Ibe ana agu akwụkwọ
6. Hụ Chineke naanya, hụ onye agbata obi gị naanya


ezigbo onye Sameria

6.

Hụ Chineke naanya, hụ onye agbata obi gị naanya

Matiu 22:37–40

Iji nyere gi aka mee ezi nhọrọ, Chineke na-enye iwu nsọ. Ọ na-eme nke a niihi na Ọ hụrụ gị naanya. Ma ihe kachasi kpata eji na-erubere iwu nsọ nke Chineke isi bụ nihi na ị hụrụ Ya n’anya. Ịhụnaanya nọ nʻetiti iwu nsọ nke Chineke.

Eziokwu ndị dị Ebighị ebi

Ọ hụrụ gị naanya. Ọ bụ Nna gị. Ịhụnaanya Ya zuru okè nwere ike ịkpate mmụọ gị ịhụ Ya naanya. Mgbe ịhụnaanya ị nwere maka Nna nke Eluigwe bụ mmetụta kachasị mkpa na ndụ gị, ọtụtụ mkpebi na-adịzị mfe karịa.

Nnukwu iwu nsọ abụọ bụ ịhụ Chineke naanya ma hụkwa onye agbata obi gị naanya. Ma onye bụ onye agbata obi gị? Onye niile! Ihe ndị ọzọ akuziri niime akwụkwọ nsọ ma site nʻọnụ ndị amụma nwere njikọ ya na iwu abụọ ndị ahụ.

Mmadụ niile bụ ụmụnne gị ndị nwoke na nwanyị—gụnyekwara, nʻezie, ndị mmadụ dị iche site na gị ma ọ bụ na-ekwenyereghi gị. Nna nke Eluigwe chọrọ ka ụmụ Ya niile hụkọrịta onwe ha naanya. Mgbe ị na-ejere ụmụ Ya ozi, ị na-ejere Ya ozi.

Ịkpọ okù

Gosi Chineke ịhụnaanya site na-idobe iwu nsọ Ya. Nʻịmatụ, site na-idebe Ụbọchị izuike nsọ, gụnyere ịkwesị ntụkwasị obi nʻịkwado maka na iri oriri nsọ, ị na-egosi Chineke na ịdị njikere ịrara otu ụbọchị niime otu izuụka nye Ya. Dịka ị na-ebu ọnụ ma na-akwụ otu ụzọ n’ụzọ iri niile na onyinye ndị ọzọ, ị na-egosi Chineke na ọrụ Ya kachasị dịrị gị mkpa karịa ihe niile nke ụwa. Mgbe ijiri aha nke Chineke na Kraịst na nkwanye ugwu, nʻabụghị nʻụzọ ihe efu ma ọlị, ị na-egosi na i nwere obi ekele maka ihe niile Ha mewooro gị.

Meso onye ọbụla agwa dịka nwa nke Chineke. Dịka onye na-eso ụzọ Jizọs Kraịst, ị nwere ike ibute ụzọ na-imeso agburu niile, okpukperechi, na otù ndị ọzọ omume jiri ịhụnaanya na nsọpụrụ—tụmadị ndị ahụ mgbe ụfọdụ na-abụkarị ndi emejoro jiri okwuọnụ na omume na-agbawa obi. Kpọtụrụ ndị ahụ nọ naanị ha, ndị agụpụrụ agụpụ na ndị na-enweghi onye ịnyeaka. Nyere ha aka nwete mmetụta ịhụnaanya nke Chineke site na gị. Kesaara ha ngọzi niile nke Ọ nyeworo gị, ma kpokuo ha isoro Jizọs Kraịst.

Hụkwa na asụsụ gị na-egosịpụta ịhụnaanya nke i nwere na Chineke na ndị ọzọ—ma ị na-akparịta ụka mmadụ na mmadụ ma ọ bụ na ikuku. Kwuo ihe ndị na-ebuli elu—nʻabụghị ihe nwere ike ibute nkewa, ịkpasu iwe, ma ọ bụ mkparị, ọ bụna dị ka njakịrị. Okwu gị niile nwere ike ịdị ike. Ọ ga-aka mma ma ha dị ike maka ezi ihe.

Gosi ezinụlọ gị ihụnaanya. Ịhụ ụmụ Chineke niile naanya na-amalite nʻebe obibi. Mee oke na ọrụ gị iji mee ka ebe obibi gị bụrụ ebe onye ọbụla nwere ike nwee mmetụta ịhụnaanya nke Onye Nzọpụta.

Jizọs Kraịst (nʻebe ọdọ mmiri nke Bethesda) na-ewelite  balanket nke nʻokpuru ya ka nwoko ngwọrọ dinara

Ngọzi ndị Ekwere nkwa

Mmekọrịta gị na Chineke ga-adịkwu omimi dịka ị na-egosipụta ịhụnaanya gị site na-irube isi nye iwu nsọ Ya ma na-edebe ọgbụgba ndụ gị na Ya gbara.

