Ozi Maka Ume nke Ndị Ntoroọbịa Kwa Ọnwa, Jenụwarị 2025
Lekwasị Kraịst anya
Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 6:36
Isiokwu Ndị Ntoroọbịa 2025 ga-enyere unu aka ịhọrọ ntụkwasị obi karịa obi abụọ na okwukwe karịa ụjọ.
Kailey dị afọ iri na asaa nọburịị n’otu ndị na-enwe obi ụtọ ruo mgbe ihe mberede butere mmerụ ahụ n’ụbụrụ. Mgbake ọrịa ya mere ka ọ ghara ịga ụlọakwụkwọ, ma ọ malitekwara inwe mmetụta nke ịnọpụ iche na ịnọ naanị ya. O nwere nsogbu n’ụzọ mmetụta uche ma ọ maghị ebe ọ ga-achọta enyemaka. Otu enyi ya tụrụ ero ka o gee ndị mgbasa ozi ọma ntị. Ha kuziri ya gbasara Aja mgbaghara mmehie nke Jizọs Kraịst. Ịmụtakwu ihe banyere Kraịst mere ka o nwee olile anya, ma ọ dịkwa ya ka a ga-asị na Chineke n’onwe Ya na-enyere ya aka.
Kailey gwara mama ya, “E nwetubeghị m mmetụta na Chineke hụrụ m nanya. Mana ugbua a mara m na Ọ hụrụ m n’anya.”
Mama ya, Michelle, nwere ihe iju anya. Ya na di ya, Brock, apụworị na Nzukọ nsọ Ahụ nke Jizọs Kraịst nke Ndị Nsọ Ụbọchị Ikpeazụ a mgbe Kailey dị afọ asaa n’ihi ajụjụdị iche iche, obi abụọ niile, na nchegbu niile. Ha chere na nwa ha nwanyị ga-enwe obi ụtọ karịa ma ọ bụrụ na ọ hapụ nzukọ na iwu nsọ niile. Ọ dịghị mgbe ha chere na nhọrọ ha ga-eme ka Kailey ghara inwe mmekọrịta siri ike na Chineke. Ka Michelle na Brock na-ele ka Kailey si gbanwe, ha chọpụtara na ọ dịla anya ha na-enwe mmetụta ịnọ Chineke nso, ma ha chọkwara inwe mmetụta ahụ ọzọ.
Ha gara hụ Bishọp ha, ma n’oge adịghị anya ezinaụlọ ahụ, gụnyere nwanne Kailey nke nwoke Braeden, lọghachiri na nzukọ nsọ. Inwe mmetụta ịbịaru Chineke nso na iso Ya na-akpakọrịta—karịsịa site n’ekpere—weghachiri okwukwe ha. Ịlọghachi na nzukọ nsọ akwụsịghị ajụjụ ma ọ bụ nchegbu ha niile, mana ha chọpụtara na inwe mmekọrịta siri ike nke onwe ha na Chineke ka mkpa karịa ekweghị ekwe ha.
Ihe nke a niile malitere mgbe otu enyi—nwa okorobịa dị ka gị—kpọkuru Kailey ka o lekwasị Kraịst anya. Ma o mere ya!
Jizọs Kraịst ekwuwo, “Lekwasịnụ m anya n’echiche ọbụla; enwela obi abụọ, atụla egwu ” (Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 6:36). Nke a bụ mkpatemmụọ so n’azụ Isiokwu ndị Ntoroọbịa 2025. Nye anyị ohere ịkọwa otu inwere ike iji họrọ ntụkwasị obi karịa obi abụọ na okwukwe karịa ụjọ dị ka ị na-elekwasị Kraịst anya:
Si aka ekpe gaa aka nri Nwanne nwanyị Runia, Onyeisi Freeman, Nwanne nwanyị Spannaus
Tamara W. Runia
Mgbe m na-adọga, ọ na-enyere m aka mgbe niile ịhụnuuche ka Jizọs Kraịst gbatịrị ogwe aka ya abụọ. Mgbe m na-ele Ya anya, Ana m echeta mkpụrụ okwu niile nke abụ ahụ, “Aga m eso Jizọs aga ije”: “Ọ gaghị ahapụ m ma ọlị, ọbụna mgbe m dara.”
Emily Belle Freeman
Mgbe m gụrụ isiokwu akwụkwọ nsọ nke a, echetaara m banyere Pita n’elu Oke Osimiri nke Galilee. Ilekwasị anya n’oke ifufe ahụ bawanyere ụjọ na obi abụọ ya, na-eme ka o mikpuo niime oke ifufe nke ebili mmiri ahụ. Mana ịlekwasị Onye Nzọpụta anya nyere Ya ike imezu ihe o metụbeghị mbụ: ọ gara ije n’elu mmiri! Ọ dị ịrịba ama, n’ezie. Kedu ihe i nwere ike imezu ka ị na-elekwasị Ya anya?
Andrea Muñoz Spannaus
Mgbe m malitere ịtụ ụjọ, n’agbanyeghị ebe m nọ ma ọ bụ ọnọdụ m nọ niime ya, ana m ama ụma na-eche ihe banyere mmekọrịta mụ na Nna nke Eluigwe na Jizọs Kraịst. Ana m ekwunwe nuche m ọtụtụ oge: ABỤ M NWA ADA NKE CHINEKE. Ana m aga n’ihu na-eme nke a ruo mgbe m malitere inwe ahụ iru ala. Ọ na-arụ ọrụ mgbe niile!
Si aka ekpe gaa aka nri Nwanne nwoke Wilcox, Onyeisi Lund, Nwanne nwoke Nelson
Bradley R. Wilcox
Jụọ onwe gị onye kachasị eche banyere gị ma hụ gị n’anya karịsịa. Ọ bụ nne na nna gị na ndị ndu Nzukọ nsọ? Ọ bụ ndị mmadụ nọ na social media nke inwere ike ịbụ naanị otu nọmba? Lekwasị Nna nke Eluigwe na Kraist anya. Ha hụrụ gị n’anya n’ezie!
Steven J. Lund
Cheta ihe a na-echetara gị maka ya mgbe ị na-agụ n’isi isiokwu nke Kworum Ọkwa nchụaja nke Erọn na Ndịinyom Nta: Ị bụ nwa nwoke ma ọ bụ nwa ada nke Chineke. Nwee okwukwe na Nna anyị nwere atụmatụ maka gị. Ilekwasị Kraịst anya pụtara ịhụ na Aja mgbaghara mmehie Ya nọ nnọọ n’etiti atụmatụ ahụ.
Michael T. Nelson
Ịgụ akwụkwọ nsọ niile bụ ịlekwasị Kraịst anya. Obi abụọ na ụjọ niile na-akwụsịkarị ka a na-echetara anyị banyere ọrụ ebube na nkuzi niile nke Jizọs. Anyị nwere ihu ọma inwe okwu Ya niile. Ha na-etinye aka na ọnọdụ ọ bụla anyị na-enweta na ndụ anyị.
© 2025 site n’aka Intellectual Reserve, Inc. Ikike niile ka edokwara. Ebipụtara na USA. Nkwado n’asụsụ Bekee: 6/19. Nkwado ntụgharị asụsụ: 6/19. Ntụgharị asụsụ nke Ozi Maka Ume nke Ndị Ntoroọbịa Kwa Ọnwa, Jenụwarị 2025. Igbo. 19615 593