“Ozi ọma nke Ịhụnaanya na ọn̄ụ,” Liahona, Jenụwarị 2025.
Ozi Liahona Kwa ọnwa, Jenụwarị 2025
Ozi ọma nke Ịhụnaanya na Ọn̄ụ
Ngọzi niile nke Mweghachite kwesịrị inye anyị obi ụtọ ma juputa obi anyị n’ekele maka oke ịhụnaanya nke Chineke.
Ozi anyị nke olile anya na udo nye mmadụ niile bụ na Jizọs Kraịst dị ndụ ma weghachitewo ozi ọma na Nzukọ nsọ Ya n’ụbọchị ikpeazụ ndị a.
“Lee ka ihe ndị a si dị ebube na-enweghị nkọwa nye mmadụ!” Onye amụma Joseph Smith mara ọkwa ya. “N’ezie a pụrụ iwere ha dị ka ozi niile nke oke ọńụ nye mmadụ niile; na ozi niile, kwa, nke kwesịkwara ijuputa ụwa ma nye mmadụ nille obi ụtọ mgbe ekwusiri ya ike na ntị ya.”
Ruo ọtụtụ narị afọ sochiri ozi elu ụwa nke Onye Nzọpụta, ụmụ Chineke chọrọ Ya ma nwekwuo oke agụụ maka ihe na eziokwu. Ugbu a ozi obi ụtọ nke ozi ọma nke Jizọs Kraịst na Mweghachite nke na-aga n’ihu na-aga n’iru ịgọzi mmadụ niile ma kwadoo ụwa maka ụbọchị ahụ mgbe Jizọs Kraịst ga-alọghachi “ịchị dị ka Eze nke ndị Eze ma wee chịa dịka Onyenwe anyị nke ndị Nwe anyị.” Nke a bụ ngosipụta dị omimi nke ịhụnaanya na-adịghị agwụ agwụ nke Nna nke Eluigwe na Onye Nzọpụta anyị. Obi dị m ụtọ na m nwere ike iji ndụ m na-ekwusa eziokwu ndị a nye ụwa niile.
Ihe A Na-anaghị ahụkebe na nke Dị ịrịba ama
Ụbọchị ọhụrụ pụtaara ezi na ụlọ ụmụ mmadụ n’ọdọ nke osisi, ebe Chineke Nna na Ọkpara Ya, JIzọs Kraịst, pụtara wee gwa Joseph Smith okwu n’aziza nye ekpere nke Joseph nta gbasara nzukọ nsọ nke o kwesịrị isonye (lee lee Joseph Smith—History 1:14–20). Jizọs Kraịst gwara Joseph ka ọ ghara isonye nzukọ nsọ ọbụla. O kwere nkwa na a ga-ekpughere Joseph uju nke ozi ọma Ya n’ọdịniihu.
N’anya ọtụtụ ndị, Joseph e yighị nnọọ ka onye a ga-akpọ n’ọrụ dị mkpa otu ahụ, ma ha kwuru eziokwu. Ọ bụ nwata nwoke na-agụghị akwụkwọ na onye a na-amaghị ama sitere n’obere ugbo nọ n’otu ime ime obodo. Dị nnọọ ka ụfọdụ kwuru banyere Onye Nzọpụta n’oge Ya, “Ọ ga-enwe ezi ihe ọ bụla ga-esi na Nazareth apụta?” (Jọn 1:46), ọtụtụ ndị nọ na-eche ihe ọma nwere ike isi n’aka onye dị afọ 14 na-agụghị akwụkwọ nọ na Palmyra, New York. Kama site n’aka Joseph—dị ka o yighị ka ọ dị—Nna nke Eluigwe na Onyenwe anyị Jizọs Kraịst ga-eweta ihe dị ịrịba ama n’ezie. Nke a kwesịrị iwetara anyị olile anya na n’ụzọ anyị dị nta ma dị umeala, anyị nwekwara ike inyeaka n’ụzọ ndị bara uru n’ọrụ nke Onyenwe anyị.
N’oge ya, Onyenwe anyị kpọrọ Joseph “ma gwa ya okwu site n’eluigwe, ma nye kwa ya iwu nsọ niile” (Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 1:17). Joseph natara mkpghe ndị dị oke ọnụ ahịa na ozizi dị mkpa nke wetara ihe ọhụrụ nye nghọta anyị banyere atụmatụ ịhụnaanya nke Nna nke Eluigwe na mgbapụta dị ịhụnaanya nke Jizọs Kraịst na ike nke aja mgbapụta Ya. N’ụzọ dị ịrịba ama, ozi obi ụtọ ndị a bịara kpọmkwem n’oge mgbe ọganihu dị ịrịba ama na njem njem, nkwurịta okwu, na akụkụ ndị ọzọ ga-ekwe ka ihe Chineke chapụta ịgọzi ọtụtụ ụmụ Ya.
