne nwoke Koivisto ịga hụ Onyeisi Leif G. Mattsson, onye ndụmọdụ niime otù ndịisi Stek Göteborg Sweden. Niihi na Samuel anaghị asụ asụsụ Sweden, a gbara ajụjụ ọnụ ahụ nʻasụsụ Bekee.

Na-esochi nleta dị nkenke, Onyeisi Mattsson gwara Samuel ka o jee ozi dịka onye ndu mishọn ngalaba ukwu nọ niime Ngalaba ukwu Utby. Samuel kwuru ihe doro anya: “Mana A naghị m asụ asụsụ Sweden.”

Onyeisi Mattsson dabere nʻelu oche ya ma kpọm kwem jụọ, “A jụrụ m gị ma i nwere ike ịsụ asụsụ Sweden, ma ọ bụ ị dị na njikere ijere Onyenwe anyị ozi?”

Samuel zara, “Ị jụru ma m dị njikere ijere Onyenwe anyị ozi. Ma adị m.”

Samuel nabatara ọkpụkpọ oku ahụ. Anna-Maria nabatakwara ọkpụkpọ oku niile. Ha abụọ jere ozi nʻikwesị ntụkwasị obi ma mụta ịsụ asụsụ Sweden nke ọma ka a na-aga.

Ime mkpebi na ịdị njikere ijere Onyenwe anyị ozi akọwawo ndụ nke Samuel and Anna-Maria. Ha bụ ndị dike nkịtị niime Nzukọ nsọ. Ha ejiriwo ikwesị ntụkwasị obi jee ozi oge ọ bụla a kpọrọ ha. Ha akuzierelam m na mgbe anyị na-eje ozi, anyị na-eji akaraka ndị anyị nwere eme ihe (lee Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 60:13), ma mgbe ahụ Onyenwe anyị na-enyere anyị aka imezu ebumnuche Ya niile.

Mgbe anyị dị njikere ije ozi, anyị na-agbalị ka anyị ghara ime mkpesa ma ọ bụ ịtamu ntamu, niihi na anyị achọghị imebi ozi anyị nʻụzọ ọ bụla. Ime mkpesa nwere ike ịbụ ihe iriba ama nke mkpebi na-akụda mmụọ, ma ọ bụ na ịhụnaanya anyị maka Onye Nzọpụta adịghị otu o kwesịrị ịdị. Ịtamu ntamu, a na-achịkwaghị achịkwa nwere ike ịga nʻihu ruo na nnupu isi kpam kpam megide Onyenwe anyị. A na-ahụ ọganihu nke a na ndụ Ezra Booth onye nʻisi mbụ atọghatara nye Nzukọ nsọ na Ohio onye a kpọrọ dị ka onye mgbasa ozi ọma na Missouri.

Ka ọ hapụrụ Ohio na Jun 1831, Ezra were iwe na ụfọdụ ndị mgbasa ozi ọma ọzọ nwere ike iji ụgbọ ala wagọn gaa njem ebe ọ na-eje ije nʻoge okpomọkụ ọkọchị, na-ekwusa ozi ọma nʻụzọ. Ọ tamuru ntamu. Mgbe o rutere na Missouri, ike gwụrụ ya. Missouri abụghị ihe ọ tụrụ anya ya. Kama, o legharịrị anya gburugburu wee chọpụta na “ihe atụrụ anya ya adịghị ka esi chee.”

Ezra bịara na-adịwanye njọ na-ahụghị ihe dị mma nʻebe ndị ọzọ nọ, ama njakịrị, ma na-akatọ. Mgbe ọ hapụrụ Missouri, kama ikwusa ozi ọma ka ọ na-aga, dị ka a gwara ya ka o mee, ọ laghachiri nʻOhio ngwa ngwa dị ka o nwere ike. Ntamu mbụ ya dubara na-ịda mba ma nʻikpeazụ ghọọ onye na-enweghị ntụkwasị obi na nhụmiihe ime mmụọ ya nke isi mbụ. Nʻoge adịghị anya Ezra hapụrụ Nzukọ nsọ ahụ ma “nʻikpeazụ hapụ Iso Ụzọ Kraịst wee ghọọ onye na-ekweghị na Chineke.”

Otu ihe ahụkwa nwekwara ike mee anyị ma ọ bụrụ ma anyị elezighị anya. Ọ bụrụ na anyị anaghị echekwa nhụnuuche ebighị ebi, na-echetara onwe anyị onye nwe ọrụ nke a nʻezie, anyị nwere ike ime mkpesa, daa mba, ma mesịa tufuo okwukwe anyị nwere.

Ana m ekpe ekpere ka anyị nwere ike ịhọrọ iso Jizọs Kraịst site na-isonye Ya nʻọrụ Ya. Dị ka anyị na-eme, a na-enye anyị “nkwa niile dị oke egwu ma dị oke ọnụ ahịa” (2 Pita 1:4). Ngọzi ndị a gụnyere mgbaghara nke mmehie (lee Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 60:7; 61:2, 34; 62:3; 64:3), nzọpụta (lee Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 6:13; 56:2), na mbuli elu (lee Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 58:3–11; 59:23). Nʻezie, e kwere anyị nkwa onyinye kachasị ukwuu Chineke nwere ike inye—ndụ ebighị ebi.

Hụba ama

  1. Dallin H. Oaks, Aha Nsọ Ya (1998), 37.

  2. Ikpokọta Izrel pụtara ịkpọ mmadụ niile ka ha bụrụ ezi ndị kwere ekwe na Jizọs Kraịst.

  3. Kwusaa Ozi ọma M: Odudu iji Kwusaa Ozi ọma nke Jizọs Kraịst (2023), 13, Ọba akwụkwọ Ozi ọma.

  4. Russell M. Nelson, “Olileanya nke Izrel” (worldwide youth devotional, June 3, 2018), Ọba akwụkwọ Ozi ọma.

  5. Lee Matthew McBride, “Ezra Booth na Isaac Morley,” niime Mkpughe niile dị na Ọnọdụ: Akụkọ ndị dị na Nkeji niile nke Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile (2016), 130–36.