2025
“Aga M Agwọ Ha”
Febrụwarị 2025


“Aga M Agwọ Ha,” Liahona, Feb. 2025.

Ozi Liahona Kwa ọnwa, Febrụwarị 2025

Aga M Agwọ Ha

Okenye Uchtdorf na-akuzi na ozi ọgwụgwọ nke Onye Nzọpụta bụ ndubata na nkwa nke ọgwụgwọ anụ ahụ na nke echiche na-anọgide nke si na chi nke ga-abịara onye ọbụla niime anyị n’oge Mbilite n’ọnwụ.

Oyiyi vidiio baịbụlụ nke Jizọs Kraịst na-akasi otu nwanyị obi

Aka na m echeta nke ọma ụfọdụ ogologo oge m gbara ụgbọ elu n’oge m na-arụ ọrụ dị ka onye na-anya ụgbọ elu.

N’otu niime ha, aga m anyapụ na Germany na elekere anya 11 nke ụtụtụ ma daa na California n’elekere anya 1 nke ehihie n’otu ụbọchị ahụkwa. Ịtụnyere oge ọpụpụ na oge nrute nke ebe ahụ, o nwere ike dị ka ifefe ofe Atlantic Ocean na kọntinent North America were naanị awa abụọ. Boeing 747 dịịrị ọsọ ọsọ, mana ọ dịchaghị ọsọ ọsọ otu ahụ! N’eziokwu, o were anyị awa 11, na-adabere n’ikuku, ime njem maịlụ dị 5,600 (9,000 km).

Niihi na anyị na-efega ọwụwa anyanwụ, anwụ adaghị n’oge anyị na-efe. Anyị nwere ihè nke ụbọchị n’oge niile site na Germany ruo na California.

ọdịda anyanwụ kufere urukpuru

Ịlaghaghchi na Germany bụ nnọọ akụkọ pụrụ iche. Ọbụna mgbe anyị fepụrụ n’isi mbụ n’ehihie ahụ, dị ka anyị fegawara ọwụwa anyanwụ, ọdịda anyanwụ bịara oke ngwa ngwa karịa ka ọ na-emekarị, ma tupu anyị na-amata, chi ejikwuwo anyị.

N’oge ogologo ụgbọ elu ahụ, mkpụrụ obi m ọtụtụ mgbe na-ejupụta n’ịtụnaanya dị ka m na-atụgharị uche n’ịdị mma nke ụwa nke a na usoro nke okike nke Chineke. Ọbụna mgbe m na-efe na abalị, na ọchịchịrị gbara kpam kpam, a maara m n’ezie na anwụ ga-amalite ịcha ọzọ, na ihè ahụ na-acha bam ga-alọghachi ma wete ekpomọkụ n’ụbọchị ọhụrụ tupu njem anyị ebie. Ọnọdụ niile nke ịkwọ ụgbọ elu m nwererịị ike mee ka o yie ka anwụ o jiiri nwayọ na-ada ada ma ọ bụ dị ọsịsọ ọsịsọ karịa, mana a maara m na anwụ nọgidere gaaniihu, kwụsie ike, ma dị ndabere niime eluigwe niile.

ọnwa kufere urukpuru niile

Ọ na-emetụkwa m otu ahụ banyere Chineke. Niihi na m nwere anya udo kwụ chịm banyere amamiihe na ebumnuuche nke Chineke banyere ịhe niile O kere eke, e nwere m ike inwe mmetụta olileanya na udo na-enye ọńụ na-anọgide mgbe m na-eche banyere ịdị adị nke ndụ anụ ahụ anyị. Anyị bụ ụmụ Chineke. Ọ hụrụ anyị naanya. Ọ maara ọnọdụ anyị niile. Ọ dị njikere inye aka. Eziokwu ndị a anaghị agbanwe agbanwe, ọbụna mgbe ihe ndị ọzọ gbara anyị gburugburu yiri ka ihe ejighị aka ma na-atụghị uche.

Anyị niile enwetawo nhụmiihe oge ọchịchịrị, mwute, na ejighị n’aka nke na-eyi udo anyị egwu. Lee ka obi m si ju n’ekele maka ezi isi ihè na eziokwu dị ndabere (lee Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 88:6–11). Jizọs Kraịst bụ Ìhè na ndụ nke ụwa. Niihi Ya na aja mgbaghara mmehie Ya, anyị nwere olileanya maka ọdịniihu, ohere nye ihè sinachi ịmụke ụbọchị ọchịchịrị niile nke njem anyị, na nkwa nke mmeri megide mmehie na ọnwụ n’ikpeazụ.