Mmụọ ozi Moronaị na-enyefe Joseph Smith epekele ndị ahụ, site n’aka C. C. A Christensen
Aka ebe Dị ike banyere Ịhụnaanya nke Chineke
Mpụta nke mmụọ ozi Moronaị nye Joseph Smith dị oke mkpa maka Mweghachite na ihe akaebe siri ike banyere ịhụnaanya nke Chineke. Moronaị gwara Joseph maka otu ndekọihe, e dere n’elu epekele ọlaedo niile, e liri n’ebe dị nso (lee Joseph Smith—Agụgụala 1:33–34). N’ikpeazụ, a ga-enye Joseph “ike sitere n’elu” (Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 20:8) ịtụgharị asụsụ ndekọihe ahụ banye ihe ga-aghọ Akwụkwọ nke Mọmọn, nke guzoro n’akụkụ Baịbụlụ ahụ ma bụ ama ọzọ nke Jizọs Kraịst.
Nime Akwụkwọ nke Mọmọn gbaa gburugburu, anyị na-agụ maka ndị mmadụ ndị, nari kwuru narị afọ tupu Kraịst, maara ma buo amụma banyere ọbịbịa Ya ma chọsie ike maka ya. Anyị na-ahụkwa nkọwapụta pụrụiche banyere mpụta nke onwe na ije ozi nke Onye Nzọpụta ahụ bilitere n’ọnwụ n’etiti ndị Nịfaị, n’oge nke Ọ kpọrọ mmadụ niile ka ha bịakwute Ya ma metụ aka n’akara dị na akụkụ Ya na apa ntu nọ n’aka Ya na ụkwụ Ya (lee 3 Nifaị 11:14–15). Ọ gwọrọ ndị ọrịa, ndị ngwụrọ, ndị isi—“ndị niile nwere mkpagbu n’ụdị ọbụla”—ma mgbe ahụ gozie ụmụntakịrị ma kpee ekpere maka ha (lee 3 Nifaị 17:7-9, 21). Anyị na-amụta ọtụtụ ihe gbasara ịhụnaanya na ọmịiko nke Onye Nzọpụta site na nkọwapụta nke a dị nsọ.
Akwụkwọ nke Mọmọn ahụ gbara aka ebe na “Jizọs bụ Kraịst ahụ.” Nkwenye ndị dị niime Akwụkwọ nke Mọmọn na-echetara anyị ugboro ugboro na Nna anyị nke Eluigwe na Onye Nzọpụta anyị hụrụ anyị n’anya karịa ihe ọ bụla anyị nwere ike iche n’echiche.
Ngọzi niile nke Ọkwa nchụaja na Nzukọ nsọ ahụ
Mweghachite ahụ gara n’ihu site na mpụta nke ndị ozi nke eluigwe ọzọ nye Joseph Smith. “Jọn Omee Baptizm bilitere n’ọnwụ weghachitere ikike nke ime baptizm site na mmikpu niime mmiri maka mgbaghara nke mmehie niile. Ndị Ozi atọ niime Ndịozi iri na abụọ isimbụ—Pita, Jemis, na Jọn—weghachitere ịbụ onyeozi na ntụghe niile nke ikike ọkwa nchụaja. Ndị ọzọ bịakwara n’ezie, tinyere Elaịja, onye weghachitere ikike nke ijikọta ezi na ụlọ ọnụ ruo mgbe ebighị ebi niime mmekọrịta ebighi ebi nke gafere ọnwụ.”
Na Eprel 6, 1830, Jizọs Kraịst hiwere site n’aka Onye amụma Joseph otu nzukọ nsọ emere na nsoro ọgbakọ Ọ haziri n’oge Agba Ọhụrụ (lee Edide niile nke Okwukwe 1:6.), zuru oke site na “ntọala nke ndị ozi na ndị amụma, Jizọs Kraịst n’onwe ya bụrụ isi nkume nkuku” (Ndị Efesọs 2:20). Nzukọ nsọ nke Jisọs Kraịst nke Ndi nsọ Ụbọchi Ikpeazụ a na-eme ka ngọzi niile nke ike ọkwa nchụaja eweghachitere dịịrị nye ụmụ Chineke niile ndị kwadoro onwe ha ị nata ya.
dị ka Onyeisi Russell M. Nelson kuziworo anyị, anyị nwere ike chọta ọńụ na nchegharị kwa ụbọchị dị ka anyị na-echigharịkwute Nna nke Eluigwe na Onye Nzọpụta anyị. Nye onye ọ bụla nke nwere nkụda mmụọ ma ọ bụ na ha erughị eru ma ọ bụ soro: mmadụ niile ka a na-akpọku ịbịakwute Kraịst na Nzukọ nsọ Ya. Nzukọ nsọ abụghị ebe obibi ndị mọnk maka ndị zuru oke kama ọ bụ ụlọ ọgwụ maka ndị ọrịa. Okenye Dieter F. Uchtdorf nke kworum ndi Ozi Iri na abụọ na-echetara anyị na “anyị n’abịa nzukọ nsọ ọ bụghị izo nsogbu anyị kama ka a gwọọ ha.”
niime nzukọ nsọ anyị na-enweta ọńụ niime ohere niile nke iwepụta onwe anyị, jeere ndị ọzọ ozi n’ịhụnanya, na ịkọ nhụmiihe nke onwe anyị site n’uju nke ịdị mma nke Kraịst. Anyị nwere ike “a gụnye anyị n’etiti ndị nzukọ nsọ nke Kraịst” ma “echeta ma zụọ anyị site n’okwu ọma nke Chineke” (Moronaị 6:4). Lee ụdị nnukwu ngọzị dị otu a!