Njikọta gị na Chineke ga-adịkwu omimi dịka ị na-egosipụta ịhụnaanya gị site nʻije ozi yiri nke Kraịst. Ị ga-achọta ọn̄ụ site na-ime ụwa ka ọ bụrụ ebe dị ịhụnanya karịa.

Ajụjụ na Azịza niile

Kedụ otu m ga-esi nwee mmetụta ịhụnaanya nke Chineke? Ịhụnaanya nke Nna nke Eluigwe dị adị oge niile. Kwuoro Ya okwu mgbe na mgbe site nʻekpere. Kọọrọ Ya mmetụta gị niile, ma gee ntị na mmetụta niile ga-abịa site nʻaka Ya. Gụọ okwu Ya niile niime akwụkwọ nsọ. Chee banyere ihe niile O mewooro gị. Tinye oge nʻebe niile ma nʻihe omume niile ebe Mmụọ Ya nọ.

Onyenwe anyị ọ na-atụanya ka m hụ onye niile naanya, ọbụna ndị mesoro m agwa ọjọọ? Onyenwe anyị na-atụanya na ị ga-ahụ ndị iro gị naanya ma kpee ekpere nʻisi ndị ahụ na-emeso gị agwa ọjọọ. Agbanyeghị, nke ahụ apụtaghị na ị ga-anọrọ nʻọnọdụ nke na-emerụ gị ahụ nʻuche, nʻelu ahụ ma ọ bụ nke ime mmụọ. Debe okè ziri ezi iji chekwaa onwe gị. Ọ bụrụ na a na-emekpa gị ahụ ma ọ bụ metọọ gị, ma ọ bụ ịma otuonye na-agabiga nke a, kwuoro onye dimkpa dị ntụkwasị obi okwu.

Kedụ mgbe na kedụ otu m kwesịri iji mata ndị ahụ nʻabụghị ndị otù okike ọmụmụ m? Ụzọ kachasị mma iji mata ndị ọzọ bụ site na-ịmeenyi ziri ezi. Mgbe ịbụ ntorobịa, wulite ezi mmekọ enyi gị na ọtụtụ mmadụ. Nʻụfọdụ omenala, ndị ntorobịa na-amata ndị otù nʻabụghị otu okike ọmụmụ ha site nʻegwuruegwu ziri ezi emekọtara nʻigwè. Maka mwulite uche na nke ime mmụọ nakwa nchekwa, hapụgodi ihe omume onye-na-onye ugbua tutu ruo mgbe i tozuru oke—afọ 16 bụ ezi mmalite. Dụkọrịta odụ gị na ezi na ụlọ gị na ndị ndu gị. Dobe ime enyi otuonye na otuonye tutu ruo mgbe imetụrụ okenye. Na-akpakọrịta gị na ndị ahụ na-enyere gị aka debe mkpebi obi niile imere nye Jizọs Kraịst.

Kedụ ihe m nwere ike ịme ma ọ bụrụ na ebe obibi m abụghị ebe ịhụnaanya dị? Onye Nzọpụta maara onọdụ gị, ma Ọ hụrụ gị naanya. Nwee ndidi, gaaniihu na-edebe iwu nsọ niile nke Chineke, ma bụrụ ezi ọmụmaatụ nye ezinụlọ gị. Omume gị niile nke ịhụnaanya dị mfe nwere ike rọpụta ndịiche dị ukwuu. inwekwara ike wuo mmekọrịta niime ezinụlọ nke ngalaba ukwu gị. Kwadoo ugbua iwulite ezinụlọ nke gị nke ehiwere nʻelu nkuzi niile nke Jizọs Kraịst. Cheta: Jizọs Kraịst bụ ume gị!

Lee Aịzaya 58:3–11 (ebumnuuche niile nke ibu ọnụ); 58:13–14 (ngọzi niile nke ikwanyere ụbọchị izuike ugwu); Malakaị 3:8–10 (ngọzi niile nke ịkwụ otu ụzọ n’ụzọ iri); Luk 6:27–28 (hụ ndị iro gi naanya); 10:25–37 (kedụ onye bụ onye agbata obi m?); Jọn 3:16–17 (Chineke hụrụ anyị naanya, ya mere O jiri zite Ọkpara Ya); 14:15 (anyị na-edebe iwu nsọ niihi anyị hụrụ Chineke naanya); 1 Jọn 4:19 (anyị hụrụ Chineke naanya niihi na Ọ hụrụ anyị naanya); Mosaia 2:17 (mgbe anyị na-ejere ndị ọzọ ozi, anyị na-ejere Chineke ozi).

Ajụjụ nke Rekọmend Tempụl

  • Ị na-esoro nkuzi niile nke Nzukọ nsọ ahụ nke Jizọs Kraịst niime omume nke onwe gị na n’ihu ọha n’etiti ndi otù ezi na ụlọ gị na ndi ọzọ?

  • Ị bụ onye na-akwụzu otu ụzọ na ụzọ iri?