“Ọ Hụrụ Ụwa Naanya”

Jizọs Kraịst bụ naanị onye zuru oke nke biiri n’elu ụwa. Niihi ndụ Ya zuru oke, O Jighị ikpe ziri ezi ụgwọ. Niihi ịhụnaanya o nwere maka anyị, O nyefere ndụ Ya maka onye ọbụla niime anyị n’otu n’otu na maka ụmụ Chineke niile nigwe iji meghee ụzọ nye ndụ anwụghị anwụ na ndụ ebighị ebi.

Na-agbanyeghị ihe Setan gachọ ka anyị kwere, enweghị onye ọbụla niime anyị karịrị ike nke Onye Nzọpụta ịnapụta anyị. Ọ dịghị onye ọ bụla niime anyị a ga-akwatu site na amara nke mgbaghara. Ọ dịghị onye ọ bụla niime anyị tofere inwete “aka nke ịhụnanya ya gbara gburugburu ruo mgbe ebighị ebi” (2 Nefi 1:15).

Onyinye nke a kachasị ukwuu site n’onyinye niile na-abịa site n’ike nkwado na ike mgbapụta nke Aja mgbaghara mmehie nke Jizọs Kraịst. Niihi ntaram ahụhụ nke Onye Nzọpụta na Getsemani na Golgotha, Ọ maara otu esi azọpụta anyị site na ma nyere anyị aka site na nke ọbụla na adịghị ike anyị niile (lee Alma 7:12).

“Ọ naghị eme ihe ọbụla ma ọ bụghị ma ọ ga-abara ụwa uru; niihi na ọ hụrụ ụwa naanya, ọbụna na ọ tọgbọrọ ndụ nke ya onwe ya ka o wee kpọta ụmụ mmadụ niile n’ebe ọ nọ” (2 Nifaị 26:24).

Jizọs Kraịst bụ ike anyị!

Ọ na-akpọku.

Ọ na-eweghachite.

Ọ na-anapụta.

“Mgbe Onye Nzọpụta [chụrụ aja mgbaghara mmehie Ya] maka mmadụ niile, O meghere ụzọ ka ndị ahụ ga-eso Ya wee nwete ike nke ọgwụgwọ, ikwụdosi ike, na ike mgbapụta Ya,” ka Onyeisi Russell M. Nelson kwuru.

Ike ahụ, dị ka anyanwụ, nọ ebe ahụ mgbe niile. Ọ naghị ada mba. Nhọrọ isoro na nzọụkwụ nke Onye Nzọpụta dị ka i si na ndo pụọ ma banye na anwụ, ebe anyị nwere ike ịnata ngọzi niile nke ihe, ekpomọkụ, na ịhụnaanya nke Chineke. Ama m na otu ubọchị, anyị ga-ele anya n’azụ ma juputa nʻobi ekele na anyị mere mkpebi dị mkpa ruo ebighị ebi ịtụkwasị Jizọs Kraist na ịhụnaanya Ya dị nsọ obi ibuli anyị elu ma kwadosie anyị ike.

“Lọghachikwutenụ Mụ”

Akwụkwọ nke Mọmọn na-ekwu maka ndị nke nọrọ mkpụrụ ụbọchị atọ n’ọchịchịrị kachasị dị omimi nke na-esote Mkpọgbu n’obe nke Onye Nzọpụta. Ọchịchịrị nke a na-ahụ anya na gburugburu ha nwere ike ịbụ ọdịmara ọchịchịrị nke ime mmụọ anyị niile na-enweta niihi mmehie. Emesịa ndị mmadụ nụrụ olu nke Kraịst na-akpọku ha ịpụta n’ọchịchịrị ma bata n’ihè Ya:

“Ọ bụ na unu agaghị alọghachikwute m ugbu a, ma chegharịa na mmehie unu, ma nwee ntọghata, ka m nwee ike gwọọ unu?” (3 Nefi 9:13).

“Nye maka ịchụ aja nye m obi tiwara etiwa na mmụọ dị nchegharị” (3 Nefi 9:20).