Ihe kpatara Ọn̄ụ dị Ukwuu
Onye amụma Joseph Smith mara ọkwa otu oge, “Ugbu a, gịnị ka anyị na-anụ n’ozi ọma nke anyị nataworo? Olu nke obi ụtọ! Olu nke ebere sitere n’eigwe; na olu nke eziokwu site n’ụwa; ozi niile nke obi ụtọ maka ndị nwụrụ anwụ; olu nke obi ụtọ maka ndị dị ndụ na ndị nwụrụ anwụ; ozi niile nke obi ụtọ nke oke ọn̄ụ.” (Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 128:19. 128:19).
Ozi ọma nke obi ụtọ ndị a abịawo n’ihi na Nna nke Eluigwe na Ọkpara Ya Ọ hụrụ n’anya, Jizọs Kraịst, hụrụ anyị n’anya ma chọọ—karịcha ihe ọbụla—ịnabatagharị anyị n’ihu Ha, ka anyị wee nwee ụdị ndụ Ha na-ebi ruo mgbe ebighị ebi. Mweghachite ahụ na-ekpughe na Ha emeela ihe niile dị mkpa iji mee ka nke a bụrụ ohere dị ebube nye anyị niile. Na njem ebighị ebi anyị, anyị ga-enweta ọnwụnwa na ihe isi ike niile, mana “[anyị] dị, ka [anyị] nwere ike nwee ọńụ” (2 Nefi 2:25) niime ndụ nke a na nke ọzọ. Onye amụma Joseph matara nke a nke ọma karịa ndị ọzọ.
Joseph nwetara mmegide na mkpagbu ugboro ugboro, otu ọ dị ọ nọgidere na-enwe “iru ọcha na ańụrị nke omume” (Joseph Smith—Agụgụala 1:28). Ọ nọgidere na-enwe ọńụ, gbasie ike, ma kwụsie ike, ma rụzuo ọrụ pụrụ iche e nyere ya ka ọ rụọ. Ana m asọpụrụ Ndịnsọ isimbụ ndị kwere, kwado, ma soro Onye amụma Joseph Smith ma doo onwe ha nsọ nye owuwu nke Nzukọ nsọ. Anyị ji ha ụgwọ ekele na nsọpụrụ dị otu ahụ.
Ọ bụrụ ihe siri ike n’oge isimbụ nke Nzukọ nsọ, ma o nwere ike sie ike taa. Mana Mweghachite ahụ n’aganiihu. Ebe Jịsọs Kraịst nọ n’isi Nzukọ nsọ nke a, ndị amụma dị ndụ ga-aga n’ihu na-edu anyị. A ga-aga n’ihu na-ewu ụlọ niile nke Onyenwe anyị, ka ngọzi niile nke ọgbụgba ndụ niile dị ebighị ebi nke anyị na Chineke wee jikọta anyị na Ya na ndị anyị hụrụ n’anya n’akụkụ abụọ nke akwa mgbochi (lee Matiu 16:19.. Ịhụnaanya nke Chineke na Jizọs Kraịst ga-eruta ụwa niile ka anyị na-agbaso iwu nke Onye Nzọpụta ịzụ atụrụ Ya ma na-ekesa ozi ọma Ya. Anyị ga-ahụ na eziokwu niile banyere Mweghachite ahụ ga-apụ n’ụzọ niile na ebe niile ndị a na-agaghị echetu n’echiche n’oge nke Joseph.
Anyị nwere ike chọta ume na oke ọńụ—ka Onye amụma Joseph mere—dị ka anyị na-anabata ma na-ebi ndụ eziokwu ndị a dị oke ọnụ ahịa. Oku Joseph kpọkuru Ndị nsọ n’ụbọchị ya na-aga n’ihu n’etiti anyị taa: “Ọ bụ na anyị agaghị aga n’ihu na ụzọ dị ukwuu otu a? Gaa n’iru ma alala azụ. Mgbam ume, … ma gaa n’ihu, n’ihu ruo na mmeri! Ka mkpụrụ obi unu n̄ụrịa, ma nwebiga obi ụtọ oke.” (Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 128:22.).
Ka ozi obi ụtọ nke Ịhụnaanya na ọńụ nke Mweghachite ahụ na-eweta gọzie ma duzie ndụ anyị—ugbua na mgbe niile.
© 2025 site n’aka Intellectual Reserve, Inc. Ikike niile ka edokwara. Ebipụtara na USA. Nkwado n’asụsụ Bekee: 6/19. Nkwado ntụgharị asụsụ: 6/19. Ntụgharị asụsụ nke Ozi Liahona Kwa ọnwa, Janụwarị 2025. Igbo. 19600 593