Ozi Maka Ume nke Ndị Ntoroọbịa Kwa Ọnwa, Eprel 2025
Enyemaka sitere na Jizọs Kraịst: Ihe kpatara na Kedụ Otu
Ghọta ihe kpatara Jizọs Kraịst ji bụrụ azịza na otu Ọ na-esi enyere gị aka.
Ngosipụta site n’aka Dan Wilson
“Ọ na-adị m ka na-emerikarị emeri. Ọ na-ara ahụ ịnọgide na-agba mbọ.”
“Ọnọdụ m siri ike. O doghị m anya otu m ga-esi aganiihu.”
“Ana m echegbu maka ọdịniihu. Amaghị m ma m nwere ihe ọ ga-ewe iji mee nke ọma.”
“Ike agwụla m, mana a ka nwekwara ihe ndị ọzọ ime.”
I nwere ike ịmata ihe ọ bụla metụtara nsogbu ndị a? Onyeisi Russell M. Nelson akuziwo, “Ajụjụ niile ma ọ bụ nsogbu niile ọbụla i nwere, azịza ka a na-ahụkarị niime ndụ na nkuzi niile nke Jizọs Kraịst” (“Azịza Na-abụkarị Jizọs Kraịst,” Epr. 2023 ọgbakọ zuru ọha [Liahona, Me 2023, 127]).
Ọ dị mfe ikwu, “Jizọs Kraịst bụ azịza.” Ọ na-ewetụkwu nwa obere mbọ iji ghọta ihe kpatara na otu O si bụrụ azịza.
Gịnị Mere Kraịst si bụrụ Azịza?
Mgbe Ọ nagidere aja ịkwụ ụgwọ mmehie Ya, Onye Nzọpụta mere ihe atọ dị mkpa:
-
O meriri ọnwụ, na-enye anyị ohere ibilite nʻọnwụ.
-
Ọ kwụrụ ụgwọ maka njọ anyị niile, na-eme ya ekwe omume maka anyị ichegharị, too etoo, ma laghachikwuru Chineke. Nke ahụ nakwa enyere anyị aka ịgbaghara ndị ọzọ mgbe ha mehiere, niihi na Kraịst wekwasịrị Onwe Ya mmehie ha niile.
-
Ọ nwetere nhụmiihe mgbu niile, mkpagbu niile, ọnwụnwa niile, nrịa nrịa niile na adịghị ike niile (lee Alma 7:11–13). Nke ahụ pụtara na Ọ maara kpọmkwem otu esi enye aka ma gwọọ gị ma nwere ike gbaa gị ume ịnagide mnwale niile ma gbaa mbọ ịdị mma karịa.
Họrọ nsogbu nke ọbụla, ma i nwere ike jikọọ mmeta ya na otu niime eziokwu atọ ndị ahụ ma ọ bụ karịa.
Ogbenye? Niihi na Jizọs Kraịst nwetere nhụmiihe ihe niile, Ọ maara kpọmkwem ihe ọ dị ka ya. Ọ naghị ewepụkarị ihe mkpọji ụkwụ, mana O nwere ike gbaa ndị bu ibụ arọ ume (lee Mozaya 24:15).
Ọdịda? Niihi na Kraịst meriri mmehie, ọ dịghị mkpa ka ọdịda anyị na-adịgide adịgide. Nchegharị gụnyere mmelite na ịghọkwu onye Ọ maara anyị nwere ike ịbụ.
Nrịa nrịa? Niihi na O meriri ọnwụ, anyị ga-ebilite nʻọnwụ jiri anụ ahụ zuru oke megidere nrịa nrịa na mgbu. Kraịst kwa “[wekwasịrị] onwe ya … nrịa nrịa” (Alma 7:11), na-eme Ya onye zuru oke inye nkasi obi na nkwado.
Kedụ Otu Kraịst Si Enye Aka?
