“Jizọs Kraịst: Olileanya na Nkwa Ista,” Liahona, Epr. 2025.
Ozi Liahona Kwa Ọnwa, Eprel 2025
Jizọs Kraịst: Olileanya na Nkwa Ista
Site nʻolileanya na nkwa Ista, Jizọs Kraịst mejuputara ọchịchọ niile nke obi anyị ma na-aza ajụjụ niile nke mkpụrụ obi anyị.
Ngosipụta niile site nʻaka Michael Dunford
Biko wepụta oge dị jụụ na ebe nsọ nke ime mmụọ dị ka ị na-agụ ozi nke a.
Ọtụtụ mgbe, ụwa anyị na-eju na mkpọtụ, gbagwojuo anya na aghụghọ na mpako. Mana mgbe anyị dị njikere, kwụwa aka ọtọ, ma ghara igbochigide onwe anyị na Chineke, olileanya na nkwa Ista niime Jizọs Kraịst na-adị ire. Nụdị oge ndị a, anyị na-arịọ:
“Kedụ otu m ga-esi ahụ onye otu ezi na ụlọ m, enyi m, onye m hụrụ naanya ọzọ?”
“Niime ụwa nke mmekọrịta niile nke ʻA họọrọ m onweʻ na-agbakarị ọsọ ọsọ, olee ebe m ga-achọta ma nwee mmetụta udo, olileanya, na oriri mụ na Chineke (lee Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 107:19), ndị ahụ gbara m gburugburu, na onwe m?”
“E nwere onye m nwere ike ịhụ naanya—na onye ga-ahụ m naanya nʻezie? Mmekọrịta ọgbụgba ndụ o nwere ike itolite ma nọgide, ọ bụghị dị ka akụkọ ifo mana nwee njikọ siri ike karịa agbụ niile nke ọnwụ, nwe obi ụtọ nʻezie ma ruo ebighị ebi?”
“Ebe e nwere nnukwu mgbu, ntaram ahụhụ, na mmegbu, kedụ otu m ga-esi atụnye udo, nkwekọ, na nghọta niime Jizọs Kraịst na niime ozi ọma na Nzukọ nsọ Ya eweghachitere?”
Dị ka oge Ista nke a, ana m agba ama m banyere Jizọs Kraịst na banyere nkwa na olileanya Ya.
Nkwa nke Nsonye na Ebumnuuche Ọgbụgba ndụ
Chineke, Nna anyị nke Eluigwe; Jizọs Kraịst, Ọkpara Ya Ọ Hụrụ Naanya; na Mmụọ Nsọ nʻonwe ha nọ anyị nso. Ìhè, ọmịiko, na ịhụnaanya mgbapụta ebighị ebi na nke enweghị oke Ha ka akpakọtara na ebumnuuche nke okike na ndokọ nke ịdị adị anyị (lee Alma 30:44; Mozis 6:62-63).
Na Kansụl ndụ tupu ndụ anụ ahụ nʻEluigwe, “kpakpando ụtụtụ niile bụkọtara abụ ọnụ, ma ụmụ ndị nwoke na [ụmụ ndị nwanyị] nke Chineke tiri mkpu maka ọn̄ụ” (Job 38:7). Anyị họọrọ nhọrọ. Ugbu a anyị na-eje ije nʻokwukwe. Site na nhụmiihe nke onwe anyị, anyị na-achọpụta ịma mma, ido anya, ọn̄ụ, na ebumnuuche nke Chineke kwere nkwa nʻetiti ejighị nʻaka niile, ndakpọ mgbam ume niile, na ihe ịma aka niile nke ndụ anụ ahụ.
Anyị ekwesịghị ịwagharị naanị anyị niime ejighị nʻaka ndị ga-adị adị. Anyị nwere ike mekọrịta anyị na eluigwe, wulite okwukwe na nsonye niime ezi na ụlọ ma niime otu ezi na ụlọ na obodo nke Ndị nsọ, ma bụrụzie onwe anyị kachasị eziokwu, kachasị nwere onwe, kachasị ezigbo, juputara nʻọn̄ụ site na nrube isi dị njikere ma juputa nʻọn̄ụ nye iwu nsọ niile nke Chineke. Aja mgbaghara mmehie—aja-mgbaghara-mmehie—niime na site na Jizọs Kraịst na-ewete nsonye ọgbụgba ndụ nke a.