“Chegharịa ma lọghachikwute mụ jiri ebumnuuche nke obi zuru oke” (3 Nefi 10:6).

Onye Nzọpụta mekwara ka otu ọkpụkpọ oku ahụ rute anyị taa mgbe anyị hụtara onwe anyị ka ndị furu efu n’ọchịchịrị. Dị nnọọ ka ọwụwa anyanwụ ọbụla na-egosị mmalite ụbọchị ọhụrụ, oge ọbụla anyị chegharịri, anyị na-enweta mbido ọhụrụ, mmalite ọhụrụ na-egbuke egbuke.

Ọ pụtaghị na ọ dị mfe. Nchegharị pụtara mgbanwe, ma mgbanwe anaghị eme ọsọ ọsọ. Ebe enwere nchegharị dị an̄ụrị gụnyere “iru uju nke Chineke” (2 Ndị Kọrint 7:10). Ọ chọrọ na anyị ga-anakwere ma kwuputa ezighị ezi anyị, na-arịọ mgbaghara site n’aka Chineke na site n’aka ndị ahụ anyị mejọrọ. Kachasị ihe niile, ọ chọrọ na anyị ga-ariọ “Mmụọ nke Onyenwe anyị Pụrụ Ime Ihe Niile,” ka anyị nwee ike nweta “mgbanwe dị ukwuu niime … obi anyị, nke mere na anyị enwekwaghị ọchịchọ ime ihe ọjọọ, mana ime ihe ọma esepụghị aka” (Mozaya 5:2).

Ụdị mgbanwe ahụ bụ njem dị ogologo, mana ngwa ngwa ịzọpụrụ nzọụkwụ mbụ, “ụbochị nzọpụta gị” amalite, ma “ozugbo ozugbo ka nnukwu atụmatụ nke mgbapụta ga-eruta gị” (Alma 34:31).

Site nʻezi nchegharị anyị, Chineke na-ekwe nkwa ịgbaghara ma hapụkwa icheta mmehie anyị ọzọ. Ma mgbe ọ rara anyị ahụ ichefu mmehie anyị niile, ka anyị gbasie mbọ ike ịtụkwasị obi na nkwa nke Onyenwe anyị ịgbaghara ma mụta ịgbaghara ndị ọzọ na onwe anyị kwa.

“Mmụọ anyị na-anwụ mgbe anyị mejọrọ ma mee mmehie,” ka Onyeisi Boyd K. Packer (1924–2015) kuziri. “Mana na-adịghị ka ọnọdụ ndụ anụ ahụ anyị, mgbe usoro nke nchegharị zuru, enweghị apa na-afọdụ niihi Aja mgbaghara mmehie nke Jizọs Kraist.”

Otite agba nke Jizọs na-agwọ nwoke isì kpuru

Ọgwụgwọ Nwoke Kpuru isi, site n’aka Carl Heinrich Bloch

“Kpọtanụ Ha Ebe a”

Onye Nzọpụta bụ Onyeisi Ọgwụgwọ. Otu ngosịpụta nke ike nke ọgwụgwọ Ya kachasị mma ka ahụrụ niime Akwụkwọ nke Mọmọn, na nkọwaputa nke ije ozi nke onwe Ya na Amerika mgbe gboo:

“Unu nwere ndị na-arịa ọrịa n’etiti unu?” Ọ jụrụ. “Kpọtanụ ha ebe a. Unu nwere ndị dara ngwọrọ, ma ọ bụ kpuru isi, ma ọ bụ ndị na anaghị a ga ije, ma ọ bụ ndị na-enwezughị ụkwụ na aka, ma ọ bụ ndị ekpenta, ma ọ bụ ndị arụ ha kpọnwụrụ akpọnwụ, ma ọ bụ ndị ntị chiri, ma ọ bụ ndị nwere nsogbu n’ụdị ọbụla? Kpọta nụ ha ebe a ma aga m agwọ ha, n’ihi na enwere m ọmịiko n’ebe unu nọ; afọ m juputara n’ebere. …

“Ma o wee ruo na mgbe o kwuworo otu a, igwe mmadụ ahụ niile, n’otu obi, gara nʼihu kpọrọ ndị ọrịa ha na ndị ha nwere mkpagbu, na ndị ngwọro ha, ma kpọrọ ndị ha kpuru isi, ma kpọrọ ndị ha dara ogbu, ma kpọrọ ndị ha niile nwere mkpagbu n’ụdị ọbụla; ma ọ gwọro ha, onye ọbụla dị ka e siri kpọtara ya ha” (3 Nefi 17:7, 9).