Mana ọbụna mgbe anyị maara ihe kpatara Onye Nzọpụta si bụrụ azịza (niihi onye Ọ bụ na ihe O mewooro anyị), anyị ka kwesịrị ịma otu anyị si enwete enyem aka na ume site nʻaka Ya. Lee ụzọ ole ma ole:
Ekpere. Site nikpe ekpere nʻaha Jizọs Kraịst, ndị nʻezughị oke dị ka anyị nwere ike ikwu okwu ha na Chineke zuru oke. Anyị nwere ike kpee ekpere maka ume anyị na-achọ nʻọnọdụ ọbụla, ma Chineke ga-aza—ọ bụghị nʻụzọ anyị chọrọ ma ọ bụ tụọ anya mgbe niile, mana nʻụzọ nke ga-agọzi anyị. Oku nke Onye Nzọpụta dị ire: “Rịọ, ma ị ga-anata” (Jọn 16:24; 3 Nifaị 27:29; Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 4:7).
Onyinye nke Mmụọ Nsọ. Nna nke Eluigwe, Jizọs Kraịst, na Mmụọ Nsọ bụ otu na ebumnuche. Ha na-arụkọta ọrụ ọnụ! Oge ọbụla i nwetere mmetụta odudu ma ọ bụ nkasi obi site nʻaka Mmụọ Nsọ, i nwere ike ghọta nke ahụ dị ka Kraịst na-enyekwara gị aka.
Ị na-edebe Ọgbụgba ndụ. Okenye Dale G. Renlund nke Kworum nke Ndị Ozi Iri na abụọ akuziwo: “Mkpụrụ okwu ahụ ụzọ ọgbụgba ndụ na-ekwu maka usoro niile nke ọgbụgba ndụ site ebe anyị si abịakwute Kraịst ma jikọọ na Ya. Site na njiko ọgbụgba ndụ nke a, anyị nwere ohere nke ike ebighị ebi Ya” (Epr. 2023 ọgbakọ zuru ọha [Liahona, Me 2023, 36]).
Amara. Mgbe anyị nwere okwukw niime Jizọs Kraịst ma chegharịa, anyị nwere ike ịnata enyemaka na ume agbakwunyere (a na-akpọkwa amara) iji mejuputa ihe niile anyị agaraghị enwe ike ime nonwe anyị (lee Odudu ruo na Akwụkwọ nsọ, “Amara”). Ume nke a, ma ọ bụ amara, nwere ike ịbịa site nʻọtụtụ ụzọ: site naka Mmụọ Nsọ, otu enyi, onye amaghị, mmetụta. Nʻeziokwu, ihe ọbụla dị mma na-abịa site na Kraịst (lee Moronaị 7:22). Mgbe ị chọtara naanị nwa obere ndidi ọzọ, nwa obere ike ọzọ, nwa obere ume iji nagide, mata nke ahụ dị ka Kraịst na-enyere gị aka.
Cheta Ihe kpatara na Kedụ Otu
Ya mere mgbe ọzọ ị na-achọ azịza nye ajụjụ ma ọ bụ nsogbu, lekwasị Kraịst anya. Cheta na niihi mmeri Ya megide mmehie, ọnwụ, na aka mgba niile ndị ọzọ nke anụ ahụ, ọdịghị ihe na-adịghị ekwe omume. Chọọ maka otu Ọ ga-esi agọzi gị, ma ị ga-ahụ ike mmetụta Ya niime ndụ gị. Ọ hụrụ gị na anya nke ukwuu!
© 2025 site n’aka Intellectual Reserve, Inc. Ikike niile ka edokwara. Ebipụtara na USA. Nkwado n’asụsụ Bekee: 6/19. Nkwado ntụgharị asụsụ: 6/19. Ntụgharị asụsụ nke Ozi Maka Ume nke Ndị Ntoroọbịa Kwa Ọnwa, Eprel 2025. Igbo. 19625 593