Olileanya nke Ndụ na Ozi nke Jizọs Kraịst
Ụbọchị ọbụla, olileanya na nkwa Ista gụnyere ngọzi niile na nkuzi niile Jizọs Kraịst nyere noge ije ozi ndụ anụ ahụ Ya zuru oke. Ebuụzọ chie echichi na mmalite, a mụrụ Jizọs Kraịst ịbụ Ọkpara Chineke A Mụrụ Naanị Ya (lee Jekọb 4:5; Alma 12:33–34; Mozis 5:7, 9). O tolitere na amamiihe na nʻogo, na-enwete ihu ọma na Chineke na mmadụ (lee Luk 2:52). Na-achọ naanị ime uche nke Nna Ya, Jizọs Kraịst gbaghara mmehie niile, gwọọ nrịa nrịa niile, kpọlite ndị nwụrụ anwụ, ma kasie ndị ọrịa na ndị owu na-ama obi.
Otu mgbe, mgbe o busiri ọnụ ụbọchị 40, Ọ gbara ama, “Mmụọ nke Onyenwe anyị nọnyeere m, niihi na o tewo m mmanụ ikuziri ndị ogbenye ozi ọma; o zitewo m ịgwọ ndị obi tiwara etiwa, ikwusa nnapụta nye ndị adọkpụụrụ n’agha, na ime ka onye isi hụ ụzọ, ime ka ndị a na-echi ọnụ n’ala nwere onwe ha” (Luke 4:18; lee kwa Aịzaya 61:1).
Nke a bụ onye ọbụla niime anyị.
Na Nri Anyasị Ikpeazụ, Jizọs Kraịst sara ụkwụ ndị na-eso ụzọ Ya (lee Jọn 13:4–8). Ma niime Ụwa Ochie na nke Ọhụrụ, “mmiri na-enye ndụ” na achịcha nke ndụ” Na Onwe Ya hiwere oriri nsọ. Nʻemume oriri nsọ dị nsọ, anyị na-akpọku Nna ma anyị na-agba ndụ iwekwasị onwe anyị aha nke Jizọs Kraịst, na-echeta Ya mgbe niile, ma na-edebe iwu nsọ Ya niile, ka anyị wee na-enwe Mmụọ Ya ịnọnyere anyị (lee Luk 22:19–20; 3 Nifaị 18:7, 10–11).
Niime Ubi nke Getsemane, Jizọs tara ahụhụ karịa ka mmadụ nwere ike ịta ahụhụ iji gbapụta ma kwụọ ụgwọ mmehie maka anyị. Ọbara sitere nʻoghere niile pụta. Ọ tara ahụhụ mgbu ndị a maka ndị niile, ka anyị nwee ike ghara ịta ahụhụ ọ bụrụ ma anyị chegharịa (lee Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 18:11; 19:16).
A raara ya nye ma boo ebubo ụgha, a kwara Jizọs Kraịst emo ma pịa ihe, ma ọkpueze ogwu ogwu ka ekpunyere nʻisi Ya dị umeala (lee Matiu 27:26, 29; Mak 15:15, 17, 20, 31; Luk 22:63; Jọn 19:1–2). “E chiri ọnụ nʻala maka ajọ omume anyị niile … site na akara ihe apịara ya agwọwo anyị” (Aịzaya 53:5). Ya ka “e buliri elu n’elu obe” iji dọta anyị nso na Ya (lee 3 Nifaị 27:14–1). Otu ọ dị, ọbụna nʻelu obe, Jizọs Kraịst gbaghaara (lee Luk 23:34). Ọ rịọrọ Jọn ilekọta nne Ya (lee Jọn 19:26–27). Ọ dịịrị ka onye echefuru (Lee Matiu 27:46; Mak 15:34). Ime ka emejuputa akwụkwọ nsọ ahụ, Ọ sịrị akpịrị kpọrọ ya nkụ (lee Jọn 19:28). Mgbe emejuputara ihe niile, Ya na Onwe Ya “kubiri umo” (Luk 23:46; lee kwa Jọn 10:17–18).
Jizọs Kraịst maara otu esi akasi anyị obi nʻọrịa, adịghị ike, owu ọmụma, ịnọpụ iche, na ihe isi ike anyị niile (lee Alma 7:12). Ụdị mkpagbu ndị a na-abịakarị ọtụtụ mgbe dị ka nsonazụ nhọrọ nke ndị ọzọ. Ọ makwaara otu e si esoro anyị an̄ụrị ọn̄ụ nʻobi ụtọ na obi ekele anyị, otu esi esoro anyị ebe akwa mgbe ọn̄ụ anyị juru eju. Nʻụzọ dị nro, Ọ na-akpọ anyị nʻaha Ya, site nʻolu Ya, ịbata niime ogige Ya. Ọ na-akpọku mmadụ niile ebe ọbụla. Ọ na-akpọku anyị ịhụ ma ghọta ndụ anụ ahụ site na nhụnuuche dị ebighị ebi. Dị ka anyị na-eje ije nʻụzọ kwụ ọtọ na na-edobe ọgbụgba ndụ anyị, Ọ na-ekwe nkwa na ihe niile pụrụ ịrụkọta ọrụ ọnụ maka ọdịmma anyị (lee Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 90:24; Ndị Rom 8:28).