Oge ọbụla Onye Nzọpụta gwọrọ onye obụla “nwere mkpagbu n’ụdị ọbụla,” ma tupu ma mgbe Mbilite n’ọnwụ Ya gachara, ọ bụụrụ ihe ịgba ama n’ikpeazụ nye ike Ọ nwere ịgwọ mkpụrụ obi anyị. Ọgwụgwọ ọbụla dị ebube bụ naanị ndubata na nkwa nke ọgwụgwọ anụ ahụ na nke echiche nke na-anọgide nke ga-abịara onye ọbụla niime anyị n’oge Mbilite n’ọnwụ nke bụ “omume ọgwụgwọ nke Onyenwe anyị na-ere ere.”

Ọ bụ eziokwu na ekpere anyị maka ọgwụgwọ na ndụ nke a abụghị ihe a na-aza mgbe niile n’ụzọ anyị tụrụ anya ya, mana ha abụghị ihe ana agbachi nkịtị. Oge maka ọgwụgwọ ga-abịa, dị nnọọ ka ọchịchịrị nke abalị na-apụ mgbe niile—n’oge ya—nye ọwụwa anyanwụ di ebube.

Dị ka Onyeisi Nelson gbara ama: “Ọ dịghị mgbe na-anabataghị okwukwe anyị. A ma m na mbunuuche nke Nna nke Eluigwe mazuru ihe niile kacha saa asaa karịa nke anyị. Ebe anyị ma nsogbu niile na mgbu nke ndụ anụ ahụ anyị, Ọ maara banyere ịganiihu na ike nke ndụ a na-apụghị ịnwụ anwụ anyị. Ọ bụrụ na anyị kpee ekpere ịma uche Ya ma nyefee onwe anyị na ya site na-inwe ndidi na mgbam ume, ọgwụgwọ si n’eluigwe nwere ike were ọnọdụ n’ụzọ na n’oge nke Ya.”

Na nso nso a nwunye m, Harriet, na mụ onwe m tinyere n’ekpere anyị olileanya na arịrịọ pụrụ iche maka ndị anyị hụrụ naanya. Anyị rịọrọ arịrịọ ka enye ndị otụ̀ ahụike ha ike pụrụ iche ịgwọ orịa ha niile. O metụrụ anyị ịgbakwunye na ọbụna ọ bụrụ na ọgwụgwọ ma o bụ mgbake a na-egbughị oge enweghị ike were ọnodụ, ike ọgwụgwo nke Onye Nzọpụta nwere ike wetara ha nkasi obi na udo. Ịdi ire nke ike mgbapụta nke Onye Nzọpụta nwere ike nwee ọbụna mmetụta kacha ukwuu na ahụike nke echiche, nke ime mmụọ, na nke anụ ahụ anyị karịa ọgwụgwọ nke elu ụwa anyị nwere ike ịnata. Jizọs Kraịst bụ Onye ọgwụgwọ niime ụwa nke a ma na-ebighị ebi.

Ụmụnne m ndị nwoke na ndị nwanyị, ezi ndi enyi, ana m agba ama na ebere nke Onye Nzọpụta zuuru ịgwọ mgbu unu, sachaa unu site na mmehie unu, kwadosie unu ike maka mnwale ndị ga-abịa, ma gọzie unu site na olileanya, amamiihe, na udo Ya. Ike Ya no ebe ahụ mgbe niile—na-adịgide ma nwee ndabere—ọbụna mgbe anyị, na nwa oge nta, na-eche na anyị nọ ebe dị anya site n’ịhụnaanya, ihè, na ekpomọkụ Ya.

Ekpere m bụ ka anyị hapụ itufu uche nke ịtụnaanya na oke afọ ojuju maka ihe niile Jizọs Kraist mewororịị anyị. Biko mata na a hụrụ gị naanya n’ụzọ zuru oke, ma cheta ihe e kweworo gị na nkwa ruo mgbe ebighị ebi.

“Ka Chineke za unu ka ibu arọ unu niile wee dị mfe, site n’ọn̄ụ nke Ọkpara ya,” Jizọs Kraist (Alma 33:23).