Nʻoge na nʻụzọ Ya, mweghachite na-abịa—ọ bụghị naanị nye otu ihe niile dịịrị mana kwa nye ihe ha nwere ike ịghọ. Nʻeziokwu, Jizọs Kraịst pụrụ ime anyị e nwere onwe anyị site nʻagbụ na njọ, site na ọnwụ na ala mmụọ, ma nwere ike inyere anyị aka mejuputa njirimara anyị sinachi dị ka anyị na-abụrụzi karịa dị ka anyị chebuuru, site nʻokwukwe na nchegharị.
Nkwa nke Nnapụta
Niihi Jizọs Kraịst, ọnwụ abụghị nsọtụ. Na Ista anyị na-ama ọkwa:
Site na iwu nsọ na ike sitere na Nna Ya, Jizọs nwere ike ịtọgbọ ndụ Ya ma werekwa ya ọzọ (lee Jọn 10:17). Mgbe ahụ Ya tọgbọọrọ niime ili, Jizọs Kraịst lekọtara ma hazie niime ụwa nke mmụọ, na-ama ọkwa “mgbapụta ha site nʻagbụ niile nke ọnwụ” (Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 138:16).
Nʻụtụtụ ụbọchị nke atọ, O bilitere site nʻili. Ọ gwara Meri okwu. Ọ pụtakwuteere ndị na-eso ụzọ ya abụọ nʻokporo ụzọ gawara Emmaus, Ndị ozi Ya, na ndị ọzọ. (Lee Matiu 28; Mak 16; Luk 24; Jọn 20.)
Nʻịgba ama okwu ndapụta, Ọ kpọkuru ndị na-eso ụzọ Ya ịwunye ụgbụ naka ụgbọ mmiri nke ọzọ; oge nke a, agbanyeghị ọzọ ka uju azụ, ụgbụ ndị ahụ adọwaghị (lee Jọn 21:6–11; Luk 5:3–7). O nyere ndị na-eso ụzọ nri ma rịọ Pita ugboro atọ inye atụrụ na ụmụ atụrụ Ya nri (lee Jọn 21:12–17). Ọ rigooro niime eluigwe, na-ama ọkwa na ndị na-eso ụzọ Ya mgbe ahụ na anyị niile ugbu a kwesịrị ikwusa ozi nke Ista na ozi ọma Ya dị ebube nye mba niile, ikwu na ibe, na ndị niile (lee Matiu 28:19–20; Mak 16:15).
Jizọs Kraịst bụ Onye ọzụzụ atụrụ Ọma anyị na Nwa atụrụ nke Chineke. O nyere ndụ Ya maka, ma na-enye ndụ Ya nʻaka, atụrụ Ya. Niime ubi ahụ ma nʻelu obe, O buru ihe na-adịghị ekwe obubu ma kwụọ ụgwọ mmehie maka anyị. Ugbu a na mgbe ebighị ebi, Ọ na-egosi anyị site nʻịma atụ otu “ọnwụ si emeghe ụzọ baa ebighị ebi.”
Site nʻike Aja mgbaghara mmehie na Mbilite nʻọnwụ nke Kraịst, anụ ahụ anyị na mmụọ anyị ka a ga-ejikọtagharị na mbilite nʻọnwụ nke anụ ahụ. Anyị ga-enwe ebube, eweghachite na mbara ihu na ọdịdị anụ ahụ, ụkwụ ruo na ụkwụ. Ọbụna agịrị isi nke isi anyị ka a ga-eweghachite. Anyị ga-enwere onwe site na nrịa nrịa niile nke ugbu a, ọrịa, ihe mgberede nke anụ ahụ, na adịghị ike nke ụbụrụ isi. Aja mgbaghara mmehie nke Kraịst nwere ike gọzie anyị imeri ụdị nkewa ime mmụọ niile na ọnwụ ime mmụọ. Nʻọnọdụ nke nchegharị, anyị nweere onwe site na mmehie na mwute niile ma dị nnabata nye uju nke ịhụnaanya na ọn̄ụ dị ebighị ebi. Enweghị ntụpọ, dị ọcha, nwere onwe, anyị nwere ike lọghachi na mmekọrịta ezi na ụlọ anyị kachasị dị mmasị nye ihu Chineke Nna anyị na Jizọs Kraịst dị ebube, dị selestịal.
Anyị ga-ahụ ndị anyị hụrụ naanya ọzọ. Mgbe ejikọtagharịrị anyị na ndị ahụ anyị hụrụ naanya, anyị ga-ahụ ibe anyị na anya nhụnuuche dị ebighị ebi-jiri ịhụnaanya, nghọta, na obi ọma kacha dị ukwuu. Aja mgbaghara mmehie nke Jizọs Kraịst nwere ike inyere anyị aka cheta ihe ndị dị mkpa ma chefuo ihe na-adịghị mkpa. Ị na-ahụ Onye Nzọpụta anyị na mmekọrịta nwere nnukwu okwukwe na obi ekele na-ewete udo, bulie ibu arọ niile, kpezie obi niile, ma jikọọ ezi na ụlọ niile ugbu a na mgbe ebighị ebi.
Olileanya nke Uju na Ọn̄ụ
Ista niime Jizọs Kraịst gụnyere mmepe nke mpio niile nke eluigwe, mkpụrụ nke vaịn na-amụba amụba, na ala niile ịma mma. Ista niime Jizọs Kraịst gụnyere ikasi obi na ilekọta ndị isi mkpe na ndị enweghị nne na nna, ndị agụrụ na ndị na-enweghị enyemaka, ndị ahụ egwu na-atụ, emegburu, ma ọ bụ na-enweghị ụta ejidere nʻụzọ mmerụ ahụ. Ịkpachara anya maka ibe, Jizọs Kraịst na-akpọku anyị ịhụ ma jee ozi nʻịhụnaanya na ọmịiko, dị ka Ọ na-eme.
Niime ihe niile dị mma, Jizọs Kraịst na-eweghachite ebe ọ dị ukwuu (lee Jọn 10:10; Alma 40:20–24). Ọ na-ekwe nkwa na “ụwa juputara, ma enwere nke zuru ma fọ” (Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 104:17). Mweghachite Ya nke ihe niile gụnyere uju nke ozi ọma Ya, ikike na ike ọkwa nchụaja Ya, na emume nsọ niile na ọgbụgba ndụ niile dị nsọ dị na Nzukọ nsọ Ya, akpọrọ nʻaha Ya, ọbụna Nzukọ nsọ Ahụ nke Jizọs Kraịst nke Ndị nsọ Ụbọchi ikpeazụ a.
Ista niime Jizọs Kraịst gụnyere ụlọ ndị dị nsọ nke Onyenwe anyị na-abịaru ụmụ Chineke nso nso nʻọtụtụ ebe, na-ewete niime obi anyị ozizi nke “ndị nzọpụta nʻelu Ugwu Zayọn” (lee Obadaya 1:21). Onyenwe anyị na-ewete ụzọ ido nsọ, na-adịghị echere naanị onwe maka anyị iji nye nụwa ihe ndị anyị hụrụ naanya nwụrụ anwụ nwere mkpa ha ma na-achọ nʻebighị ebi nke ha enweghị ike enwetere onwe ha.
Ụdị ahụ bụ olileanya m, nkwa m, na ama m. Ana m agba aka ebe Chineke Nna anyị; Onye Nzọpụta na Onye Mgbapụta anyị, Jizọs Kraịst; na Mmụọ Nsọ. Na Ista na ụbọchị ọbụla, ka anyị chọta olileanya dị ebighị ebi na nkwa nʻatụmatụ obi ụtọ sinachi, ya na ụzọ ọgbụgba ndụ ya nke mgbanwe dị nsọ site na ndụ pụrụ ịnwụ anwụ baa niime ndụ apụghị ịnwụ anwụ na ndụ ebighị ebi. Ụbọchị ọbụla ka izi ezi nke Aja mgbaghara mmehie nke Kraịst bulie ibu arọ anyị, nyere anyị aka kasie ndị ọzọ obi na mwute ha, ma mee mkpụrụ obi anyị enwere onwe ịnata uju ọn̄ụ Ya.
Site nʻolileanya na nkwa Ista, Jizọs Kraịst mejuputara ọchịchọ niile nke obi anyị ma na-aza ajụjụ niile nke mkpụrụ obi anyị.
© 2025 site n’aka Intellectual Reserve, Inc. Ikike niile ka edokwara. Ebipụtara na USA. Nkwado n’asụsụ Bekee: 6/19. Nkwado ntụgharị asụsụ: 6/19. Ntụgharị asụsụ nke Ozi Liahona Kwa Ọnwa, Eprel 2025. Igbo. 19612 593